Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ito Chineke n’Ugwu Ndị Dị na Philippines

Ito Chineke n’Ugwu Ndị Dị na Philippines

Ito Chineke n’Ugwu Ndị Dị na Philippines

Ọ bụrụ na i chere na Philippines bụ mba àgwàetiti mejupụtara, i hieghị ụzọ. Ma, ọ bụkwa mba nwere ugwu ndị mara mma. Nye Ndịàmà Jehova, ime nkwusa n’obodo na n’ala ndị dị larịị adịtụwo nnọọ mfe ma dị irè. Otú ọ dị, ógbè ndị bụ́ ugwu ugwu dị iche.

ỌMARỊCHA ugwu ndị dị ná mba ahụ dị nnọọ iche n’ebe ụsọ mmiri bụ́ ájá ájá, ebe ndị coral kpụkọtara ọnụ, obodo nta ndị a na-akụ azụ̀ na ha, na obodo ndị na-ekwo ekwo nke mbara ala àgwàetiti ahụ. Ugwu ndị ahụ bụkwa oké ihe mgbochi n’ikwusa “ozi ọma” nke Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.

Àgwàetiti ndị dị na Philippines dị n’ebe mbara ala dị iche iche sọkọtara isi. Nsọkọta isi nke mbara ala n’ebe a emewo ka e nwee ugwu ndị ọnụ ha pịrị apị n’àgwàetiti ndị nke ka buo ibu. Ihe karịrị àgwàetiti 7,100 mejupụtara Philippines dị n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke Ógbè Ugwu Na-agbawakarị na Pacific. N’ihi ya, ugwu ndị na-agbawa agbawa jupụtara na ha, bụ́ ndị sokwa mee ka ebe ahụ bụrụ ugwu ugwu. Ala ndị ahụ bụ́ nkume nkume kewapụrụ ndị bi n’ugwu ndị ahụ, iche. Irute n’ebe ndị ahụ siri ike n’ihi na nanị n’okporo ụzọ ole na ole ka ụgbọala pụrụ ịgba.

N’agbanyeghị ihe mgbochi ndị a, Ndịàmà Jehova ghọtara mkpa ọ dị ịgakwuru “ụdị mmadụ nile.” (1 Timoti 2:4) N’ihi ya, Ndịàmà nọ na Philippines arụsiwo ọrụ ike n’ikwekọ ná mmụọ nke Aịsaịa 42:11, 12: “Ka ndị bi [na nkume dị elu] tie mkpu ọṅụ, ka ha si n’elu ugwu nile tisie mkpu ike. Ka ha nye Jehova nsọpụrụ, gosikwa otuto Ya n’àgwàetiti nile.”

Mgbalị a nọgidere na-eme iji gbaara ndị bi n’ugwu ndị ahụ àmà malitere ihe karịrị afọ 50 gara aga. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ gasịrị, ndị ozi ala ọzọ nyere aka kwalite ọrụ ahụ. Ọtụtụ ndị bi n’ebe ndị ahụ nakweere eziokwu Bible, ma nye aka gbasaa eziokwu a n’obodo nta ndị dị n’elu elu ugwu ndị ahụ. Nke a rụpụtara ihe ndị dị mma. Dị ka ihe atụ, n’ugwu ndị dị na Cordillera Central nke dị n’ebe ugwu Luzon, e nwere ihe karịrị ndị nkwusa ozi ọma 6,000. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha bụ ndị ebe ahụ, gụnyere ndị Ibaloi, Ifugao, Igorot, na Kalinga.

Otú ọ dị, a ka nwere ógbè ndị siri ike iru n’elu ugwu ndị ahụ. E chefubeghị ndị bi n’ebe ndị ahụ. Olee otú e siworo jekwuru ụfọdụ n’ime ha, oleekwa otú ha siworo meghachi omume?

Ezi Okwukwe Anọchie Anya Ọdịnala

Ndị Tinggi bi n’ebe bụ́ ugwu ugwu nke ógbè Abra dị n’àgwàetiti Luzon nke dị n’ebe ugwu. Ọ pụrụ ịbụ na aha a sitere n’okwu Malay oge ochie bụ́ tinggi, nke pụtara “ugwu.” Nke ahụ dabara nnọọ adaba n’ezie! Ndị ahụ na-akpọkwa onwe ha ndị Itneg, na-akpọkwa asụsụ ha Itneg. Ha kweere na chi a na-akpọ Kabunian, nkwenkwe ụgha na-achịkwakwa ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị n’ụzọ dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-achọ ịpụ apụ amaa uzere, ọ bụ mgbaàmà ihe ọjọọ. Ọ ghaghị ichere ruo awa ole na ole ka ihe ọjọọ ahụ pụchaa.

