Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmetụta Ọmịiko—Mkpịsị Ugodi nke Obiọma na Ọmịiko

Mmetụta Ọmịiko—Mkpịsị Ugodi nke Obiọma na Ọmịiko

Mmetụta Ọmịiko—Mkpịsị Ugodi nke Obiọma na Ọmịiko

“Ọ BỤRỤHAALA na ị pụrụ ime ka ihe mgbu nke onye ọzọ belatatụ, ndụ gị abụghị ihe efu,” ka Helen Keller dere. N’ezie, Keller ghọtara otú ihe mgbu nke mmetụta uche na-adị. Mgbe ọ dị ọnwa 19, ọ rịara ọrịa nke mere ka o kpuo ìsì kpam kpam ma bụrụ onye ntị chiri. Ma otu onye nkụzi dị ọmịiko kụziiri Helen ịgụ ihe na ide ihe ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì, o mesịkwara kụziere ya ikwu okwu.

Onye nkụzi Keller, bụ́ Ann Sullivan, maara nkụda mmụọ onye nwere nkwarụ na-enwe nke ọma. Ya onwe ya fọrọ nke nta ka o kpuo ìsì. Ma Ann ji ndidi chepụta ụzọ isi na-ekwunyere Helen okwu site “n’ịsụpe” mkpụrụ akwụkwọ n’aka Helen. N’ịbụ onye mmetụta ọmịiko nke onye nkụzi ya kpaliri, Helen kpebiri itinye ndụ ya n’inyere ndị ìsì na ndị ntị chiri aka. N’ịbụ onye o were mgbalị dị ukwuu iji merie nkwarụ nke ya, ọ na-emetara ndị nọ n’ọnọdụ yiri nke ahụ ebere. Ọ chọrọ inyere ha aka.

Ikekwe ị chọpụtawo na, n’ụwa a nke na-achọ ọdịmma onwe ya nanị, ọ dị mfe ‘mmadụ imechi ọnụ ụzọ nke obi ọmịiko ya’ ma na-eleghara mkpa nke ndị ọzọ anya. (1 Jọn 3:17) Otú ọ dị, e nyere Ndị Kraịst iwu ịhụ ndị agbata obi ha n’anya na inwe ịhụnanya siri ike n’ebe ibe ha nọ. (Matiu 22:39; 1 Pita 4:8) Ma, ikekwe ị maara eziokwu a: Ọ bụ ezie na anyị na-achọ n’ụzọ zuru ezu ịhụ ibe anyị n’anya, mgbe mgbe anyị na-eleghara ohere nke ibelata ihe mgbu nke ndị ọzọ anya. Nke ahụ pụrụ ịbụ nanị n’ihi na anyị amaghị mkpa ha. Mmetụta ọmịiko bụ mkpịsị ugodi nke pụrụ ịkpọghe ọnụ ụzọ nke obiọma na ọmịiko anyị.

Gịnị Bụ Mmetụta Ọmịiko?

Otu akwụkwọ ọkọwa okwu na-asị na mmetụta ọmịiko bụ “ịmata na ịghọta ọnọdụ, mmetụta, na ebumnobi onye ọzọ.” A kọwawokwa ya dị ka mmadụ inwe ikike nke itinye onwe ya n’ọnọdụ mmadụ ibe ya. Ya mere, mmetụta ọmịiko na-achọ na, nke mbụ, anyị ga-aghọta ọnọdụ nke onye ọzọ nakwa, nke abụọ, na anyị ga-eso ya nwee mmetụta ọnọdụ ndị ahụ kpaliri n’ahụ́ ya. Ee, mmetụta ọmịiko na-agụnye ihe mgbu onye ọzọ na-enwe imetụ anyị n’obi.

Okwu ahụ bụ́ “mmetụta ọmịiko” adịghị na Bible, ma Akwụkwọ Nsọ zoro aka n’àgwà a n’ụzọ a na-akapịghị ọnụ. Pita onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha na-egosi ‘mmetụta maka onye ọzọ, mmetụta ụmụnna na ọmịiko.’ (1 Pita 3:8) Okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “mmetụta maka onye ọzọ” pụtara n’ụzọ nkịtị “iso onye ọzọ takọọ ahụhụ” ma ọ bụ “inwe ọmịiko.” Pọl onyeozi tụrụ aro àgwà yiri nke ahụ mgbe ọ dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ ka ha ‘soro ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soro ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.’ Pọl gbakwụnyere, sị: “Ka uche unu na-adị n’ebe ndị ọzọ nọ dị ka ọ na-adị n’ebe unu onwe unu nọ.” (Ndị Rom 12:15, 16) Ọ̀ bụ na i kweghị na ọ gachaghị ekwe omume ịhụ onye agbata obi anyị n’anya dị ka onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị etinyeghị onwe anyị n’ọnọdụ ya?

