Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịkụnye Ịhụnanya Maka Jehova n’Obi Ụmụ Anyị

Ịkụnye Ịhụnanya Maka Jehova n’Obi Ụmụ Anyị

Akụkọ Ndụ

Ịkụnye Ịhụnanya Maka Jehova n’Obi Ụmụ Anyị

DỊ KA WERNER MATZEN SI KỌỌ

Afọ ụfọdụ gara aga, diọkpara m, bụ́ Hans Werner, nyere m Bible. O dere n’ime mkpo ya, sị: “Ezigbo Nna M, Ka Okwu Jehova nọgide na-edu anyị dị ka ezinụlọ n’ụzọ nke ndụ. Eji m obi ekele na-edetara gị ya, abụ m diọkpara gị.” Ndị nne na nna ga-aghọta otú okwu ndị ahụ si mee ka obi m jupụta n’ekele na ọṅụ. N’oge ahụ, amabeghị m ụdị ihe ịma aka anyị ka gaje inwe dị ka ezinụlọ.

AMỤRỤ m na 1924 na Halstenbek, nke dị ihe dị ka kilomita 20 site n’ọdụ ụgbọ mmiri Germany dị na Hamburg, ọ bụkwa mama m na nna m ochie zụlitere m. N’ịbụ onye mụworo ọrụ ịkpụpụta ngwá ọrụ, na 1942, e debara aha m na Wehrmacht, bụ́ òtù ndị agha. Ahụmahụ m nwere n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ka m na-alụ agha n’ihu agha ndị Russia abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Adara m ọrịa ịba ahụ́ ọkụ, a kpọghachikwara m n’ihu agha mgbe a gwọsịrị m. Na January 1945, anọ m na Lodz, Poland, bụ́ ebe m nọ merụọ ahụ́ nke ukwuu ma nọrọ n’ụlọ ọgwụ ndị agha. Aka m nọ ebe ahụ mgbe agha ahụ biri. N’ụlọ ọgwụ ahụ nakwa, mgbe e mesịrị, n’ogige a na-edebe ndị e ji eji bụ́ nke dị na Neuengamme, enwere m oge ịtụgharị uche. Ajụjụ ndị a nyere m nsogbu n’obi, È nwere Chineke n’ezie? Ọ bụrụ na e nwere, n’ihi gịnị ka o ji kwere ka e nwee oké obi ọjọọ?

N’oge na-adịghị anya mgbe a tọhapụrụ m n’ogige ahụ a na-edebe ndị e ji eji, na September 1947, alụrụ m Karla. Anyị tokọrọ n’otu obodo, ma n’agbanyeghị na Karla bụ onye Katọlik, ọ dịghị okpukpe m na-ekpe. Onye ụkọchukwu jikọrọ anyị n’alụmdi na nwunye tụụrụ anyị aro na ma ọ dịghị ihe ọzọ, ka anyị na-ekpe Ekpere Onyenwe Anyị kwa anyasị. Anyị mere otú o kwuru, n’amaghị ihe anyị na-ekpe n’ezie.

Otu afọ mgbe e mesịrị, a mụrụ Hans Werner. N’ihe dị ka n’otu oge ahụ, Wilhelm Ahrens, bụ́ onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ, mere ka m mata Ndịàmà Jehova. O gosiri m site na Bible na agha ga-akwụsị otu ụbọchị. (Abụ Ọma 46:9) N’oge mgbụsị akwụkwọ nke 1950, araara m ndụ m nye Jehova, e meekwa m baptizim. Lee ọṅụ m nwere otu afọ mgbe e mesịrị bụ́ mgbe e mekwara nwunye m m hụrụ n’anya baptizim!

Ịzụlite Ụmụ n’Ụzọ nke Jehova

Agụtara m na Bible na ọ bụ Jehova malitere alụmdi na nwunye. (Jenesis 1:26-28; 2:22-24) Ịnọ ya mgbe a mụrụ ụmụ anyị—Hans Werner, Karl-Heinz, Michael, Gabriele, na Thomas—mere ka mkpebi m ịbụ ezigbo di na nna sikwuo ike. Mụ na Karla nwere obi ụtọ mgbe a mụrụ nke ọ bụla n’ime ụmụ anyị.

Mgbakọ Ndịàmà Jehova e nwere na Nuremberg na 1953 bụụrụ ezinụlọ anyị ihe omume dị nnọọ mkpa. N’ehihie Friday, mgbe a na-ekwu okwu bụ́ “Ịzụlite Ụmụ n’Òtù Ụwa Ọhụrụ Ahụ,” ọkà okwu kwuru ihe anyị na-echefubeghị: “Ihe nketa kasịnụ anyị pụrụ inye ụmụ anyị bụ ọchịchọ nke ịbụ ndị ohu Chineke.” Site n’enyemaka Jehova, mụ na Karla chọrọ ime nke ahụ kpọmkwem. Ma olee otú anyị ga-esi mee ya?

