Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ị̀ Na-echeta?

Ọ̀ masịwo gị ịgụ mbipụta Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, lee ma ị pụrụ ịza ajụjụ ndị na-esonụ:

Usoro ihe omume onwe onye dị aṅaa nke metụtara Ozizi Elu Ugwu ahụ ka ị pụrụ ịgbaso iji belata nrụgide?

Kwa ụbọchị, ị pụrụ ịgụ otu n’ime ozizi ndị bụ́ isi nke Jizọs ndị e dekọrọ n’ozizi ahụ ma ọ bụ n’ebe ọzọ n’Oziọma ndị ahụ. Site n’ịtụgharị uche n’ozizi ahụ na ịchọ itinye ya n’ọrụ n’onwe gị, eleghị anya ị ga-enwekwu obi ụtọ ma belata nrụgide.—12/15, peeji nke 12-14.

Gịnị bụ ezi ihe atọ mere ndị okenye ọgbakọ ga-eji zụọ ndị ohu na-eje ozi ibukwu ibu ọrụ?

N’ihi mmụba a na-enwe n’ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova, a chọkwuru ndị ikom ruru eru inyere ndị e mere baptizim ọhụrụ aka inwe ọganihu. Afọ ndụ ma ọ bụ nsogbu ahụ́ ike na-ebelatazi ihe ụfọdụ ndị okenye jeworo ozi ruo ogologo oge pụrụ ime. Ụfọdụ ndị okenye bụ́ aka ochie na-ebukwa ibu ọrụ ndị ọzọ na-abụghị n’ọgbakọ ha, n’ihi ya, ha nwere ike ghara imeli ihe dị ukwuu n’ọgbakọ ha dị ka ha na-emebu.—1/1, peeji nke 29.

Olee otú ndị mmadụ si na-atụkwasị obi na chi ndị na-abụghị ezigbo ya?

Ọtụtụ ndị na-efe chi nke okpukpe ha ofufe, ma ndị a pụrụ ịbụ nanị chi ndị na-adịghị ndụ bụ́ ndị na-apụghị ịzọpụta, dị ka Baal na-azọpụtalighị ndị ya n’oge Ịlaịja. (1 Ndị Eze 18:26, 29; Abụ Ọma 135:15-17) Ndị ọzọ na-efe ndị na-eme ihe ntụrụndụ na ndị na-eme egwuregwu dị ka chi, bụ́ ndị na-apụghị ime ka e nwee ezi olileanya maka ọdịnihu. N’ụzọ dị iche, Jehova dị adị n’ezie, ọ na-emezukwa nzube ya.—1/15, peeji nke 3-5.

Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’otú Ken si meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị Chineke nyere ya?

Chineke enyewo anyị nnwere onwe ime nhọrọ, anyị pụkwara ịhọrọ ime ihe ziri ezi kama ịghara ime ihe dị mma, bụ́ otú Ken si meghachi omume. Ihe ndekọ Bible na-egosikwa na Jehova na-emezu ihe o kpere n’ikpe n’isi ndị na-enweghị nchegharị.—1/15, peeji nke 22-23.

N’ihi gịnị ka ịdị ọcha ji dị mkpa ugbu a karịsịa?

N’ihi mgbanwe a na-enwe n’ụzọ ndụ ọha mmadụ na-anakwere, ọtụtụ ndị na-etinye oge dị nta n’ihichasị ebe obibi ha karịa ka ha na-emebu. Ileghara ịdị ọcha nke ihe oriri na mmiri anya pụrụ ịkpata ihe ize ndụ ahụ́ ike. Tụkwasị n’ịdị ọcha anụ ahụ́, Bible na-ekwukwa banyere ilebara ịdị ọcha ime mmụọ, nke omume, na nke uche anya.—2/1, peeji nke 3-6.

