Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Kpọrọ Omume Aghụghọ Asị

Jehova Kpọrọ Omume Aghụghọ Asị

Jehova Kpọrọ Omume Aghụghọ Asị

‘Unu aghọgbula ibe unu.’—MALAKAỊ 2:10.

1. Gịnị ka Chineke na-achọ n’aka anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi?

Ị̀ CHỌRỌ ịdị ndụ ebighị ebi? Ọ bụrụ na i nwere olileanya ahụ dị ka e kwere ya ná nkwa na Bible, eleghị anya ị ga-aza sị, ‘Eenụ.’ Ma, ọ bụrụ na ị chọrọ ka Chineke nye gị ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ ya dị ka onyinye, ọ ga-adị mkpa ka i mezuo ihe ndị ọ chọrọ. (Eklisiastis 12:13; Jọn 17:3) Ọ̀ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya ịtụ anya ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè mee nke ahụ? Ee e, n’ihi na Jehova kwuru ihe a na-agba ume, sị: “Ebere atọwo m ụtọ, ọ bụghị àjà; ọmụma Chineke atọwokwa m ụtọ karịa àjà nsure ọkụ nile.” (Hosea 6:6) Ya mere, ọbụna ụmụ mmadụ na-emehie ihe pụrụ imezu ihe Chineke na-achọ.

2. Olee otú ọtụtụ ndị Izrel siri ghọọ Jehova aghụghọ?

2 Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile na-achọ ime uche Jehova. Hozia na-ekpughe na ọbụna ọtụtụ ndị Izrel achọghị ime otú ahụ. Dị ka otu mba, ha ekwerewo ịbanye n’ọgbụgba ndụ, bụ́ nkwekọrịta, irube isi n’iwu Chineke. (Ọpụpụ 24:1-8) N’agbanyeghị nke ahụ, n’oge na-adịghị anya, ha malitere ‘ịgabiga ọgbụgba ndụ ahụ’ site n’imebi iwu ya. N’ihi ya, Jehova sịrị na ndị Izrel ahụ ‘ghọgburu’ ya. (Hosea 6:7) Otú ahụkwa ka ọtụtụ ndị meworo kemgbe ahụ. Jehova kpọrọ omume aghụghọ asị, ma ọ̀ bụ ya ka a ghọrọ aghụghọ ma ọ bụ ndị hụrụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi.

3. Nnyocha dị aṅaa ka anyị ga-eme n’ihe ọmụmụ a?

3 Ọ bụghị nanị Hozia bụ onye amụma mere ka echiche Chineke banyere aghụghọ pụta ìhè, bụ́ echiche nke ọ dị mkpa ka anyị nwee ma ọ bụrụ na anyị na-atụ anya ịdị ndụ obi ụtọ. N’isiokwu bu ụzọ, anyị malitere inyocha ihe ka ukwuu n’ozi amụma Malakaị, na-amalite n’isi nke mbụ nke akwụkwọ ya. Ugbu a, ka anyị sapeta isi nke abụọ nke akwụkwọ ahụ ma hụ otú e si lebakwuoro echiche Chineke banyere aghụghọ anya. Ọ bụ ezie na Malakaị na-ekwu okwu banyere ọnọdụ nke dị n’etiti ndị Chineke ọtụtụ iri afọ mgbe ha sisịworo na Babilọn lọta, isi nke abụọ ahụ nwere ihe gbara ọkpụrụkpụ ọ pụtara nye anyị taa.

Ndị Nchụàjà Ụta Dịịrị

4. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jehova nyere ndị nchụàjà?

4 Isi nke 2 ji nkatọ Jehova katọrọ ndị nchụàjà ndị Juu n’ihi ịhapụ ụzọ ezi omume ya, malite. Ọ bụrụ na ha egeghị ntị na ndụmọdụ ya ma dozie ụzọ ha, ọ ghaghị ịrụpụtara ha oké ihe ọjọọ. Rịba amaokwu abụọ ndị mbụ ama: “Unu ka ihe a e nyere n’iwu dịịrị, unu ndị nchụàjà. Ọ bụrụ na unu agaghị anụ, ọ bụrụkwa na unu agaghị etinye ya n’obi unu, inye aha m nsọpụrụ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, M ga-ezitekwa ọbụbụ ọnụ ahụ n’ahụ unu, bụọ ngọzi nile unu ọnụ.” A sị na ndị nchụàjà ahụ kụziiri ndị ahụ iwu Chineke ma debe ha, a gaara agọzi ha. Ma n’ihi ileghara uche Chineke anya, ọbụbụ ọnụ, nkọcha, gaje ịbịa. Ọbụna ngọzi ndị ndị nchụàjà ahụ kwupụtara gaje ịghọ ọbụbụ ọnụ.