Onye ọ bụla bu ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke mmetụta ọmịiko pụta ụwa. Olee onye ọ na-emetụbeghị n’ahụ́ mgbe ọ na-ahụ foto na-agbawa obi nke ụmụaka agụụ na-agụgbu ma ọ bụ ndị gbara ọsọ ndụ oké egwu na-atụ? Olee nne na-ahụ n’anya nke pụrụ ileghara nwa ya na-eti mkpu ákwá anya? Ma ọ bụghị nhụjuanya nile ka a na-achọpụta ngwa ngwa. Lee ka o si sie ike ịghọta mmetụta nke onye dara mbà n’obi, onye nwere nkwarụ a na-amachaghị banyere ya, ma ọ bụ ọbụna nsogbu nke iri ihe—ma ọ bụrụ na anyị enwetụbeghị ụdị nsogbu ahụ n’onwe anyị! Otú o sina dị, Akwụkwọ Nsọ na-egosi na anyị pụrụ ma kwesị ịzụlite mmetụta n’ebe ndị anyị na-anọghị n’ọnọdụ ha nọ.

Ihe Atụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke Mmetụta Ọmịiko

Jehova bụụrụ anyị onye nlereanya kasịnụ nke mmetụta ọmịiko. Ọ bụ ezie na o zuru okè n’onwe ya, ọ dịghị atụ anya ka anyị zuo okè, “n’ihi na Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; Ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103:14; Ndị Rom 5:12) Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ọ maara erughị eru anyị nke ọma, ‘ọ dịghị ekwe ka a nwaa anyị gabiga ihe anyị pụrụ ịnagide.’ (1 Ndị Kọrint 10:13) Site n’aka ndị ohu ya na mmụọ ya, ọ na-enyere anyị aka ịchọta ụzọ mgbapụ.—Jeremaịa 25:4, 5; Ọrụ 5:32.

Ihe mgbu ndị ya na-enwe na-emetụ Jehova n’onwe ya n’ahụ́. Ọ gwara ndị Juu si Babilọn lọta, sị: “Onye na-emetụ unu aka na-emetụ nwa anya [m].” (Zekaraịa 2:8) N’ịbụ onye maara mmetụta ọmịiko nke Chineke nke ọma, onye so dee Bible bụ́ Devid gwara ya, sị: “Tinye anya mmiri m nile n’ime karama akpụkpọ Gị; hà adịghị n’akwụkwọ Gị?” (Abụ Ọma 56:8) Lee ihe nkasi obi ọ bụ ịmara na Jehova na-echeta—dị ka a ga-asị na e dere ha n’akwụkwọ—anya mmiri na-agba ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ka ha na-adọga ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe!

Dị ka Nna ya nke eluigwe, mmetụta ndị ọzọ na-enwe na-emetụ Jizọs Kraịst n’ahụ́. Mgbe ọ gwọrọ otu onye ntị chiri, ọ kpọpụtara ya akpọpụta, ikekwe ka ọgwụgwọ ọ ga-eji ụzọ ọrụ ebube gwọọ ya ghara imenye ya ihere ma ọ bụ ju ya anya n’ụzọ na-enweghị isi. (Mak 7:32-35) N’oge ọzọ, Jizọs hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ nke a na-aga ili nanị otu nwa nwoke ọ mụrụ. Ọ ghọtara ozugbo ihe mgbu o nwere, gakwuru ndị ahụ bu ozu ahụ na-aga ili, ma kpọlite nwa okorobịa ahụ n’ọnwụ.—Luk 7:11-16.

