Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Pastọ Abụọ Ndị Ji Ihe Odide Russell Kpọrọ Ihe

Ndị Pastọ Abụọ Ndị Ji Ihe Odide Russell Kpọrọ Ihe

Ndị Pastọ Abụọ Ndị Ji Ihe Odide Russell Kpọrọ Ihe

NA 1891, Charles Taze Russell, bụ́ onye rụrụ ọrụ dị ịrịba ama n’etiti ezi Ndị Kraịst na-efe Jehova ofufe, letara Europe ná nke mbụ ya. Dị ka akụkọ ụfọdụ si gosi, mgbe Russell kwụsịtụrụ na Pinerolo, Ịtali, o zutere Prọfesọ Daniele Rivoire, onye bụ́bu pastọ nke okpukpe a na-akpọ ndị òtù Waldo. * Ọ bụ ezie na Rivoire na ndị òtù Waldo ka na-emekọrịta ihe n’ụzọ chiri anya ka ọ hapụsịrị okpukpe ahụ, ọ nọgidere nwee uche ghere oghe, ma gụọ ọtụtụ akwụkwọ C. T. Russell dere.

Na 1903, Rivoire sụgharịrị akwụkwọ Russell bụ́ The Divine Plan of the Ages gaa n’asụsụ Italian ma kwụọ ụgwọ maka mbipụta ya. Nke a bụrịị tupu Russell ebipụta ya n’asụsụ Italian. N’okwu mmalite nke akwụkwọ ahụ, Rivoire dere, sị: “Anyị na-edebe mbipụta mbụ a nke asụsụ Italian n’aka Onyenwe anyị. N’agbanyeghị na o zughị okè, ka ọ gọzie ya ka o nwee ike inye aka n’ito aha ya kasị dịrị nsọ ma gbaa ụmụ ya na-asụ Italian ume ịrarakwu onwe ha nye ya. Ka obi nke ndị ga-aghọta ịdị omimi nke akụ̀, amamihe, na ihe ọmụma nke atụmatụ na ịhụnanya Chineke, site n’ịgụ akwụkwọ a, nwee ekele n’ebe Chineke n’onwe ya nọ, bụ́ onye amara ya meworo ka o kwe omume ibipụta akwụkwọ a.”

Rivoire malitekwara ịsụgharị Zion’s Watchtower and Herald of Christ’s Presence gaa n’asụsụ Italian. Magazin a, bụ́ ụdị mbụ nke Ụlọ Nche, pụtara na 1903 dị ka mbipụta a na-enweta ugboro atọ n’afọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe Prọfesọ Rivoire ghọrọ Onye Mmụta Bible, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova mgbe ahụ, o gosiri mmasị dị ukwuu n’ịgbasa ozi Bible dị ka e si kọwaa ya ná mbipụta nke Ndị Mmụta Bible.

“O Yiri Ka A Ga-asị na Akpịrịkpa Si n’Anya M Dapụtasịa”

Onye pastọ ọzọ nke ndị òtù Waldo nke ji akwụkwọ Russell kpọrọ ihe bụ Giuseppe Banchetti. Nna Giuseppe, bụ́ onye e si n’okpukpe Katọlik tọghata, nyere ya ọzụzụ n’usoro agụmakwụkwọ ndị òtù Waldo. Na 1894, Giuseppe ghọrọ pastọ ma jeere ógbè dị iche iche nke ndị òtù Waldo ozi n’Apulia na Abruzzi nakwa n’àgwàetiti nke Elba na Sicily.

E bipụtara mbipụta nke asụsụ Italian nke akwụkwọ Russell bụ́ Divine Plan of the Ages na 1905 bụ́ nke e nyere ikike ka e bipụta. Banchetti ji obi ụtọ dee nkọwa nke akwụkwọ ahụ. Ọ pụtara n’akwụkwọ ndị Protestant a na-ebipụta site n’oge ruo n’oge bụ́ La Rivista Cristiana. “Nye anyị,” ka Banchetti dere, akwụkwọ Russell “bụ ihe nduzi kasị doo anya na nke a pụrụ ịdabere na ya karịsịa, bụ́ nke Onye Kraịst ọ bụla pụrụ ịchọta iji mụọ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ bara uru na n’ụzọ na-akwụghachi ụgwọ . . . Ozugbo m gụrụ ya, o yiri ka a ga-asị na akpịrịkpa si n’anya m dapụtasịa, na ụzọ isi gakwuru Chineke kwụ ọtọ ma dị mfe karị. Ọbụna ihe ndị yiri ka ha na-emegiderịta onwe ha bịara doo anya. Nkwenkwe ndị siburu ike nghọta bịara yie ndị dị mfe ma bụrụ ndị m pụrụ nnọọ ịnakwere. Ihe ndị siburu ike nghọta bịara doo anya. Ọmarịcha atụmatụ e mere ịzọpụta ụwa site n’aka Kraịst bịara nnọọ dị mfe n’anya m n’ụzọ dị ịtụnanya nke na ọ kpaliri m isoro Onyeozi ahụ kwuo sị: Lee ịdị omimi nke akụ̀ nke ma amamihe ma ihe ọmụma nke Chineke!”—Ndị Rom 11:33.

