Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụrụ Anya, Jiri Obi Ike Na-aga n’Ihu!

Mụrụ Anya, Jiri Obi Ike Na-aga n’Ihu!

Mụrụ Anya, Jiri Obi Ike Na-aga n’Ihu!

Akụkọ Banyere Nzukọ Ndị Pụrụ Iche

Ọ̀ DỊ onye pụrụ ịrụ ụka n’ụzọ ziri ezi na anyị na-ebi “n’oge pụrụ iche nke siri ike obibi”? Dị ka Ndịàmà Jehova, a gụpụghị anyị ná ndị nrụgide nke ibi “n’ụbọchị ikpeazụ” na-emetụta. (2 Timoti 3:1-5) Ma anyị na-aghọta na enyemaka dị ndị mmadụ mkpa. Ha adịghị aghọta ihe ihe ndị na-eme n’ụwa pụtara. Nkasi obi na olileanya dị ha mkpa. N’ụzọ bụ́ isi, gịnị bụ òkè anyị na-ekere n’inyere ụmụ mmadụ ibe anyị aka?

Chineke nyere anyị ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke e guzobere eguzobe. (Matiu 24:14) Ọ dị ndị mmadụ mkpa ịmara na Alaeze eluigwe a bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, a dịghị anabata ozi anyị nke ọma mgbe nile. N’ebe ụfọdụ, a machibidowo ọrụ anyị iwu ma kpagbuo ụmụnna anyị. Ma, anyị adịghị ada mbà. N’ịbụ ndị tụkwasịrị Jehova obi n’ụzọ zuru ezu, anyị kpebisiri ike ịmụrụ anya na ịnọgide na-eji obi ike aga n’ihu, na-akpọsa ozi ọma ahụ n’esepụghị aka.—Ọrụ 5:42.

Mkpebi ahụ siri ike pụtara ìhè ná nzukọ ndị pụrụ iche e nwere n’October nke 2001. Na Saturday, October 6, e nwere nzukọ kwa afọ nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania n’Ụlọ Mgbakọ nke Ndịàmà Jehova dị na Jersey City, New Jersey, United States. * N’echi ya, e nwere nzukọ ntụkwasị n’ebe anọ, atọ bụ na United States, ebe otu bụ na Canada. *

N’okwu mmeghe ya ná nzukọ kwa afọ ahụ, onyeisi oche ya, bụ́ Samuel F. Herd, onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, zoro aka n’Abụ Ọma 92:1, 4 ma kwuzie, sị: “Anyị chọrọ igosi na anyị nwere ekele.” N’ezie, e kwuru ihe ndị mere anyị ga-eji na-enwe ekele n’akụkọ ise e nwetara gburugburu ụwa.

Akụkọ Ndị Si n’Ebe Nile

Nwanna Alfred Kwakye kọrọ banyere ọganihu a na-enwe n’ọrụ nkwusa ahụ na Ghana, bụ́ nke a mabu dị ka Gold Coast. A machibidoro ọrụ anyị iwu n’ala ahụ ruo ọtụtụ afọ. Ndị mmadụ na-ajụ, sị: “Gịnị kpatara mmachibido iwu ahụ? Gịnị ka unu mere?” Nke a na-emeghe ohere maka ịgba àmà, ka Nwanna Kwakye kọwara. Na 1991 bụ́ mgbe e wepụrụ mmachibido iwu ahụ, e nwere mmadụ 34,421 bụ́ Ndịàmà Jehova na Ghana. N’August 2001, ha dị 68,152—mmụba dị pasent 98. A na-eme atụmatụ iwu Ụlọ Mgbakọ nke ga-aba mmadụ 10,000. N’ụzọ doro anya, ụmụnna ime mmụọ anyị nọ na Ghana ji nnwere onwe okpukpe ha na-eme ihe n’ụzọ kasị mma.