5, 6. (a) N’ihi gịnị ka ụta ji dịrị ndị nchụàjà karịsịa? (b) Olee otú Jehova si kwupụta nlelị o lelịrị ndị nchụàjà?

5 Gịnị mere ụta ji dịrị ndị nchụàjà ahụ karịsịa? Amaokwu nke 7 na-ekwu otu ihe doro anya kpatara ya: “Egbugbere ọnụ abụọ nke onye nchụàjà ga-edebe ihe ọmụma, ọ bụkwa iwu ka ha ga-achọ n’ọnụ ya: n’ihi na onye ozi nke Jehova nke usuu nile nke ndị agha ka ọ bụ.” Ihe karịrị otu puku afọ tupu mgbe ahụ, iwu Chineke nke e nyere Izrel site n’aka Mozis kwuru na ndị nchụàjà nwere ọrụ ‘izi ụmụ Israel ụkpụrụ nile nke Jehova gwaworo ha.’ (Levitikọs 10:11) N’ụzọ dị mwute, n’otu oge ka e mesịrị, onye dere 2 Ihe E Mere 15:3 kọrọ, sị: “Ọtụtụ ụbọchị ka Israel nọ n’enweghị Chineke nke eziokwu, n’enweghịkwa onye nchụàjà na-ezi ihe, n’enweghịkwa iwu.”

6 N’oge Malakaị, na narị afọ nke ise T.O.A., ọnọdụ ndị nchụàjà ahụ ka dị otú ọ dị. Ha adịghị akụziri ndị ahụ Iwu Chineke. N’ihi ya, ndị nchụàjà ahụ kwesịrị ịza ajụjụ. Rịba ama okwu dị ike Jehova gwara ha. Malakaị 2:3 na-asị: ‘M ga-efesa unu nsị́ anụ n’ihu, bụ́ nsị́ anụ nke anụ ememe nile unu.’ Lee ịba mba nke ahụ bụ! E kwesịrị ibuga nsị́ anụ nke anụmanụ e ji chụọ àjà n’azụ ọmụma ụlọikwuu ma kpọọ ya ọkụ. (Levitikọs 16:27) Ma mgbe Jehova gwara ha na kama ikpopụ nsị́ anụ ahụ ekpopụ na a ga-efesa ha ya n’ihu, ọ na-egosi n’ụzọ doro anya na o lelịrị àjà ha na ndị na-achụ ha ma jụ ha.

7. N’ihi gịnị ka Jehova ji wesoo ndị nkụzi nke Iwu ahụ iwe?

7 Ọtụtụ narị afọ tupu oge Malakaị, Jehova enyeworị ndị Livaị ọrụ ilekọta ụlọikwuu ahụ nakwa, mgbe e mesịrị, ilekọta ụlọ nsọ ahụ na ozi dị nsọ. Ha bụ ndị nkụzi ná mba Izrel. Ịrụzu ọrụ ha gaara arụpụtaworo ha na mba ahụ ndụ na udo. (Ọnụ Ọgụgụ 3:5-8) Ma ndị Livaị kwụsịrị ịtụ Chineke egwu ha tụrụ ya na mbụ. N’ihi ya, Jehova gwara ha, sị: “Unu ewezụgawo onwe unu n’ụzọ Chineke; unu emewo ka ọtụtụ mmadụ sụọ ngọngọ n’iwu; unu ebibiwo ọgbụgba ndụ Livaị . . . unu [adịghị] edebe ụzọ m nile.” (Malakaị 2:8, 9) Site n’ịghara ịkụzi eziokwu ahụ nakwa site n’ihe nlereanya ha na-adịghị mma, ndị nchụàjà ahụ duhiere ọtụtụ ndị Izrel, n’ihi ya Jehova wesoro ha iwe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Idebe Ụkpụrụ Chineke

8. Ọ̀ bụ ihe karịrị akarị bụ́ ịtụ anya ka ụmụ mmadụ debe ụkpụrụ Chineke? Kọwaa.

