Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye Ọ Bụla Pụrụ Inwe Nkwarụ

Onye Ọ Bụla Pụrụ Inwe Nkwarụ

Onye Ọ Bụla Pụrụ Inwe Nkwarụ

NDỊ agha bụ́ ndị nwara ịmanye Christian, bụ́ onye bi n’otu mba dị n’Africa, isonye n’òtù ndị agha tọọrọ ya, ma ọ jụrụ ikwenyere ha n’ihi akọ na uche ya e ji Bible zụọ. Mgbe ahụ, ndị agha ahụ kpọọrọ ya gaa n’ogige ndị agha bụ́ ebe, mgbe ha tisịrị ya ihe ruo ụbọchị anọ, otu n’ime ha gbara ya egbe n’ụkwụ. Christian jisiri ike garuo n’ụlọ ọgwụ, mana e bepụrụ ya ụkwụ ma a gafetụ ikpere ya. Ná mba ọzọ dị n’Africa, ndị nnupụisi ji ngwá agha ebepụwo ọbụna aka ma ọ bụ ụkwụ nke obere ụmụaka. Sitekwa na Cambodia ruo mba ndị dị na Balkan, site n’Afghanistan ruo Angola, ogbunigwe anọgidewo na-akwarụ ndị na-eto eto na ndị agadi aghara aghara.

Ihe ndị ọzọ na-akpatakwa nkwarụ bụ ihe ọghọm na ọrịa, dị ka ọrịa shuga. Ọbụna nsí ndị dị gburugburu ebe obibi pụrụ ịkpata nkwarụ. Dị ka ihe atụ, n’ógbè ndị dịdebere ibe ha n’otu obodo ukwu dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, a mụwo ọtụtụ ụmụaka na-enweghị otu ogwe aka. Nanị ihe ha nwere bụ aka dị mkpirikpi nke gafetụrụ ikpere aka ha. Ihe àmà na-egosi na ihe kpatara ya bụ mmebi ọgwụ mebiri mkpụrụ ndụ ihe nketa ha. Imerime ndị ọzọ ka nwere aka na ụkwụ ma, otú o sina dị, ha nwekwara nkwarụ n’ihi ahụ́ mkpọnwụ ma ọ bụ ụfọdụ nsogbu ndị ọzọ. N’ezie, onye ọ bụla pụrụ inwe nkwarụ.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, nkwarụ pụrụ ịbụ ihe na-agbawa obi. E bepụrụ Junior ụkwụ aka ekpe ma a gafesịa ikpere ya mgbe ọ dị afọ 20. O mesịrị kwuo, sị: “Ọtụtụ mgbe, enwere m ihe mgbu nke mmetụta uche. Ebere m ákwá nke ukwuu n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ụkwụ m agaghị ezu ezu ọzọ ma ọlị. Amaghị m ihe m ga-eme. Enwere m mgbagwoju anya.” Otú ọ dị, ka oge na-aga, àgwà Junior gbanwere n’ụzọ dị ịrịba ama. Ọ malitere ịmụ Bible ma mụta ihe ndị na-abụghị nanị na ha enyeworo ya aka ịnagide nsogbu ya kamakwa ha enyewo ya olileanya dị ebube nke ọdịnihu obi ụtọ kpọmkwem n’ụwa ebe a. Ọ bụrụ na i nwere nkwarụ, ọ̀ ga-amasị gị iso nwee olileanya ahụ?

Ọ bụrụ otú ahụ, biko gụzie isiokwu na-esonụ. Anyị na-atụ aro ka i jiri Bible nke gị gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha ka i wee nwee ike ịhụ n’onwe gị ihe Onye Okike kwadebewooro ndị mụtara nzube ya ma mee ka ndụ ha kwekọọ na ya.