Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Mgbe Jọn hụrụ “oké ìgwè mmadụ” ahụ ka ha nọ na-efe ofufe n’ụlọ nsọ Jehova, n’akụkụ ebee nke ụlọ nsọ ahụ ka ha nọ na-eme nke a?—Mkpughe 7:9-15.
Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwu na oké ìgwè mmadụ ahụ na-efe Jehova ofufe n’otu n’ime ogige elu ala nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ ya, kpọmkwem na nke ahụ ya na ogige dị n’èzí n’ụlọ nsọ nke Solomọn wuru kwekọrọ.
Ruo afọ ole na ole gara aga, e kwuwo na oké ìgwè mmadụ ahụ nọ n’ogige nke ya na Ogige Ndị Jentaịl nke dị n’oge Jizọs kwekọrọ, ma ọ bụ nke sere onyinyo ya n’ụzọ ime mmụọ. Otú ọ dị, nnyocha e mekwuru ekpughewo ihe ise ma ọ dịkarịa ala mere na ọ bụghị otú ahụ. Nke mbụ, ọ bụghị akụkụ nile nke ụlọ nsọ Herọd nwere ihe ha sere onyinyo ha n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. Dị ka ihe atụ, ụlọ nsọ Herọd nwere Ogige Ndị Inyom na Ogige Ndị Izrel. Ma ndị nwoke ma ndị nwanyị pụrụ ịba n’Ogige Ndị Inyom, ma ọ bụ nanị ndị nwoke ka a na-ekwe ka ha banye n’Ogige Ndị Izrel. N’ogige elu ala nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, a dịghị ekewapụ ndị nwoke iche n’ebe ndị nwanyị nọ n’ofufe ha. (Ndị Galeshia 3:28, 29) N’ihi ya, e nweghị ihe ya na Ogige Ndị Inyom na Ogige Ndị Izrel kwekọrọ n’ụlọ nsọ ime mmụọ ahụ.
Nke abụọ, e nweghị Ogige Ndị Jentaịl n’ụkpụrụ ihe owuwu ahụ Chineke nyere maka ụlọ nsọ Solomọn ma ọ bụ ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ; ọ dịghịkwa n’ụlọ nsọ ahụ Zerubabel wughachiri. N’ihi ya, ọ dịghị ihe mere a ga-eji kwuo na Ogige Ndị Jentaịl ga-enwe ihe kwekọrọ na ya ná ndokwa ife ofufe nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, karịsịa mgbe a tụlere isi ihe na-esonụ.
Nke atọ, ọ bụ Eze Herọd bụ́ onye Idọm wuru Ogige Ndị Jentaịl ahụ iji wetara onwe ya otuto na iji nweta ihu ọma nke ndị Rom. Herọd malitere idozi ụlọ nsọ ahụ Zerubabel wuru ikekwe n’afọ 18 ma ọ bụ 17 T.O.A. Akwụkwọ bụ́ The Anchor Bible Dictionary na-akọwa, sị: “Ụdị ihe owuwu oge ochie nke onye eze nke na-achị Ebe Ọdịda Anyanwụ [Rom] nwere mmasị na ya . . . mere ka ọ dị mkpa na a ga-ewu ụlọ nsọ buru nnọọ ibu karịa ndị nke dị n’obodo ndị dị n’akụkụ ọwụwa anyanwụ.” Otú ọ dị, a kapịrị otú akụkụ dị iche iche nke ụlọ nsọ ahụ ga-aha ọnụ. Akwụkwọ ọkọwa okwu ahụ na-akọwa, sị: “Ọ bụ ezie na Ụlọ Nsọ ahụ n’onwe ya ga-enwe otu ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ dị ka ndị nke bu ya ụzọ [nke Solomọn wuru na nke Zerubabel wuru], a kparaghị otú Ugwu Ụlọ Nsọ ahụ ga-aha ókè.” N’ihi ya, Herọd mere ka gburugburu ebe ụlọ nsọ ahụ dị buwanye ibu site n’ịgbakwụnye ihe a kpọworo n’oge a Ogige Ndị Jentaịl. N’ihi gịnị ka ihe owuwu nke nwere mmalite dị otú ahụ ga-eji nwee ihe ya na ya ga-ekwekọ ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova?
