Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iwu Chineke Bụ Maka Abamuru Anyị

Iwu Chineke Bụ Maka Abamuru Anyị

Iwu Chineke Bụ Maka Abamuru Anyị

“Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya!”—ABỤ ỌMA 119:97.

1. Olee àgwà e nwere n’ebe nile banyere irube isi n’iwu Chineke?

ADỊKARỊGHỊ erube isi n’iwu Chineke taa. Nye ọtụtụ ndị, ido onwe ha n’okpuru ikike ka elu a na-adịghị ahụ anya yiri ihe na-enweghị isi. Anyị bi n’ọgbọ nke onye na uche ya n’ihe banyere omume, ọgbọ nke a na-adịghị ahụ ókè dị n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, na nke e nwere ọnọdụ ndị a na-apụghị ịkọwa n’ụzọ dị mfe dị ka ndị ziri ezi ma ọ bụ ndị na-ezighị ezi. (Ilu 17:15; Aịsaịa 5:20) N’igosipụta ụzọ iche echiche nke jupụtara n’ọha mmadụ ebe e nwere echiche ụwa, e kwuru n’otu nnyocha e mere n’oge na-adịbeghị anya na “ihe ka ọtụtụ ná ndị America chọrọ ịdị na-ekpebiri onwe ha ihe ziri ezi, ihe dị mma na ihe bara uru.” Ha na-ahọrọ “Chi na-esighị ike. Ụkpụrụ nduzi na-esighị ike. Ndị isi na-esighị ike, n’ụzọ omume ma ọ bụ n’ụzọ ndị ọzọ.” Otu onye na-enyocha ọha na eze kwuru na taa, “a na-atụ anya ka ndị mmadụ n’otu n’otu jiri aka ha na-ekpebi ihe ibi ndụ dị mma na nke omume ọma pụtara.” Ọ gara n’ihu, sị: “Ụdị ọ bụla nke ikike ka elu aghaghị ime ka iwu ya kwekọọ ná mkpa nke ndị mmadụ n’ezie.”

2. Olee otú ebe mbụ a kpọtụrụ iwu aha n’ime Bible na ngọzi na ihu ọma Chineke si nwee njikọ chiri anya?

2 Ebe ọ bụ na ọtụtụ mmadụ na-enyo uru iwu Jehova bara enyo, ọ dị anyị mkpa ime ka nkwenye anyị kwenyere na ụkpụrụ Chineke bụ maka abamuru anyị, sikwuo ike. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị ịtụle ihe ndekọ nke ebe mbụ e kwuru banyere iwu n’ime Bible. Na Jenesis 26:5, anyị na-agụ okwu Chineke bụ́: “Abraham . . . wee debe ihe ndebe m, ihe nile M nyere n’iwu, ụkpụrụ m nile, na iwu m nile.” E kwuru okwu ndị ahụ ọtụtụ narị afọ tupu Jehova enye ụmụ Ebreham usoro iwu zuru ezu. Olee otú Chineke si kwụghachi Ebreham ụgwọ maka nrubeisi ya, gụnyere nrubeisi nye iwu Ya? Jehova Chineke kwere ya nkwa, sị: “Ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Jenesis 22:18) Nrubeisi nye iwu Chineke nakwa ngọzi na ihu ọma Chineke si otú a nwee njikọ chiri anya.

3. (a) Mmetụta dị aṅaa ka otu ọbụ abụ kwupụtara banyere iwu Jehova? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa kwesịrị ka anyị lebara ha anya?