Iji malitegodị, anyị mere ka ọ bụrụ omume anyị ikpekọ ekpere ọnụ dị ka ezinụlọ kwa ụbọchị. Nke ahụ kụnyere n’ime ụmụ anyị mkpa ekpere dị. Nke ọ bụla n’ime ụmụ anyị mụtara mgbe ọ ka dị obere na anyị na-ekpe ekpere mgbe nile tupu anyị eriwe nri. Ọbụna mgbe ha ka bụ ụmụ ọhụrụ, ngwa ngwa ha hụrụ karama e ji enye ha nri, ha na-ehulata obere isi ha ma fụchie obere aka ha. N’otu oge, a kpọrọ anyị òkù ịga agbamakwụkwọ nke otu n’ime ndị ikwu nwunye m, bụ́ ndị na-abụghị Ndịàmà. Mgbe ememe ahụ gasịrị, ndị mụrụ nwanyị ahụ a lụrụ ọhụrụ kpọrọ ndị ọbịa ha ka ha bịa n’ebe obibi ha maka oriri ntụrụndụ. Onye ọ bụla chọrọ ịmalite riwe nri ozugbo. Ma nwa anyị dị afọ ise bụ́ Karl-Heinz echeghị na nke a kwesịrị ekwesị. “Biko burunụ ụzọ kpee ekpere,” ka o kwuru. Ndị ọbịa ahụ lere ya anya, bịa lee anyị, ma lezie onye ahụ kpọrọ anyị. Iji zere ime ka ihere mee ha, ewepụtara m onwe m ikpe ekpere maka ihe oriri ahụ, bụ́ nke onye ahụ kpọrọ anyị kwere ka m mee.

Ihe ahụ merenụ chetaara m okwu Jizọs bụ́: “Site n’ọnụ ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara ka i meworo ka otuto pụta.” (Matiu 21:16) Anyị ji n’aka na ekpere sitere n’obi anyị na-ekpe mgbe nile nyeere ụmụ anyị aka iwere Jehova dị ka Nna ha nke eluigwe na-ahụ n’anya.

Ibu Ọrụ Anyị n’Ebe Jehova Nọ

Ịkụziri ụmụaka ịhụ Chineke n’anya na-achọkwa ịgụchi na ịmụchi Okwu ya anya. N’iburu nke a n’uche, anyị na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ kwa izu, ọ na-akasị abụ n’uhuruchi Monday. Ebe ọ bụ na nwa mbụ anyị ji afọ itoolu tọọ nwa ikpeazụ anyị, mkpa ha dị nnọọ iche, n’ihi ya ọ bụghị mgbe nile ka anyị na-enwe ike ịmụrụ ha nile otu ihe.

Dị ka ihe atụ, maka ụmụaka ndị na-etorubeghị ịga ụlọ akwụkwọ elementrị, anyị na-amụrụ ha ihe n’ụzọ dị nnọọ mfe. Karla na-eso ha tụlee nanị otu akụkụ Bible, ma ọ bụ na-eji ihe osise ndị dị n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible akụziri ha ihe. Aka m ji obi ụtọ echeta ịbụ onye ụmụ anyị ndị nke obere na-akpọte n’ụra n’isi ụtụtụ ka ha na-arịgote n’ihe ndina anyị iji gosi anyị ihe osise kasị amasị ha n’akwụkwọ bụ́ The New World. *

Karla zụlitere nkà nke iji ndidi na-akụziri ụmụ anyị ọtụtụ ihe mere anyị nile ji kwesị ịhụ Jehova n’anya. Nke ahụ pụrụ ịda ka ihe dị mfe ma ghara ịdị na-egbu oge, ma n’ezie, n’ụzọ anụ ahụ́ na n’ụzọ mmetụta uche, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọrụ oge nile nye mụ na Karla. Ma, anyị adaghị mbà. Anyị chọrọ idenye ihe n’obi ha na-esibeghị ike tupu ndị ọzọ na-amaghị Jehova amalite inwe mmetụta n’ahụ́ ha. N’ihi nke a, anyị siri ọnwụ na ụmụ anyị ga na-anọ n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ozugbo ha malitere ịnọ ọdụ.