8 Ka anyị ghara iche na ndị nchụàjà ahụ kwesịrị ka e meere ha ebere ma gbaghara ha n’ihi na ha bụ ụmụ mmadụ nkịtị na-ezughị okè, a pụghịkwa ịtụwo anya ka ha debe ụkpụrụ Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụ mmadụ pụrụ idebe ihe Chineke nyere n’iwu, n’ihi na Jehova adịghị atụ anya ihe ha na-apụghị ime n’aka ha. Ikekwe ndị nchụàjà ụfọdụ n’otu n’otu n’oge ahụ debere ụkpụrụ Chineke, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya banyere otu onye nke debere ya ka oge na-aga—Jizọs, bụ́ “nnukwu onye nchụàjà.” (Ndị Hibru 3:1) A pụrụ ikwu n’ezie banyere ya, sị: “Iwu nke eziokwu dị n’ọnụ ya, a hụghịkwa ajọ omume n’egbugbere ọnụ ya: n’udo na n’izi ezi ka o sooro m jee ije, ọ dịkwa ọtụtụ mmadụ o mere ka ha si n’ajọ omume chigharịa.”—Malakaị 2:6.

9. Olee ndị jiworo ikwesị ntụkwasị obi na-akụzi eziokwu n’oge anyị?

9 N’ụzọ yiri ya, ruo ihe karịrị otu narị afọ ugbu a, ụmụnna Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nwere olileanya nke eluigwe, ejewo ozi dị ka “òtù ndị nchụàjà dị nsọ, iji chụọ àjà ime mmụọ ndị Chineke na-anara nke ọma.” (1 Pita 2:5) Ha ebutewo ụzọ n’ịkụziri ndị ọzọ eziokwu Bible. Ka ị mụtaworo eziokwu nke ha na-akụzi, ọ̀ bụ na ị hụbeghị site n’ahụmahụ na iwu nke eziokwu dị n’ọnụ ha? Ha enyewo aka mee ka ọtụtụ ndị si n’ihie ụzọ okpukpe chigharịa, nke mere na ugbu a e nwere ọtụtụ nde mmadụ n’ụwa nile bụ́ ndị mụtaworo eziokwu Bible ma nwee olileanya nke ndụ ebighị ebi. Ndị a nwere ihe ùgwù nke ịkụzikwara ọtụtụ nde ndị ọzọ iwu nke eziokwu.—Jọn 10:16; Mkpughe 7:9.

Ihe Mere A Ga-eji Na-elezi Anya

10. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee ihe mere anyị ga-eji na-elezi anya?

10 Otú ọ dị, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji na-elezi anya. Ihe mmụta ndị dị na Malakaị 2:1-9 pụrụ ifunahụ anyị. Ànyị nọ na nche n’onwe anyị ka a ghara ịhụ ajọ omume n’egbugbere ọnụ anyị? Dị ka ihe atụ, ndị òtù ezinụlọ anyị hà pụrụ ịtụkwasị obi n’ezie n’ihe anyị na-ekwu? Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ọgbakọ hà pụrụ ime otú ahụ? Ọ ga-adị nnọọ mfe ịzụlite àgwà nke ikwu okwu n’ụzọ ga-abụ eziokwu ma e nyochasịwa ya, ma ya abụrụ nke ga-eduhie ndị ọzọ. Ma ọ bụ mmadụ pụrụ ịdị na-ekwubiga okwu ókè ma ọ bụ na-ezochi ihe ụfọdụ n’okwu achụmnta ego. Ọ̀ bụ na Jehova agaghị ahụ nke ahụ? Ọ bụrụkwa na anyị agbasoo omume ndị dị otú ahụ, ọ̀ ga-anakwere àjà otuto sitere n’egbugbere ọnụ anyị?