N’agbanyeghị ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ụmụnna anyị nọ n’Ireland na-ekeresi òkè ike n’ozi ahụ, a na-akwanyekwara ha ùgwù maka nnọpụiche ha. Ireland nwere ọgbakọ 115 na sekit 6, ka onye nhazi Kọmitii Alaka bụ́ Peter Andrews kwuru. Nwanna Andrews kọrọ ahụmahụ banyere Liam, bụ́ nwata nwoke dị afọ iri nke na-adịghị atụ egwu ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ. Liam nyefere mmadụ 25 n’ime ụmụ klas ya nakwa onye nkụzi ya Akwukwọm nke Akukọ Bible, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Liam chọrọ ka e mee ya baptizim, ma otu onye jụrụ ma ò toruola maka ya. Liam zaghachiri, sị: “Ihe kwesịrị ikpebi ya abụghị afọ ole m dị kama ọ bụ ịhụnanya m nwere n’ebe Jehova nọ. Baptizim mụ ga-egosi otú m hụruru ya n’anya.” Ihe mgbaru ọsọ Liam bụ ịghọ onye ozi ala ọzọ.

Na 1968, e nwere ndị nkwusa 5,400 nke ozi ọma ahụ na Venezuela. Ma ugbu a e nwere ihe karịrị 88,000, ka Stefan Johansson, bụ́ onye nhazi Kọmitii Alaka kwuru. O yikwara ka a ka ga-enwekwu mmụba n’ihi na ihe karịrị mmadụ 296,000 bịara Ememe Ncheta na 2001. Na December nke 1999, oké mmiri ozuzo mere ka e nwee apịtị na-asọ asọ bụ́ nke gburu ihe e mere atụmatụ na ha dị mmadụ 50,000, gụnyere ọtụtụ Ndịàmà. Apịtị jupụtara n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ruo ihe fọrọ ọkara otu mita ka o ruo n’uko ụlọ ahụ. Mgbe otu onye tụrụ aro ka a gbahapụ ụlọ ahụ, ụmụnna zaghachiri, sị: “Anyị agaghị anwa ya anwa! Ihe a bụ Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị, anyị achọghịkwa ịgbahapụ ya ugbu a.” Ha malitere ọrụ, na-ekpopụ ikpo apịtị, nkume, na ụmụ irighiri ihe ndị ọzọ. A rụziri ụlọ ahụ, ụmụnna kwukwara na ọ mara mma ugbu a karịa otú ọ mara tupu ọdachi ahụ emee!

E nwere asụsụ na olumba 87 na Philippines, ka Nwanna Denton Hopkinson, bụ́ onye nhazi Kọmitii Alaka kwuru. N’ime afọ ije ozi gara aga, e wepụtara New World Translation of the Holy Scriptures n’ozuzu ya n’asụsụ atọ bụ́ isi nke mba ahụ—Cebuano, Iloko, na Tagalog. Nwanna Hopkinson kọrọ ahụmahụ banyere nwata nwoke dị afọ itoolu bụ́ onye gụrụ akwụkwọ bụ́ Ozi Ọma—Nke Geme Ka I Nwee Obi Utọ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara. O nwetara akwụkwọ ndị ọzọ site n’alaka ụlọ ọrụ, bụ́ ndị ọ gụkwara, ma ezinụlọ ya megidere ya. Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, bụ́ mgbe ọ nọ n’ụlọ akwụkwọ nkà mmụta ọgwụ, ọ kpọtụụrụ alaka ụlọ ọrụ ahụ ma rịọ maka ọmụmụ Bible. E mere ya baptizim na 1996, ọ banyekwara n’ozi oge nile n’oge na-adịghị anya. Ya na nwunye ya na-eje ozi ugbu a n’alaka ụlọ ọrụ ahụ.

‘Puerto Rico nọ n’ọrụ “mbupụ Ndịàmà,”’ ka onye nhazi Kọmitii Alaka bụ́ Ronald Parkin kọwara. E nwere ihe dị ka ndị nkwusa 25,000 n’àgwàetiti ahụ, ọnụ ọgụgụ ahụ adịgidewokwa otú ahụ ruo ọtụtụ afọ. N’ihi gịnị? A na-eme atụmatụ na, kwa afọ, Puerto Rico “na-ebupụ” ihe dị ka 1,000 ndị nkwusa gaa United States, ọtụtụ n’ime ha na-akwaga ebe ahụ n’ihi ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba. Nwanna Parkin kọrọ banyere otu mkpebi ikpe dị ịrịba ama bụ́ nke metụtara Luis, bụ́ Onyeàmà dị afọ 17 nke na-arịa ọrịa leukemia. Ebe ọ bụ na Luis ekweghị ka a mịnye ya ọbara, e wepụrụ okwu ya n’ụlọikpe. Ọkàikpe chọrọ ka ya na ya kwurịta okwu, n’ihi ya, ọ chọọrọ ya gaa n’ụlọ ọgwụ. Luis jụrụ ya, sị: “N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na m mee mpụ dị njọ, unu ekpee m ikpe ka m bụ onye toruworo ogo mmadụ, ma mgbe m chọrọ irubere Chineke isi, unu ana-emeso m ka m bụ nwata?” Ọkàikpe ahụ bịara kwenye na ọ bụ nwata toworo eto ma nwee ike imere onwe ya mkpebi.

