Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Ga-alanahụ Ụbọchị Jehova?

Ònye Ga-alanahụ Ụbọchị Jehova?

Ònye Ga-alanahụ Ụbọchị Jehova?

“Ụbọchị ahụ na-abịa, ọ na-ere dị ka ite ọkụ ukwu.”—MALAKAỊ 4:1.

1. Olee otú Malakaị si kọwaa ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a?

CHINEKE kpaliri Malakaị onye amụma idekọ amụma banyere ihe omume ndị na-emenye ụjọ bụ́ ndị ga-eme n’ọdịnihu dị ezi nso. Ihe omume ndị a ga-emetụta onye ọ bụla nọ n’ụwa. Malakaị 4:1 na-ebu amụma, sị: “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa, ọ na-ere dị ka ite ọkụ ukwu; ndị nganga nile na onye ọ bụla nke na-eme ihe mmebi iwu ga-abụkwa ahịhịa ọka: ụbọchị ahụ nke na-abịa ga-erechapụ ha, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ọ gaghị ahapụkwara ha mkpọrọgwụ ma ọ bụ alaka.” Ruo ókè ha aṅaa ka mbibi nke ajọ usoro ihe a ga-ezu ezu? Ọ ga-adị ka osisi e bibiri mkpọrọgwụ ya ka ọ ghara ito ọzọ ma ọlị.

2. Olee otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ụfọdụ si kọwaa ụbọchị Jehova?

2 Ị pụrụ ịjụ sị, ‘Olee “Ụbọchị” Malakaị onye amụma na-ebu amụma banyere ya?’ Ọ bụ otu ụbọchị ahụ e kwuru okwu ya n’Aịsaịa 13:9, bụ́ nke na-asị: “Lee, ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị na-enweghị obi ebere, na-abịa, ya na nrubiga ókè nke iwe na iwe dị ọkụ; ime ka ala nke a ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu na ikpochapụ ndị mmehie n’ime ya.” Zefanaịa 1:15 na-enye nkọwa a: “Ụbọchị nrubiga ókè nke iwe ka ụbọchị ahụ bụ, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị.”

“Oké Mkpagbu Ahụ”

3. Gịnị bụ “ụbọchị Jehova”?

3 Ná mmezu bụ́ isi nke amụma Malakaị, “ụbọchị Jehova” bụ oge e ji “oké mkpagbu” mara. Jizọs buru amụma, sị: “Mgbe ahụ ka a ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwebeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghịkwa enwe ya ọzọ.” (Matiu 24:21) Cheedị echiche banyere nsogbu bịakwasịwororị ụwa, karịsịa kemgbe 1914. (Matiu 24:7-12) Leenụ, nanị Agha Ụwa nke Abụọ gburu ihe karịrị nde mmadụ 50! Ma, ‘oké mkpagbu ahụ’ ga-eweta ọdachi ndị ga-eme ka nsogbu ndị dị otú ahụ bụrụ ntakịrị ihe. Ihe omume ahụ, nke ya na ụbọchị Jehova bụ otu ihe, ga-abịa ná njedebe n’Amagedọn, na-eweta ụbọchị ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a ná njedebe.—2 Timoti 3:1-5, 13; Mkpughe 7:14; 16:14, 16.

4. Mgbe ụbọchị Jehova ga-abịa ná njedebe, gịnị ga-emeworị?

4 Ka ọ na-erule oge ụbọchị Jehova ahụ ga-agwụ, a ga-ekpochapụworị ụwa Setan na ndị na-akwado ya. Ihe mbụ a ga-ekpochapụ bụ okpukpe ụgha nile. Ọ gasịa, Jehova ga-eme ihe o kpere n’ikpe megide usoro akụ̀ na ụba na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Setan. (Mkpughe 17:12-14; 19:17, 18) Izikiel na-ebu amụma, sị: “Ọlaọcha ha ka ha ga-atụfu n’èzí nile, ọlaedo ha ga-aghọkwa ihe ịsọ nsọ; ọlaọcha ha na ọlaedo ha agaghị enwe ike ịnapụta ha n’ụbọchị nrubiga ókè nke iwe Jehova.” (Ezikiel 7:19) Banyere ụbọchị ahụ, Zefanaịa 1:14 na-asị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” N’ihi ihe Bible na-ekwu banyere ụbọchị Jehova, anyị kwesịrị ikpebisi ike ịdị na-eme ihe n’ụzọ kwekọrọ n’iwu na ụkpụrụ ezi omume nile nke Chineke.

