Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Imezu Ihe Chineke Chọrọ Na-ebuli Jehova Elu

Imezu Ihe Chineke Chọrọ Na-ebuli Jehova Elu

Imezu Ihe Chineke Chọrọ Na-ebuli Jehova Elu

“M ga-eji ekele bulie Ya elu.”—ABỤ ỌMA 69:30, NW.

1. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji kwesị ka e bulie ya elu? (b) Olee otú anyị si eji ekele ebuli ya elu?

JEHOVA bụ Chineke pụrụ ime ihe nile, Eze Eluigwe na Ala, Onye Okike. N’ihi ya, o kwesịrị ka e bulie aha na nzube ya elu. Ibuli Jehova elu pụtara ịkwanyere ya ùgwù kasị ukwuu, iji okwu ọnụ na omume too ya ma mee ka ọ dị elu. ‘Iji ekele’ na-eme nke ahụ chọrọ ka anyị na-enwe ekele mgbe nile maka ihe ọ na-emere anyị ugbu a nakwa maka ihe ọ ga-eme n’ọdịnihu. E gosiri àgwà anyị kwesịrị inwe ná Mkpughe 4:11, bụ́ ebe ndị mmụọ e kere eke na-ekwesị ntụkwasị obi nọ n’eluigwe kwupụtara, sị: “I kwesịrị ekwesị, Jehova, ọbụna Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na i kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ gị ka ha ji dịrị, ka e jikwa kee ha.” Ànyị si aṅaa ebuli Jehova elu? Ọ bụ site n’ịmụta banyere ya ma na-emezi ihe ọ chọrọ n’aka anyị. Anyị kwesịrị inwe mmetụta yiri nke ọbụ abụ ahụ mgbe ọ sịrị: “Zi m ime ihe dị Gị ụtọ; n’ihi na Gị onwe gị bụ Chineke m.”—Abụ Ọma 143:10.

2. Olee otú Jehova si emeso ndị na-ebuli ya elu ihe, oleekwa otú o si emeso ndị na-adịghị ebuli ya elu ihe?

2 Jehova ji ndị na-ebuli ya elu kpọrọ ihe. Ọ bụ n’ihi nke ahụ ka o ji bụrụ “onye na-akwụghachi ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Gịnị bụ ụgwọ ọrụ ahụ? Jizọs kwuru n’ekpere o kpegaara Nna ya nke eluigwe, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ee, ndị ‘ji ekele na-ebuli Jehova elu’ “ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:29) N’aka nke ọzọ, “ọdịnihu agaghị adịrị onye ọjọọ.” (Ilu 24:20) N’ụbọchị ikpeazụ a kwa, mkpa ọ dị ibuli Jehova elu dị ngwa n’ihi na n’isi nso, ọ ga-ebibi ndị ajọ omume ma chebe ndị ezi omume. “Ụwa na-agabiga, otú ahụkwa ka ọ dị ọchịchọ ya, ma onye na-eme uche Chineke na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17; Ilu 2:21, 22.

3. Gịnị mere anyị ji kwesị ịṅa ntị n’akwụkwọ Malakaị?

3 A na-achọta uche Jehova na Bible, n’ihi na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) Okwu Chineke bu ọtụtụ ihe ndekọ banyere otú Jehova si agọzi ndị na-ebuli ya elu na ihe na-eme ndị na-adịghị eme otú ahụ. Otu n’ime ihe ndekọ ndị ahụ metụtara ihe mere n’Izrel n’oge Malakaị onye amụma. Ihe dị ka n’afọ 443 T.O.A., n’oge Nehemaịa na-achị Juda, Malakaị dere akwụkwọ ahụ bu aha ya. Akwụkwọ a bụ́ ọkpọka ma na-akpali akpali bu ihe ọmụma na amụma ndị ‘e dere ka ha bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị bụ́ ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe dị iche iche bịakwasịworo.’ (1 Ndị Kọrint 10:11) Ịṅa ntị n’okwu Malakaị pụrụ inyere anyị aka ịkwadebe maka “oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova,” bụ́ mgbe Ọ ga-ebibi ajọ usoro ihe a.—Malakaị 4:5.