Mgbe a kọsịrị akụkọ ndị ahụ si n’ala ndị dị anya, Harold Corkern, nke so na Kọmitii Alaka United States, gbara mmadụ anọ jewooro Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ ajụjụ ọnụ. Arthur Bonno ejewo ozi oge nile ruo afọ 51 ma na-eje ozi ugbu a na Kọmitii Alaka Ecuador. Angelo Catanzaro ejewo ozi oge nile ruo afọ 59, o ji ihe ka ọtụtụ n’ime ha jee ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị. Richard Abrahamson gụsịrị akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilead na 1953, o nwekwaara ihe ùgwù nke ilekọta ọrụ ahụ na Denmark ruo afọ 26 tupu ya alọghachi na Betel Brooklyn. N’ikpeazụ, obi tọrọ mmadụ nile ụtọ ịnụrụ okwu Carey W. Barber dị afọ 96. N’ịbụ onye e mere baptizim na 1921, Nwanna Barber ejewo ozi oge nile ruo afọ 78, o sowokwa n’Òtù Na-achị Isi kemgbe 1978.

Okwu Ndị Na-akpali Akpali

Nzukọ kwa afọ ahụ gụnyere ọtụtụ okwu ndị na-akpali echiche. Nwanna Robert W. Wallen kwuru okwu n’isiokwu, bụ́: “Otu Ndị Maka Aha Ya.” Anyị bụ ndị dịịrị aha Chineke, a pụkwara ịhụ anyị n’ihe karịrị ala 230. Jehova enyewo anyị “ọdịnihu na ntụkwasị obi.” (Jeremaịa 29:11) Anyị aghaghị ịnọgide na-akwalite Alaeze Chineke, na-ekerịta ozi dị ebube nke nkasi obi na ngụgụ obi. (Aịsaịa 61:1) “Site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị,” ka Nwanna Wallen kwubiri, “ka anyị nọgide na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’aha a na-akpọ anyị, bụ́ Ndịàmà Jehova.”—Aịsaịa 43:10.

Akụkụ ikpeazụ nke usoro ihe omume ahụ bụ usoro isiokwu nke mmadụ atọ so n’Òtù Na-achị Isi kwuru. Isiokwu ya bụ “Ugbu A Bụ Oge Ịmụrụ Anya, Guzosie Ike, Ma Dị Ike.”—1 Ndị Kọrint 16:13.

Nke mbụ, Nwanna Stephen Lett kwuru okwu n’isiokwu bụ “Mụrụ Anya n’Awa Ikpeazụ A.” Ụra nkịtị bụ onyinye, ka Nwanna Lett kọwara. Ọ na-eme ka anyị nwetaghachi ume. Otú ọ dị, ụra ime mmụọ adịghị mma ma ọlị. (1 Ndị Tesalonaịka 5:6) Oleezi otú anyị pụrụ isi nọgide na-amụ anya n’ụzọ ime mmụọ? Nwanna Lett kwupụtara “mkpụrụ ọgwụ” ime mmụọ atọ: (1) Nwee ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị. (1 Ndị Kọrint 15:58) (2) Mara mkpa ime mmụọ gị. (Matiu 5:3) (3) Na-anabata ndụmọdụ dabeere na Bible ka i wee na-eji amamihe eme ihe.—Ilu 13:20.

Nwanna Theodore Jaracz kwuru okwu na-akpali akpali nke isiokwu ya bụ “Guzosie Ike n’Okpuru Ule.” N’izo aka ná Mkpughe 3:10, Nwanna Jaracz jụrụ, sị: “Gịnị bụ ‘awa nke ule’ ahụ?” Ule ahụ na-abịa “n’ụbọchị Onyenwe anyị,” bụ́ oge anyị bi na ya. (Mkpughe 1:10) Ule ahụ metụtara ihe iseokwu ahụ bụ́ isi—ànyị kwụnyeere Alaeze Chineke e guzobere eguzobe ka ọ bụ ajọ usoro ihe Setan? Ruo mgbe awa ule ahụ ga-agwụ, anyị aghaghị ịdị na-enweta ọnwụnwa ma ọ bụ ihe isi ike dị iche iche. Ànyị gaje ịnọgide na-eguzosi ike n’ihe nye Jehova na nzukọ ya? ‘Anyị aghaghị igosipụta nguzosi ike n’ihe dị otú ahụ dị ka ndị mmadụ n’otu n’otu,’ ka Nwanna Jaracz kwuru.