5. Gịnị ka ndị na-atụ egwu aha Jehova na-enweta?

5 Mgbe e busịrị amụma banyere ihe ụbọchị Jehova ga-eme ụwa Setan, e dekọrọ na Malakaị 4:2 na Jehova kwuru, sị: “Unu ndị na-atụ egwu aha m ka anyanwụ nke ezi omume ga-awara, ọgwụgwọ dịkwa na nku ya; unu ga-apụkwa, wụlie elu dị ka ụmụ ehi nke ụlọ ebe a na-eme ka anụ maa abụba.” Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ “anyanwụ nke ezi omume” ahụ. Ọ bụ “Ìhè [ime mmụọ] nke ụwa.” (Jọn 8:12) Jizọs na-egbukepụ dị ka anyanwụ mgbe ọ na-eweta ọgwụgwọ, nke mbụ ọgwụgwọ ime mmụọ, nke anyị na-enweta taa, nakwa ọgwụgwọ anụ ahụ́ zuru ezu, nke ọ ga-eweta n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Dị ka Jehova na-ekwu, ndị a gwọrọ ‘ga-apụkwa, wụlie elu dị ka ụmụ ehi mara abụba,’ bụ́ ndị obi dị ụtọ nke ukwuu ịbụ ndị a tọhapụrụ n’agbụ.

6. Ememe mmeri dị aṅaa ka ndị ohu Jehova ga-eme?

6 Gịnị banyere ndị na-eleghara ihe ndị Jehova chọrọ anya? Malakaị 4:3 na-ekwu, sị: “Unu [ndị ohu Chineke] ga-azọdakwa ndị na-emebi iwu; n’ihi na ha ga-abụ ntụ n’okpuru ọbụ ụkwụ unu n’ụbọchị ahụ mgbe M ga-eme ihe, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị.” Ụmụ mmadụ na-efe Chineke ofufe agaghị ekere òkè n’ibibi ụwa Setan. Kama nke ahụ, n’ụzọ ihe atụ, ha ‘ga-azọda ndị na-emebi iwu’ site n’ikere òkè n’ememe mmeri nke ga-esochi ụbọchị Jehova. E mere oké ememe mgbe e bibisịrị ndị agha Fero n’Oké Osimiri Uhie. (Ọpụpụ 15:1-21) N’otu aka ahụkwa, a ga-enwe oké ememe mmeri mgbe e bibisịrị Setan na ụwa ya n’oké mkpagbu ahụ. Ndị kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ga-alanahụ ụbọchị Jehova ga-eti mkpu, sị: “Ka anyị tegharịa egwú ọṅụ ṅụrịakwa ná nzọpụta Ya.” (Aịsaịa 25:9) Lee ọṅụ a ga-enwe mgbe e gosipụtara oruru o ruuru Jehova ịbụ ọkaaka, meekwa ka ụwa dị ọcha maka ibi n’ime ya n’udo!

Krisendọm Na-eṅomi Izrel

7, 8. Kọwaa ọnọdụ ime mmụọ nke Izrel n’oge Malakaị.

7 Ndị na-enweta ihu ọma Jehova bụ ndị na-ejere ya ozi, ebe ndị na-adịghị eme otú ahụ na-adịghị enweta ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe Malakaị dere akwụkwọ ya. Na 537 T.O.A., e weghachiri ihe fọdụrụ ná ndị Izrel mgbe afọ 70 nke ndọrọ n’agha laa Babilọn gasịrị. Otú ọ dị, n’ime ihe karịrị otu narị afọ sochiri ya, mba ahụ e weghachiri eweghachi malitere isi n’ezi ofufe dapụ na ime ajọ omume. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ahụ adịghị asọpụrụ aha Jehova; na-eleghara iwu ezi omume ya anya; na-emetọ ụlọ nsọ ya site n’iweta anụ ndị kpuru ìsì, ndị dara ngwụrọ, na ndị na-arịa ọrịa maka iji chụọ àjà; ma na-agba ndị nwunye ha lụrụ n’okorobịa alụkwaghịm.

8 N’ihi ya, Jehova gwara ha, sị: “M ga-abịakwute unu nso ikpe ikpe; M ga-abụkwa onye àmà dị ngwa megide ndị mgbaasị, na imegide ndị na-akwa iko, na imegide ndị na-aṅụ iyi ụgha, na imegide ndị na-emegbu onye e goro ọrụ n’ụgwọ ọrụ ya na nwanyị di ya nwụrụ na nwa mgbei, ndị na-ewezụgakwa ọbịa n’ihe ya, ndị na-adịghị atụ egwu m, . . . n’ihi na Mụ onwe m, bụ́ Jehova, agbanweghị.” (Malakaị 3:5, 6) Ma, Jehova kpọrọ ndị ọ bụla ga-ahapụ ụzọ ọjọọ ha òkù, sị: “Laghachikwutenụ m, Mụ onwe m ga-alaghachikwutekwa unu.”—Malakaị 3:7.

