Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nọgide Na-eji Obi Na-eguzosi Ike Na-ejere Jehova ozi

Nọgide Na-eji Obi Na-eguzosi Ike Na-ejere Jehova ozi

Nọgide Na-eji Obi Na-eguzosi Ike Na-ejere Jehova ozi

“Obi m na-eguzosi ike, Chineke, obi m na-eguzosi ike.”—ABỤ ỌMA 57:7, NW.

1. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee nkwenye siri ike dị ka nke Devid?

JEHOVA pụrụ ime ka anyị na-eguzosi ike n’okwukwe Ndị Kraịst, ka anyị wee nwee ike ịrapagidesi ike n’Iso Ụzọ Kraịst dị ka ndị ohu ya raara onwe ha nye. (Ndị Rom 14:4) N’ihi ya, anyị pụrụ inwe nkwenye yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid, bụ́ onye a kpaliri ịbụ, sị: “Obi m na-eguzosi ike, Chineke.” (Abụ Ọma 108:1, NW) Ọ bụrụ na obi anyị na-eguzosi ike, a ga-akpali anyị imezu nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke. Sitekwa n’ilegara ya anya maka nduzi na ike, anyị pụrụ igosipụta na anyị bụ ndị a na-apụghị ịkwapụ akwapụ, na-akwụsi ike ná mkpebi nakwa ná nkwenye anyị dị ka ndị na-eguzosi ike n’ihe, ‘na-enwe ọtụtụ ihe mgbe nile ime n’ọrụ Onyenwe anyị.’—1 Ndị Kọrint 15:58.

2, 3. Gịnị ka agbamume Pọl nyere nke e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 16:13 pụtara?

2 N’agbamume Pọl onyeozi nyere ụmụazụ Jizọs nọ na Kọrint oge ochie, bụ́ nke metụtakwara Ndị Kraịst nke oge a n’ezie, ọ sịrị: “Mụrụnụ anya, guzosienụ ike n’okwukwe, na-emenụ ka ndị dimkpa, dịnụ ike.” (1 Ndị Kọrint 16:13) N’asụsụ Grik, nke ọ bụla n’ime iwu ndị a nọ n’ụdị okwu na-egosi ihe na-eme ugbu a, si otú ahụ na-agba ume ka a nọgide na-eme ihe. Gịnị ka ndụmọdụ a pụtara?

3 Anyị pụrụ ‘ịmụrụ anya’ n’ụzọ ime mmụọ site n’iguzogide Ekwensu na ịnọ Chineke nso. (Jems 4:7, 8) Ịdabere n’ebe Jehova nọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-adị n’otu, nakwa ‘iguzosi ike n’okwukwe Ndị Kraịst.’ Anyị—gụnyere ọtụtụ ndị inyom nọ n’etiti anyị—‘na-eme ka ndị dimkpa’ site n’iji obi ike na-ejere Chineke ozi dị ka ndị mkpọsa Alaeze. (Abụ Ọma 68:11) Anyị ‘na-adị ike’ site n’ịnọgide na-elegara Nna anyị nke eluigwe anya maka ike iji na-eme uche ya.—Ndị Filipaị 4:13.

4. Nzọụkwụ ndị dị aṅaa dugara n’anyị ịbụ ndị e mere baptizim dị ka Ndị Kraịst?

4 Anyị na-ewere nguzo anyị maka eziokwu ahụ mgbe anyị raara onwe anyị nye Jehova kpam kpam ma gosipụta ya site n’ịbụ ndị e mere baptizim ime mmiri. Ma olee ihe ndị dugara n’anyị ịbụ ndị e mere baptizim? Nke mbụ, anyị nwetara ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke. (Jọn 17:3) Nke a wulitere okwukwe anyị ma kpalie anyị ichegharị, na-egosipụta ezi mwute maka ihe ọjọọ anyị mere n’oge gara aga. (Ọrụ 3:19; Ndị Hibru 11:6) Nchigharị anyị sochiziri, n’ihi na anyị chigharịrị site n’omume ọjọọ anyị iji biwe ndụ kwekọrọ n’uche Chineke. (Ndị Rom 12:2; Ndị Efesọs 4:23, 24) Nrara anyị ji obi anyị dum rara onwe anyị nye Jehova n’ekpere sochiri nke a. (Matiu 16:24; 1 Pita 2:21) Anyị rịọrọ Chineke maka ezi akọ na uche, e meekwa anyị baptizim ná ngosipụta nke nrara anyị raara onwe anyị nye ya. (1 Pita 3:21) Iburu nzọụkwụ ndị a n’uche ga-enyere anyị aka ilekwasịgide anya ná mkpa ọ dị ịnọgide na-eme mgbalị iji na-ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị ma nọgide jiri obi na-eguzosi ike na-ejere Jehova ozi.