11. Olee ndị karịsịa ka ọ dị mkpa ilezi anya?

11 Banyere ndị nwere ihe ùgwù nke izi Okwu Chineke n’ọgbakọ taa, Malakaị 2:7 kwesịrị ịbụrụ ha okwu ịdọ aka ná ntị. Ọ sịrị na egbugbere ọnụ ha abụọ “ga-edebe ihe ọmụma, ọ bụkwa iwu ka ha ga-achọ” n’ọnụ ha. Ndị ozizi dị otú ahụ nwere ibu ọrụ dị ukwuu n’ihi na Jems 3:1 na-egosi na ha “ga-anata ikpe dị arọ karị.” Ọ bụ ezie na ha ga-eji ume na ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ihe, izi ihe ha aghaghị ịdaberesi ike n’Okwu Chineke e dere ede nakwa ná ntụziaka na-esite ná nzukọ Jehova. N’ụzọ dị otú ahụ, ha “ga-eru eru nke ọma . . . ịkụziri ndị ọzọ ihe.” Ya mere, a dụrụ ha ọdụ, sị: ‘Meenụ ike unu nile iche onwe unu n’ihu Chineke dị ka ndị a nwapụtara anwapụta, ndị ọrụ na-enweghị ihe ha ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’—2 Timoti 2:2, 15.

12. Gịnị ka ndị na-ezi ihe kwesịrị ilezi anya maka ya?

12 Ọ bụrụ na anyị akpachapụghị anya, a pụrụ ịnwa anyị ọnwụnwa iwebata ihe ndị na-amasị anyị ma ọ bụ echiche nke aka anyị n’ihe anyị na-ezi. Nke ahụ ga-abụ ihe ize ndụ karịsịa nye onye na-ekwenyesi ike n’echiche ya ọbụna mgbe nke ahụ megidere ihe nzukọ Jehova na-akụzi. Ma Malakaị isi 2 na-emesi ya ike na anyị kwesịrị ịtụ anya na ndị na-ezi ihe n’ọgbakọ ga-adabere n’ihe ọmụma nke sitere n’aka Chineke ọ bụghị n’echiche nke ha, bụ́ nke pụrụ ime ka ìgwè atụrụ ahụ sụọ ngọngọ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eme ka otu n’ime ndị a dị nta bụ́ ndị nwere okwukwe na m sụọ ngọngọ, ọ baara ya uru karị na e ji nkume igwe nri, ụdị nke ịnyịnya ibu na-akwagharị konye ya n’olu ya ma tụba ya n’ime ogbu oké osimiri.”—Matiu 18:6.

Ịlụ Onye Na-ekweghị Ekwe

13, 14. Olee otu omume aghụghọ nke Malakaị kọwapụtara?

13 Malite n’amaokwu nke 10 gaa n’ihu, Malakaị isi 2 dọọrọ uche gaa n’ịghọgbu mmadụ ọbụna n’ụzọ a kapịrị ọnụ karị. Malakaị lekwasịrị anya n’omume abụọ nwere njikọ, ndị o ji okwu bụ́ “nghọgbu” mee ihe ugboro ugboro banyere ha. Nke mbụ, rịba ama na tupu Malakaị enye ndụmọdụ, o bu ụzọ jụọ ajụjụ ndị a: “Ọ́ bụghị otu nna ka anyị nile nwere? ọ́ bụghị otu Chineke keworo anyị? gịnị mere anyị na-aghọgbu, onye ọ bụla ọ ghọgbuo ibe ya, na-eme ka ọgbụgba ndụ nna anyị hà ghara ịdị nsọ?” Amaokwu nke 11 na-agbakwụnyezi na aghụghọ nke Izrel bụ ‘ime ka ịdị nsọ Jehova ghara ịdị nsọ.’ Gịnị ka ha na-eme nke dị oké njọ? Amaokwu ahụ kwuru otu n’ime omume ndị ahụ dị njọ: Ha ‘alụwokwa nwa nwanyị nke chi ala ọzọ.’

14 N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ụfọdụ ndị Izrel, ndị bụ́ akụkụ nke mba a raara nye Jehova, alụwo ndị na-adịghị efe ya. Ihe ndị gbara okwu ahụ gburugburu na-enyere anyị aka ịhụ ihe mere nke ahụ ji dị oké njọ. Amaokwu nke 10 na-ekwu na ha nwere otu nna. Nke a apụtaghị Jekọb (onye a gụgharịrị aha bụ́ Izrel), ma ọ bụ Ebreham, ma ọ bụkwanụ Adam. Malakaị 1:6 na-egosi na ọ bụ Jehova bụ “otu nna” ahụ. Ya na mba Izrel na-emekọrịta ihe, ha so n’ọgbụgba ndụ ya na ndị nna nna ha gbara. Otu n’ime iwu ndị dị n’ọgbụgba ndụ ahụ bụ: “Gị na ha alụrịtakwala nwunye; enyela nwa ya nwoke nwa gị nwanyị, ekurukwala nwa ya nwanyị nye nwa gị nwoke.”—Deuterọnọmi 7:3.

