Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebee Ka Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Gị Dabeere?

Ebee Ka Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Gị Dabeere?

Ebee Ka Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Gị Dabeere?

N’otu obodo nta dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, nwa okorobịa bụ́ Josué feere ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya aka sị ha nọdụ nke ọma. * Ọ gawaziri n’obodo ukwu ịchọ ego. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya mgbe o ruru, olileanya ya dakpọrọ nnọọ ka ọ chọpụtara na obodo ukwu ahụ abụghị ebe osisi na-amị ego.

KA Ọ na-adọga ime ka ndụ obodo ukwu mara ya ahụ́, Josué nwere nnọọ nkụda mmụọ. Obodo ukwu ahụ adịtụghị otú ọ tụrụ anya ya. N’oge a nile, n’ime obi Josué, ọ na-agụsi ya agụụ ike ịlaghachikwuru ndị ezinụlọ ya na ndị enyi ya n’obodo nta ahụ dara ogbenye ọ hapụrụ. Ma egwu na-atụ ya na ụfọdụ ndị obodo ya ga-achị ya ọchị. ‘Ha ga-akpọ m onye na-abaghị uru,’ ka o chere ná mwute, ‘n’ihi na akpatalighị m ego n’obodo ukwu.’

Ọbụna ihe na-enye ya nsogbu n’obi karị bụ ndakpọ olileanya nke ndị mụrụ ya pụrụ inwe. Ha dabeere n’ebe ọ nọ maka enyemaka n’ụzọ ego. Ka Josué nọ na-agbalị ịnagide nchegbu a, ọ rụrụ ọrụ dị ala ruo ọtụtụ awa, ma na-enweta nanị ihe dị nnọọ nta n’ihe ọ tụrụ anya inweta. Oké ọrụ emewo ka ike gwụ ya. Oge o nwere maka ọrụ Ndị Kraịst, bụ́ ihe o ji kpọrọ ihe nke ukwuu, na-ebelata ka izu ọ bụla na-agafe. N’ịbụ onye ya na ezinụlọ ya na ndị enyi ya mbụ na-adịghịzi akpakọrịta, o nwere mwute na owu ọmụma. Ọ chọpụtara na obodo ukwu ahụ emeghị ka ọ nọrọ ná ntụkwasị obi ọ na-achọsi ike.

Ọ bụ ezie na aha na obodo pụrụ ịdịgasị iche iche, ọtụtụ ndị na-enwekarị ụdị ahụmahụ a dị mwute Josué nwere. Ọ bụghị n’ihi ọdịmma onwe ya nanị ka Josué ji nwee ọchịchọ ịkwaga ebe ọzọ—nanị ihe ọ na-achọ bụ ịnọ ná ntụkwasị obi. O ji ezi obi chee na ọ ga-adịrị ya mfe ịchọta ya n’obodo ukwu karịa n’obodo nta ya. N’ezie, mgbe ụfọdụ, mmadụ pụrụ ime ka ọnọdụ ya ka mma n’ụzọ ihe onwunwe, ma nke ahụ apụtaghị ịnọ ná ntụkwasị obi n’ezie. N’ezie, o mezughịrị Josué, o yikwara ka ọ gaghị emezuchara ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị na-anwale otu ihe ahụ. Nke a mere anyị ji na-ajụ, sị, ‘Gịnị bụ ịnọ ná ntụkwasị obi?’

Ndị dị iche iche na-ele ịnọ ná ntụkwasị obi anya n’ụzọ dị iche iche. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-ekwu na ịnọ ná ntụkwasị obi bụ “nnwere onwe pụọ n’ihe ize ndụ” ma ọ bụ “nnwere onwe pụọ n’egwu ma ọ bụ nchegbu.” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ghọtara na ‘inwere onwe kpam kpam pụọ n’ihe ize ndụ’ ekweghị omume taa. Ha na-enwe afọ ojuju ma ọ bụrụhaala na ha nwere mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi, n’agbanyeghị ọnọdụ ndị dị ize ndụ gbara ha gburugburu.

Gịnị banyere gị? Ebee ka ị na-achọga ịnọ ná ntụkwasị obi? À na-achọta ya n’obodo ukwu n’abụghị n’ime obodo, dị ka Josué chere? Ka ọ̀ bụ n’ego, n’agbanyeghị ebe ma ọ bụ otú ị pụrụ isi nweta ya? Ọ̀ bụ ma eleghị anya, n’ịrịgo n’ọkwá? N’agbanyeghị ebe i kweere na ịnọ ná ntụkwasị obi gị dabeere, ogologo oge ha aṅaa ka ma gị ma ezinụlọ gị ga-anọ ná ntụkwasị obi ahụ?

Ka anyị tụlee ụzọ atọ ọtụtụ ndị si achọ ịnọ ná ntụkwasị obi—ịkwaga ebe ọzọ; ego; ọnọdụ, ma ọ bụ ọkwá. E mesịa, anyị ga-enyocha ebe a pụrụ inweta ezi ịnọ ná ntụkwasị obi na-adịgide adịgide.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A gbanweela aha ahụ.