Chineke Na-anabata Mba Nile
Chineke Na-anabata Mba Nile
NA NJEM mbụ ya gaa Mali, omume ile ọbịa nke Mamadou na ezinụlọ ya gosiri metụrụ John n’ahụ́. Ka John nọ ọdụ n’ala na-eri nri site n’efere nke mmadụ nile si na ya na-eri nri, ọ nọ na-eche ụzọ kasị mma ọ ga-esi soro ndị na-ele ya ọbịa kerịta otu onyinye dị nnọọ oké ọnụ ahịa—ozi ọma Alaeze ahụ nke si n’Okwu Chineke bụ́ Bible. Ọ bụ ezie na ọ maara asụ French, bụ́ asụsụ a na-asụ na Mali. John nọ na-eche ụzọ ya na ezinụlọ nke okpukpe ha na ụzọ ha si eche echiche dị nnọọ iche ga-esi nwee nkwurịta okwu.
Ọ bụghị ihe ijuanya na John chetara ihe ndekọ Bible banyere obodo Bebel. N’ebe ahụ ka Chineke ghagburu asụsụ ndị nnupụisi ahụ. (Jenesis 11:1-9) N’ihi ya, ìgwè mmadụ ndị nwere asụsụ, okpukpe, na echiche dịgasị iche iche bilitere n’akụkụ dịgasị iche iche nke ụwa. Taa, ka ime njem na nkwagharị na-aghọ ihe a na-emekarị, ọtụtụ ndị na-ezute ihe ịma aka ndị yiri nke ahụ John chere ihu, ọbụna n’agbata obi ha: Ụzọ ha na ndị si ná nzụlite dị iche ga-esi kerịta olileanya ha dabeere na Bible.
Ihe Atụ Oge Ochie
Dị ka ndị amụma ndị ọzọ n’Izrel, n’ụzọ bụ́ isi ọ bụ ndị Izrel ka Jona gwara okwu. O buru amụma banyere oge mgbe alaeze ebo iri ahụ si n’ezi ofufe dapụ ga-etinye aka n’ụzọ pụtara ìhè n’omume ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. (2 Ndị Eze 14:23-25) Cheedị echiche mmeghachi omume Jona mgbe ọ natasịrị ọrụ ahụ pụrụ iche ka ọ hapụ mba ya ma gaa Asiria ịga kwusaara ndị bi na Nineve ozi ọma, bụ́ ndị nwere okpukpe na omenala dị iche. O nwere ike ịbụ na Jona asụtụbeghịdị asụsụ ndị Nineve, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ọ naghị asụ ya were were. Ka o sina dị, o doro anya na Jona hụtara nnọọ ihe ịma aka ahụ dị ka nke karịrị ya, o wee gbaa ọsọ.—Jona 1:1-3.
N’ụzọ doro anya, ọ dị Jona mkpa ịmụta na Jehova Chineke na-ahụ ihe karịrị nanị ọdịdị elu ahụ́, ọ na-enyochakwa obi. (1 Samuel 16:7) Mgbe ọ zọpụtasịrị Jona n’ụzọ ọrụ ebube ka mmiri ghara iri ya, na nke ugboro abụọ, Jehova nyere ya iwu ka ọ gaa mee nkwusa nye ndị bi na Nineve. Jona rubere isi, n’ihi ya kwa, ndị Nineve nile chegharịkọtara. N’agbanyeghị nke ahụ, Jona eleghị ya anya n’ụzọ ziri ezi. Site n’otu ihe mmụta dị ike, Jehova kụziiri ya na ọ dị ya mkpa ịgbanwe echiche ya. Jehova jụrụ Jona, sị: “Ḿ gaghị emere Nineve ebere, bụ́ obodo ukwu ahụ; nke ihe karịrị [otu narị puku na iri puku mmadụ abụọ] nọ n’ime ya, bụ́ ndị na-amaghị nke bụ́ aka nri ha na aka ekpe ha?” (Jona 4:5-11) Gịnị banyere anyị taa? Olee otú anyị pụrụ isi nyere ndị nwere nzụlite dị iche aka?