Nọgide Na-achọ Ezi Ihe Ọmụma

5. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọgide na-enweta ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ?

5 Iji na-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke, anyị aghaghị ịnọgide na-enweta ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ nke na-ewulite okwukwe. Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ iri nri ime mmụọ mgbe mbụ anyị mụtara eziokwu Chineke! (Matiu 24:45-47) “Nri” ndị ahụ dị ụtọ—ha na-edozikwa anyị ahụ́ n’ụzọ ime mmụọ. Ọ dị oké mkpa ugbu a ịnọgide na-eri nri ime mmụọ na-edozi ahụ́ ka anyị wee nọgide na-enwe obi na-eguzosi ike dị ka ndị ohu Jehova raara onwe ha nye.

6. Olee otú ọ pụrụ ịbụ na e siri nyere gị aka inwe ekele sitere n’obi maka eziokwu ahụ?

6 Ọ dị mkpa ime mgbalị iji na-enwetakwu ihe ọmụma Akwụkwọ Nsọ. Ọ dị ka ịchọ akụ̀ zoro ezo—ihe chọrọ mgbalị siri ike. Ma lee ka o si bụrụ ihe na-akwụghachi ụgwọ ịchọta “ihe ọmụma Chineke”! (Ilu 2:1-6) Mgbe mbụ onye nkwusa Alaeze duziiri gị ọmụmụ Bible, ọ pụrụ ijiwo akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi mee ihe. Ọ pụrụ ịbụwo na o were unu oge dị ukwuu iji mụchaa otu isiokwu, ikekwe ihe karịrị n’otu ugboro unu mụrụ ihe. I ritere uru mgbe a gụrụ ma kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Ọ bụrụ na ọ dị isi ihe siri ike nghọta, a kọwara ya. Onye duziiri gị ọmụmụ Bible kwadebere nke ọma, kpee ekpere maka mmụọ Chineke, ma nyere gị aka inwe ekele sitere n’obi maka eziokwu ahụ.

7. Gịnị na-eme ka mmadụ ruo eruo ịkụziri ndị ọzọ eziokwu nke Chineke?

7 Mgbalị a kwesịrị ekwesị, n’ihi na Pọl dere, sị: “Ka onye ọ bụla e ji ọnụ na-akụziri okwu ahụ soro onye ahụ ji ọnụ na-akụziri ya ihe dị otú ahụ na-ekerịta ihe ọma nile.” (Ndị Galeshia 6:6) N’ebe a, ihe odide Grik a na-egosi na a kụnyere ozizi nke Okwu Chineke n’uche na n’obi nke onye ahụ ‘e ji ọnụ kụziere ihe.’ Gị ịbụ onye a kụziiri ihe n’ụzọ dị otú ahụ na-eme ka i ruo eruo ọbụna ịbụ onye nkụzi nke ndị ọzọ. (Ọrụ 18:25) Iji nọgide ná nraranye gị, ị ghaghị ịnọgide na-enwe ezi ahụ́ ike ime mmụọ ma na-eguzosi ike site n’ịnọgide na-amụ Okwu Chineke.—1 Timoti 4:13; Taịtọs 1:13; 2:2.

Cheta Nchegharị na Nchigharị Gị

8. Olee otú ọ ga-esi kwe omume ịnọgide na-enwe àgwà nsọpụrụ Chineke?

8 Ì chetara ahụ́ efe i nwere mgbe ị mụtara eziokwu ahụ, chegharịa, ma nwee mmetụta nke ịbụ onye Chineke gbaghaara mmehie ya na-adabere n’okwukwe i nwere n’àjà mgbapụta Jizọs? (Abụ Ọma 32:1-5; Ndị Rom 5:8; 1 Pita 3:18) N’ezie ị chọghị ịlaghachi ná ndụ nke mmehie. (2 Pita 2:20-22) Tinyere ihe ndị ọzọ, ikpeku Jehova ekpere mgbe nile ga-enyere gị aka ịnọgide na-enwe àgwà nsọpụrụ Chineke, ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye gị, nakwa ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi.—2 Pita 3:11, 12.