3 Otu n’ime ndị ọbụ abụ—ikekwe nwa nwoke nke eze Juda nke mesịrị bụrụ eze—kwupụtara mmetụta nke ya na iwu na-adịghị agakọkarị. O ji oké olu gwa Chineke, sị: “Lee ka m si hụ iwu Gị n’anya!” (Abụ Ọma 119:97, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) Nke a abụghị nnọọ okwu dapụnahụrụ ya adapụnahụ. Ọ bụ nkwupụta nke ịhụnanya o nwere n’ebe uche Chineke dị, dị ka e si depụta ya n’iwu ya. Jizọs Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke zuru okè, nwere mmetụta yiri nke ahụ. A kọwara Jizọs n’ụzọ amụma dị ka onye na-asị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke; iwu Gị dịkwa n’ime obi m.” (Abụ Ọma 40:8; Ndị Hibru 10:9) Gịnị banyere anyị? Ọ̀ na-atọ anyị ụtọ ime ihe dị Chineke ụtọ? Ànyị kwenyesiri ike n’uru iwu Jehova bara? N’ọnọdụ dị aṅaa ka nrubeisi nye iwu Chineke nọ n’ofufe anyị, ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, ná mkpebi anyị na-eme, nakwa ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ? Iji hụ iwu Chineke n’anya, anyị kwesịrị ịghọta ihe mere Chineke ji bụrụ onye o ruuru ime iwu na ịhụ na e debere ya.

Jehova—Onye O Ruuru Ịbụ Onye Na-enye Iwu

4. Gịnị mere Jehova ji bụrụ onye ọ kasị ruoro ịbụ Onye Na-enye Iwu?

4 Dị ka Onye Okike, Jehova bụ onye ọ kasị ruoro ịbụ Onye Na-enye Iwu n’eluigwe na ala. (Mkpughe 4:11) Aịzaịa onye amụma kwuru, sị: “Jehova bụ onye na-enye anyị iwu.” (Aịsaịa 33:22) O mewo iwu okike ndị na-achịkwa ihe ndị e kere eke dị ndụ na ndị na-adịghị ndụ. (Job 38:4-38; 39:1-12; Abụ Ọma 104:5-19) Dị ka onye Chineke kere eke, mmadụ bụ onye iwu okike nke Jehova ga na-achịkwa. N’agbanyeghịkwa na mmadụ nweere onwe ya ime nhọrọ, nwee ike iche echiche n’onwe ya, ọ na-enwe obi ụtọ nanị mgbe o doro onwe ya n’okpuru iwu Chineke ndị metụtara omume na ihe ime mmụọ.—Ndị Rom 12:1; 1 Ndị Kọrint 2:14-16.

5. Olee otú ụkpụrụ dị ná Ndị Galeshia 6:7 si bụrụ eziokwu ma a bịa n’ihe banyere iwu Chineke?

5 Dị ka anyị maara, a dịghị emebi iwu okike nke Jehova emebi. (Jeremaịa 33:20, 21) Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe megidere iwu okike ụfọdụ, dị ka iwu ike ndọda, ọ na-enweta ihe na-esi na ya apụta. N’ụzọ yiri nke ahụ, a pụghị ịgbanwe iwu Chineke ndị metụtara omume agbanwe, a pụghịkwa izere ha ma ọ bụ imebi ha n’enwetaghị ntaramahụhụ. A na-ahụ na e debere ha dị nnọọ ka e si ahụ na e debere iwu okike ya, ọ bụ ezie na o nwere ike ọ gaghị arụpụta ihe ngwa ngwa dị ka iwu okike ya. “Chineke abụghị onye a ga-akwa emo. N’ihi na mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.”—Ndị Galeshia 6:7; 1 Timoti 5:24.

Ókè Iwu Jehova Haruru

6. Ókè ha aṅaa ka iwu Chineke saruru mbara?

6 Otu ebe e gosipụtara iwu Chineke n’ụzọ pụtara ìhè bụ n’Iwu Mozis. (Ndị Rom 7:12) Ka oge na-aga, Jehova Chineke ji “iwu nke Kraịst ahụ” dochie Iwu Mozis. * (Ndị Galeshia 6:2; 1 Ndị Kọrint 9:21) Dị ka Ndị Kraịst nọ n’okpuru ‘iwu ahụ zuru okè nke dịịrị nnwere onwe,’ anyị na-aghọta na Chineke adịghị enye ntụziaka nanị n’ihe ndị metụtara akụkụ ụfọdụ nke ndụ anyị, dị ka nkwenkwe ma ọ bụ ememe okpukpe. Ụkpụrụ ya na-emetụta akụkụ nile nke ndụ, gụnyere ihe omume ezinụlọ, azụmahịa, omume anyị n’ebe ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị nọ, àgwà anyị n’ebe Ndị Kraịst ibe anyị nọ, na ikere òkè n’ezi ofufe.—Jems 1:25, 27.

