Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ụkpụrụ Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị

Jiri Ụkpụrụ Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị

Jiri Ụkpụrụ Chineke Na-eduzi Nzọụkwụ Gị

“[Jehova] na-ezi gị ime ihe na-aba uru.”—AỊSAỊA 48:17.

1. Olee otú Onye Okike si edu ụmụ mmadụ?

KA NDỊ ọkà mmụta sayensị na-arụsi ọrụ ike ịchọpụta ihe nzuzo ndị dị n’eluigwe na ala, ike dị ukwuu nke jupụtara n’ụwa gbara anyị gburugburu na-eju ha anya. Anyanwụ anyị—kpakpando há otú kwesịrịnụ—na-emepụta ike haruru ka nke “100 ijeri bọmbụ hydrogen ndị na-agbawa kwa sekọnd.” Onye Okike pụrụ iji ike ya na-enweghị nsọtụ chịkwaa ma duzie akatamkpo ihe ndị dị otú ahụ dị na mbara igwe. (Job 38:32; Aịsaịa 40:26) Gịnị banyere anyị bụ́ ụmụ mmadụ, ndị e nyere onyinye nke nnwere onwe ime nhọrọ, ikike ime omume ọma, ikike iche echiche, na ikike nke ịghọta ihe ime mmụọ? Olee ụzọ Onye Mere anyị họrọwooro isi na-edu anyị? O ji ịhụnanya na-edu anyị site n’iwu ya zuru okè na ụkpụrụ ya dị elu, nakwa site n’akọ na uche anyị a zụrụ nke ọma.—2 Samuel 22:31; Ndị Rom 2:14, 15.

2, 3. Olee ụdị nrubeisi na-atọ Chineke ụtọ?

2 Chineke na-enwe obi ụtọ n’ebe ihe e kere eke nwere ọgụgụ isi bụ́ ndị chọrọ irubere ya isi nọ. (Ilu 27:11) Kama ike anyị n’ụzọ anyị ga na-ekwere ihe nile n’ajụghị ase dị ka ígwè ọrụ robot na-enweghị uche, Jehova kenyere anyị nnwere onwe ime nhọrọ ka anyị wee nwee ike ime mkpebi ndị dabeere n’ezi ihe ọmụma iji na-eme ihe ziri ezi.—Ndị Hibru 5:14.

3 Jizọs, bụ́ onye mere ka Nna ya n’ụzọ zuru okè, gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu. Adịkwaghị m akpọ unu ndị ohu.” (Jọn 15:14, 15) N’oge ochie, ọ dịghị ihe ọzọ ohu na-eme ma ọ́ bụghị irube isi n’iwu nke onye nwe ya. N’aka nke ọzọ, a na-amalite ọbụbụenyi site n’igosipụta àgwà ndị na-adọrọ mmasị. Anyị pụrụ ịghọ ndị enyi Jehova. (Jems 2:23) A na-eme ka ọbụbụenyi a sikwuo ike site n’inwerịta ịhụnanya. Jizọs jikọrọ irubere Chineke isi na ịhụnanya mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla hụrụ m n’anya, ọ ga-edebe okwu m, Nna m ga-ahụkwa ya n’anya.” (Jọn 14:23) Iji mezuo nke ahụ—na iji na-edu anyị n’enweghị nsogbu—Jehova na-agba anyị ume ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya.