Na 1572, ndị Spen webatara okpukpe Katọlik, ma ha akụzighịrị ndị Tinggi ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ndị ghọrọ ndị Katọlik ka kwenyesiri ike na Kabunian ma na-agbaso omenala obodo ahụ. Ndị a nwetara ezi ihe ọmụma banyere Bible nke mbụ ya n’afọ ndị 1930 mgbe Ndịàmà Jehova malitere ịgbasa ozi Alaeze ahụ n’ugwu ndị ahụ. Ọ dịla anya ọtụtụ ndị Tinggi nwere obi eziokwu malitere ito Jehova ‘site n’elu ugwu nile.’

Dị ka ihe atụ, Lingbaoan bụbu onyeisi a na-akwanyere ùgwù nke otu agbụrụ dị n’ógbè ahụ. O mikpuru nnọọ onwe ya n’ọdịnala ndị Tinggi. “Agbasochiri m ọdịnala ndị Tinggi anya. Ọ bụrụ na e gbuo mmadụ, anyị na-agba egwú mgbe e lisịrị ya, ma kụọ ogele. Anyị na-achụkwa ụmụ anụmanụ n’àjà. Anyị kweere na Kabunian, amaghịkwa m Chineke nke e kwuru banyere ya na Bible.” Ọ na-eme nke a n’agbanyeghị na ọ sị na ya bụ onye Katọlik.

Ndị ozi nke Ndịàmà Jehova bịara ime nkwusa n’ógbè ahụ. Ha zutere Lingbaoan ma gbaa ya ume ịgụ Bible. Ọ na-echeta, sị: “Ọ bụ Bible mere ka m kwenye na Jehova bụ ezi Chineke ahụ.” Mgbe ahụ, otu Onyeàmà bịara mụọrọ ya Bible, Lingbaoan mekwara mkpebi ijere ezi Chineke ahụ ozi. Ọ hapụrụ ụzọ ndụ ya mbụ, gụnyere ọkwá ya dị ka onye ndú agbụrụ, bụ́ nke kpasuru onye ụkọchukwu obodo ha na ndị ha na Lingbaoan bụbu enyi iwe. Otú ọ dị, Lingbaoan kpebisiri ike ịgbaso eziokwu ahụ ọ chọtara n’ime Bible. Ọ na-eje ozi ugbu a dị ka okenye ọgbakọ.

Ehihie Asaa na Abalị Isii

Ọ bụ ezie na akụkụ ụfọdụ nke ógbè Abra na-anụ ozi ọma ahụ n’ụzọ chiri anya ugbu a, ndị ọzọ dịpụrụ adịpụ, ọ bụkwa nanị mgbe ụfọdụ ka a na-agbara ha àmà. N’otu oge gara aga, e mere mgbalị iji ruo otu n’ime ebe ndị a. Otu ìgwè nke Ndịàmà 35 mejupụtara gawara ime nkwusa n’ókèala a na-eketaghị ọrụ na ya nke dị na Tineg, Abra, bụ́ ebe a na-agabeghị kemgbe afọ 27.

E ji ụkwụ mee njem ime nkwusa a, nke were ụbọchị asaa. Cheedị ihe ọ dị ka ya ịgafe àkwà mmiri ndị e ji eriri rụọ na mmiri ndị dị omimi nakwa iji ọtụtụ awa buru ibu gabiga ọtụtụ ugwu—ihe a nile bụ iji kwusaa ozi ọma ahụ nye ndị na-adịghị anụkebe ya! N’ime abalị isii ha ji mee njem ahụ, ha ji abalị anọ hie ụra n’elu ugwu n’èzí nkịtị.