Ịnabata Ndị Sameria na Ndị Na-abụghị Ndị Juu
Na narị afọ mbụ, Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu ka ha mee ndị nke mba nile ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19) Nke a adịghịrị ha mfe. Ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ndị Juu, dịkwa ka Jona, ha bụ ndị ọ maara ahụ́ ikwunyere nanị ndị ha na ha nwere otu nzụlite na ọdịnala okwu. Dị ka ọ na-adịkarị, ha ga-enwewokwarị mmetụta nke ịbụ ndị ajọ mbunobi ndị e nwere n’oge ahụ nwere mmetụta n’ahụ́ ha. Otú ọ dị, Jehova duziri ihe, ndị na-ejere ya ozi jiri nke nta nke nta ghọta ihe bụ uche ya maka ha.
Nzọụkwụ nke mbụ bụ imeri ajọ mbunobi nke dị n’etiti ndị Juu na ndị Sameria. Ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọrịta ihe. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe karịrị otu ugboro, Jizọs mere ka ndị Sameria nwee ike ịnabata ozi ọma ahụ n’ọdịnihu. O gosiri eleghị mmadụ anya n’ihu ya site n’ịgwa nwanyị Sameria okwu. (Jọn 4:7-26) N’oge ọzọ, site n’ihe atụ nke ezi onye agbata obi ahụ bụ́ onye Sameria, o gosiri onye Juu ji okpukpe kpọrọ ihe na ndị ọzọ na-abụghị ndị Juu nwekwara ike igosi ịhụnanya n’ebe ndị agbata obi ha nọ. (Luk 10:25-37) Mgbe oge ruru ka Jehova kpọbata ndị Sameria n’ọgbakọ Ndị Kraịst, Filip, Pita, na Jọn—ndị bụcha ndị Juu—kwusaara ndị bi na Sameria ozi ọma. Ozi ha rụpụtara oké ọṅụ n’obodo ahụ.—Ọrụ 8:4-8, 14-17.
Ọ bụrụ na o siiri ndị Juu bụ́ Ndị Kraịst ike ịhụ ndị Sameria n’anya, ndị bụ́ n’ezie, ndị ikwu dị anya nke ndị Juu, ọ ghaghị isiworo ha ike karịa ọbụna igosi ịhụnanya nke onye agbata obi n’ebe ndị na-abụghị ndị Juu, ma ọ bụ ndị Jentaịl nọ. (Ndị Efesọs 2:13, 14) Iji nyere Pita aka ịnakwere ndokwa ọhụrụ a, Jehova gosiri ya ọhụụ nke ọ nọ na ya gwa ya ka ọ “kwụsị ịkpọ ihe ndị Chineke meworo ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” Mgbe ahụ, mmụọ Jehova duuru ya gakwuru otu onye Jentaịl aha ya bụ Kọnịliọs. Mgbe Pita ghọtara echiche Chineke—na ya ekwesịghị ịkpọ nwoke a bụ́ onye mba ọzọ onye rụrụ arụ n’ihi na Chineke emewo ka ọ dị ọcha—o kwuru site n’ike mmụọ nso, sị: “N’ezie ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:9-35) Lee ka o si ju Pita anya mgbe Chineke gosiri na ya nabatara Kọnịliọs na ezinụlọ ya site n’ịwụkwasị ha mmụọ nsọ ya!