Dị ka nne na nna, mụ na Karla ghọtara mkpa ọ dị isetịpụrụ ụmụ anyị ihe nlereanya ziri ezi n’ihe banyere ofufe. Ma ànyị na-eri ihe, na-elekọta okooko osisi, ma ọ bụ na-eme mkpagharị, anyị na-agbalị ime ka mmekọrịta nwa nke ọ bụla na Jehova nwere sikwuo ike. (Deuterọnọmi 6:6, 7) Anyị jidere n’aka na nwa nke ọ bụla nwere Bible nke ya mgbe ọ ka dị obere. Ọzọkwa, ozugbo anyị nwetara magazin, ana m ede aha onye ọ bụla so n’ezinụlọ anyị na magazin nke ya. N’ụzọ dị otú ahụ, ụmụ anyị mụtara ịmata akwụkwọ nke ha. Anyị chepụtara ikenye ụmụ anyị isiokwu ụfọdụ na Teta! ka ha gụọ. Mgbe anyị risịrị nri ehihie na Sunday, ha na-akọwara anyị otú ha si ghọta isiokwu ahụ.

Inye Ụmụ Anyị Nlebara Anya Dị Ha Mkpa

N’ezie, ihe agazichaghị mgbe nile. Ka ụmụ anyị tolitere, anyị chọpụtara na ịkụnye ịhụnanya n’ime obi ha chọrọ na anyị ga-ama ihe dị adị n’obi ha. Nke ahụ pụtara ige ha ntị. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ụmụ anyị ka ha nwere ihe ha ga-eme mkpesa banyere ya, n’ihi ya, mụ na Karla na-anọdụ ala ma soro ha kwurịta ya. Anyị bịara wepụta ọkara awa pụrụ iche ná ngwụsị nke ọmụmụ ihe ezinụlọ. Onye ọ bụla nweere onwe ya ikwu ihe ọ bụla o chere n’ezoghị ọnụ.

Dị ka ihe atụ, ọ dị Thomas na Gabriele, bụ́ ndị nke a tọchara n’ime ụmụ anyị ka, dị ka ndị mụrụ ụmụ, anyị na-emelara nwanne ha nwoke nke tọchara ha ihe. N’otu oge, ha welitere okwu ahụ ma sị: “Papa, anyị chere na gị na mama anyị na-enye Hans Werner ohere ime ihe masịrị ya mgbe nile.” Na mbụ, o siiri m ike ikwere ihe m nụrụ. Otú ọ dị, mgbe anyị jisịrị obi ọcha tụlee okwu ahụ, mụ na Karla bịara kweta na ụmụaka ahụ ji okwu. N’ihi ya, anyị tinyekwuru mgbalị n’imeso ụmụ anyị dum ihe n’otu ụzọ.

Mgbe ụfọdụ, ana m enye ụmụ anyị ntaramahụhụ ọkụ ọkụ ma ọ bụ n’ụzọ na-ezighị ezi. N’oge ndị dị otú ahụ, anyị bụ́ nne na nna aghaghị ịmụta ịrịọ mgbaghara. Mgbe nke ahụ gasịrị, anyị na-agakwuru Jehova n’ekpere. Ọ dị mkpa ka ụmụ anyị ghọta na nna ha dị njikere ịsị ha ma sịkwa Jehova biko gbaghara m. N’ihi ya, anyị na ha nwere mmekọrịta na-ekpo ọkụ na nke enyi na enyi. Ha na-agwakarị anyị, sị, “Unu bụ ezi ndị enyi anyị.” Nke ahụ na-eme ka anyị nwee nnọọ obi ụtọ.

Ịrụkọ ọrụ ọnụ dị ka ezinụlọ na-akwalite ịdị n’otu. Iji mezuo nke a, onye ọ bụla nwere ọrụ ọ na-arụ mgbe nile. E kenyere Hans Werner ịdị na-aga n’ụlọ ahịa azụta ihe otu ugboro n’izu, nke pụtara, dị ka o kwesịrị ịdị, na a na-enye ya ego na ndepụta nke ihe ndị ọ ga-azụ. Otu izu, anyị enyeghị ya ndepụta nke ihe ndị ọ ga-azụ ma ọ bụ ego ọ bụla. Ya ajụọ mama ya banyere ya, mama ya agwakwa ya na anyị enwebeghị ego ọ bụla. Ụmụ anyị malitere ịgbarịta izu n’etiti onwe ha, mgbe ahụ, ha nile butere igbe ego ha ma wụpụta ihe nile dị na ha n’elu tebụl. “Mama, anyị pụrụ ịga zụọ ihe ugbu a!” ka ha nile kwuru. Ee, ụmụ anyị mụtara ịgbata ọsọ enyemaka mgbe e nwere ọnọdụ mberede, nke ahụ jikọtakwara ezinụlọ anyị ọnụ ọbụna karị.