9. Olee otú amụma ndị Malakaị buru si nwee mmezu mbụ ha?

9 Okwu ndị ahụ mezukwara na narị afọ mbụ O.A. Ndị Juu fọdụrụnụ jeere Jehova ozi ma ghọọ akụkụ nke “mba” ọhụrụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ nke mesịrị gụnye ndị Jentaịl. Ma ihe ka nnọọ n’ọnụ ọgụgụ ná ndị Izrel anụ ahụ́ jụrụ Jizọs. N’ihi ya, Jizọs gwara mba Izrel ahụ, sị: “Lee! A gbahapụworo unu ụlọ unu.” (Matiu 23:38; 1 Ndị Kọrint 16:22) Na 70 O.A., dị ka e buru n’amụma na Malakaị 4:1, “ụbọchị. . . na-ere dị ka ite ọkụ ukwu” bịakwasịrị Izrel anụ ahụ́. E bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya, a kọkwara na ihe karịrị otu nde mmadụ nwụrụ n’ihi ụnwụ nri, ịzọ ọchịchị, nakwa mwakpo nke ndị agha Rom. Otú ọ dị, ndị jeere Jehova ozi lanahụrụ mkpagbu ahụ.—Mak 13:14-20.

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị mmadụ n’ozuzu ha na ndị ụkọchukwu si eṅomi Izrel narị afọ mbụ?

10 Ihe a kpọrọ mmadụ, karịsịa, Krisendọm, eṅomiwo mba Izrel nke narị afọ mbụ. Ndị ndú na ndị mmadụ n’ozuzu ha n’ime Krisendọm na-ahọrọ ụkpụrụ okwukwe okpukpe nke ha kama ịhọrọ eziokwu Chineke ndị Jizọs kụziri. Ọ bụ ndị ụkọchukwu ka ụta dịịrị karịsịa. Ha jụrụ iji aha Jehova eme ihe, ọbụnadị wepụ ya ná nsụgharị dị iche iche nke Bible ha. Ha na-elelị Jehova site n’izi ozizi ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, dị ka ozizi ndị ọgọ mmụọ bụ́ mmekpa ahụ́ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ, Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, nakwa evolushọn. N’ụzọ dị otú a, ha adịghị enye Jehova otuto ruuru ya, dị ka ndị nchụàjà ahụ mere n’oge Malakaị.

11. Olee otú okpukpe dị iche iche nke ụwa si egosipụta onye ha na-ejere ozi n’ezie?

11 Na 1914, bụ́ mgbe ụbọchị ikpeazụ malitere, okpukpe dị iche iche nke ụwa a, bụ́ ndị ndị na-azọrọ na ha bụ Ndị Kraịst nọ n’isi ha, gosiri n’ezie onye ha jeere ozi. N’oge agha ụwa abụọ ndị ahụ, ha gbara ndị òtù ha ume ịga agha n’ihi esemokwu mba na mba, ọbụna ma a sị na ọ pụtara igbu ndị so n’okpukpe nke ha. Okwu Chineke na-eme ka a mata n’ụzọ doro anya ndị na-erubere Jehova isi na ndị na-adịghị erubere ya isi: “Ụmụ Chineke na ụmụ Ekwensu pụtara ìhè site n’eziokwu a: Onye ọ bụla nke na-adịghị anọgide na-eme ezi omume esiteghị na Chineke, otú ahụ ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya. N’ihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụworo site ná mmalite, na anyị kwesịrị inwe ịhụnanya maka ibe anyị; ọ bụghị dị ka Ken, onye sitere n’ajọ onye ahụ ma gbuo nwanne ya.”—1 Jọn 3:10-12.

Imezu Amụma

12, 13. Amụma ndị dị aṅaa ka ndị ohu Chineke mezuworo n’oge anyị?