Banyere ndị àmà dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst, Pọl kwuru na ‘a gaghị eme ka ha zuo okè n’agụnyeghị anyị.’ N’ụzọ dị aṅaa? (Ndị Hibru 11:40)

N’ime Narị Afọ Iri ahụ na-abịanụ, Kraịst na ụmụnna ya e tere mmanụ nọ n’eluigwe, bụ́ ndị na-eje ozi dị ka ndị eze na ndị nchụàjà, ga-eme ka uru nke àjà mgbapụta ahụ rute ndị e si n’ọnwụ kpọlite. N’ụzọ dị otú ahụ, a ga-eme ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka ndị ahụ e kwuru banyere ha ná Ndị Hibru isi 11 “zuo okè.”—2/1, peeji nke 23.

Gịnị ka Pọl bu n’uche mbe ọ gwara ndị Hibru, sị: “Unu anọgidebeghị na ya ruo n’ọbara”? (Ndị Hibru 12:4)

O bu n’uche ịnọgide na ya ruo n’ókè nke ịnwụ. E nwere ihe atụ ndị mere eme nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ. Ọ bụ ezie na e lebeghị ndị Hibru Pọl degaara akwụkwọ ule ruo n’ókè ahụ, ọ dị ha mkpa inwe ọganihu ruo itozu okè, na-ewulite okwukwe ha ịtachi obi n’ihe ọ bụla pụrụ ịbịanụ.—2/15, peeji nke 29.

N’ihi gịnị ka o ji kasị mma izere ikwu na Jehova na-eji ebere ebelata ikpe ziri ezi ya?

N’asụsụ ụfọdụ, “belata” pụrụ ịpụta ime ka ihe ruo n’ókè kwesịrị ekwesị ma ọ bụ igbochi ihe. Jehova bụ Chineke nke, ma ikpe ziri ezi ma ebere, mgbe ọ na-egosipụtakwa àgwà ndị a, ha abụọ na-arụkọ ọrụ n’otu. (Ọpụpụ 34:6, 7; Deuterọnọmi 32:4; Abụ Ọma 116:5; 145:9) Ọ dịghị mkpa iji ebere belata ikpe ziri ezi Jehova ma ọ bụ mee ka ọ dị nro.—3/1, peeji nke 30.

Ò kwesịrị ekwesị ka Onye Kraịst gbasie ozu nke onye ọ hụrụ n’anya?

Ịgbasi ozu bụ ụzọ isi chekwaa ozu. Ụfọdụ ndị oge ochie mere ya n’ihi ihe ndị metụtara okpukpe. Ọ gaghị adị otú ahụ n’ebe ndị na-efe ezi ofufe nọ. (Eklisiastis 9:5; Ọrụ 24:15) Nanị ihe ịgbasi ozu ga-eme bụ igbu ihe a na-apụghị izere ezere oge, ahụ́ ịlaghachi n’àjà. (Jenesis 3:19) Ma ọ gaghị adị mkpa inwewa nchegbu ma ọ bụrụ na iwu ma ọ bụ ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ achọọ ka a gbasie ozu, ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ dị mkpa n’ihi na ụfọdụ ndị aghaghị isi ebe dị anya bịa olili ozu ahụ..—3/15, peeji nke 29-31.

Olee ihe atụ ndị dị na Bible bụ́ ndị na-akụziri anyị na Chineke na-anabata ndị nke mba nile?

Jehova zigara Jona onye amụma ịdọ ndị Nineve aka ná ntị, Chineke gbakwara Jona ume ịnakwere nchegharị ha. Site n’okwu ọnụ na n’omume, Jizọs gbara ume ka a na-egosi ịhụnanya n’ebe ndị Sameria nọ. Ma Pita onyeozi ma Pọl onyeozi kerechaara òkè n’iwegara ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma ahụ. Site n’ihe atụ ndị dị otú ahụ, anyị pụrụ ịhụ mkpa ọ dị ịgbalị inyere ndị sitere ná nzụlite nile aka.—4/1, peeji nke 21-24.