4. Olee isi ihe isii a dọọrọ uche anyị gaa na ha na Malakaị isi 1?

4 Olee otú akwụkwọ Malakaị, nke e dere ihe karịrị afọ 2,400 gara aga, si enyere anyị aka na narị afọ nke 21 a ịkwadebe maka oké ụbọchị ahụ dị egwu nke Jehova? Isiakwụkwọ nke mbụ na-adọrọ uche anyị gaa, ma ọ dịkarịa ala, n’isi ihe isii dị mkpa maka anyị iji ekele na-ebuli Jehova elu iji wee nweta ihu ọma ya na ndụ ebighị ebi: (1) Jehova hụrụ ndị ya n’anya. (2) Anyị aghaghị igosipụta na anyị ji ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe. (3) Jehova na-atụ anya ka anyị nye ya ihe kasị mma anyị nwere. (4) Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị na-akpali ezi ofufe, ọ bụghị anyaukwu. (5) Ozi Chineke na-anabata abụghị ihe mmeju iwu bụ́ ibu arọ. (6) Onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị ịza Chineke ajụjụ. Ugbu a, na nke mbụ a n’isiokwu atọ a tụlere akwụkwọ Malakaị na ha, ka anyị tụlee nke ọ bụla n’ime isi ihe ndị a ka anyị na-elerukwu anya na Malakaị isi 1.

Jehova Hụrụ Ndị Ya n’Anya

5, 6. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji hụ Jekọb n’anya? (b) Ọ bụrụ na anyị eṅomie ikwesị ntụkwasị obi Jekọb, gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya?

5 E mere ka ịhụnanya Jehova doo anya n’amaokwu ndị mbụ nke Malakaị. Akwụkwọ a ji okwu ndị a malite: “Ibu okwu Jehova e boro Israel.” Ọzọ, Chineke na-ekwu, sị: “Ahụwo m unu n’anya.” N’ihota otu ihe atụ, Jehova na-ekwu n’otu amaokwu ahụ, sị: “Ana m ahụ Jekọb n’anya.” Jekọb bụ nwoke nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ka oge na-aga, Jehova gbanwere aha Jekọb ịbụ Izrel, ọ ghọkwara nna nna nke mba Izrel. Ọ bụ n’ihi na Jekọb bụ nwoke nwere okwukwe ka Jehova ji hụ ya n’anya. N’etiti ndị mba ahụ, Jehova hụkwara onye ọ bụla nke gosipụtara ụdị àgwà Jekọb nwere n’ebe Ọ nọ n’anya.—Malakaị 1:1, 2.

6 Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya ma jiri iguzosi ike n’ihe rapagidesie ike n’ebe ndị ya nọ, anyị pụrụ inweta nkasi obi site n’ihe e kwuru na 1 Samuel 12:22: “Jehova agaghị ahapụ ndị Ya n’ihi aha ukwu Ya.” Jehova hụrụ ndị ya n’anya, ọ ga-ejikwa ndụ ebighị ebi kwụọ ha ụgwọ ọrụ n’ikpeazụ. N’ihi ya anyị na-agụ, sị: “Tụkwasị Jehova obi, meekwa ezi ihe; biri n’ala, na-azụkwa onwe gị n’ikwesị ntụkwasị obi. Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.” (Abụ Ọma 37:3, 4) Anyị ịhụ Jehova n’anya na-agụnye isi ihe nke abụọ a dọọrọ uche anyị gaa na ya na Malakaị isi 1.