12 Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke Agha Ụwa Mbụ na 1918, ndị ohu Jehova pụrụ ịhụ na Chineke amawo Krisendọm na okpukpe ụgha ndị ọzọ nile ikpe. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, a kpọrọ ndị nwere obi eziokwu òkù, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya kere òkè ná mmehie ya, nakwa ma ọ bụrụ na unu achọghị ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya. N’ihi na mmehie ya akpụkọtawo nnọọ ọnụ ruo eluigwe, Chineke echetawokwa ajọ omume ndị o mere.” (Mkpughe 18:4, 5) A malitere ime ka ndị chọrọ ijere Jehova ozi dị ọcha pụọ n’ihe nile metụtara okpukpe ụgha, ha malitekwara ikwusa, n’ụwa nile, ozi ọma nke Alaeze ahụ e guzobeworo eguzobe, bụ́ ọrụ a ga-arụzu tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a eruo.—Matiu 24:14.

13 Nke a bụ iji mezuo amụma dị na Malakaị 4:5, bụ́ ebe Jehova kwuru, sị: “Lee, Mụ onwe m na-ezitere unu Elaịja, bụ́ onye amụma, tupu oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.” Amụma ahụ nwere mmezu mbụ ya n’ọrụ Jọn Onye Na-eme Baptizim rụrụ, bụ́ onye Ịlaịja sere onyinyo ya. Jọn rụrụ ọrụ yiri nke Ịlaịja mgbe o mere ndị Juu chegharịrị ná mmehie ha mere megide ọgbụgba ndụ Iwu ahụ baptizim. Nke ka mkpa, Jọn bụ onye obu ụzọ nke Mezaịa ahụ. Otú ọ dị, ọrụ Jọn rụrụ bụ nanị mmezu mbụ nke amụma Malakaị. Mgbe Jizọs na-ekwu banyere Jọn dị ka Ịlaịja nke abụọ, o gosiri na a ga-arụ ọrụ “Ịlaịja” n’ọdịnihu.—Matiu 17:11, 12.

14. Ọrụ dị aṅaa dị oké mkpa ka a na-aghaghị ịrụ tupu usoro ihe a abịa ná njedebe?

14 Amụma Malakaị gosiri na a ga-arụ oké ọrụ Ịlaịja a tupu “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova abịa.” Ụbọchị ahụ ga-abịa ná njedebe n’agha ahụ ji ọsọ na-abịa nke oké ụbọchị nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, n’Amagedọn. Nke a pụtara na a ga-arụ ọrụ kwekọrọ n’ọrụ Ịlaịja tupu ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a nakwa tupu mmalite nke Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Alaeze eluigwe Chineke bụ́ nke Jizọs Kraịst e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze ga-achị. N’ikwekọ n’amụma ahụ, tupu Jehova ebibie ajọ usoro ihe a, ndị òtù Ịlaịja nke oge a, bụ́ ndị ọtụtụ nde Ndị Kraịst ibe ha bụ́ ndị nwere olileanya elu ala na-akwado, ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ iweghachi ofufe dị ọcha, ibuli aha Jehova elu, na izi ndị yiri atụrụ eziokwu Bible.

Jehova Na-agọzi Ndị Ya

15. Olee otú Jehova si echeta ndị ohu ya?

15 Jehova na-agọzi ndị na-ejere ya ozi. Malakaị 3:16 na-ekwu, sị: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha Ya, akwụkwọ ncheta n’ihu Ya.” Malite n’oge Ebel gaa n’ihu, Chineke anọwo na-edetu n’akwụkwọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, aha ndị a ga-echeta ná nzube nke inye ha ndụ ebighị ebi. Jehova na-agwa ndị a, sị: “Webatanụ otu ụzọ n’ụzọ iri nile n’ụlọ akụ̀ nke m, ka ihe oriri wee dị n’ụlọ m, biko, nwaanụ m na nke a . . . ma M gaghị emeghere unu windo nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.”—Malakaị 3:10.

16, 17. Olee otú Jehova siworo gọzie ndị ya nakwa ọrụ ha?

16 N’ezie Jehova agọziwo ndị na-ejere ya ozi. N’ụzọ dị aṅaa? Otu ụzọ bụ site n’ime ka ha ghọtakwuo nzube ya. (Ilu 4:18; Daniel 12:10) Ụzọ ọzọ bụ site n’ime ka ọrụ nkwusa ha na-amịpụta mkpụrụ n’ụzọ dị ịtụnanya. Ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi esonyeworo ha n’ezi ofufe, ndị a nile na-emejupụta “oké ìgwè mmadu . . . ndị si ná mba na ebo na ndị na asụsụ nile pụta, . . . ha wee nọgide na-eti mkpu n’oké olu, na-asị: ‘Nzọpụta anyị sitere n’aka Chineke anyị, bụ́ onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, sitekwa n’aka Nwa Atụrụ ahụ.’” (Mkpughe 7:9, 10) Oké ìgwè mmadụ a apụtawo ìhè n’ụzọ dị ebube, ndị na-arụsikwa ọrụ ike n’ijere Jehova ozi agafeela nde isii ugbu a n’ihe karịrị ọgbakọ 93,000 n’ụwa nile!