7. Nye ihe atụ nke iwu Chineke ndị dị mkpa.

7 Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu, sị: “Ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị bụ di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko, ma ọ bụ ndị ikom e debere maka mmekọahụ na-ekwekọghị n’okike, ma ọ bụ ndị ikom na-edina ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị na-ekwujọ mmadụ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ee, ịkwa iko na ịkwa iko nke ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye abụghị “ime enyi” nkịtị. Idina ụdị onwe abụghị nnọọ “ụzọ ndụ dị iche.” Ha bụ imebi iwu Jehova. Otú ahụ ka ihe ndị dị ka izu ohi, ịgha ụgha, na nkwutọ dịkwa. (Abụ Ọma 101:5; Ndị Kọlọsi 3:9; 1 Pita 4:15) Jems katọrọ ịnya isi, ebe Pọl dụrụ anyị ọdụ ka anyị zere okwu nzuzu na okwu njakịrị rụrụ arụ. (Ndị Efesọs 5:4; Jems 4:16) Nye Ndị Kraịst, ụkpụrụ nchịkwa ndị a nile metụtara omume socha n’iwu zuru okè nke Chineke.—Abụ Ọma 19:7.

8. (a) Olee otú iwu Jehova dị? (b) Gịnị ka okwu Hibru e ji eme ihe maka “iwu” pụtara n’ụzọ bụ́ isi?

8 Iwu nchịkwa ndị dị otú ahụ bụ́ isi dị n’Okwu Jehova na-eme ka a mara na iwu ya karịrị nnọọ usoro iwu tara akpụ bụ́ ndị a ga-agbasoru n’isi. Ọ na-enye ihe ndabere maka ndụ guzoziri eguzozi, ma na-arụpụta ihe, na-emetụta akụkụ nile nke omume n’ụzọ dị mma. Iwu Chineke na-ewuli elu, dị mma, ma na-akụzi ihe. (Abụ Ọma 119:72) E si n’okwu Hibru bụ́ toh·rahʹ sụgharịa okwu ahụ bụ́ “iwu” dị ka ọbụ abụ ahụ si jiri ya mee ihe. Otu ọkà mmụta Bible na-ekwu, sị: ‘E si na ngwaa pụtara iduzi, ịtụzi, ịgbapụ ihe n’ihu, nweta okwu a. Mgbe ahụ, ihe ọ pụtara ga-abụ ụkpụrụ omume.’ Nye ọbụ abụ ahụ, iwu ahụ bụ onyinye sitere n’aka Chineke. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iji ya kpọrọ ihe n’otu aka ahụ, na-ekwe ka ọ na-akpụzi ụzọ ndụ anyị?

9, 10. (a) Gịnị mere nduzi a pụrụ ịdabere na ya ji dị anyị mkpa? (b) Olee nanị ụzọ anyị pụrụ isi bie ndụ dị ụtọ na nke na-aga nke ọma?

9 Nduzi a pụrụ ịdabere na ya na nke a pụrụ ịtụkwasị obi dị ihe nile e kere eke mkpa. Otú a ka ọ dị n’ebe Jizọs na ndị mmụọ ozi ndị ọzọ nọ, bụ́ ndị dị elu karịa mmadụ. (Abụ Ọma 8:5; Jọn 5:30; 6:38; Ndị Hibru 2:7; Mkpughe 22:8, 9) Ọ bụrụ na ndị a e kere eke zuru okè pụrụ irite uru ná nduzi Chineke, lee ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ isi rite uru na ya karị! Akụkọ ihe mere eme nke mmadụ na ahụmahụ onwe onye anwapụtawo ịbụ eziokwu nke ihe Jeremaịa onye amụma kwuru, sị: “Jehova, amawo m na ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.”—Jeremaịa 10:23.