Jiri Ihe Ndị Dị Nsọ Kpọrọ Ihe

7. N’ihi gịnị ka Jehova ji kpọọ Ịsọ asị?

7 Dị ka anyị na-agụ na Malakaị 1:2, 3, mgbe Jehova kwusịrị, “Ana m ahụ Jekọb n’anya,” ọ sịrị, “Isọ ka M kpọworo asị.” Gịnị mere e ji nwee ọdịiche ahụ? Jekọb buliri Jehova elu, ma ejima ya, bụ́ Ịsọ, emeghị otú ahụ. A kpọkwara Ịsọ Edọm. Na Malakaị 1:4, a kpọrọ ala Edọm ókèala mmebi iwu, a katọkwara ndị bi na ya. E nyere Ịsọ aha ahụ bụ́ Edọm (nke pụtara “Ọbara Ọbara”) mgbe o resịsịrị Jekọb ọnọdụ ọkpara ya dị oké ọnụ ahịa n’ihi ntakịrị ofé na-acha ọbara ọbara. “Isọ wee leda ọnọdụ ọkpara ya anya,” ka Jenesis 25:34 na-ekwu. Pọl onyeozi gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha lezie anya ka “e wee ghara inwe onye ọ bụla na-akwa iko ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ejighị ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe, dị ka Ịsọ, bụ́ onye nyefere ihe ndị ruuru ya dị ka nwa mbụ iji gbanweta otu nri.”—Ndị Hibru 12:14-16.

8. Gịnị mere Pọl ji jiri Ịsọ tụnyere onye na-akwa iko?

8 N’ihi gịnị ka Pọl ji jikọta omume Ịsọ na ịkwa iko? Ọ bụ n’ihi na inwe ụdị echiche Ịsọ pụrụ iduga mmadụ n’ịghara iji ihe ndị dị nsọ kpọrọ ihe. Nke a nweziri ike ịrụpụta mmehie ndị dị oké njọ, dị ka ịkwa iko. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ̀ na-adị m mgbe ụfọdụ ka ọ̀ bụ m jiri ihe nketa m dị ka Onye Kraịst—ndụ ebighị ebi—gbanwere ihe ndị na-adịghị adịte aka dị ka otu efere ofé lentil? Ma eleghị anya, àna m eleda ihe ndị dị nsọ anya, n’amaghị ama?’ Ọ dị Ịsọ ọkụ n’ahụ́ imeju ọchịchọ anụ ahụ́ ya. Ọ sịrị Jekọb: “[Mee ngwa, NW] biko, kwee ka m loda ụfọdụ n’ime ihe a na-acha ọbara ọbara.” (Jenesis 25:30) N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ n’ime ndị ohu Jehova ekwuwo, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, sị: “Mee ngwa! Gịnị mere a ga-eji chewe ruo mgbe a lụrụ di ma ọ bụ nwunye n’ụzọ dị nsọpụrụ?” Ọchịchọ inweta afọ ojuju nke mmekọahụ n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu aghọwo efere ofé lentil nke ha.

9. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-atụ Jehova egwu nsọpụrụ?

9 Ya adịla mgbe anyị ga-elelị ihe ndị dị nsọ site n’ileda ịdị ọcha nke mmekọahụ, iguzosi ike n’ezi ihe, na ihe nketa ime mmụọ anyị anya. Kama ịdị ka Ịsọ, ka anyị dị ka Jekọb kwesịrị ntụkwasị obi ma nọgide na-atụ Chineke egwu nsọpụrụ site n’iji ihe ndị dị nsọ na-akpọrọ ihe nke ukwuu. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a? Ọ bụ site n’ilezi anya imezu ihe Jehova na-achọ. N’ụzọ ezi uche dị na ya, nke a na-eduga anyị n’isi ihe nke atọ Malakaị isi 1 kọwapụtara. Gịnị ka ọ bụ?