17 A na-ahụkwa ngọzi Jehova n’ụdị na Ndịàmà Jehova na-ebipụta akwụkwọ ndị dabeere na Bible ndị a kasị kesaa n’akụkọ ihe mere eme nile. Ugbu a, a na-ebipụta magazin Ụlọ Nche na Teta! dị nde 90 kwa ọnwa, Ụlọ Nche n’asụsụ 144, Teta! n’asụsụ 87. E kesara ihe gafere nde 107 nke akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi, nke e bipụtara na 1968, n’asụsụ 117. Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke e wepụtara na 1982, gafere nde 81 n’asụsụ 131. E bipụtaworị ihe karịrị nde 85 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke e wepụtara na 1995, n’asụsụ 154. Ka ọ dị ugbu a, e kesawo nde 150 nke broshuọ ahụ e bipụtara na 1996, bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, n’asụsụ 244.

18. Gịnị mere anyị ji na-enwe ọganihu ime mmụọ n’agbanyeghị mmegide?

18 E nwewo ọganihu ime mmụọ a n’agbanyeghị mmegide kasị kpụrụ ọkụ n’ọnụ na nke dịteworo aka sitere n’ụwa Setan. Nke a na-egosi ịbụ eziokwu nke Aịsaịa 54:17: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha na-esite na m: ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” Lee ihe na-akasi obi ọ bụụrụ ndị ohu Jehova ịmara na Malakaị 3:17 na-enwe mmezu ya bụ́ isi n’ahụ́ ha: “Ha ga-abụkwa nke m, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, n’ụbọchị ahụ mgbe Mụ onwe m ga na-eme ihe, bụ́ ihe nke aka m.”

Iji Ọṅụ Na-ejere Jehova Ozi

19. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-ejere Jehova ozi si dị iche ná ndị na-adịghị ejere ya ozi?

19 Ọdịiche dị n’etiti ndị ohu Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi na ndị nọ n’ụwa Setan na-apụtawanye ìhè ka oge na-agafe. Malakaị 3:18 buru amụma, sị: “Unu ga-alaghachikwa hụ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye na-emebi iwu, n’etiti onye na-efe Chineke na onye na-adịghị efe Ya.” Otu n’ime ọtụtụ ọdịiche ndị ahụ bụ na ndị na-ejere Jehova ozi ji ọṅụ dị ukwuu na-eme nke ahụ. Otu n’ime ihe ndị kpatara nke a bụ olileanya dị ebube ha nwere. Ha nwere obi ike zuru ezu n’ebe Jehova nọ mgbe ọ na-asị: “Lee, M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke Mụ onwe m na-eke.”—Aịsaịa 65:17, 18; Abụ Ọma 37:10, 11, 29; Mkpughe 21:4, 5.

20. N’ihi gịnị ka anyị ji bụrụ ndị nwere ọṅụ?

20 Anyị kweere na nkwa Jehova bụ́ na ndị ya na-eguzosi ike n’ihe ga-alanahụ oké ụbọchị ya ma banye n’ụwa ọhụrụ. (Zefanaịa 2:3; Mkpughe 7:13, 14) Ọ bụkwa ezie na ụfọdụ pụrụ ịnwụ tupu mgbe ahụ n’ihi ime agadi, ọrịa, ma ọ bụ ihe ọghọm, Jehova kwere nkwa na ya ga-akpọlite ha n’ọnwụ ná nzube nke ime ka ha dị ndụ ebighị ebi. (Jọn 5:28, 29; Taịtọs 1:2) Ya mere, ọ bụ ezie na anyị nile nwere nsogbu na ihe ịma aka dị iche iche, ka anyị na-eru nso ụbọchị Jehova, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji bụrụ ndị kasị enwe obi ụtọ n’ụwa.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Gịnị bụ “ụbọchị Jehova”?

• Olee otú okpukpe ndị dị n’ụwa si eṅomi Izrel oge ochie?

• Amụma ndị dị aṅaa ka ndị ohu Jehova na-emezu?

• Olee otú Jehova siworo gọzie ndị ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 21]

Jeruselem narị afọ mbụ ‘rere ọkụ dị ka ite ọkụ ukwu’

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Jehova na-enye ndị na-ejere ya ozi ihe na-akpa ha

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

N’ihi olileanya ha dị ebube, ndị ohu Jehova na-enwe ọṅụ n’ezie