Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mgbe Ọ Bụ Ihe Amamihe Dị Na Ya Ịgbalaga

Mgbe Ọ Bụ Ihe Amamihe Dị Na Ya Ịgbalaga

Mgbe Ọ Bụ Ihe Amamihe Dị Na Ya Ịgbalaga

IHE e jikarị mara ụwa nke oge a bụ mmụọ àna m anwụ anwụ na nke esemokwu, ma ọ bụ ọnwụnwa. N’ozuzu, a na-ele onye si n’ihe agbalaga anya dị ka onye na-adịghị ike ma ọ bụ onye ụjọ. A pụrụ ọbụna ịkwa ya emo.

Otú ọ dị, Bible na-eme ka o doo anya na e nwere oge mgbe ịgbalaga n’ihe bụ ma ihe amamihe dị na ya ma ihe na-egosipụta obi ike. N’igosipụta na nke ahụ bụ eziokwu, Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya tupu ya ezipụ ha ije ozi, sị: “Mgbe ha kpagburu unu n’otu obodo, gbalaganụ n’obodo ọzọ.” (Matiu 10:23) Ee, ndị na-eso ụzọ Jizọs gaje ịgbalị isi n’aka ndị na-akpagbu ha gbalaga. Ha agajeghị ime ihe dị ka ịlụ agha ntụte, na-agbalị iji ike atọghata ndị ọzọ. Ha ji ozi udo. (Matiu 10:11-14; Ọrụ 10:34-37) Ya mere, kama iwewe iwe ọkụ, Ndị Kraịst gaje ịgbalaga agbalaga, isi n’ebe ihe ahụ na-akpasu iwe dị pụọ. N’ụzọ dị otú a, ha ga-anọgide na-enwe ezi akọ na uche, nọgidekwa soro Jehova na-enwe mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa.—2 Ndị Kọrint 4:1, 2.

A na-achọta ihe atụ dị iche na nke ahụ n’akwụkwọ Bible bụ́ Ilu. Ọ na-akọ banyere otu nwa okorobịa, bụ́ onye, kama ịgbalagara ọnwụnwa, sowere akwụna “dị ka ehi si abịa n’ogbugbu ya.” Gịnị si na ya pụta? Ọ bụ ọdachi, n’ihi ịdaba n’ọnwụnwa nke megidere ndụ ya.—Ilu 7:5-8, 21-23.

Gịnị ma ọ bụrụ na ọnwụnwa inwe mmekọahụ́ rụrụ arụ abịara gị ma ọ bụ gị echee ihe ize ndụ ndị ọzọ ihu? Dị ka Okwu Chineke na-egosi, ihe kwesịrị ekwesị ime pụrụ ịbụ ịgbalaga, isi n’ebe ahụ pụọ ozugbo.—Ilu 4:14, 15; 1 Ndị Kọrint 6:18; 2 Timoti 2:22.