Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Otu Nwa Nwoke Si Nyere Nna Ya Aka

Otú Otu Nwa Nwoke Si Nyere Nna Ya Aka

Otú Otu Nwa Nwoke Si Nyere Nna Ya Aka

JAMES, bụ́ onye si England, nke nọ ná mmalite afọ ndị 30 ya, nwere nsogbu dị oké njọ nke isi akpakọghị ọnụ na nke amaghị onwe ya. Ma, ruo ọtụtụ afọ, o sorowo nne ya na nwanne ya nwanyị na-aga nzukọ nke Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, ọ dịbeghị mgbe nna ya gosiri mmasị dị ukwuu na nkwenkwe ha. N’otu uhuruchi, mgbe e nwesịrị nzukọ nke a nọ na ya mee ihe ngosi banyere otú e si akpọ onye a maara òkù ịbịa Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst, James gbabara n’ọnụ ụlọ ya. N’ịbụ onye nwere nchegbu, nne ya sochiri ya ma hụ ya ka ọ nọ na-achọsi mbipụta ndị ochie nke magazin Ụlọ Nche na Teta! ike. Ọ họọrọ otu nke bu akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta na peeji nke azụ ya ma gbakwuru nna ya. Ya eburu ụzọ tụọ aka na foto ahụ ma tụzie nna ya aka ma sị, “Gị!” Nne ya na nna ya lere ibe ha anya n’ijuanya ka ha ghọtara na James na-akpọ nna ya òkù ịbịa Ememe Ncheta. Nna ya kwuru na ya pụrụ ịga.

N’uhuruchi ụbọchị Ememe Ncheta ahụ, James gara n’ebe nna ya na-ekosa uwe ya, họrọ otu traụza, wetara ya nna ya, ma jiri aka gwa ya ka o yinye ya. Nna ya zaghachiri na ya agaghị aga nzukọ ahụ. N’ihi ya, James na nne ya gawara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze nanị ha.

Otú ọ dị, oge ụfọdụ mgbe e mesịrị, James bịara na-agbawanye isi akwara mgbe nne ya na-anwa ịkwadebe ya maka nzukọ ọgbakọ, ọ bịara họrọ iso nna ya na-anọ n’ụlọ kama ịga nzukọ. E mesịa, n’otu ụtụtụ Sunday, James gbara isi akwara ka nne ya na-anwa ịkwadebe ya maka nzukọ. N’ụzọ juru nnọọ nne ya anya, nna James lere James anya ma kwuo, sị: “James, ọ bụrụ na mụ agaa nzukọ taa, ị̀ ga-aga?” James mụmụrụ ọnụ ọchị. Ya amakụọ nna ya ma kwuo sị “Ee!,” ha atọ gawakwara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Site n’ụbọchị ahụ gawa, nna James nọgidere na-aga nzukọ nile a na-enwe na Sunday, n’oge na-adịghịkwa anya, o kwupụtara na ọ bụrụ na ya gaje inwe ọganihu, na ya aghaghị ịdị na-agakwa nzukọ ndị ọzọ. (Ndị Hibru 10:24, 25) O mere nke a, ọnwa abụọ mgbe e mesịkwara, ọ malitere ịmụchi Bible anya. O nwere ọganihu ngwa ngwa, ozugbo ahụ ọ malitere ime mgbanwe ndị dị mkpa ná ndụ ya, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ malitere ikere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze. Otu afọ ka ọ malitesịrị ịmụ Bible, ọ raara ndụ ya nye Jehova ma gosipụta nke a site n’ịbụ onye e mikpuru n’ime mmiri. Ka ọ dị ugbu a, ọ na-eje ozi dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ ya. Ugbu a, ndị nile nọ n’ezinụlọ ahụ na-ejere Jehova ozi n’ịdị n’otu.