10 Ọ bụrụ na anyị na-achọ ibi ndụ dị ụtọ na nke na-aga nke ọma, anyị aghaghị ilegara Chineke anya maka nduzi. Eze Solomọn ghọtara ihe ize ndụ dị na mmadụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ o ji aka ya setịpụ, n’enwetaghị nduzi site n’aka Chineke: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.”—Ilu 14:12.

Ihe Ndị Mere A Ga-eji Jiri Iwu Jehova Kpọrọ Ihe

11. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ịchọ ịghọta iwu Chineke?

11 Anyị ga-eme nke ọma ịzụlite ọchịchọ miri emi nke ịghọta iwu Jehova. Ọbụ abụ ahụ kwupụtara ọchịchọ dị otú ahụ mgbe ọ sịrị: “Kpughepụ anya m abụọ, ka m wee legide oké ihe dị iche iche si n’iwu Gị pụta.” (Abụ Ọma 119:18) Ka anyị na-amatakwu Chineke na ụzọ ya, otú ahụ ka anyị ga-aghọtakwu eziokwu nke okwu Aịzaịa bụ́: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso. Ọ ga-adị m nnọọ mma na a sị na ị ṅararịị ntị n’ihe nile M nyere n’iwu!” (Aịsaịa 48:17, 18) Jehova ji ezi obi na-achọ ka ndị ya zere ọdachi ma nụ ụtọ ndụ site n’ịṅa ntị n’ihe o nyere n’iwu. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ bụ́ isi mere anyị ji kwesị iji iwu Chineke kpọrọ ihe.

12. Olee otú ọmụma Jehova maara anyị si mee ka ọ bụrụ Onye Na-enye Iwu n’ụzọ kasị mma?

12 Iwu Chineke si n’aka Onye ahụ nke kasị mara anyị nke ọma. Ebe Jehova bụ Onye Okike anyị, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ọ ga-ama ụmụ mmadụ nke ọma. (Abụ Ọma 139:1, 2; Ọrụ 17:24-28) Ezi ndị enyi, ndị ikwu, ọbụna ndị mụrụ anyị apụghị ịma anyị nke ọma otú Jehova si mara anyị. Leenụ, Chineke maara anyị nke ọma ọbụna karịa otú anyị si mara onwe anyị! Onye Mere anyị na-aghọta mkpa ime mmụọ, nke mmetụta uche, nke uche, na nke anụ ahụ́ anyị n’ụzọ na-enweghị atụ. Ka ọ na-elebara anyị anya, ọ na-egosi nghọta miri emi banyere otú e si mee anyị, ọchịchọ anyị, na ihe ndị anyị na-achụso. Jehova na-aghọta erughị eru anyị, ma ọ makwaara ikike anyị nwere ime ezi ihe. Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14) N’ụzọ dị otú a, anyị pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ ndị nọ ná nchebe n’ụzọ ime mmụọ ka anyị na-achọ ije ije n’iwu ya, jiri ọchịchọ obi na-edo onwe anyị n’okpuru nduzi Chineke.—Ilu 3:19-26.

13. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Jehova bu ọdịmma anyị kasinụ n’obi?

13 Iwu Chineke na-esite n’aka Onye ahụ nke hụrụ anyị n’anya. Chineke nwere nchegbu miri emi banyere ọdịmma anyị na-adịgide adịgide. Ọ̀ bụ na o nyeghị Ọkpara ya dị ka “ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,” n’agbanyeghị na o furu ya ihe dị ukwuu? (Matiu 20:28) Jehova ó kwebeghị nkwa na ‘ọ gaghị ekwe ka a nwaa anyị gabiga ihe anyị pụrụ ịnagide’? (1 Ndị Kọrint 10:13) Bible ọ́ dịghị emesi anyị obi ike na ‘ọ na-eche banyere anyị’? (1 Pita 5:7) Ọ dịghị onye ji ịhụnanya nwee mmasị n’inye ihe e kere eke bụ́ mmadụ ụkpụrụ nduzi bara uru karịa Jehova. Ọ maara ihe dị anyị mma na ókè dị n’etiti obi ụtọ na obi ilu. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè ma na-ehie ụzọ, ọ bụrụ na anyị achụsoo ezi omume, ọ na-egosi anyị ịhụnanya ya n’ụzọ ndị ga-ewetara anyị ndụ na ngọzi.—Ezikiel 33:11.