Ụkpụrụ Chineke

4. Olee otú ị ga-esi akọwa ụkpụrụ?

4 Gịnị bụ ụkpụrụ? A na-akọwa ụkpụrụ dị ka “eziokwu ọha maara ma ọ bụ nke bụ́ isi: iwu, nkwenkwe, ma ọ bụ nchepụta echiche bụ́ isi ma saa mbara bụ́ nke ndị ọzọ na-adabere na ya ma ọ bụ nke e si na ya enweta ndị ọzọ.” (Webster’s Third New International Dictionary) Ojiji e ji nlezianya mụọ Bible na-ekpughe na Nna anyị nke eluigwe na-enye ntụziaka ndị bụ́ isi na-emetụta ọnọdụ na akụkụ dịgasị iche iche nke ndụ. Ọ na-eburu abamuru ebighị ebi anyị n’uche eme nke a. Nke ahụ kwekọrọ n’ihe Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Nụrụ, nwa m, narakwa okwu ọnụ m nile; afọ ndụ ga-abakwara gị ụba. N’ụzọ amamihe ka m ziworo gị ihe; emewo m ka ị zọọ ije n’ụzọ nile nke izi ezi.” (Ilu 4:10, 11) Ụkpụrụ ndị bụ́ isi Jehova nyere na-emetụta mmekọrịta anyị na ya na nke anyị na ụmụ mmadụ ibe anyị, ofufe anyị, na ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 1:1) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ụkpụrụ ndị ahụ bụ́ isi.

5. Nye ihe atụ nke ụfọdụ ụkpụrụ ndị bụ́ isi.

5 Jizọs kwuru banyere mmekọrịta anyị na Jehova, sị: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Tụkwasị na nke ahụ, Chineke na-enye ụkpụrụ ndị metụtara mmekọrịta anyị na ụmụ mmadụ ibe anyị, dị ka Ụkpụrụ Ọma ahụ: “Ya mere, ihe nile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.” (Matiu 7:12; Ndị Galeshia 6:10; Taịtọs 3:2) A bịa n’ofufe, a dụrụ anyị ọdụ, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ghara ịdị na-ahapụ nzukọ nke anyị onwe anyị.” (Ndị Hibru 10:24, 25) A bịa n’ihe ndị anyị na-eme ná ndụ kwa ụbọchị, Pọl onyeozi na-asị: “Ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto.” (1 Ndị Kọrint 10:31) E nwere ọtụtụ ụkpụrụ ndị ọzọ dị n’Okwu Chineke.

6. Olee otú e si amata ọdịiche dị n’etiti ụkpụrụ na iwu?

6 Ụkpụrụ bụ eziokwu ndị dị irè ma dị oké mkpa, Ndị Kraịst maara ihe na-amụtakwa ịhụ ha n’anya. Jehova nyere Solomọn ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ṅaa ntị n’okwu m nile; tọọ ntị gị n’ala n’okwu ọnụ m nile. Ekwela ka ha si n’anya gị abụọ wezụga onwe ha; debe ha n’etiti obi gị. N’ihi na ndụ ka ha bụụrụ ndị na-achọta ha, ha bụkwa ihe na-agwọ anụ ahụ́ ha nile.” (Ilu 4:20-22) Olee otú ụkpụrụ si dị iche n’iwu? Ụkpụrụ na-enye ihe ndabere maka iwu. Iwu, bụ́ nke a na-akapịkarị ọnụ, pụrụ ịbụ nke na-adị irè n’oge ma ọ bụ n’ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem, ma ụkpụrụ na-adị irè mgbe nile. (Abụ Ọma 119:111) Ụkpụrụ Chineke adịghị aghọ ihe mgbe ochie ma ọ bụ ihe gabigara agabiga. Ihe Aịzaịa onye amụma ji ike mmụọ nsọ dee bụ eziokwu: “Ahịhịa akpọnwụwo, okooko ọhịa ajanwụwo: ma okwu Chineke anyị ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Aịsaịa 40:8.