Mgbe mbilite n’ọnwụ Jizọs gasịrị, mgbe o mere ka Sọl hụ ya anya n’ụzọ Damaskọs, o mere ka Sọl mara otú mkpagbu ọjọọ ọ na-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya si emetụta ya. “Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu,” ka ọ gwara ya. (Ọrụ 9:3-5) Ihe mgbu ndị na-eso ụzọ ya nwere metụrụ Jizọs n’onwe ya n’ahụ́, dị ka nne nke ihe mgbu nwa ya na-arịa ọrịa na-emetụ n’ahụ́. N’otu aka ahụ, dị ka Nnukwu Onye Nchụàjà anyị nke eluigwe, Jizọs ‘na-emetara anyị ebere n’adịghị ike anyị,’ ma ọ bụ dị ka nsụgharị nke Rotherham si kwuo, ọ na-enwe “mmetụta maka adịghị ike anyị.”—Ndị Hibru 4:15.

Pọl onyeozi mụtara ịbụ onye nhụjuanya na mmetụta nke ndị ọzọ na-emetụ n’ahụ́. “Ònye bụ onye na-adịghị ike, m wee ghara ịbụ onye na-adịghị ike? Ònye sụrụ ngọngọ, iwe ewee ghara iwe m?” ka ọ jụrụ. (2 Ndị Kọrint 11:29) Mgbe mmụọ ozi tọhapụrụ Pọl na Saịlas n’ụzọ ọrụ ebube n’agbụ n’ụlọ nga dị na Filipaị, ihe mbụ Pọl chetara bụ ịgwa onye na-elekọta ụlọ nga ahụ na ọ dịghị onye gbapụworonụ. O ji mmetụta ọmịiko ghọta na onye ahụ na-elekọta ụlọ nga nwere ike igbu onwe ya. Pọl maara na dị ka omenala ndị Rom si dị, a ga-ata onye na-elekọta ụlọ nga ahụhụ kpụ ọkụ n’ọnụ ma ọ bụrụ na onye mkpọrọ agbapụ—karịsịa ma ọ bụrụ na e nyewo ya ntụziaka ka o chegidesie ya ike. (Ọrụ 16:24-28) Obiọma a Pọl gosipụtara bụ́ nke zọpụtara ndụ masịrị onye nlekọta ụlọ nga ahụ, ya na ezinụlọ ya mekwara ihe iji ghọọ Ndị Kraịst.—Ọrụ 16:30-34.

Otú E Si Azụlite Mmetụta Ọmịiko

Akwụkwọ Nsọ gbara anyị ume ugboro ugboro iṅomi Nna anyị nke eluigwe na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, n’ihi ya, mmetụta ọmịiko bụ àgwà dị mkpa ka anyị zụlite. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Ọ dị ụzọ atọ bụ́ isi anyị pụrụ isi na-aghọtakwu mkpa na mmetụta nke ndị ọzọ: site n’ige ntị, site n’ileru anya, na site n’iji anya nke uche na-ahụ ihe.

Na-ege ntị. Site n’ige ntị nke ọma, anyị na-amata nsogbu ndị ọzọ na-enwe. Ka anyị na-ege ntị nke ọma karị, otú ahụ ka ọ ga-aka eyi ka ha ga-ewepụta obi ha ikpughere anyị mmetụta ha. “Apụrụ m ịgwa onye okenye okwu ma ọ bụrụ na obi siri m ike na ọ ga-ege m ntị,” ka Miriam na-akọwa. “Achọrọ m ịma na ọ na-aghọta nsogbu m n’ezie. Ana m enwekwu obi ike n’ebe ọ nọ mgbe ọ na-ajụ m ajụjụ njụta echiche ndị na-egosi na o gere ntị nke ọma n’ihe m gwara ya.”

Na-eleru anya. Ọ bụghị mmadụ nile ga-agwa anyị, n’ezoghị ọnụ, mmetụta ha na-enwe ma ọ bụ ihe ha na ya na-alụ. Otú ọ dị, onye na-eleru anya nke ọma ga-achọpụta mgbe Onye Kraịst ibe ya yiri onye dara mbà n’obi, mgbe onye dị afọ iri na ụma ghọrọ onye na-anọrọ onwe ya, ma ọ bụ mgbe onye ozi na-adịghịzi anụ ọkụ n’obi. Ikike a nke ịchọpụta nsogbu mgbe ọ ka na-amalite amalite dị oké mkpa nye ndị nne na nna. “N’ụzọ ụfọdụ, mama m na-ama mmetụta m na-enwe tupu m kọọrọ ya,” ka Marie na-ekwu, “ya mere ọ na-adịrị m mfe ịkọrọ ya nsogbu m n’ezoghị ọnụ.”