Nke anọ, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile—ndị ìsì, ndị ngwụrọ na ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù—pụrụ ịba n’Ogige Ndị Jentaịl. (Matiu 21:14, 15) N’eziokwu, ogige ahụ baara ọtụtụ ndị Jentaịl a na-ebighị úgwù uru bụ́ ndị chọrọ ịchụrụ Chineke àjà. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka Jizọs nọ mgbe ụfọdụ gwa ìgwè mmadụ okwu, chụpụkwa ndị na-agbanwe ego na ndị na-ere ahịa ugboro abụọ, na-ekwu na ha adịghị akwanyere ụlọ Nna ya ùgwù. (Matiu 21:12, 13; Jọn 2:14-16) Ma akwụkwọ bụ́ The Jewish Encyclopedia na-ekwu, sị: “N’ikwu ya kpọmkwem otú ọ dị, ogige a dị n’èzí esoghị n’Ụlọ Nsọ ahụ. Ala ya adịghị nsọ, onye ọ bụla pụkwara ịba n’ime ya.”
Nke ise, okwu Grik bụ́ (hi·e·ron’) nke a sụgharịrị ịbụ “ụlọ nsọ,” bụ́ nke a na-eji eme ihe n’izo aka n’Ogige Ndị Jentaịl, “na-ezo aka n’ihe owuwu ahụ dum, kama ịbụ kpọmkwem n’Ụlọ Nsọ Matiu 27:5, 51; Luk 1:9, 21; Jon 2:20.
ahụ n’onwe ya,” ka akwụkwọ bụ́ A Handbook on the Gospel of Matthew, nke Barclay M. Newman na Philip C. Stine dere, na-ekwu. N’ụzọ dị iche, okwu Grik bụ́ (na·os’) nke a sụgharịrị ịbụ “ụlọ nsọ” n’ọhụụ Jọn hụrụ banyere oké ìgwè mmadụ ahụ bụ nke a kapịrị ọnụ karị. Mgbe a na-ekwu banyere ụlọ nsọ Jeruselem, ọ na-ezokari aka n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, n’ihe owuwu ụlọ nsọ ahu, ma ọ bụ gburugburu ya. Mgbe ụfọdụ a na-asụgharị ya ịbụ “ebe nsọ.”—Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ na-enwe okwukwe n’àjà mgbapụta nke Jizọs. Ha dị ọcha n’ụzọ ime mmụọ, ebe ha ‘saworo uwe mwụda ha ma mee ka ha na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’ N’ihi ya, a kpọwo ha ndị ezi omume n’atụmanya nke ịghọ ndị enyi Chineke na ịlanarị oké mkpagbu ahụ. (Jems 2:23, 25) N’ọtụtụ ụzọ, ha yiri ndị na-eso ụzọ ndị Juu n’Izrel bụ́ ndị rubere isi n’Iwu ọgbụgba ndụ ahụ ma soro ndị Izrel na-efe ofufe.
N’ezie, ndị a bụ́ ndị na-eso ụzọ ndị Juu ejeghị ozi n’ogige ahụ dị n’ime, bụ́ ebe ndị nchụàjà na-arụ ọrụ ha. Ndị sokwa n’oké ìgwè mmadụ ahụ anọghị n’ogige ahụ dị n’ime n’oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova, bụ́ ogige nke na-anọchite anya ọnọdụ nke ịbụ ụmụ bụ́ mmadụ ndị zuru okè, ndị bụ́ ndị ezi omume, ndị so ‘n’òtù ndị nchụàjà dị nsọ’ nke Jehova mgbe ha ka nọ n’ụwa. (1 Pita 2:5) Ma, dị ka onye okenye ahụ nọ n’eluigwe gwara Jọn, n’ezie oké ìgwè mmadụ ahụ nọ n’ime ụlọ nsọ ahụ, ọ bụghị n’èzí ụlọ nsọ ahụ, n’ebe yiri Ogige Ndị Jentaịl n’ụzọ ime mmụọ. Lee ihe ùgwù ọ bụ! Leekwa otú o si na-egosi mkpa ọ dị ka onye ọ bụla n’ime anyị nọgide na-adị ọcha n’ụzọ ime mmụọ na n’omume mgbe nile!
[Ihe Osise/Foto dị na peeji nke 31]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Ụlọ Nsọ Solomọn
1. Ihe Owuwu nke Ụlọ Nsọ
2. Ogige Dị n’Ime
3. Ogige Dị n’Èzí
4. Steepụ E Ji Arịgo n’Ogige Ụlọ Nso