Dabere n’Ụkpụrụ Na-eche Echiche Ma Na-eme Omume

7. Olee otú Okwu Chineke si agba anyị ume ịdabere n’ụkpụrụ na-eche echiche ma na-eme omume?

7 Ugboro ugboro, “okwu Chineke anyị” gbara anyị ume ịdabere n’ụkpụrụ na-eche echiche ma na-eme omume. Mgbe a gwara Jizọs ka ọ chịkọta Iwu ahụ, o kwuru okwu abụọ nwere njikọ—otu na-emesi ịhụ Jehova n’anya ike, nke ọzọ na-emesi ịhụ mmadụ ibe anyị n’anya ike. (Matiu 22:37-40) N’ime nke ahụ, Jizọs hotatụrụ ihe site ná nchịkọta dị mkpirikpi a chịkọtara ụkpụrụ ndị bụ́ isi nke Iwu Mozis tupu mgbe ahụ, bụ́ nke e kwuru na Deuterọnọmi 6:4, 5: “Jehova, bụ́ Chineke, Jehova bụ otu: ị ga-ewerekwa obi gị nile, werekwa mkpụrụ obi gị nile, werekwa ike gị nile, hụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya.” Ihe àmà na-egosi na Jizọs bukwa ntụziaka Chineke nke dị na Levitikọs 19:18 n’obi. Ná ngwụsị doro anya, kwesịrị ekwesị, ma dị ike nke akwụkwọ Eklisiastis, okwu Eze Solomọn chịkọtara ọtụtụ iwu Chineke: “Ka anyị nụrụ nkwubi okwu a nile: tụọ egwu Chineke, debekwa ihe nile O nyere n’iwu; n’ihi na nke a bụ ọrụ mmadụ nile. N’ihi na ọrụ ọ bụla ka Chineke ga-eme ka ọ baa n’ikpe, ya na ihe ọ bụla zoro ezo, ma ọ bụ ezi ihe ma ọ bụ ihe ọjọọ.”—Eklisiastis 12:13, 14; Maịka 6:8.

8. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe nchebe ịghọta ụkpụrụ ndị bụ́ isi nke Bible nke ọma?

8 Ịghọta ụkpụrụ ndị dị otú ahụ bụ́ isi nke ọma pụrụ inyere anyị aka ịghọta na itinye ntụziaka ndị a kapịrị ọnụ karị n’ọrụ. Ọzọkwa, ọ bụrụ na anyị aghọtaghị ụkpụrụ ndị bụ́ isi nke ọma ma nakwere ha, e nwere ike anyị agaghị emeli mkpebi ndị dị mma, okwukwe anyị pụkwara ịbụ nke a na-akwagharị n’ụzọ dị mfe. (Ndị Efesọs 4:14) Ọ bụrụ na anyị akụbanye ụkpụrụ ndị dị otú ahụ n’uche na n’obi anyị, anyị ga-adị njikere iji ha mee mkpebi. Mgbe anyị ji nghọta tinye ha n’ọrụ, ha na-eme ka anyị nwee ihe ịga nke ọma.—Joshua 1:8; Ilu 4:1-9.

9. Gịnị mere na ọ naghị adị mfe mgbe nile ịghọta na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ?

9 Ịghọta na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ adịghị mfe ka ịgbaso usoro iwu. Dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị pụrụ ịdị na-ezere ime mgbalị a chọrọ iji dabere n’ụkpụrụ na-eche echiche. Anyị pụrụ ịhọrọ ka a gwa anyị kpọmkwem ihe anyị ga-eme mgbe anyị chere mkpebi ma ọ bụ ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme ihu. Mgbe ụfọdụ anyị pụrụ ịchọ nduzi n’aka Onye Kraịst tozuru okè—ikekwe okenye ọgbakọ—na-atụ anya inweta ụkpụrụ nduzi a kapịrị ọnụ bụ́ nke metụtara ọnọdụ anyị. Ma, e nwere ike Bible ma ọ bụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible agaghị enye ụkpụrụ nduzi a kapịrị ọnụ, ọ bụrụgodị na e nyere anyị otu, e nwere ike ọ gaghị adị irè n’oge nile nakwa n’ọnọdụ nile. Ị pụrụ icheta na otu nwoke jụrụ Jizọs, sị: “Onye Ozizi, gwa nwanne m nwoke ka mụ na ya kee ihe nketa anyị.” Kama iti iwu a ga-eji na-edozi esemokwu dị n’etiti ụmụnne, Jizọs nyere ya ụkpụrụ sara mbara karị: ‘Ghewe anya gị oghe, na-echekwa nche megide ụdị ọchịchọ anyaukwu ọ bụla.’ N’ụzọ dị otú a, Jizọs nyere ụkpụrụ nduzi nke bara uru n’oge ahụ ma nọgide na-aba uru n’oge a.—Luk 12:13-15.