Dị ka Remigio Cuminetti kwuru na 1925, Banchetti “kweere nnọọ” n’akwụkwọ Ndị Mmụta Bible ma “kwenyesie ike” n’ozizi dị iche iche dị ka ha si kọwaa ha. Banchetti chọkwara isi n’ụzọ nke ya mee ka a mara ozizi ndị ahụ.

Site n’ihe odide ya, ihe àmà na-egosi na, dị ka Ndịàmà Jehova kweere, Banchetti kweere ná mbilite n’ọnwụ ịnọ n’elu ala, dị ka a kụziri n’Akwụkwọ Nsọ. O kwekwaara ihe Ndị Mmụta Bible kweere mgbe ọ kọwara na, n’amụma Daniel banyere izu 70 ahụ, Chineke setịpụrụ ma kpughee afọ ahụ Jizọs nwụrụ. (Daniel 9:24-27) Ihe karịrị otu ugboro, nakwa n’ịjụ ozizi nke chọọchị ya n’ezoghị ọnụ, o kweere na e kwesịrị ịdị na-eme Ememe Ncheta ọnwụ Jizọs Kraịst nanị otu ugboro kwa afọ, “kpọmkwem n’ụbọchị ememe mgbaafọ ahụ dabara.” (Luk 22:19, 20) Ọ jụrụ ozizi Darwin nke evolushọn, o kwukwara na ezi Ndị Kraịst ekwesịghị ikere òkè n’agha nkịtị.—Aịsaịa 2:4.

N’otu oge, Banchetti so otu nwoke aha ya bụ J. Campbell Wall na-ekwurịta banyere ihe odide Russell. N’ịzaghachi nkatọ Wall, Banchetti sịrị: “Eji m n’aka na ọ bụrụ na ị gụọ mpịakọta isii nke Russell, ị ga-enwe ọṅụ dị ukwuu na nke miri emi, ị ga-ejikwa obi gị kelee m. Adịghị m akwalite nkwenkwe n’ụzọ aghụghọ; ma agụrụ m akwụkwọ ndị ahụ afọ iri na otu gara aga, ana m ekelekwa Chineke kwa ụbọchị maka igosi m ìhè na ngụgụ obi dị otú ahụ site n’akwụkwọ dabeere kpam kpam na n’ụzọ siri ike n’Akwụkwọ Nsọ.”

“Gee Ntị, Gee Ntị, Gee Ntị”

Ọ dị ịrịba ama na ndị pastọ abụọ a nke ndị òtù Waldo—Daniele Rivoire na Giuseppe Banchetti—kwupụtara ekele maka ụzọ Russell si kọwaa Bible. Banchetti dere, sị: “Ana m ekwu na ọ dịghị onye Evangelical ọ bụla n’ime anyị, ọbụnadị ndị pastọ anyị ma ọ bụ ndị prọfesọ nkà mmụta okpukpe anyị, maara ihe nile. Ee e, anyị nwere imerime ihe ndị ọzọ anyị ga-amụta. . . . [Anyị kwesịrị] . . . ịnọ gee ntị, n’echeweghị na anyị maara ihe nile, n’ajụghịkwa ihe e nyere anyị ka anyị nyochaa. Kama nke ahụ, gee ntị, gee ntị, gee ntị.”

Kwa afọ, ọtụtụ puku mmadụ na-ege ntị n’ozi Alaeze nke Ndịàmà Jehova na-ewetara ha n’ụlọ ha. Ndị nwere obi na-anabata ihe bụ́ ndị nọ n’ebe nile, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka eziokwu Bible, na-aza òkù Jizọs na-akpọ, sị: ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’—Mak 10:17-21; Mkpughe 22:17.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 2 A kpọrọ ya aha Pierre Vaudès, ma ọ bụ Peter Waldo, bụ́ onye ọchụnta ego nke narị afọ nke 12 bụ́ onye Lyons, France. A chụpụrụ Waldo na Chọọchị Katọlik n’ihi nkwenkwe ya. Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ndị òtù Waldo, lee isiokwu bụ́ “Ndị Òtù Waldo—Site n’Ịjụ Okwukwe Gaa n’Okpukpe Protestant” nke dị n’Ụlọ Nche nke March 15, 2002.

[Foto dị na peeji nke 28]

Prọfesọ Daniele Rivoire

[Foto dị na peeji nke 29]

Giuseppe Banchetti

[Ebe E Si Nweta Foto]

Banchetti: La Luce, April 14, 1926