15. (a) Olee otú ụfọdụ pụrụ isi nwaa ime ka ịlụ onye na-ekweghị ekwe yie ihe ziri ezi? (b) Olee otú Jehova si kwupụta uche ya n’ihe banyere alụmdi na nwunye?

15 Ụfọdụ ndị taa pụrụ iche, sị: ‘Onye dọọrọ mmasị m bụ ezigbo mmadụ. Ma eleghị anya, ka oge na-aga, ọ ga-anakwere ezi ofufe.’ Echiche dị otú ahụ na-akwado ịdọ aka ná ntị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị nghọta ka ọ bụkwa.” (Jeremaịa 17:9) E kwupụtara echiche Chineke banyere ịlụ onye na-ekweghị ekwe na Malakaị 2:12: “Jehova [ga-ebipụ] onye ahụ nke na-eme nke a.” Ya mere, a gbara Ndị Kraịst ume ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Ná ndokwa Ndị Kraịst, a naghị ‘ebipụ’ onye kwere ekwe n’ihi ịlụ onye na-ekweghị ekwe. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ na-ekweghị ekwe anọgide n’ekweghị ekwe ya, gịnị ga-eme onye ahụ mgbe Chineke ga-eme ka usoro ihe a gwụsịa n’oge na-adịghị anya?—Abụ Ọma 37:37, 38.

Mmadụ Imegbu Onye Òtù Ọlụlụ Ya

16, 17. Olee omume aghụghọ nke ụfọdụ ndị mere?

16 Malakaị tụleziri aghụghọ nke abụọ: mmadụ imegbu onye òtù ọlụlụ ya, karịsịa site n’ịgba ya alụkwaghịm n’ụzọ na-ezighị ezi. Amaokwu nke 14 nke isi 2 na-asị: “Jehova abụrụwo onye àmà n’etiti gị na nwunye ị lụtara n’okorobịa, onye gị onwe gị ghọgbuworo, ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ nwanyị e jikọtara gị na ya, na nwunye ọgbụgba ndụ gị.” Site n’ịghọgbu ndị nwunye ha, ndị di bụ́ ndị Juu mere ka ebe ịchụàjà Jehova ‘jupụta n’anya mmiri.’ (Malakaị 2:13) Ndị ikom ahụ na-agba alụkwaghịm n’ihi ihe ndị na-enweghị isi, na-ahapụ, n’ụzọ na-ezighị ezi, nwunye ha lụrụ n’okorobịa, ikekwe iji lụọ ụmụ agbọghọ ma ọ bụ ndị inyom na-ekpere arụsị. Ndị nchụàjà ahụ na-arụrụ aka kwekwara ka nke ahụ na-eme! Ma, Malakaị 2:16 na-ekwu, sị: “Ọ kpọwo nchụpụ nwunye asị, otú a ka Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, sịrị.” Mgbe e mesịrị, Jizọs gosiri na ịkwa iko bụ nanị ihe ga-eme ka a gbaa alụkwaghịm nke ga-eme ka onye nke aka ya dị ọcha nwere onwe ya ịlụ onye ọzọ.—Matiu 19:9.

17 Tụgharịa uche n’ihe ndị Malakaị kwuru ma hụ otú ha si emetụ n’obi ma na-akpali mmetụta obiọma e bu pụta ụwa. Ọ na-ezo aka na “nwanyị e jikọtara gị na ya, na nwunye ọgbụgba ndụ gị.” Nwoke ọ bụla o metụtara lụrụ onye ya na ya na-efekọ ofufe, nwanyị bụ́ onye Izrel, na-ahọrọ ya dị ka onye ibe ọ hụrụ n’anya, onye e jikọtara ya na ya ruo ogologo ndụ ha. Ọ bụ ezie na alụmdi na nwunye ahụ weere ọnọdụ ma eleghị anya mgbe ha ka bụ nwa okorobịa na nwa agbọghọ, ngafe nke oge na ime agadi emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ, ya bụ, nkwekọrịta alụmdi na nwunye, kwụsị ịdị irè.