N’ikpeazụ, Nwanna John E. Barr kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Dị Ike Dị Ka Onye Ji Ihe Ime Mmụọ Kpọrọ Ihe.” N’izo aka na Luk 13:23-25, o kwuru na anyị aghaghị itinyesi mgbalị ike “isi n’ọnụ ụzọ dị warara banye.” Ọtụtụ ndị na-ada n’ihi na ha anaghị adị uchu n’ụzọ zuru ezu iji dị ike. Iji ghọọ Ndị Kraịst tozuru okè, anyị aghaghị ịmụta itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ n’akụkụ nile nke ndụ anyị. Nwanna Barr gbara ume, sị: “Eji m n’aka na unu ga-ekweta na ugbu a bụ oge maka (1) idebe Jehova n’ọnọdụ mbụ; (2) ịdị ike; na (3) itinyesi mgbalị ike n’ime uche Jehova. N’ụzọ dị otú a, anyị ga-enwe ike isi n’ọnụ ụzọ ahụ dị warara nke na-eduga ná ndụ dị ebube nke na-enweghị ọgwụgwụ banye.”

Ka nzukọ kwa afọ ahụ nọ na-abịa ná njedebe, ọ dị otu ajụjụ a na-azabeghị: Gịnị bụ isiokwu dịịrị afọ maka afọ ije ozi 2002? A zara ajụjụ ahụ n’echi ya.

Nzukọ Ntụkwasị

E nwere oké atụmanya n’ụtụtụ Sunday ka usoro ihe omume nke nzukọ ntụkwasị ahụ malitere. O ji nchịkọta nke ihe ọmụmụ Ụlọ Nche dịịrị izu ahụ malite, okwu dị mkpirikpi banyere ụfọdụ isi ihe ndị a tụlere ná nzukọ kwa afọ ahụ sochikwara. Mgbe nke ahụ gasịrị, obi tọrọ mmadụ nile ụtọ ige okwu dabeere n’isiokwu dịịrị afọ 2002: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.” (Matiu 11:28) Isiokwu ahụ dabeere n’isiokwu ndị dịịrị ọmụmụ e mesịrị bipụta n’Ụlọ Nche nke December 15, 2001.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ụfọdụ ndị gara Mgbakọ “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” pụrụ iche e nwere na France na Ịtali n’August 2001 kọrọ ahụmahụ ha. * N’ikpeazụ, dị ka isi ihe e mere n’usoro ihe omume nke ụbọchị ahụ, ndị ọkà okwu si Betel Brooklyn kwuru okwu abụọ ndị ikpeazụ.

Isiokwu nke mbụ bụ “Iji Obi Ike Na-atụkwasị Jehova Obi n’Oge Ndị A Pụrụ Iche.” Ọkà okwu ahụ kọwapụtara isi ihe ndị a na-esonụ: (1) Iji obi ike na-atụkwasị Jehova obi adịlarị anya ọ dịwara ndị Chineke oké mkpa. Bible nwere ọtụtụ ihe atụ nke ndị gosipụtara obi ike na okwukwe n’agbanyeghị mmegide. (Ndị Hibru 11:1–12:3) (2) Jehova na-enye ihe ndabere gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji na-atụkwasị ya obi kpam kpam. Ọrụ ya na Okwu ya na-emesi obi ike na ọ na-echebara ndị ohu ya echiche nakwa na ọ gaghị echezọ ha ma ọlị. (Ndị Hibru 6:10) (3) A chọrọ obi ike na ntụkwasị obi taa karịsịa. Anyị bụ ‘ndị a kpọrọ asị,’ dị ka Jizọs buru n’amụma. (Matiu 24:9) Iji tachie obi, ọ dị anyị mkpa ịdabere n’Okwu Chineke, na-enwe ntụkwasị obi na mmụọ ya nọnyeere anyị, na obi ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma ahụ. (4) Ihe atụ ndị e nwere na-egosi na anyị na-eche mmegide ihu ugbu a. O metụrụ mmadụ nile n’ahụ́ nke ukwuu ka ọkà okwu ahụ kọrọ ihe ụmụnna anyị na-atachi obi na ya n’Armenia, France, Georgia, Kazakhstan, Russia, na Turkmenistan. N’ezie, ugbu a bụ oge igosipụta obi ike na ntụkwasị obi n’ebe Jehova nọ!