10. Olee otú anyị ịgbaso ụkpụrụ si ekpughe ebumnobi anyị?

10 Ikekwe ị hụwo ndị na-erubetụ isi n’iwu, n’ihi ụjọ inweta ntaramahụhụ. Inwe nkwanye ùgwù maka ụkpụrụ ga-eme ka a ghara inwe àgwà dị otú ahụ. Otú ụkpụrụ dị n’onwe ya na-akpali ndị ọ na-achịkwa ime ihe site n’obi. N’ezie, ụkpụrụ ka n’ọnụ ọgụgụ adịghị ewetara ndị na-adịghị agbaso ha ntaramahụhụ ozugbo. Nke a na-enye anyị ohere igosipụta ihe mere anyị ji erubere Jehova isi, ihe na-akpali obi anyị. Anyị na-ahụ otu ihe atụ n’ọjụjụ Josef jụrụ arịrịọ nwunye Pọtịfa rịọrọ ya maka omume rụrụ arụ. Ọ bụ ezie na Jehova enyebeghị iwu e dere ede nke megidere ịkwa iko nke ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye, ọ dịghịkwa ntaramahụhụ Chineke kwuru na a ga-enye onye so nwunye nwoke ọzọ nwee mmekọahụ, Josef maara nke ọma banyere ụkpụrụ ikwesị ntụkwasị obi nke Chineke guzobere ná mmekọrịta alụmdi na nwunye. (Jenesis 2:24; 12:18-20) Anyị pụrụ ịhụ site n’otú o si meghachi omume na ụkpụrụ ndị dị otú ahụ metụtara ya n’ụzọ dị ike: “M̀ ga-esikwa aṅaa mee oké ihe ọjọọ nke a, mehie megide Chineke?”—Jenesis 39:9.

11. N’akụkụ ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst na-achọ ịbụ ndị ụkpụrụ Jehova na-eduzi?

11 Taa, Ndị Kraịst chọrọ ịbụ ndị ụkpụrụ Jehova na-eduzi ma a bịa n’ihe ndị metụtara onwe onye, dị ka ịhọrọ ndị enyi, ntụrụndụ, egwú, na akwụkwọ ọgụgụ. (1 Ndị Kọrint 15:33; Ndị Filipaị 4:8) Ka ihe ọmụma, nghọta, na ekele anyị na-enwe n’ebe Jehova nọ nakwa n’ebe ụkpụrụ ya dị na-amụbawanye, akọ na uche anyị, bụ́ echiche anyị banyere omume ọma, ga-enyere anyị aka itinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ n’ọnọdụ ọ bụla anyị na-eche ihu, ọbụna n’ihe ndị bụ́ nnọọ nke onwe onye. N’ịbụ ndị ụkpụrụ Bible na-eduzi, anyị agaghị achọwa ebe ndị iwu Chineke na-edochaghị anya; anyị agaghịkwa eṅomi ndị na-agbalị ịhụ ókè ha pụrụ iru n’emebighị iwu ụfọdụ n’ezie. Anyị na-aghọta na echiche dị otú ahụ na-emegide onwe ha ma na-emerụ ahụ́.—Jems 1:22-25.