14. N’ụzọ dị aṅaa dị mkpa ka iwu Chineke si dị iche n’echiche mmadụ?

14 N’ụzọ na-emesi obi ike, iwu Chineke adịghị agbanwe agbanwe. N’oge a jupụtara n’ọgba aghara anyị bi n’ime ya, Jehova bụ oké nkume kwụsiri ike, na-adị site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 90:2) O kwuru banyere onwe ya, sị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:6) Ụkpụrụ Chineke, dị ka e si dekọọ ha na Bible, bụ ndị a pụrụ ịdabere na ha kpam kpam—n’adịghị ka echiche ụmụ mmadụ bụ́ ndị a na-agbanwe n’esepụghị aka. (Jems 1:17) Dị ka ihe atụ, ruo ọtụtụ afọ, ndị ọkà n’akparamàgwà mmadụ kwalitere ịhapụ ụmụaka ka ha mere ihe masịrị ha, ma mgbe e mesịrị, ụfọdụ n’ime ha gbanwere obi ha ma kweta na ndụmọdụ ha hiere ụzọ. Ụkpụrụ na nduzi ndị ụwa na-enye n’okwu a na-aga ihu na azụ dị ka a ga-asị na ifufe na-ebugharị ha. Otú ọ dị, Okwu Jehova adịghị agha agha. Ruo ọtụtụ narị afọ, Bible enyewo ndụmọdụ banyere otú e si eji ịhụnanya azụ ụmụ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ndị bụ́ nna, unu adịkwala na-eme ụmụ unu ihe iwe, kama nọgidenụ na-azụlite ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Lee ihe na-emesi obi ike ọ bụ ịmara na anyị pụrụ ịdabere n’ụkpụrụ Jehova; ha agaghị agbanwe!

Ngọzi Ndị Na-abịara Ndị Na-erube Isi n’Iwu Chineke

15, 16. (a) Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị etinye ụkpụrụ Jehova n’ọrụ? (b) Olee otú iwu Chineke pụrụ isi bụrụ ihe nduzi dị mma n’alụmdi na nwunye?

15 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Aịzaịa, Chineke kwuru, sị: ‘Okwu m nke na-esi n’ọnụ m pụta ga-aga nke ọma.’ (Aịsaịa 55:11) N’ezie, mgbe anyị ji ezi obi na-agbalịsi ike ịgbaso ụkpụrụ ndị dị n’Okwu ya, anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma, rụpụta ihe dị mma, ma nweta obi ụtọ.

16 Tụlee otú iwu Chineke si bụrụ ihe nduzi dị mma nye alụmdi na nwunye na-aga nke ọma. “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile,” ka Pọl dere, “ka ihe ndina alụmdi na nwunye bụrụkwa ihe na-enweghị mmerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Di na nwunye ga na-akwanyerịtara onwe ha ùgwù ma na-ahụrịta onwe ha n’anya: “Ka onye ọ bụla n’ime unu n’otu n’otu sikwa otú ahụ hụ nwunye ya n’anya dị ka o si hụ onwe ya n’anya; n’aka nke ọzọ, onye bụ́ nwunye kwesịrị inwe nkwanye ùgwù miri emi maka di ya.” (Ndị Efesọs 5:33) A kọwara ụdị ịhụnanya a chọrọ ná 1 Ndị Kọrint 13:4-8: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrịrị ajọ omume ọṅụ, kama ọ na-aṅụrịrị eziokwu ọṅụ. Ọ na-edi ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-enwe olileanya ihe nile, na-atachiri ihe nile obi. Ịhụnanya adịghị ada ada.” Alụmdi na nwunye nke e ji ụdị ịhụnanya a mara agaghị ada ada.

17. Uru ndị dị aṅaa ka a na-erite site n’itinye ụkpụrụ Jehova nyere banyere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe n’ọrụ?