Ọ bụ ezie na Ndịàmà ahụ ahụ́ gbasiri ike mere njem ahụ buuru ụfọdụ ihe oriri, ha apụghị iburu nke ga-ezuru ha maka njem ahụ. Otú ọ dị, nke a abụghị nsogbu n’ihi na ndị mmadụ nwere obi ụtọ nke ukwuu iji ihe oriri gbanwere akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Ndịàmà ahụ natara ọtụtụ ihe ndị a na-arụpụta n’ugbo, azụ̀, na anụ mgbada. Ọ bụ ezie na ha nwere ihe isi ike ụfọdụ, ndị so n’ìgwè ahụ sịrị: “E ji ọṅụ dị ukwuu nke anyị nwetara kwụọ ụgwọ àjà ndị anyị chụrụ.”

N’ime ụbọchị asaa ahụ, ndị ozi a gbara àmà n’obodo nta iri, na-enyefe akwụkwọ 60, magazin 186, broshuọ 50, na ọtụtụ traktị. Ha duziiri ìgwè mmadụ 74 ọmụmụ Bible. Mgbe ndị ọchịchị obodo Tineg na ụfọdụ ụmụ amaala ya a ma ama rịọrọ ka e nwee nzukọ ọgbakọ n’obodo ahụ, e nwere nzukọ nke mmadụ 78 gara. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị gara ya bụ ndị nkụzi na ndị uwe ojii. E nwere olileanya na ọtụtụ ndị Tinggi ka ga-esonye ná ndị ‘na-eti mkpu’ ma na-eto Jehova site n’elu ugwu.

Ihe Ka Ọlaedo Mma

N’ebe ndịda Philippines ka e nwere ụfọdụ àgwàetiti ebe ndị Spen hụrụ ọlaedo. Nke a mere e ji nwee aha bụ́ Mindoro, mkpọbiri nke okwu Spanish bụ́ mina de oro, ma ọ bụ “ebe a na-egwupụta ọlaedo.” Otú ọ dị, a na-achọta ihe ka ọlaedo mma n’àgwàetiti ndị ahụ ugbu a—ndị chọrọ ijere ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova ozi.

Ihe dị ka mmadụ 125,000 bụ́ ndị bi ebe ahụ, ndị a na-akpọ ndị Mangyan, bi n’ime ime ọhịa nke Mindoro. Ha na-ebi ndụ dị mfe, na-anọkarịrị onwe ha, ma nwee asụsụ nke ha. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha na-ekpe okpukpe ọdịnala ma na-efe ọtụtụ chi, ha kwekwara ná ndị mmụọ dịgasị iche iche dị n’ihe ndị e kere eke.

Site n’oge ruo n’oge, mgbe ha na-enweghị ihe oriri ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị mkpa, ụfọdụ ndị Mangyan na-abịa na gburugburu ụsọ oké osimiri ịchọ ọrụ. Nke a bụ ihe Pailing mere, bụ́ onye si ná ntakịrị ìgwè nke ndị Mangyan a na-akpọ Batanga. O tolitere n’etiti ndị ya n’ime ọhịa ndị dị n’ugwu ahụ, o kwekwara n’ihe ndị Batanga kweere ma na-eme ka ha. Uwe ha na-eyikarị bụ nanị mbé n’úkwù. Iji hụ na ihe ọkụkụ ha mere nke ọma, ọdịnala ndị Batanga bụ na ndị na-efe chi ha ga-egbu ọkụkọ, mee ka ọbara ya na-atanye n’ime mmiri ka ha na-ekpe ekpere.

Pailing adịghịzi agbaso ọdịnala ndị ahụ. N’ihi gịnị? Mgbe ọ gara n’ebe ndị dị larịị, ọ chọtara ọrụ n’ebe ezinụlọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ. Otu n’ime ezinụlọ ndị a jiri ohere a gwa Pailing eziokwu Bible. Ọ nabatara ya ma nwee ekele n’ezie maka ịmụta banyere nzube Jehova maka mmadụ na ụwa. Ha mere ndokwa ka ọ gaa ụlọ akwụkwọ elementrị, mụọkwa Bible. E mere Pailing baptizim dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova mgbe ọ dị afọ 24. Mgbe ọ dị afọ 30, ọ nọ n’afọ nke abụọ ya n’ụlọ akwụkwọ kọleji, o mekwara ụlọ akwụkwọ ahụ ókèala ọ na-eme nkwusa na ya. Ugbu a, ha na-akpọ ya Rolando (aha ndị bi n’ala dị larịị).