Na-eji anya nke uche gị na-ahụ ihe. Ụzọ kasị ike isi kpalie mmetụta ọmịiko bụ ịjụ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na m nọ n’ọnọdụ a, olee otú ọ ga-adị m? Olee otú m ga-esi emeghachi omume? Gịnị ga-adị m mkpa?’ Ndị nkasi obi ụgha atọ nke Job enweghị ike itinye onwe ha n’ọnọdụ ya. N’ihi ya, ha katọrọ ya n’ihi mmehie ha weere ya na ọ ghaghị imewo.

Mgbe mgbe, ọ na-aka adịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ịkatọ mmejọ karịa ịghọta mmetụta. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike iji anya nke uche hụ ahụhụ onye nọ ná nsogbu na-ata, ọ ga-enyere anyị aka imetara ya ebere kama ịkatọ ya. “Ana m enye ndụmọdụ ka nnọọ mma mgbe m gere ntị nke ọma ma gbalịa ịghọta ọnọdụ ahụ dum tupu mụ amalite ịtụ aro,” ka Juan, bụ́ onye okenye nwere ahụmahụ na-ekwu.

Mbipụta dị iche iche Ndịàmà Jehova na-ekesa enyeworo ọtụtụ ndị aka n’akụkụ a. Magazin Ụlọ Nche na Teta! atụlewo nsogbu ndị dị mgbagwoju anya dị ka ịda mbà n’obi na mmetọ ụmụaka. Ihe ọmụma a na-abịa n’ezi oge na-enyere ndị na-agụ ya aka ịbụ ndị mmetụta nke ndị na-ata ahụhụ n’ụzọ ndị dị otú ahụ na-emetụkwu n’ahụ́. N’otu aka ahụ, akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè enyeworo ọtụtụ ndị nne na nna aka ịghọta nsogbu nke ụmụ ha.

Mmetụta Ọmịiko Na-enye Aka n’Ọrụ Ndị Kraịst

Ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime anyị pụrụ ileghara ọnọdụ nke nwatakịrị agụụ na-agụgbu anya ma ọ bụrụ na anyị nwere ihe oriri anyị ga-enye ya. Ọ bụrụ na anyị nwere mmetụta ọmịiko, anyị ga-aghọtakwa ọnọdụ ime mmụọ nke mmadụ. Bible na-akọ banyere Jizọs, sị: “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ ahụ, o nwere ọmịiko n’ahụ́ ha, n’ihi na a gbara ha akpụkpọ, chụsasịakwa ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Ọtụtụ nde mmadụ taa nọ n’ọnọdụ ime mmụọ yiri nke ahụ, enyemaka dịkwa ha mkpa.

Dị ka ọ dị n’oge Jizọs, ọ pụrụ ịbụ na anyị aghaghị imeri ajọ mbunobi ma ọ bụ ọdịnala gbanyere mkpọrọgwụ n’obi iji ruo n’obi ndị ụfọdụ. Onye ozi nwere mmetụta ọmịiko na-agbalịsi ike ịchọpụta ihe ya na onye ọzọ kwekọrịtara na ya ma ọ bụ ikwu banyere isiokwu ndị mmadụ bu n’obi iji mekwuo ka ozi ya bụrụ nke na-adọrọ mmasị. (Ọrụ 17:22, 23; 1 Ndị Kọrint 9:20-23) Obiọma nke mmetụta ọmịiko kpaliri pụkwara ime ka ndị na-ege anyị ntị na-anabatakwu ozi Alaeze ahụ, dị ka o si dị n’ebe onye Filipaị ahụ na-elekọta ụlọ nga nọ.

Mmetụta ọmịiko bara uru nke ukwuu n’inyere anyị aka ileghara mmejọ nke ndị ọzọ nọ n’ime ọgbakọ anya. Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ịghọta mmetụta nke nwanna nke mejọworo anyị, obi abụọ adịghị ya na ọ ga-adịrị anyị mfe karị ịgbaghara ya. Ikekwe anyị gaara emeghachiwo omume n’otu ụzọ ahụ ma a sị na anyị nọ n’ọnọdụ ya ma bụrụ ndị a zụlitere otú e si zụlite ya. Mmetụta ọmịiko Jehova na-akpali ya ‘icheta na ájá ka anyị bụ,’ ya mere, ọ̀ bụ na mmetụta ọmịiko anyị ekwesịghị ịkwali anyị inye ohere maka ezughị okè nke ndị ọzọ na ‘ịgbaghara ha kpam kpam’?—Abụ Ọma 103:14; Ndị Kọlọsi 3:13.