9. Ebe anyị chigharịworo site ná mmehie, olee ụzọ anyị kwesịrị ịgbaso?

9 Ebe i chigharịworo site n’ịhapụ mmehie, nọgide na-achọ enyemaka Chineke iji nọgide na-eme ka obi gị na-eguzosi ike. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ị gahiere ụzọ ma lee anya na map a pụrụ ịtụkwasị obi ma malite ịga n’ezigbo ụzọ. Agahiekwala ụzọ ugbu a. Nọgide na-adabere ná nduzi Chineke, kpebisiekwa ike ịnọgide n’okporo ụzọ ahụ nke na-eduba ná ndụ.—Aịsaịa 30:20, 21; Matiu 7:13, 14.

Echefula Nraranye na Baptizim Gị Ma Ọlị

10. Isi ihe ndị dị aṅaa ka anyị kwesịrị iburu n’uche banyere nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke?

10 Buru n’uche na ị raara onwe gị nye Jehova n’ekpere, na-atụ anya iji ikwesị ntụkwasị obi jeere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi. (Jud 20, 21) Nraranye na-apụta idebe ihe iche, ma ọ bụ ikewapụ ihe iche, maka nzube dị nsọ. (Levitikọs 15:31; 22:2) Nraranye gị abụghị nkwekọrịta na-adịru nwa oge ma ọ bụ ụgwọ i ji mmadụ. Ọ bụ nrara na-adịgide adịgide ị raara onwe gị nye Ọkaaka Eluigwe na Ala, ibikwa ndụ kwekọrọ na ya chọrọ iguzosi ike n’ihe nye Chineke ruo ogologo ndụ gị nile. Ee, “ma ànyị dị ndụ ma ànyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.” (Ndị Rom 14:7, 8) Obi ụtọ anyị dabeere n’anyị ime uche ya na ịnọgide na-eji obi na-eguzosi ike ejere ya ozi.

11. N’ihi gịnị ka i ji kwesị ịdị na-echeta baptizim gị na ihe ọ pụtara?

11 Na-echeta mgbe nile baptizim e mere gị ná ngosipụta nke nrara i ji obi gị dum rara onwe gị nye Chineke. Ọ bụghị baptizim e ji mmanye mee gị, n’ihi na i ji aka gị mee mkpebi ahụ. Ì kpebisiwo ike ugbu a ime uche gị n’ikwekọ n’uche Chineke ná ndụ gị nile fọdụrụnụ? Ị rịọrọ Chineke ka o nye gị ezi akọ na uche, e meekwa gị baptizim ná ngosipụta nke nrara ị raara onwe gị nye ya. Chebe ezi akọ na uche ahụ site n’imezu nraranye gị, ngọzi bara ụba nke Jehova ga-adịkwasịkwa gị.—Ilu 10:22.

Uche Gị Na-ekere Òkè

12, 13. Olee otú uche anyị na nraranye na baptizim si nwee njikọ?

12 N’ezie, nraranye na baptizim ewetaworo ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile ngọzi dị ukwuu. Mgbe anyị gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke site n’ịbụ ndị e mere baptizim ime mmiri, anyị na-anwụ n’ihe banyere ụdị ndụ anyị biri n’oge gara aga ma ọ bụghị n’ihe banyere uche anyị. Dị ka ndị kwere ekwe a kụziiri ihe nke ọma, anyị mere uche anyị n’ezie mgbe anyị raara onwe anyị nye Chineke n’ekpere ma bụrụ ndị e mere baptizim. Anyị ịrara onwe anyị nye ma bụrụ ndị e mere baptizim na-achọ na anyị ga-amata ihe bụ́ uche Chineke ma mara ụma họrọ ime ya. (Ndị Efesọs 5:17) N’ụzọ dị otú ahụ, anyị na-eṅomi Jizọs, bụ́ onye mere uche ya mgbe ọ chịsara ngwá ọrụ ịkwa nkà ya, e mee ya baptizim, ya etinyekwa onwe ya n’ụzọ zuru ezu n’ime uche Nna ya nke eluigwe.—Abụ Ọma 40:7, 8; Jọn 6:38-40.