Inye Jehova Ihe Kasị Mma Anyị Nwere

10. N’ụzọ dị aṅaa ka ndị nchụàjà ahụ si na-elelị tebụl Jehova?

10 Ndị nchụàjà nke Juda, bụ́ ndị na-eje ozi n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem n’oge Malakaị, adịghị achụrụ Jehova àjà kasị mma. Malakaị 1:6-8 na-ekwu, sị: “Nwa na-asọpụrụ nna ya, ohu na-asọpụrụkwa onye nwe ya: ọ bụrụkwa na nna ka M bụ, olee ebe nsọpụrụ m dị? ọ bụrụkwa na onye nwe mmadụ ka M bụ, olee ebe egwu m dị? ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị unu, unu ndị nchụàjà, ndị na-elelị aha m.” “N’ime gịnị ka anyị lelịworo aha Gị?” ka ndị nchụàjà ahụ jụrụ. “Unu na-eweta nso achịcha e mere ka ọ ghara ịdị nsọ n’elu ebe ịchụàjà m,” ka Jehova zara. “N’ime gịnị ka anyị meworo Gị ka Ị ghara ịdị nsọ?” ka ndị nchụàjà ahụ jụrụ. Ya mere, Jehova gwara ha, sị: “N’ịsị, Tebụl nke Jehova, ihe nlelị ka ọ bụ.” Ndị nchụàjà ahụ na-egosi na ha na-elelị tebụl Jehova mgbe ọ bụla ha ji anụmanụ nwere nkwarụ chụọ àjà, na-ekwu, sị: “Ihe ọjọọ adịghị ya.”

11. (a) Gịnị ka Jehova kwuru banyere àjà ndị a na-adịghị anakwere? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ụta si dịrị ndị ahụ n’ozuzu ha?

11 Jehova soziri ha tụgharịa uche banyere àjà ndị ahụ a na-adịghị anakwere, sị: “Biko, weta ya nso onye na-achị ala gị; ihe gị [ọ̀] ga-atọ ya ụtọ? ma ọ bụ, ọ̀ ga-ahụ gị ihu ọma?” Ee e, onyinye dị otú ahụ agaghị atọ onye na-achị ala ha ụtọ. Lee ka Eze Eluigwe na Ala na-agaghị esi nara àjà e ji anụmanụ nwere nkwarụ chụọ! Ọ bụghịkwa nanị ndị nchụàjà ka a ga-ata ụta. N’eziokwu, ha nọ na-elelị Jehova site n’ịchụ àjà achụ. Ma, ọ̀ bụ na ụta adịghịrị ndị ahụ n’ozuzu ha? Ee, ọ dịịrị ha! Ọ bụ ha họọrọ anụ ndị ahụ kpuru ìsì, ndị dara ngwụrọ, na ndị na-arịa ọrịa ma wetara ha ndị nchụàjà ka ha jiri ha chụọ àjà. Lee mmehie ọ bụ!

12. È si aṅaa enyere anyị aka inye Jehova ihe kasị mma anyị nwere?

12 Inye Jehova ihe kasị mma anyị pụrụ inye ya bụ ụzọ isi gosi na anyị hụrụ ya n’anya n’ezie. (Matiu 22:37, 38) N’adịghị ka ndị nchụàjà ahụ na-enupụ isi n’oge Malakaị, nzukọ Jehova taa na-enye anyị ọtụtụ ọmarịcha ntụziaka ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị na-enyere anyị aka iji ekele na-ebuli Jehova elu site n’imezu ihe ndị ọ chọrọ. E jikọtara nke a na isi ihe nke anọ dị mkpa a pụrụ ịhụ na Malakaị isi 1.

Ọ Bụ Ịhụnanya Na-akpali Ezi Ofufe, Ọ Bụghị Anyaukwu

13. Gịnị ka ndị nchụàjà ahụ na-eme nke gosiri na ọ bụ anyaukwu na-akpali ha?

13 Ndị nchụàjà nke oge Malakaị na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, bụrụ ndị na-adịghị ahụ n’anya, na ndị nwere akpịrị ego. Olee otú anyị si mara? Malakaị 1:10 na-ekwu, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na otu onye dị n’etiti unu nke na-emechi ụzọ, ka unu wee ghara ịfụnwu ọkụ nke ebe ịchụàjà m n’efu! ọ dịghị ihe unu na-atọ m ụtọ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, M gaghị anarakwa onyinye ịnata ihu ọma n’aka unu nke ọma.” Ee, ọbụna ndị nchụàjà ahụ dị anyaukwu na-asị ka e nye ha ego iji jee ozi kasị nta n’ụlọ nsọ ahụ, na-achọ ka a kwụọ ha ụgwọ maka imechi ọnụ ụzọ na ịfụnwu ọkụ nke ebe ịchụàjà! Ka a sịkwa ihe mere na àjà ha na-achụ adịghị atọ Jehova ụtọ!

14. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji sị na ọ bụ ịhụnanya na-akpali Ndịàmà Jehova?