Ọkà okwu nke ikpeazụ kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Iso Nzukọ Jehova Na-aga n’Ihu n’Ịdị n’Otu.” E kwuru ọtụtụ isi ihe ndị bịara n’oge ha n’okwu ahụ. (1) A na-ahụ ọganihu nke ndị Jehova n’ebe nile. Ọrụ nkwusa anyị na mgbakọ anyị na-eme ka ọha na eze na-ahụ anyị. (2) Jehova eguzobewo nzukọ dị n’otu. Na 29 O.A., e ji mmụọ nsọ tee Jizọs mmanụ ka o wee chịkọta “ihe nile”—ndị nwere olileanya ibi n’eluigwe nakwa ndị nwere olileanya ibi n’ụwa—n’ime ezinụlọ dị n’otu nke Chineke. (Ndị Efesọs 1:8-10) (3) Mgbakọ bụ ihe na-egosipụta n’ụzọ pụtara ìhè na anyị nwere ịdị n’otu zuru ụwa ọnụ. Nke a pụtara ìhè nke ọma ná mgbakọ ndị pụrụ iche e nwere na France na Ịtali n’August gara aga. (4) A nakweere mkpebi na-akpali akpali na France nakwa n’Ịtali. Ọkà okwu ahụ kwuru ihe ụfọdụ e dere ná mkpebi ahụ na-akpali akpali. Ihe nile e dere ná mkpebi ahụ dị n’okpuru ebe a.

Ná mmechi nke okwu ikpeazụ ahụ, ọkà okwu si esi bịa mara ọkwa na-emetụ n’obi bụ́ nke Òtù Na-achị Isi dere. Ihe ụfọdụ e dere na ya bụ: “Ugbu a bụ oge ịmụrụ anya na ịnọ na nche, na-aghọta otú ihe ndị na-eme n’ụwa si apụta ìhè. . . . Anyị na-ezitere unu nchegbu ịhụnanya Òtù Na-achị Isi nwere n’ebe unu nọ nakwa n’ebe ndị nile ọzọ bụ́ ndị Chineke nọ. Ka ọ gọzie unu n’ụba ka unu ji obi unu dum na-eme uche ya.” Ndị Jehova n’ebe nile na-ekpebisi ike ịmụrụ anya n’oge ndị a pụrụ iche na ịnọgide na-eji obi ike eso nzukọ Jehova dị n’otu na-aga n’ihu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 E ji ígwè electronic mee ka ndị nọ n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ kere òkè ná nzukọ kwa afọ ahụ, na-eme ka ọnụ ọgụgụ ndị gara ya bụrụ 13,757.

^ par. 5 E nwere nzukọ ntụkwasị ndị ahụ na Long Beach, California; Pontiac, Michigan; Uniondale, New York; na Hamilton, Ontario. Ndị nile gara ya, gụnyere ndị e ji ígwè electronic mee ka ha nọrọ n’ebe ndị ọzọ kere òkè na ya, dị mmadụ 117,885.

^ par. 23 E nwere mgbakọ atọ pụrụ iche na France—na Paris, Bordeaux, na Lyons. N’Ịtali, a gwara ndị si United States ka ha gaa mgbakọ ndị nke e nwere na Rom na Milan, ọ bụ ezie na e nwere ngụkọta nke mgbakọ itoolu n’otu mgbe.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 29-31]

Mkpebi

N’August 2001, e nwere Mgbakọ “Ndị Na-ezi Okwu Chineke” pụrụ iche na France na Ịtali. Ná mgbakọ ndị ahụ, a gụrụ otu mkpebi na-akpali akpali. Ihe na-esonụ ka e dere ná mkpebi ahụ.