Ka ha na-eto, ndị nke nwoke malitere inwe mmasị n’ebe ụmụ agbọghọ nọ. Dị ka ihe atụ, Thomas bịara nwee nnọọ mmasị n’ebe Onyeàmà ibe ya dị afọ 16 nọ. Akọwaara m ya na ọ bụrụ na o nwere nnọọ mmasị n’ebe nwa agbọghọ ahụ nọ, ọ ghaghị ịdị njikere ịlụ ya na ibu ibu nke ilekọta nwunye na ụmụaka. Thomas ghọtara na ọ dịghị njikere ịlụ nwanyị, ebe ọ bụ na ọ dị nanị afọ 18.

Inwe Ọganihu Dị Ka Ezinụlọ

Mgbe ha ka dị obere, nke ọ bụla n’ime ụmụ anyị debara aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Anyị na-ege ntị nke ọma n’ihe omume ha, anyị na-abụkwa ndị a gbara ume n’ihi na anyị na-ahụ ịhụnanya sitere n’obi ụmụ anyị nwere n’ebe Chineke nọ. Ndị nlekọta sekit na distrikti bụ́ ndị na-anọnyere anyị site n’oge ruo n’oge na-akọrọ anyị ahụmahụ ndị ha nwere ná ndụ ma ọ bụ na-agụrụ anyị ndị dị na Bible. Ndị ikom a na ndị nwunye ha nyere aka ime ka ezinụlọ anyị zụlite ịhụnanya maka ozi oge nile.

Anyị na-adị atụ anya mgbakọ dị iche iche. Ha bụ ihe ndị bụ́ isi nyeere anyị aka ná mgbalị ndị anyị mere ịkụbanye ọchịchọ nke ịbụ ndị ohu Chineke n’ime ụmụ anyị. Ọ na-abụrụ ụmụ anyị oge pụrụ iche mgbe ha tinyere baajị n’uwe ha tupu na-aga n’ala mgbakọ. Obi tọrọ anyị ụtọ nke ukwuu mgbe e mere Hans Werner baptizim mgbe ọ dị afọ iri. Ọtụtụ mmadụ weere ya na o torubeghị ịrara onwe ya nye Jehova, ma mgbe ọ dị afọ 50, ọ gwara m ekele ọ na-enwe maka ịbụ onye nọworo na-ejere Jehova ozi ruo afọ 40.

Anyị gosiri ụmụ anyị na ọ dị mkpa ka ha onwe ha soro Jehova na-enwe mmekọrịta, ma anyị amanyeghị ha ime nraranye. Ma, obi tọrọ anyị ụtọ mgbe ndị nke ọzọ nwekwara ọganihu ruo n’ịbụ ndị e mere baptizim mgbe ha dị njikere.

Ịmụta Ịtụkwasị Jehova Ibu Anyị

Anyị nwere oké ọṅụ mgbe, na 1971, Hans Werner gụsịrị akwụkwọ dị ka onye so na klas nke 51 nke Watchtower Bible School of Gilead, e zigakwa ya ije ozi dị ka onye ozi ala ọzọ na Spen. N’otu n’otu, ụmụ anyị ndị nke ọzọ jikwa oge ụfọdụ jee ozi dị ka ndị ozi oge nile, bụ́ nke mere ka anyị bụ́ ndị nne na nna nwee nnọọ obi ụtọ. N’ihe dị ka n’oge a, Hans Werner nyere m Bible ahụ m kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a. Obi ụtọ anyị nwere dị ka ezinụlọ yiri ihe zuru ezu.

E mesịa, anyị chọpụtara na ọ dị anyị mkpa ịrapagidesikwu ike n’ebe Jehova nọ. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị hụrụ ụfọdụ n’ime ụmụ anyị toworo eto ka ha nwetara nsogbu ndị lere okwukwe ha ule n’ụzọ siri ike. Dị ka ihe atụ, nwa anyị nwanyị anyị hụrụ n’anya bụ́ Gabriele nwetara mkpagbu. Na 1976, ọ lụrụ Lothar. Di ya dara ọrịa n’oge na-adịghị anya mgbe ha gbasịrị akwụkwọ. Ka ume nọgidere na-agwụ ya, Gabriele lekọtara ya ruo mgbe ọ nwụrụ. Ịhụ onye òtù ezinụlọ anyị ahụ́ dị mma ka ọ dara ọrịa, nwụọkwa chetaara anyị otú enyemaka ịhụnanya Jehova dịruru anyị mkpa.—Aịsaịa 33:2.