17 Ihe àmà ọzọ na-egosi na ụkpụrụ Jehova bara uru bụ eziokwu ahụ bụ́ na ọ na-akatọ aṅụrụma. Ọbụna ọ na-akatọ mmadụ ‘ịṅụ oké mmanya.’ (1 Timoti 3:3, 8; Ndị Rom 13:13) Ọtụtụ ndị na-eleghara ụkpụrụ Chineke anya n’okwu a na-arịa ọrịa ndị ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata ma ọ bụ na-eme ka ha ka njọ. N’ileghara ndụmọdụ Bible nyere banyere imeru ihe n’ókè anya, ụfọdụ enweela àgwà nke ịṅụ oké mmanya iji “nyere ha aka ịtụsara ahụ́.” Nsogbu ịnụbiga mmanya ókè na-akpata dị ọtụtụ, gụnyere ire ùgwù onwe onye, imebi mmekọrịta ezinụlọ ma ọ bụ itisasị ezinụlọ, ịla ego n’iyi, na ịbụ onye ọrụ ya funahụrụ. (Ilu 23:19-21, 29-35) Ọ̀ bụ na ụkpụrụ Jehova banyere iji ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya eme ihe abụghị ihe nchebe?

18. Iwu Chineke hà dị irè n’ihe ndị metụtara ego? Kọwaa.

18 Ụkpụrụ Chineke abawokwa uru n’ihe ndị metụtara ego. Bible na-agba Ndị Kraịst ume ịbụ ndị na-eme ihe n’eziokwu na ndị na-adị uchu. (Luk 16:10; Ndị Efesọs 4:28; Ndị Kọlọsi 3:23) Ebe ọ bụ na ha na-agbaso ndụmọdụ a, e buliwo ọtụtụ Ndị Kraịst n’ọkwá ma ọ bụ mee ka ha nọgide n’ọrụ ha mgbe a chụrụ ndị ọzọ n’ọrụ. Mmadụ na-eritekwa uru n’ụzọ ego mgbe ọ na-ezere àgwà ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị na ndị na-eri ahụ́ dị ka ịgba chaa chaa, ise siga, na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Obi abụọ adịghị ya na ị pụrụ icheta ihe atụ ndị ọzọ banyere ụzọ ụkpụrụ Chineke si dị irè ma a bịa n’ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba.

19, 20. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya ịnakwere na ịrapara n’iwu Chineke?

19 Ọ dịịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe isi n’iwu na ụkpụrụ Chineke kpafuo. Chee banyere ụmụ Izrel ahụ nọ n’Ugwu Saịnaị. Chineke gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karịa ndị nile.” Ha zaghachiri, sị: “Ihe nile Jehova kwuru, anyị ga-eme ya.” Ma, lee ka ụzọ ha họọrọ ịgbaso si dị iche! (Ọpụpụ 19:5, 8; Abụ Ọma 106:12-43) N’ụzọ dị iche, ka anyị nakwere ma nọgide na-agbaso ụkpụrụ Chineke.

20 Ụzọ amamihe dị na ya nke na-enyekwa obi ụtọ bụ ịrapagidesi ike n’iwu na-enweghị atụ nke Jehova nyeworo iji nye aka duzie ndụ anyị. (Abụ Ọma 19:7-11) Iji mee nke a n’ụzọ na-aga nke ọma, ọ dịkwa anyị mkpa ịghọta uru ụkpụrụ Chineke bara. Nke a bụ isi ihe a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Maka ntụle zuru ezu banyere “iwu nke Kraịst ahụ,” lee Ụlọ Nche, September 1, 1996, peeji nke 14-24.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee ntụkwasị obi na iwu Chineke bụ maka abamuru anyị?

• Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị iji iwu Jehova kpọrọ ihe?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka iwu Chineke si baa uru?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 13]

A gọziri Ebreham n’ụba maka irube isi n’iwu Jehova

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Nchegbu nke ndụ iji ọrụ n’aka nke oge a na-adọpụ uche ọtụtụ ndị n’ebe iwu Chineke dị

[Foto dị na peeji nke 17]

Dị ka ụlọ na-enye ìhè nke e wukwasịrị n’elu oké nkume, iwu Chineke kwụ chịm, ọ dịghịkwa agbanwe agbanwe