Ọ bụrụ na i zute Rolando, onye ị ga-ahụzi bụ onye ozi nwere ihu ọchị nke na-eji ejiji dị mma bụ́ onye na-eje ozi dị ka onye nkwusa oge nile na ohu na-eje ozi n’otu n’ime ọgbakọ ndị dị na Mindoro. N’oge na-adịbeghị anya, Rolando laghachiri n’ugwu ndị ahụ, ọ bụghị ịga sonyere ndị Batanga n’ọdịnala ha, kama ọ bụ isoro ha kerịta eziokwu na-enye ndụ nke sitere na Bible.

Ha Chọsiri Ike Inweta Ụlọ Nzukọ Alaeze

Ógbè Bukidnon—nke pụtara “Ndị Bi n’Ugwu” na Cebuano—dị n’àgwàetiti nke ebe ndịda bụ́ Mindanao. Nke a bụ ógbè ugwu, ndagwurugwu ndị dị omimi, ndagwurugwu ndị mmiri dị na ha, na ala ndị dị larịị, jupụtara na ya. Ala ahụ na-eme ihe nke ọma na-emepụta ihe ọkụkụ ndị dị ka akwụoro, ọka, kọfị, osikapa, na unere. Agbụrụ ndị si n’ebe ndị bụ́ ugwu ugwu bụ́ Talaandig na Higaonon, bi n’ebe ahụ. Ọ dịkwa ndị a mkpa ịmụta banyere Jehova. N’oge na-adịbeghị anya, na nso nso obodo Talakag, ohere a meghere n’ụzọ na-akpali nnọọ mmasị.

Ndịàmà gara n’ebe ndị ahụ bụ́ ugwu ugwu chọpụtara na ihu igwe ha jụrụ oyi ma a nabatara ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ. Ndị bi n’ebe ndị ahụ sị na ha kweere na Chineke nke pụrụ ime ihe nile, bụ́ Nna, ma ha amaghị aha ya. Ebe ọ bụ na ha biri ihe ka ukwuu ná ndụ ha n’ime oké ọhịa, nke a bụ nke mbụ ha zutere Ndịàmà Jehova. A gwara ha aha Chineke, gwakwa ha nzube ya dị ebube n’ihe banyere Alaeze ahụ. Obi dị ha ụtọ, n’ihi ya, e kpebiri na a ga-eleta obodo ha ọzọ.

E letara ha ọtụtụ ugboro. N’ihi ya, ndị obodo ahụ nyere ala maka “ụlọ” Ndịàmà Jehova. Ndịàmà ahụ ji obi ụtọ nara ya. Ala ahụ dị n’elu ugwu kasị elu n’ógbè ahụ, nke a na-anọ na ya na-ahụ okporo ụzọ. E ji osisi, achara, na igu nkwụ wuo ụlọ ahụ. E wuchara ụlọ ahụ n’ime ọnwa atọ na ụbọchị iri. A na-ahụ ihe odide bụ́ “Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova” nke ọma n’ihu ụlọ ahụ. Cheedị banyere nke ahụ, e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze tupu e hiwe ọgbakọ!

Kemgbe ahụ, otu okenye ọgbakọ nke bụ́kwa onye ozi oge nile, kwagara ebe ahụ, dịkwa ka otu ohu na-eje ozi mere. Ha na Ndịàmà si n’ógbè ndị gbara ebe ahụ gburugburu rụrụ ọrụ iru ihe mgbaru ọsọ nke ihiwe ọgbakọ. Nke a mezuru n’August nke afọ 1998. Otu ntakịrị ọgbakọ na-eji Ụlọ Nzukọ Alaeze a eme ihe ugbu a n’ụzọ zuru ezu, na-enyere ndị bi n’ugwu aka ịmụta eziokwu Bible.

N’ezie, Jehova ejiriwo ndị ohu ya dị njikere mee ihe na Philippines ịgbasa eziokwu nke Alaeze ahụ ọbụna n’ugwu ndị ọ na-esi ike iru. A na-echetara anyị Aịsaịa 52:7, bụ́ nke na-asị: “Lee, ka ha si maa mma nke ukwuu n’elu ugwu, bụ́ ụkwụ nke onye na-ezisa ozi ọma.”

[Map ndị dị na peeji 11]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

ABRA

MINDORO

BUKIDNON

[Ebe E Si Nweta Foto]

Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ime nkwusa n’ugwu ndị ahụ gụnyere iji ọtụtụ awa arị ugwu ndị bụ́ nkume nkume

[Foto dị na peeji nke 10]

Ime baptizim ná mmiri dị n’ugwu