Ihe Ùgwù Dị Iche Iche ná Nzukọ Jehova

Mgbe a họpụtara m dị ka ohu ọgbakọ (nke a na-akpọzi onyeisi oche ndị nlekọta) na 1955, ọ dịghị m ka m ruru eru maka ibu ọrụ ahụ. Enwere m ọtụtụ ihe ime, nanị ụzọ m pụkwara isi na-arụzu ọrụ m bụ site n’ịdị na-ebili n’elekere anya anọ n’ụtụtụ ụfọdụ. Nwunye m na ụmụ m nyere m nkwado hiri nne, na-ejide n’aka na ha adịghị enye m nsogbu n’uhuruchi mgbe ọ bụla a ka nwere ihe ndị a ga-arụ.

Otú o sina dị, dị ka ezinụlọ, anyị nọkọrọ ọnụ maka ntụrụndụ ruo ókè o kwere mee. Mgbe ụfọdụ, onye were m n’ọrụ na-ekwe ka m buru ụgbọala ya ka m wee nwee ike iburu ezinụlọ m gaa mkpapụ. Ụmụ anyị na-enwe aṅụrị n’oge ndị anyị nọ n’ime ọhịa mụọ Ụlọ Nche. Anyị na-emekọkwa mkpagharị ọnụ, mgbe ụfọdụ anyị na-adị abụ abụ ma na-akpọkwa ụbọ harmonica m ka anyị na-aga n’ógbè osisi jupụtara.

Na 1978, a họpụtara m dị ka onye nlekọta sekit (onye ozi na-ejegharị ejegharị) nke inyeaka. N’ịbụ onye ọ na-enyeghị ọnụ okwu, ekpere m ekpere, sị: “Jehova, echeghị m na m pụrụ ime ya. Ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka m nwalee ya, mgbe ahụ, aga m eme ike m nile.” Afọ abụọ mgbe e mesịrị, mgbe m dị afọ 54, enyefere m obere azụmahịa m n’aka nwa anyị nwoke nke a tọchara, bụ́ Thomas.

Ụmụ anyị etochaala, nke a nyere mụ na Karla ohere nke imekwuru Jehova ihe. N’otu afọ ahụ, a họpụtara m dị ka onye nlekọta sekit, e kenyekwara m ọrụ n’otu akụkụ nke Hamburg nakwa n’ógbè nile nke Schleswig-Holstein. N’ihi ahụmahụ anyị nwere n’ịzụlite ụmụ, anyị bịara nwee ike igosi ndị nne na nna na ụmụ ha nghọta pụrụ iche. Ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị ahụ na-akpọ anyị nne na nna sekit ha.

Mgbe Karla sonyesịịrị m n’ọrụ sekit ruo afọ iri, a wara ya ahụ́. N’otu afọ ahụkwa, ndị dọkịta chọpụtara na m nwere akpụ ụbụrụ. N’ihi ya, akwụsịrị m ozi m dị ka onye nlekọta sekit ma gaa ka a waa m ahụ́ n’ụbụrụ. O ruru afọ atọ tupu m nwee ike ịrụ ọrụ ọzọ dị ka onye nlekọta sekit nke inyeaka. Mụ na Karla dị afọ 70 na ụma ugbu a, anyị anọghịzikwa n’ọrụ njegharị. Jehova nyeere anyị aka ịhụ na ọ dịghị uru dị n’ijigidesi ihe ùgwù m na-apụghịzi ịrụ ọrụ dị na ya ike.

N’ileghachi anya azụ, mụ na Karla nwere ekele n’ebe Jehova nọ maka enyemaka ya n’ịkụnye ịhụnanya maka eziokwu ahụ n’obi ụmụ anyị. (Ilu 22:6) N’ime afọ ndị gafeworonụ, Jehova eduziwo ma zụọ anyị, na-enyere anyị aka ibu ibu ọrụ anyị. Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị agadi na ndị na-adịkwaghị ike, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ dị nnọọ ọhụrụ ma sie ike dị ka ọ dị kemgbe.—Ndị Rom 12:10, 11.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara, ma ọ dịghịzi adị.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ka ezinụlọ anyị ji ụkwụ na-aga n’akụkụ Osimiri Elbe, Hamburg, 1965

[Foto dị na peeji nke 28]

Ụfọdụ n’ime ndị òtù ezinụlọ anyị ná mgbakọ mba nile e nwere na Berlin na 1998

[Foto dị na peeji nke 29]

Mụ na nwunye m, bụ́ Karla