13 Jehova Chineke zubere na a ga-eme ka Ọkpara ya “zuo okè site n’ịta ahụhụ.” N’ihi ya, Jizọs aghaghị ime uche ya iji jiri ikwesị ntụkwasị obi tachie obi n’ahụhụ ndị dị otú ahụ. Iji mezuo nke ahụ, o ji “mkpu ákwá siri ike na anya mmiri kpesie ekpere ike ma rịọkwa . . . arịrịọ, e jikwa ihu ọma nụrụ olu ya n’ihi egwu Chineke o nwere.” (Ndị Hibru 2:10, 18; 5:7, 8) Ọ bụrụ na anyị egosipụta egwu nsọpụrụ Chineke dị otú ahụ, anyị ga-ejidekwa n’aka na anyị ga-abụ ndị ‘a ga-eji ihu ọma nụrụ olu ha,’ anyị pụkwara inwe obi ike na Jehova ga-eme ka anyị na-eguzosi ike dị ka Ndịàmà ya raara onwe ha nye.—Aịsaịa 43:10.

Ị Pụrụ Ịnọgide Na-enwe Obi Na-eguzosi Ike

14. Gịnị mere anyị ga-eji na-agụ Bible kwa ụbọchị?

14 Gịnị ga-enyere gị aka ịnọgide na-enwe obi na-eguzosi ike ma si otú ahụ na-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara ị raara onwe gị nye Chineke? Iji na-enweta ihe ọmụma na-amụbawanye amụbawanye nke Okwu Chineke, na-agụ Bible kwa ụbọchị. Nke a bụ ihe “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” na-agba anyị ume mgbe nile ịdị na-eme. E nyere ndụmọdụ dị otú ahụ n’ihi na ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị na-achọ ka anyị nọgide na-eje ije n’eziokwu nke Chineke. Ọ bụrụ na nzukọ Jehova maara ụma na-akwado ozizi ụgha, a gaaraghị na-enye Ndịàmà Jehova na ndị ha na-ekwusara ozi ọma ndụmọdụ ma ọlị ka ha na-agụ Bible.

15. (a) Gịnị ka e kwesịrị ịtụle mgbe a na-eme mkpebi? (b) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ọrụ ego bụ ọrụ nke abụọ nke Onye Kraịst?

15 Mgbe ị na-eme mkpebi dị iche iche, na-atụle mgbe nile otú ha pụrụ isi metụta mmezu nke nrara ị raara onwe gị nye Jehova. Nke a pụrụ imetụta ọrụ ego gị. Ị̀ na-agbalịsi ike ime ka o nyere gị aka n’ime ka ezi ofufe gaa n’ihu? Ọ bụ ezie na ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-achọpụta na Ndị Kraịst raara onwe ha nye bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha na ndị na-arụpụta ihe, ha na-achọpụtakwa na Ndịàmà Jehova adịghị enwe oké ọchịchọ ịnọ n’isi n’ụwa, ha adịghịkwa eso ndị ọzọ azọrịta ọkwá kasị enye ego. Nke a bụ n’ihi na ihe mgbaru ọsọ nke Ndịàmà abụghị inweta akụ̀ na ụba, ùgwù, ike, ma ọ bụ ịbụ ndị a ma ama. Nye ndị na-ebi ndụ kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye Chineke, ihe kasị mkpa bụ ime uche Chineke. Ọrụ ego bụ́ nke na-enyere ha aka inweta ihe ndị dị mkpa ná ndụ bụ ọrụ nke abụọ. Dị ka Pọl onyeozi, ọrụ ha bụ́ isi bụ ozi Ndị Kraịst. (Ọrụ 18:3, 4; 2 Ndị Tesalonaịka 3:7, 8; 1 Timoti 5:8) Ị̀ na-ebute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ gị?—Matiu 6:25-33.

16. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na nchegbu na-enweghị isi na-eme ka o siere anyị ike ibi ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke?

16 Ọ pụrụ ịbụwo na ọ fọrọ nke nta ka nchegbu dịgasị iche iche rikpuo ụfọdụ ndị tupu ha amụta eziokwu ahụ. Ma lee ka obi ha si jupụta n’ọṅụ, ekele, na ịhụnanya maka Chineke mgbe ha nakweere olileanya nke Alaeze ahụ! Ịtụgharị uche ná ngọzi ndị ha nwetaworo kemgbe ahụ pụrụ nnọọ inyere ha aka ibi ndụ kwekọrọ ná nrara ha raara onwe ha nye Jehova. N’aka nke ọzọ, gịnị ma ọ bụrụ na nchegbu na-enweghị isi banyere nsogbu ndị a na-enwekarị ná ndụ n’usoro ihe a na-achọzi ịkpagbu “okwu Chineke,” dị nnọọ ka ogwu pụrụ igbochi ihe a kụrụ akụ iru ịmị mkpụrụ? (Luk 8:7, 11, 14; Matiu 13:22; Mak 4:18, 19) Ọ bụrụ na ọ dị gị ka nke a ọ̀ malitela ime gị ma ọ bụ ezinụlọ gị, tụkwasị Jehova nchegbu gị ma kpekuo ya ekpere ka o nyere gị aka inwekwu ịhụnanya na ekele. Ọ bụrụ na ị tụkwasị ya ibu gị, ọ ga-anagide gị ma nye gị ike ịnọgide jiri obi na-eguzosi ike na-ejere ya ozi n’obi ụtọ.—Abụ Ọma 55:22; Ndị Filipaị 4:6, 7; Mkpughe 2:4.