14 Anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ndị nchụàjà ahụ na-eme mmehie, ndị nọ na Jeruselem oge ochie pụrụ nnọọ ichetara anyị na, dị ka Okwu Chineke si kwuo, ndị anyaukwu agaghị eketa Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ịtụgharị uche n’omume ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke ndị nchụàjà ahụ na-eme ka anyị jirikwuo ọrụ ime nkwusa nke Ndịàmà Jehova na-arụ n’ụwa nile kpọrọ ihe. Ọ bụ nke a na-arụ n’afọ ofufo; anyị adịghị ana ego ma ọlị maka ozi anyị. Ee e, “anyị abụghị ndị na-ere okwu Chineke.” (2 Ndị Kọrint 2:17) Dị ka Pọl, onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikwu n’eziokwu, sị: “N’anaghị ụgwọ ọrụ, eji m ọṅụ kpọsaara unu ozi ọma Chineke.” (2 Ndị Kọrint 11:7) Rịba ama na Pọl ‘ji ọṅụ kpọsaa ozi ọma’ ahụ. Nke ahụ na-egosi isi ihe nke ise e mere ka anyị mata na Malakaị isi 1.

Ozi A Na-ejere Chineke Abụghị Ihe Mmeju Iwu Bụ́ Ibu Arọ

15, 16. (a) Àgwà dị aṅaa ka ndị nchụàjà nwere n’ebe ịchụ àjà dị? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova si achụ àjà ha?

15 Ndị nchụàjà ahụ na-enweghị okwukwe nọ na Jeruselem oge ochie lere ịchụ àjà anya dị ka ihe na-agwụ ike a na-eme iji mezuo iwu. Ọ bụụrụ ha ibu arọ. Dị ka e kwuru na Malakaị 1:13, Chineke gwara ha, sị: “Unu asịwokwa, Lee, ka o si bụrụ oké ike ọgwụgwụ! unu afụwokwa ya ná nlelị.” Ndị nchụàjà ahụ kpọrọ n’imi, ma ọ bụ lelịa, ihe ndị dị nsọ nke Chineke. Ka anyị na-ekpe ekpere ka anyị ghara ịdị ka ha ma ọlị. Kama nke ahụ, ka anyị na-egosipụta mgbe nile mmụọ nke ihe ahụ e kwuru na 1 Jọn 5:3, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.”

16 Ka obi na-atọ anyị ụtọ n’ịchụrụ Chineke àjà ime mmụọ, ya adịla mgbe anyị ga-ewere nke a dị ka ibu arọ na-agwụ ike. Ka anyị na-aṅa ntị n’okwu amụma bụ́: “Sịnụ [Jehova], Bupụ ajọ omume nile anyị, nara ezi ihe: anyị ewee kwụghachi egbugbere ọnụ anyị, dị ka oké ehi.” (Hosea 14:2) Okwu bụ́ “egbugbere ọnụ anyị, dị ka oké ehi” na-egosi àjà ime mmụọ, okwu anyị na-ekwu iji too Jehova na nzube ya dị iche iche. Ndị Hibru 13:15 na-ekwu, sị: “Ka anyị site na [Jizọs Kraịst] chụọrọ Chineke àjà otuto mgbe nile, ya bụ, mkpụrụ egbugbere ọnụ bụ́ nke na-ekwupụta aha ya n’ihu ọha.” Lee ka obi si dị anyị ụtọ na àjà ime mmụọ anyị na-achụ abụghị nanị iji mezuo iwu, kama ha bụ ngosipụta nke ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ site n’obi anyị dum! Nke a na-eduga n’isi ihe nke isii anyị pụrụ ịmụta site na Malakaị isi 1.

Onye Ọ Bụla n’Ime Anyị Aghaghị Ịza Ajụjụ

17, 18. (a) N’ihi gịnị ka Jehova ji bụọ “onye nghọgbu ahụ” ọnụ? (b) Gịnị ka ndị ahụ ghọgburu aghọgbu na-eburughị n’uche?