18. N’ụzọ dị aṅaa ka ndụmọdụ Malakaị banyere ịghọgbu mmadụ si dị irè n’oge a?

18 Ndụmọdụ metụtara okwu ndị ahụ dịkwa irè n’otu aka ahụ taa. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị na-eleghara nduzi Chineke n’ihe banyere ịlụ nanị n’ime Onyenwe anyị anya. Ọ dịkwa mwute na ụfọdụ adịghị anọgide na-arụ ọrụ iji mee ka alụmdi na nwunye ha sie ike. Kama nke ahụ, ha na-anwa inye ihe ngọpụ ma na-agbaso omume Chineke kpọrọ asị site n’ịgba alụkwaghịm n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị iji wee lụrụ onye ọzọ. N’ime otú ahụ, ha ‘na-eme ka ike gwụ Jehova.’ Laa azụ n’oge Malakaị, ndị ahụ leghaara ndụmọdụ Chineke anya nwere anyaike ọbụna iche na echiche Jehova ezighị ezi. Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ha kwuru, sị: “Olee ebe Chineke nke ikpe nọ?” Lee echiche hiere ụzọ nke ahụ bụ! Ka anyị ghara ịdaba n’ụdị ọnyà ahụ.—Malakaị 2:17.

19. Olee otú ndị di na nwunye pụrụ isi nweta mmụọ nsọ Chineke?

19 N’akụkụ dị mma, Malakaị na-egosi na ụfọdụ ndị bụ́ di adịghị aghọgbu ndị nwunye ha. Ha ‘nwere ihe fọdụrụ ná mmụọ nsọ Chineke.’ (Amaokwu nke 15) N’ụzọ na-enye obi ụtọ, e nwere ọtụtụ ndị ikom dị otú ahụ ná nzukọ Chineke taa, bụ́ ndị ‘na-ekenye nwunye ha nsọpụrụ.’ (1 Pita 3:7 ) Ha adịghị eti nwunye ha ihe ma ọ bụ na-agwa ha okwu ọjọọ, ha adịghị esi ọnwụ inwe mmekọahụ rụrụ arụ, ha adịghịkwa eleda nwunye ha anya site n’inwe ndị iko nwanyị ma ọ bụ site n’ikiri ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ. Nzukọ Jehova nwekwara obi ụtọ inwe ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ nwunye na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ndị na-eguzosi ike n’ihe nye Chineke na iwu ya. Ndị ikom na ndị inyom nile dị otú ahụ maara ihe Chineke kpọrọ asị, ha na-echekwa echiche ma na-eme omume n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ. Nọgide na-eme ka ha, ‘na-erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị’ ma bụrụ onye ọ ga-eji mmụọ nsọ ya gọzie.—Ọrụ 5:29.

20. Oge dị aṅaa na-eru nso nye ihe nile a kpọrọ mmadụ?

20 N’isi nso, Jehova ga-akpọ ụwa a dum ikpe. Onye ọ bụla gaje ịza ya ajụjụ maka nkwenkwe na omume ya. “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Ndị Rom 14:12) Ya mere, ugbu a, otu ajụjụ na-akpali iche echiche bụ: Ònye ga-alanahụ ụbọchị Jehova? Isiokwu nke atọ bụ́kwa nke ikpeazụ n’usoro isiokwu a ga-atụle nke ahụ.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

• N’ihi ihe dị aṅaa bụ́ isi ka Jehova ji katọọ ndị nchụàjà nọ n’Izrel?

• N’ihi gịnị ka ụkpụrụ Chineke na-ejighị bụrụ ihe ụmụ mmadụ na-agaghị edebeli?

• N’ihi gịnị ka anyị ga-eji na-elezi anya n’ihe anyị na-ezi taa?

• Omume abụọ dị aṅaa ka Jehova katọrọ karịsịa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 15]

N’oge Malakaị, a katọrọ ndị nchụàjà n’ihi edebeghị ụkpụrụ Jehova

[Foto dị na peeji nke 16]

Anyị aghaghị ilezi anya ịkụzi ụzọ Jehova, ọ bụghị ịkwalite ihe ndị na-amasị anyị

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jehova katọrọ ndị Izrel bụ́ ndị gbara nwunye ha alụkwaghịm n’ihi ihe ndị na-enweghị isi ma lụrụ ndị inyom na-ekpere arụsị

[Foto dị na peeji nke 18]

Ndị Kraịst taa na-asọpụrụ ọgbụgba ndụ alụmdi na nwunye ha