12. Gịnị bụ isi ihe dị n’ịbụ ndị ụkpụrụ Chineke na-eduzi?

12 Ndị Kraịst tozuru okè na-aghọta na isi ihe dị n’ịgbaso ụkpụrụ Chineke bụ ịchọ ịmara mmetụta Jehova na-enwe banyere ihe ụfọdụ. “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya,” ka ọbụ abụ ahụ na-adụ n’ọdụ, “kpọọnụ ihe ọjọọ asị.” (Abụ Ọma 97:10) N’idepụta ụfọdụ n’ime ihe ndị Chineke ga-ewere dị ka ihe ọjọọ, Ilu 6:16-19 na-asị: “Ihe isii dị nke Jehova kpọrọ asị; ee, ihe asaa dị nke bụ́ ihe arụ nke mkpụrụ obi Ya: anya dị elu, na ire okwu ụgha, na aka na-awụsị ọbara na-emeghị ihe ọjọọ; na obi nke na-echepụta echiche ajọ ihe, na ụkwụ na-eme ngwa ịgbaga n’ihe ọjọọ; na onye àmà okwu ụgha nke na-ekupụ okwu ụgha dị iche iche dị ka ume, na onye na-ezisa iseokwu n’etiti ụmụnne.” Mgbe ọchịchọ ịtụgharị uche ná mmetụta Jehova na-enwe banyere ihe ndị dị otú ahụ bụ́ isi malitere ịchịkwa ndụ anyị, ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ na-aghọ ihe anyị na-emechi anya.—Jeremaịa 22:16.

A Chọrọ Ezi Ebumnobi

13. Echiche dị aṅaa ka Jizọs mesiri ike n’Ozizi Elu Ugwu ya?

13 Ịmara na itinye ụkpụrụ n’ọrụ na-echebekwa anyị pụọ n’ọnyà nke ofufe na-enweghị isi, na nke a na-efe iji mezuo iwu. E nwere ọdịiche dị n’etiti ịgbaso ụkpụrụ na ịgbasoru iwu n’isi. Jizọs gosipụtara nke a n’ụzọ doro anya n’Ozizi Elu Ugwu ahụ. (Matiu 5:17-48) Cheta na ndị na-ege Jizọs ntị bụ ndị Juu, n’ihi ya, omume ha kwesịrị ịbụwo nke Iwu Mozis na-achịkwa. Ma n’ezie, ha nwere echiche gbagọrọ agbagọ banyere Iwu ahụ. Ihe ha mere bụ imesi ihe e dere n’Iwu ahụ ike kama imesi ihe ọ pụtara n’ezie ike. Ha kwalitekwara ọdịnala ha, na-edebe ya n’ọnọdụ dị elu karịa ozizi Chineke. (Matiu 12:9-12; 15:1-9) N’ihi ya, a kụzighịrị ndị ahụ n’ozuzu ha iburu ụkpụrụ n’uche wee na-eche echiche.

14. Olee otú Jizọs si nyere ndị na-ege ya ntị aka ịdabere n’ụkpụrụ wee na-eche echiche?

14 N’ụzọ dị iche, Jizọs gụnyere ụkpụrụ ndị metụtara akụkụ ise nke omume n’Ozizi Elu Ugwu ahụ: iwe, alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm, nkwa, mmegwara, na ịhụnanya na ịkpọasị. Na nke ọ bụla, Jizọs gosiri uru ịgbaso ụkpụrụ bara. N’ụzọ dị otú a, Jizọs mere ka ụmụazụ ya nwee ụkpụrụ omume dị elu. Dị ka ihe atụ, n’okwu metụtara ịkwa iko nke ndị bụ́ di ma ọ bụ nwunye, o nyere anyị ụkpụrụ nke na-eduzi ọ bụghị nanị omume anyị kamakwa echiche na ọchịchọ anyị: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.”—Matiu 5:28.