“DỊ KA Ndịàmà Jehova, anyị nile bụ́ ndị gbakọtara ná Mgbakọ ‘Ndị Na-ezi Okwu Chineke’ a abụrụwo ndị e ziri ozizi bara uru nke ukwuu. E gosipụtawo nke ọma ebe ozizi a sitere. Ozizi a esighị n’aka mmadụ. O si n’aka Onye ahụ onye amụma oge ochie bụ́ Aịzaịa kọwara dị ka ‘Onye Nkụzi Ukwu’ anyị. (Aịsaịa 30:20, NW) Rịba ama ihe ncheta Jehova nyere dị ka e kwuru ya n’Aịsaịa 48:17, sị: ‘Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.’ Olee otú o si emezu nke a? Ụzọ bụ́ isi bụ site n’akwụkwọ a kasị sụgharịa ma kesaa n’ụwa, bụ́ Bible, bụ́ ebe a gwara anyị hoo haa, sị: ‘Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru.’—2 Timoti 3:16.

“Taa, ozizi dị otú ahụ bara uru dị ihe a kpọrọ mmadụ oké mkpa. Gịnị mere a pụrụ iji kwuo otú ahụ? N’ịtụle mgbanwe na ihe mgbagwoju anya a na-ahụ n’ụwa a, gịnị ka ndị na-eche echiche na-ekweta? N’ụzọ dị mfe, ọ bụ nke a: Ọ bụ ezie na a kụziworo ọtụtụ nde mmadụ ihe n’usoro agụmakwụkwọ ụwa, n’ụzọ dị mwute, e nwere ụkọ nke ezi ụkpụrụ, ha adịghịkwa amata ọdịiche dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ. (Aịsaịa 5:20, 21) Imerime mmadụ enweghị ihe ọmụma nke Bible. Ọ bụ ezie na nkà na ụzụ na-eme ka e nwee ike inweta imirikiti ihe ọmụma site n’iji kọmputa eme ihe, ebee ka a na-enweta azịza nye ajụjụ ndị dị oké mkpa dị ka, Gịnị bụ nzube nke ndụ? Olee otú anyị ga-esi aghọta ihe ndị na-eme n’oge anyị? È nwere olileanya gbara ọkpụrụkpụ maka ọdịnihu? Ọ̀ dị mgbe udo na nchebe ga-aghọ ihe dị adị? Ọzọkwa, n’ọ́bá akwụkwọ dị iche iche, e nwere ọtụtụ akwụkwọ ntụaka ndị na-ekwu banyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ihe omume ụmụ mmadụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ihe a kpọrọ mmadụ na-ehieghachi ụzọ ndị ha hiere n’oge gara aga. Mpụ na-arịwanye elu. Ọrịa ndị e cheburu na e kpochapụla na-alọghachi, ka ọrịa ndị ọzọ, dị ka AIDS, na-agbasa n’ụzọ dị egwu. Ndụ ezinụlọ na-etisasị n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mgbagwoju anya. Mmetọ na-emebisị gburugburu ebe obibi. Iyi ọha egwu na ngwá agha ndị e ji ekpochapụ ìgwè mmadụ na-eme ka a ghara inwe udo na nchebe. Nsogbu ndị na-enweghị ngwọta nọgidere na-amụbawanye. Olee òkè anyị kwesịrị ikere n’inyere ụmụ mmadụ ibe anyị aka n’oge ndị a pụrụ iche? Ọ̀ dị ozizi na-akọwa ihe kpatara ọnọdụ ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya, nke na-abụghị nanị na ọ na-egosi ụzọ na-eduga ná ndụ ka mma ugbu a kamakwa na-enye olileanya mara mma e ji n’aka maka ọdịnihu?

“Ọrụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ e nyere anyị bụ ka anyị ‘gaa mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile Kraịst nyere n’iwu.’ (Matiu 28:19, 20) Ọ bụ Jizọs Kraịst nyere ọrụ ahụ mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, bụ́ mgbe ọ natara ikike nile n’eluigwe na n’elu ụwa. Ọ karịrị ihe omume nile ụmụ mmadụ na-akwalite. A bịa n’otú Chineke si ele ihe anya, ọrụ anyị, bụ́ nke na-elekwasị anya ná mkpa ime mmụọ nke ndị agụụ ezi omume na-agụ, bụ nke na-ebute ụzọ. Anyị nwere ihe ndị ezi uche dị na ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ mere anyị ga-eji jiri ọrụ ahụ kpọrọ ihe.