Pọl—Arịa A Họọrọ Ịgakwuru Ndị Mba Ọzọ
Ije ozi Pọl bụ ihe atụ pụtara ìhè nke otú Jehova si na-akwadebe ndị na-ejere ya ozi n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu ịhụ ụdị mmadụ nile n’anya na inyere ha aka. N’oge ntọghata Pọl, Jizọs kwuru na Pọl ga-arụ ọrụ dị ka arịa ọ họọrọ iburu aha Ya gakwuru ndị mba ọzọ. (Ọrụ 9:15) Pọl gaziri Arebia, ikekwe ịga tụgharịa uche ná nzube Chineke nke bụ́ iji ya kpọsaara ndị mba ọzọ ozi ọma.—Ndị Galeshia 1:15-19.
Na njem ozi ala ọzọ mbụ ya, Pọl gosiri ịnụ ọkụ n’obi n’ikwusara ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma. (Ọrụ 13:46-48) Jehova gọziri ọrụ Pọl, bụ́ ihe àmà na-egosi na onyeozi ahụ na-eme ihe kwekọrọ ná ndokwa Jehova. Pọl gosiri na ya ghọtara echiche Jehova n’ụzọ zuru ezu mgbe o ji obi ike gbazie Pita, bụ́ onye gosipụtara omume ile mmadụ anya n’ihu site n’izere isoro ụmụnna ya na-abụghị ndị Juu mekọọ ihe.—Ndị Galeshia 2:11-14.
A na-ahụ ihe àmà ọzọ na-egosi na Chineke nọ na-eduzi mgbalị Pọl na njem ozi ala ọzọ nke abụọ ya, mgbe mmụọ nsọ gbochiri Pọl ime nkwusa n’ógbè ndị Rom bụ́ Bitinia. (Ọrụ 16:7) O doro anya na oge erubeghị mgbe ahụ. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, ụfọdụ ndị Bitinia ghọrọ Ndị Kraịst. (1 Pita 1:1) N’otu ọhụụ, otu onye Masedonia rịọrọ Pọl, na-asị: “Gafeta na Masedonia nyere anyị aka.” Pọl ruru ná nkwubi okwu bụ na ya kwesiri ịgbanwe ebe ya na-aga iji wee kwusaa ozi ọma n’ógbè ndị Rom ahụ.—Ọrụ 16:9, 10.
E lere ikike Pọl nwere ịnagide ọnọdụ ọ bụla ule n’ụzọ siri ike mgbe o kwusaara ndị Atens ozi ọma. Iwu ndị Gris na ndị Rom machibidoro mmadụ iwebata chi ndị ala ọzọ na omenala okpukpe ọhụrụ. Ịhụnanya Pọl nwere n’ebe ndị mmadụ nọ kwaliri ya ichebara nnọọ omume okpukpe ha echiche. N’Atens, ọ hụrụ otu ebe ịchụàjà nke e dekwasịrị “nye Chi A Na-amaghị Ama.” O hotara ihe a ọ hụrụ n’ọrụ ịgba àmà ya. (Ọrụ 17:22, 23) Lee ụzọ dị mma ọ bụ isi webata ozi ya n’ụzọ obiọma na nkwanye ùgwù!
Lee obi ụtọ Pọl na-aghaghị inweworị mgbe o leghachiri anya azụ n’ihe ndị ọ rụzuru dị ka onyeozi nye ndị mba ọzọ! O nyere aka iguzobe na Kọrint, Filipaị, Tesalonaịka, na n’obodo ndị dị na Galeshia, ọgbakọ ndị ọ bụ ọtụtụ Ndị Kraịst na-abụghị ndị Juu mejupụtara ha. O nyeere ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe, dị ka Damaris, Daịọnisiọs, Sajiọs Pọlọs na Taịtọs aka. Lee ihe ùgwù ọ bụ ịhụ ka ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ Bible nakweere eziokwu nke Iso Ụzọ Kraịst! N’ihi ọrụ ọ rụrụ n’inyere ndị na-abụghị ndị Juu aka ịmata eziokwu ahụ, Pọl Ndị Rom 15:20, 21) Ànyị pụrụ ikere òkè n’ịkpọsara ndị na-esiteghị n’ọdịnala anyị ozi ọma ahụ?