15. Olee otú anyị pụrụ isi zere ọchịchọ ọ bụla nke ịbụ ndị na-agbasoru iwu n’isi?

15 Ihe atụ a na-egosi na anyị ekwesịtụghị ileghara ebumnobi na nzube nke ụkpụrụ Jehova anya. N’ezie anyị ekwesịghị ịnwa inweta ihu ọma Chineke site n’ịgbasobiga iwu ókè n’ụzọ omume. Jizọs kpughere aghụghọ dị n’àgwà dị otú ahụ site n’ịrụtụ aka n’ebere na ịhụnanya Chineke. (Matiu 12:7; Luk 6:1-11) N’ịgbaso ụkpụrụ Bible, anyị ga-ezere ịnwa ịgbaso (ma ọ bụ ịchọ ka ndị ọzọ na-agbaso) usoro iwu ndị sara mbara ma taa akpụ bụ́ ndị na-ekwekọghịkwa n’ozizi Bible. Anyị ga na-echebara ụkpụrụ ndị metụtara ịhụnanya na nrubeisi n’ebe Chineke nọ echiche karịa ime nsọ nsọ.—Luk 11:42.

Ihe Ndị Na-enye Obi Ụtọ Ọ Na-arụpụta

16. Nye ihe atụ nke ụkpụrụ ndị metụtara ụfọdụ ntụziaka Bible.

16 Ka anyị na-agbalịsi ike irubere Jehova isi, ọ dị mkpa ịghọta na iwu ya na-adabere n’ụkpụrụ ndị bụ́ isi. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst ga-ezere ikpere arụsị, mmekọahụ rụrụ arụ, na iji ọbara eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. (Ọrụ 15:28, 29) Olee ihe mere Ndị Kraịst ji ewere nguzo dị otú ahụ n’okwu ndị a? Chineke chọrọ ka anyị na-enye ya ofufe a na-ekewaghị ekewa; anyị kwesịrị ịdị na-ekwesị ntụkwasị obi nye di ma ọ bụ nwunye anyị; Jehova bụkwa Onye na-enye ndụ. (Jenesis 2:24; Ọpụpụ 20:5; Abụ Ọma 36:9) Ịghọta ụkpụrụ ndị okwu ndị a dabeere na ha na-eme ka ọ dịkwuo mfe ịnakwere na ịgbaso iwu ndị metụtara ha.

17. Ezi ihe ndị dị aṅaa pụrụ isi n’ịghọta na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ pụta?

17 Ka anyị na-aghọta ụkpụrụ ndị ọnọdụ biliterenụ dabeere na ha ma na-etinye ha n’ọrụ, anyị na-aghọta na ha bụ maka ọdịmma anyị. Abamuru ndị gbara ọkpụrụkpụ na-esochikarị ngọzi ime mmụọ ndị Chineke na-enweta. Dị ka ihe atụ, ndị na-ezere ise siga, na-eme omume ọma, ma na-akwanyere ịdị nsọ nke ọbara ùgwù na-ezere ịda ọrịa ụfọdụ. N’ụzọ yiri nke ahụ, ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu Chineke pụrụ ịbara anyị uru n’ụzọ akụ̀ na ụba, ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ, ma ọ bụ n’ebe obibi anyị. Abamuru ọ bụla dị otú ahụ gbara ọkpụrụkpụ na-egosi uru ụkpụrụ Jehova bara, na ha dị irè n’ezie. Ma irite uru dị irè otú ahụ abụghị n’onwe ya isi ihe mere a ga-eji na-etinye ụkpụrụ Chineke n’ọrụ. Ezi Ndị Kraịst na-erubere Jehova isi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya, n’ihi na ọ bụ ya ka ha kwesịrị ife ofufe, nakwa n’ihi na ọ bụ ihe ziri ezi ime.—Mkpughe 4:11.

18. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ Ndị Kraịst na-enwe ihe ịga nke ọma, gịnị kwesịrị iduzi ndụ anyị?