“Nke a na-achọ ibute ọrụ dị otú ahụ ụzọ ná ndụ anyị. Site ná ngọzi na enyemaka Chineke, a ga-arụ ọrụ ahụ, n’agbanyeghị ọtụtụ ihe ndị na-adọpụ uche, ihe mgbochi, na mmegide ndị sitere n’aka ndị okpukpe na ndị ọchịchị, bụ́ ndị e dokwara iji gbochie ọganihu nke usoro izi ihe a zuru ụwa ọnụ. Anyị nwere ntụkwasị obi na okwukwe na ọrụ a ga-anọgide na-aga n’ihu ma ruo ngwụsị ya dị ebube. Olee ihe mere anyị pụrụ iji jide nke a nnọọ n’aka? Ọ bụ n’ihi na Onyenwe anyị Jizọs Kraịst kwere nkwa na ya ga-anọnyere anyị n’ozi Chineke nyere anyị ruo n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a.

“Oge aganahụwo ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụsi anya. Anyị aghaghị ịrụzu ọrụ e nyere anyị ugbu a tupu ọgwụgwụ ikpeazụ abịa. N’ihi ya, anyị, dị ka Ndịàmà Jehova, na-ekpebi na:

“Nke mbụ: Dị ka ndị ozi raara onwe ha nye, anyị na-ekpebisi ike ibute ihe ndị metụtara Alaeze ụzọ ná ndụ anyị ma nọgide na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ. Iji mezuo nke ahụ, ekpere anyị na-ekwekọ n’okwu ndị dị n’Abụ Ọma 143:10, bụ́: ‘Zi m ime ihe dị Gị ụtọ; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke m.’ Nke a na-achọ ịbụ ezigbo ndị mmụta, na-agbalịsi ike ịgụ Bible kwa ụbọchị, na-ekere òkè n’ọmụmụ ihe onwe onye na ime nnyocha. Iji mee ka ọganihu anyị pụta ìhè nye mmadụ nile, anyị ga-eme mgbalị nile ezi uche dị na ya iji kwadebe maka na iji rite uru n’ụzọ zuru ezu n’ihe ọmụmụ ọchịchị Chineke ndị a na-amụ ná nzukọ ọgbakọ, ná mgbakọ ndị a na-enwe na sekit, nakwa ná mgbakọ distrikti, nke mba, na nke mba nile.—1 Timoti 4:15; Ndị Hibru 10:23-25.

“Nke abụọ: Iji bụrụ ndị Chineke ziri ihe, anyị ga na-eri nri nanị na tebụl ya ma jiri nlezianya na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Bible na-enye banyere ozizi ndị na-eduhie eduhie nke ndị mmụọ ọjọọ. (1 Ndị Kọrint 10:21; 1 Timoti 4:1) Anyị ga-akpachara anya n’ụzọ pụrụ iche iji zere ihe ndị na-emerụ ahụ́, gụnyere ụgha nke okpukpe, echiche na-enweghị isi, mmekọahụ rụrụ arụ bụ́ nke na-eme ihere, ihe otiti nke ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, ntụrụndụ ndị na-emerụ emerụ, na ihe ọ bụla nke ‘na-ekwekọghị n’ozizi na-enye ezi ndụ.’ (Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 3:20; 1 Timoti 6:3; 2 Timoti 1:13) N’ihi nsọpụrụ anyị nwere n’ebe ‘onyinye n’ụdị mmadụ’ nọ, bụ́ ndị ruru eru ịkụzi ihe dị mma, anyị ga-eji ezi obi na-akwanyere ha ùgwù maka mgbalị ndị ha na-eme ma jiri obi anyị dum na-akwado ha n’ibuli ụkpụrụ omume na nke ime mmụọ ndị dị ọcha ma zie ezie bụ́ ndị dị n’okwu Chineke elu.—Ndị Efesọs 4:7, 8, 11, 12; 1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13; Taịtọs 1:9.

“Nke atọ: Dị ka Ndị Kraịst bụ́ ndị nne na nna, mgbalị anyị ga-eji obi anyị dum na-eme ga-abụ izi ụmụ anyị ihe, ọ bụghị nanị site n’okwu ọnụ, kamakwa site n’ihe nlereanya. Nchegbu anyị bụ́ isi bụ inyere ha aka site n’oge ha bụ ụmụ ọhụrụ ka ha ‘mata ihe odide ndị dị nsọ ka ha wee mara ihe maka nzọpụta.’ (2 Timoti 3:15) Anyị ga-eburu n’uche nke ọma na anyị ịzụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova ga-enye ha ohere kasị mma iji nweta nkwa Chineke kwere bụ́ na ‘ọ ga-agara ha nke ọma, ka ha wee nọọkwa ogologo oge n’elu ụwa.’—Ndị Efesọs 6:1-4.