Ọ bụrụ na anyị ga-enyerịrị ndụmọdụ, ikekwe anyị ga-ejikwu obiọma enye ya ma ọ bụrụ na anyị aghọta mmetụta na echiche nke onye ahụ gahierenụ. Onye Kraịst bụ́ onye okenye nke nwere mmetụta ọmịiko na-echetara onwe ya, sị: ‘Mụ onwe m pụrụ imehie ihe otú a. Apụrụ m ịnọ n’ọnọdụ a.’ N’ihi ya, Pọl na-atụ aro, sị: “Gbalịanụ ịgbazigharị onye dị otú ahụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-elekwasị onwe ya anya, a dịghị ama ama a nwaakwa gị.”—Ndị Galeshia 6:1.

Mmetụta ọmịiko pụkwara ịkpali anyị inye aka n’ụzọ dị irè ma ọ bụrụ na anyị ga-emeli ya, n’agbanyeghị na Onye Kraịst ibe anyị pụrụ ịla azụ ịrịọ maka ya. Jọn onyeozi dere, sị: “Onye ọ bụla nwere ihe ụwa a ndị e ji akwado ndụ ma hụ nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa ma mechibidokwa ya ọnụ ụzọ nke obi ọmịiko ya, n’ụzọ dị aṅaa ka ịhụnanya maka Chineke si adịgide n’ime ya? . . . Ka anyị na-ahụ n’anya, ọ bụghị n’okwu ma ọ bụ site n’ire, kama n’omume na n’eziokwu.”—1 Jọn 3:17, 18.

Iji na-ahụ n’anya “n’omume na n’eziokwu,” ọ dị anyị mkpa ibu ụzọ hụ kpọmkwem mkpa nwanna anyị nwere. Ànyị na-eji nlezianya achọpụta mkpa nke ndị ọzọ, na-eburu n’uche inyere ha aka? Nke ahụ bụ ihe mmetụta ọmịiko pụtara.

Zụlite Mmetụta Maka Onye Ọzọ

Ọ pụrụ ịbụ na anyị ebughị mmetụta ọmịiko pụta ụwa, ma anyị pụrụ ịzụlite mmetụta maka ndị ọzọ. Ọ bụrụ na anyị na-ege ntị nke ọma karị, na-elerukwu anya nke ọma, ma na-etinyekwu onwe anyị n’ọnọdụ nke onye ọzọ mgbe nile, mmetụta ọmịiko anyị ga-amụba. N’ihi ya, anyị ga-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a kpaliri igosikwu ụmụ anyị, Ndị Kraịst ndị ọzọ, na ndị agbata obi anyị ịhụnanya, obiọma, na ọmịiko.

Ekwela mgbe ọ bụla ka ịchọ ọdịmma onwe onye nanị mee ka mmetụta ọmịiko gị belata. “Ọ dịghị onye n’ime unu kwesịrị iche nanị banyere ihe nke aka ya,” ka Pọl dere, “kama ka unu na-echebakwara ọdịmma nke ndị ọzọ echiche.” (Ndị Filipaị 2:4, Phillips) Ọdịnihu ebighị ebi anyị na-adabere ná mmetụta ọmịiko nke Jehova na nke Nnukwu Onye Nchụàjà ya, bụ́ Jizọs Kraịst. N’ihi ya, iwu ji anyị n’ụzọ omume ịzụlite àgwà a. Mmetụta ọmịiko anyị ga-enye anyị ike ịghọ ndị ozi ka mma na ndị nne na nna ka mma. Karịsịa, mmetụta ọmịiko ga-enyere anyị aka ịchọpụta na “a na-enwe obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mmetụta ọmịiko na-agụnye iji nlezianya na-achọpụta mkpa nke ndị ọzọ, na-eburu n’uche inyere ha aka

[Foto dị na peeji nke 26]

Ànyị pụrụ ịmụta igosi mmetụta ọmịiko ebumpụta ụwa nke nne na-ahụ n’anya na-enwe n’ebe nwa ya nọ?