18 Ikwe ka ụkpụrụ Bible na-eduzi ndụ anyị na-eme ka anyị na-ebi ndụ ka elu, bụ́ nke pụrụ n’onwe ya ịdọta ndị ọzọ n’ụzọ nke Chineke. Nke kasị mkpa bụ na ụzọ ndụ anyị na-enye Jehova nsọpụrụ. Anyị na-aghọta na Jehova bụ n’ezie Chineke na-ahụ n’anya nke chọrọ ọdịmma anyị kasịnụ. Mgbe anyị na-eme mkpebi ndị kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, anyị na-ahụ otú Jehova si agọzi anyị, anyị na-enwekwa mmetụta nke ịbụ ndị nọ ya nso ọbụna karị. Ee, anyị na-azụlitekwu mmekọrịta ịhụnanya n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị bụ ụkpụrụ?

• Olee otú e si amata ọdịiche dị n’etiti ụkpụrụ na iwu?

• Gịnị mere o ji baa uru ka anyị dabere n’ụkpụrụ na-eche echiche ma na-eme omume?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 20]

A gwara Wilson, bụ́ Onye Kraịst nọ na Ghana, na n’ụbọchị ole na ole na-abịanụ, a ga-achụ ya n’ọrụ. N’ụbọchị ikpeazụ ọ ga-arụ ọrụ, a gwara ya ka ọ saa ụgbọala nke onyeisi ụlọ ọrụ ahụ. Mgbe Wilson hụrụ ego n’ụgbọala ahụ, onye ka Wilson n’ọkwá gwara ya na Chineke ezitewo ego ahụ n’ihi na a na-aga ịchụ ya n’ọrụ n’ụbọchị ahụ. Otú ọ dị, n’itinye ụkpụrụ Bible banyere ime ihe n’eziokwu n’ọrụ, Wilson nyeghachiri onyeisi ụlọ ọrụ ahụ ego ahụ. N’ịbụ onye nke a juru anya ma kpalie mmasị ya, ọ bụghị nanị na onyeisi ụlọ ọrụ ahụ gwara Wilson ozugbo ka ọ nọrọwazie kamakwa o buliri ya n’ọkwá ịbụ otu n’ime ndị isi nke ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ.—Ndị Efesọs 4:28.

[Igbe dị na peeji nke 21]

Rukia bụ nwanyị Albania nke dị afọ 60 na ụma. N’ihi nghọtahie ha nwere n’ezinụlọ ha, ọ tụpụghịrị nwanne ya nwoke ọnụ ruo ihe karịrị afọ 17. Ọ malitere iso Ndịàmà Jehova mụwa Bible ma mụta na ezi Ndị Kraịst aghaghị iso ndị ọzọ na-adị n’udo, ọ bụghị iburu ha iwe n’obi. O ji abalị dum kpee ekpere, ka obi ya na-akụkwa gbim gbim, o ji ụkwụ gaa n’ụlọ nwanne ya nwoke. Ada nwanne ya nwoke meghere ụzọ. N’inwe ihe ijuanya, ọ jụrụ Rukia, sị: “Ọ̀ dị onye nwụrụnụ? Gịnị ka ị na-eme ebe a?” Rukia gwara ya na ya chọrọ ịhụ nwanne ya nwoke. O ji olu ọma kọwaa na ịmụta ụkpụrụ Bible na ịmụta banyere Jehova akwaliwo ya ime ka ya na nwanne ya nwoke dị n’udo. Ka anya mmiri gbasịrị ha, ha amakụchaakwa onwe ha, ha mere oriri maka njikọghachi a pụrụ iche!—Ndị Rom 12:17, 18.

[Foto dị na peeji nke 23]

Matiu 5:27, 28

[Foto dị na peeji nke 23]

Matiu 5:3

[Foto dị na peeji nke 23]

Matiu 5:24

[Foto dị na peeji nke 23]

“Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, ọ rịgooro n’elu ugwu; mgbe ọ nọdụsịrị ala, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya; o wee meghee ọnụ ya malite izi ha ihe.”MATIU 5:1, 2