“Nke anọ: Mgbe anyị nọ ná nchegbu ma ọ bụ nsogbu ndị siri ike, anyị ga-ebu ụzọ ‘mee ka Chineke mara ihe anyị na-arịọ,’ na-ejide n’aka na ‘udo nke Chineke nke karịrị uche nile nke mmadụ’ ga-echebe anyị. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ebe ọ bụ na anyị abatawo n’okpuru yok nke Kraịst, anyị ga-enweta ume ọhụrụ. N’ịmara na Chineke na-eche banyere anyị, anyị agaghị egbu oge ịtụkwasị nchegbu anyị n’ebe ọ nọ.—Matiu 11:28-30; 1 Pita 5:6, 7.

“Nke ise: N’igosipụta ekele anyị nwere n’ebe Jehova nọ maka ihe ùgwù nke ịbụ ndị na-ezi Okwu ya, anyị ga-eme ka mgbalị anyị na-eme ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’ na ‘ije ozi anyị n’ụzọ zuru ezu’ dịghachi ọhụrụ. (2 Timoti 2:15; 4:5) Ebe ọ bụ na anyị maara ihe ọ na-agụnye nke ọma, ọchịchọ anyị sitere n’obi bụ ịchọ ndị kwesịrị ekwesị na ịzụlite mkpụrụ anyị kụrụ. Ọzọkwa, anyị ga-eme ka ozizi anyị ka mma site n’ịdị na-eduzikwu ọmụmụ Bible ebe obibi n’ụzọ dị irè. Nke a ga-emekwu ka anyị na-eme ihe kwekọrọ n’uche Chineke bụ́ ka ‘a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.’—1 Timoti 2:3, 4.

“Nke isii: N’ime narị afọ gara aga nakwa na nke a, Ndịàmà Jehova nọ n’ọtụtụ ala enwetawo ụdị mmegide na mkpagbu dịgasị iche iche. Ma Jehova anọnyeworo anyị. (Ndị Rom 8:31) Okwu ya na-adịghị agha agha na-emesi anyị obi ike na ‘ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide anyị’ iji gbochie, belata, ma ọ bụ kwụsị ọrụ nkwusa Alaeze na izi ihe anyị ga-aga nke ọma. (Aịsaịa 54:17) Ma ọ bụ n’oge dị mma ma ọ bụ n’oge nsogbu, anyị apụghị ịkwụsị ikwu eziokwu. Mkpebi anyị bụ ịrụcha ọrụ nkwusa na izi ihe anyị ngwa ngwa. (2 Timoti 4:1, 2) Ebumnobi anyị bụ ikwusara ndị nke mba nile ozi ọma nke Alaeze Chineke ruo ókè ike kwere anyị. N’ụzọ dị otú a, ha ga-anọgide na-enweta ohere nke ịmụta banyere ndokwa maka inweta ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ nke ezi omume. Dị ka ìgwè ndị dị n’otu na-ezi Okwu Chineke, mkpebi anyị siri ike bụ ịnọgide na-agbaso ihe nlereanya nke Onye Ozizi Ukwu ahụ, bụ́ Jizọs Kraịst, na igosipụta àgwà ya ndị na-enye Chineke nsọpụrụ. Ihe a nile ka anyị ga-eme iji wetara Onye Nkụzi Ukwu anyị na Onye Na-enye anyị Ndụ, bụ́ Jehova Chineke, nsọpụrụ na otuto.

“Ka mmadụ nile nọ ná mgbakọ a bụ́ ndị nakweere mkpebi a, biko sị EE!”

Mgbe a jụrụ mmadụ 160,000 gbakọtara ná mgbakọ atọ ahụ e nwere na France nakwa mmadụ 289,000 gbakọtara n’ebe itoolu e nwere ya n’Ịtali ajụjụ mmechi ahụ, a zara “Ee” dara oké ụda n’ọtụtụ asụsụ ndị gara mgbakọ ndị ahụ na-asụ.