17. Olee otú ọ ga-esi ekwe omume ịnagide ule ndị tara akpụ?

17 Nọgide na-ekpeku Jehova Chineke ekpere mgbe nile, ọbụna dị ka i kpere mgbe ị na-arara onwe gị nye ya. (Abụ Ọma 65:2) Mgbe a nwara gị ọnwụnwa ime ihe na-ezighị ezi ma ọ bụ mgbe i chere ule tara akpụ ihu, chọọ nduzi Chineke na enyemaka ya iji gbasoo ya. Buru n’uche mkpa okwukwe dị, n’ihi na Jems onye na-eso ụzọ dere, sị: “Ọ bụrụ na amamihe [iji mee ihe maka ịnagide ule] kọrọ onye ọ bụla n’ime unu, ka ọ nọgide na-arịọ Chineke, n’ihi na o ji mmesapụ aka na-enye mmadụ nile ihe, n’akọchaghịkwa akọcha; a ga-enyekwa ya. Ma ka ọ nọgide na-arịọ n’okwukwe, n’enweghị obi abụọ ma ọlị, n’ihi na onye na-enwe obi abụọ dị ka ebili mmiri nke oké osimiri nke ifufe na-akwagharị ma na-enugharị. N’eziokwu, ka onye ahụ ghara iche na ya ga-anata ihe ọ bụla site n’aka Jehova; ọ bụ onye nwere uche abụọ, onye na-adịghị akwụsi ike n’ụzọ ya nile.” (Jems 1:5-8) Ọ bụrụ na ule yiri ka ọ na-akarị ike anyị, anyị pụrụ ijide nke a n’aka: “Ọ dịghị ọnwụnwa ọ bụla bịakwasịworo unu ma e wezụga nke na-abịara ụmụ mmadụ. Ma Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama mgbe ọnwụnwa ahụ bịara ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Ndị Kọrint 10:13.

18. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na mmehie dị oké njọ e zochiri ezochi na-eme ka mkpebi anyị ibi ndụ kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova ghara isi ike?

18 Gịnị ma ọ bụrụ na mmehie dị oké njọ nke e zochiri ezochi na-enye akọ na uche gị nsogbu ma na-eme ka mkpebi gị ibi ndụ kwekọrọ ná nrara ị raara onwe gị nye Chineke ghara isi ike? Ọ bụrụ na i nwere nchegharị, ị pụrụ inweta nkasi obi n’ịmara na Jehova ‘adịghị eleda obi tiwara etiwa nke e gwepịara egwepịa anya.’ (Abụ Ọma 51:17) Chọọ enyemaka nke Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye na-ahụ n’anya, na-amara na ha—n’iṅomi Jehova—agaghị eleda ọchịchọ gị ime ka gị na Nna gị nke eluigwe dịghachi ná mma anya. (Abụ Ọma 103:10-14; Jems 5:13-15) Mgbe ahụ, mgbe i nwetaghachiri ike ime mmụọ na obi na-eguzosi ike, ị ga-enwe ike imere ụkwụ gị ụzọ kwụ ọtọ, ọ ga-ekwekwa gị omume ibi ndụ kwekọrọ ná nrara ị raara onwe gị nye Chineke.—Ndị Hibru 12:12, 13.

Nọgide Jiri Obi Na-eguzosi Ike Na-eje Ozi

19, 20. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka anyị nọgide na-ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị?

19 N’oge a pụrụ iche, anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike iji na-ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị ma nọgide jiri obi na-eguzosi ike na-ejere Chineke ozi. Jizọs sịrị: “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” (Matiu 24:13) Ebe ọ bụ na anyị na-ebi “n’ụbọchị ikpeazụ,” ọgwụgwụ pụrụ ịbịa mgbe ọ bụla. (2 Timoti 3:1) Ọzọkwa, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ijide n’aka na anyị ga-adị ndụ echi. (Jems 4:13, 14) N’ihi ya, ọ dị oké mkpa ka anyị nọgide na-ebi ndụ kwekọrọ ná nraranye anyị taa!