kwuru, sị: “N’ezie, n’ụzọ dị otú a, emere m ka ọ bụrụ nzube m ịghara ịkpọsa ozi ọma n’ebe a kpọwororị Kraịst aha, . . . kama, dị nnọọ ka e dere, sị: ‘Ndị ọ na-adịghị ọkwa a mawooro ha banyere ya ga-ahụ ụzọ, ndị na-anụbeghịkwa ga-aghọta.’” (Inyere Ndị Nile nke Ụwa Aka
Solomọn kpegaara Jehova ekpere banyere ndị na-abụghị ndị Izrel, bụ́ ndị ga-abịa ife ofufe n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem. Ọ rịọrọ, sị: “Gị onwe gị nụrụkwa n’eluigwe, bụ́ ọnọdụ obibi Gị guzosiri ike, mee dị ka ihe nile si dị nke onye ala ọzọ ahụ na-akpọku Gị; ka ndị nile nke ụwa wee mara aha Gị.” (1 Ndị Eze 8:41-43, ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Ọtụtụ puku ndị nkwusa Alaeze bụ́ ndị nọ n’ọtụtụ mba taa na-ekwupụtaghachi okwu ndị ahụ. Ha na-ezute ndị yiri ndị Nineve, bụ́ ndị, n’ụzọ ime mmụọ “na-amaghị nke bụ́ aka nri ha na aka ekpe ha.” Ndị nkwusa Alaeze nwekwara ọchịchọ siri ike iso kere òkè ná mmezu nke amụma ndị metụtara nchịkọta nke ndị na-efe ezi ofufe site n’ọtụtụ mba.—Aịsaịa 2:2, 3; Maịka 4:1-3.
Dị nnọọ ka ndị si na Krisendọm nakwerewooro ozi ahụ na-enye olileanya nke si na Bible, ndị a zụlitere n’okpukpe ndị ọzọ na-emekwa otú ahụ. Olee otú nke a kwesịrị isi metụta gị onwe gị? Jiri obi eziokwu nyochaa onwe gị. Ọ bụrụ na ị na-eche na ajọ mbunobi gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ime gị, were ịhụnanya merie ya. * Ajụla ndị Chineke dị njikere ịnabata.—Jọn 3:16.
Kwadebe nke ọma n’uche gị tupu gị na ndị nwere nzụlite ọzọ ana-enwe nkwurịta okwu. Mata nke ọma nkwenkwe ha, nchegbu ha, na ụzọ ha si eche echiche; mgbe ahụ chọọ ihe gị na ha nwekọrọ mmasị na ya. Gosi ndị ọzọ ịdị mma na ọmịiko. Zere esemokwu, dị nro ma nwee echiche ziri ezi. (Luk 9:52-56) N’ime nke ahụ, ị ga na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, “onye ọ bụ uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Timoti 2:4.
Lee ka obi si atọ anyị ụtọ inwe ndị nwere nzụlite dị iche iche n’ọgbakọ anyị dị iche iche! (Aịsaịa 56:6, 7) Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ ịnụ taa, ọ bụghị nanị aha ndị dị ka, Mary, John, Stephen, na Tom, kamakwa aha ndị dị ka Mamadou, Jegan, Reza, na Chan! N’eziokwu “e megheworo [anyị] ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.” (1 Ndị Kọrint 16:9) Ka anyị jiri ohere dị iche iche anyị nwere kpọsaa òkù ahụ Jehova Chineke, bụ́ onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu na-akpọ, bụ́ ịnabata ndị nke mba nile!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 19 Lee Teta! July 8, 1996 peeji nke 5-7, “Mgbidi Ndị Na-egbochi Nkwurịta Okwu.”
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Pọl sooro ndị mmadụ kerịta ozi ọma ahụ n’ebe nile site n’ịdị na-eme mgbanwe
. . . n’Atens
. . . na Filipaị
. . . mgbe ọ na-eme njem