17 Ndị dịrị ndụ n’oge Malakaị zara ajụjụ n’otu n’otu maka omume ha, otú ahụ ka anyị ga-azakwa. (Ndị Rom 14:12; Ndị Galeshia 6:5) N’ikwekọ na nke ahụ, Malakaị 1:14 na-ekwu, sị: “Onye a na-abụ ọnụ ka onye nghọgbu ahụ bụ, nke oké dị n’ìgwè atụrụ ya, ma ọ na-ekwe nkwa, wee chụọrọ Onyenwe anyị àjà ihe bibiri ebibi.” Onye nwere ìgwè anụmanụ enweghị nanị otu anụmanụ—dị ka, otu atụrụ—nke ga-eme ka ọ ghara inwe ike ime nhọrọ. N’ịhọrọ anụ ọ ga-eji chụọ àjà, o kwesịghị ịhọrọ nke kpuru ìsì, nke dara ngwụrọ, ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa. Ọ bụrụ na ọ họrọ anụmanụ dị otú ahụ nwere nkwarụ, ọ ga-egosi na o lelịrị ndokwa Jehova mere maka ịchụ àjà, n’ihi na onye nwere ìgwè anụmanụ pụrụ n’ezie ịhụ nke na-enweghị nkwarụ!

18 N’ihi ya, Jehova nwere ezi ihe mere o ji bụọ onye nghọgbu ahụ ọnụ, bụ́ onye nwere anụmanụ kwesịrị ekwesị nke bụ́ oké ma wetara—ikekwe dọkpụtara—onye nchụàjà anụ kpuru ìsì, nke dara ngwụrọ, ma ọ bụ nke na-arịa ọrịa maka iji chụọ àjà. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị ihe ọ bụla gositụrụ na ọ dị onye nchụàjà hotara ihe iwu Chineke kwuru na a pụghị ịnakwere anụmanụ nwere nkwarụ. (Levitikọs 22:17-20) Ndị ọ bụla nwere ezi uche maara na ihe gaara adịrị ha njọ ma a sị na ha nwara anwa ime ka onye na-achị ala ha nara ụdị onyinye ahụ. Ma n’ezie, ọ bụ ha na Eze Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova, bụ́ onye dị nnọọ ukwuu karịa onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ, na-emekọ ihe. Malakaị 1:14 si otú a kwuo ya: “Eze ukwu ka M bụ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, aha m dịkwa egwu n’etiti mba nile.”

19. Gịnị ka anyị na-atụsi anya ya ike, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịdị na-eme?

19 Dị ka ndị ohu Chineke na-eguzosi ike n’ihe, anyị na-atụsi anya ike ụbọchị ahụ mgbe ihe nile a kpọrọ mmadụ ga na-asọpụrụ Eze Ukwu ahụ, bụ́ Jehova. N’oge ahụ, “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:9) Ka ọ dịgodị, ka anyị na-agbalịsi ike imezu ihe Jehova na-achọ site n’iṅomi ọbụ abụ ahụ bụ́ onye sịrị: “M ga-eji ekele bulie Ya elu.” (Abụ Ọma 69:30, NW) Iji mezuo nke ahụ, Malakaị nwekwuru ndụmọdụ nke pụrụ ịbara anyị uru dị ukwuu. N’ihi ya, n’isiokwu abụọ na-esonụ, ka anyị jiri nlezianya tụlee akụkụ ndị ọzọ nke akwụkwọ Malakaị.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ibuli Jehova elu?

• Gịnị mere Jehova anakwereghị àjà ndị nchụàjà chụrụ n’oge Malakaị?

• Olee otú anyị si achụrụ Jehova àjà otuto?

• Gịnị kwesịrị ịbụ ihe mkpali maka ife ezi ofufe?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Amụma Malakaị zoro aka n’ụbọchị anyị

[Foto dị na peeji nke 10]

Ịsọ ejighị ihe dị nsọ kpọrọ ihe

[Foto dị na peeji nke 11]

Ndị nchụàjà na ndị mba ahụ chụrụ àjà a na-adịghị anakwere

[Foto dị na peeji nke 12]

N’ụwa nile, Ndịàmà Jehova na-achụ àjà otuto n’anaghị ego