20 Pita onyeozi mesiri nke a ike n’akwụkwọ ozi ya nke abụọ. O gosiri na ọbụna dị ka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke lara n’iyi n’Iju Mmiri ahụ, otú ahụkwa ka a ga-esi laa ụwa ihe atụ, ma ọ bụ ajọ ọha mmadụ, n’iyi ‘n’ụbọchị Jehova.’ N’ihi ya, Pita kwuru sị: “Lee ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke”! Ọ gbakwara ha ume, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ebe unu bu ụzọ mara ihe ndị a, nọrọnụ na nche ka e wee ghara idufu unu na ha site [n’aka ndị ozizi ụgha na ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke], unu ewee si ná nguzosi ike nke unu daa.” (2 Pita 3:5-17) Lee ihe dị mwute ọ ga-abụ ma ọ bụrụ na a ga-eduhie onye e mere baptizim, ya anwụọkwa dị ka onye na-anọgideghị na-enwe obi na-eguzosi ike!

21, 22. Olee otú okwu ndị dị n’Abụ Ọma 57:7 siworo bụrụ eziokwu n’ihe banyere Devid nakwa ezi Ndị Kraịst?

21 A pụrụ ime ka mkpebi i mere ibi ndụ kwekọrọ ná nrara ị raara onwe gị nye Chineke sikwuo ike ma ọ bụrụ na i buru n’uche ụbọchị na-enye obi ụtọ e mere gị baptizim ma na-achọ enyemaka Chineke ka okwu na omume gị wee na-eme ka obi ya ṅụrịa. (Ilu 27:11) Jehova adịghị emechu ndị ya ihu ma ọlị, anyị kwesịkwara n’ezie ikwesị ntụkwasị obi nye ya. (Abụ Ọma 94:14) O gosiri ebere na ọmịiko site n’imebi atụmatụ ndị iro nakwa site n’ịnapụta Devid. N’inwe ekele maka nke a, Devid kwupụtara ịhụnanya siri ike na nke kwụ chịm o nwere n’ebe Onye Nnapụta ya nọ. O ji mmetụta miri emi bụọ sị: “Obi m na-eguzosi ike, Chineke, obi m na-eguzosi ike. Aga m abụ abụ ma gụọ uri olu ụtọ.”—Abụ Ọma 57:7, NW.

22 Dị ka Devid, ezi Ndị Kraịst alabeghị azụ ná nrara ha raara onwe ha nye Chineke. Ha ji obi na-eguzosi ike na-ekwu na nnapụta na nchebe ha si n’aka Jehova, bụ́ onye ha ji ọṅụ na-abụku abụ. Ọ bụrụ na obi gị na-eguzosi ike, ọ ga-adabere n’ebe Chineke nọ, sitekwa n’enyemaka ya, ị ga-enwe ike imezu nraranye gị. Ee, ị pụrụ ịdị ka “onye ezi omume” ahụ ọbụ abụ bụrụ banyere ya, sị: “Ọ gaghị esite n’ihe ọjọọ a nụworo tụọ egwu: [obi ya na-eguzosi ike, NW], ebe ọ na-atụkwasị Jehova obi.” (Abụ Ọma 112:6, 7) Site n’inwe okwukwe n’ebe Chineke nọ na ịdabere n’ebe ọ nọ n’ụzọ zuru ezu, ị pụrụ ibi ndụ kwekọrọ ná nraranye gị ma nọgide jiri obi na-eguzosi ike na-ejere Jehova ozi.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịnọgide na-enweta ezi ihe ọmụma nke Bible?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị iburu nchegharị na nchigharị anyị n’uche?

• Olee otú anyị si erite uru site n’icheta nraranye na baptizim anyị?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide jiri obi na-eguzosi ike na-ejere Jehova ozi?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ime ozi Ndị Kraịst ọrụ anyị bụ́ isi na-enyere anyị aka ịnọgide na-eji obi na-eguzosi ike ejere Jehova ozi

[Foto dị na peeji nke 18]

Ị̀ na-anọgide na-enwe ezi ahụ́ ike ime mmụọ site n’ịdị na-agụ Okwu Chineke kwa ụbọchị?