Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-enwe Ekele Maka Ịhụnanya Chineke?

Ị̀ Na-enwe Ekele Maka Ịhụnanya Chineke?

Ị̀ Na-enwe Ekele Maka Ịhụnanya Chineke?

N’OTU oge, nwoke ahụ bụ́ Job ji okwu ndị a kọwaa ọnọdụ ezughị okè nke mmadụ: “Mmadụ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ. Dị ka okooko osisi ka ọ pụtaworo, e wee na-ebipụ ya: o wee na-agbalaga dị ka onyinyo, ọ dịghị eguzokwa.” (Job 14:1, 2) Dị ka Job na-enwe ahụmahụ ya mgbe ahụ, ndụ jupụtara ná nhụjuanya na iru újú. Ọ̀ dịtụwo mgbe ọ dịrị gị otú ahụ?

Otú ọ dị, n’agbanyeghị ihe isi ike na nsogbu ndị anyị pụrụ iche ihu, olileanya siri ike dị, bụ́ nke dabeere n’ọmịiko na ịhụnanya Chineke. Nke mbụ, Nna anyị nke eluigwe nwere obi ebere enyewo àjà mgbapụta iji gbapụta ihe a kpọrọ mmadụ n’ọnọdụ ha dara ada nke mmehie. Dị ka Jọn 3:16, 17 na-ekwu, Jizọs Kraịst sịrị: “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. N’ihi na Chineke zitere Ọkpara ya [Jizọs] n’ime ụwa, ọ bụghị ka o kpee ụwa ikpe, kama ka e wee zọpụta ụwa site na ya.”

Tụleekwa àgwà obiọma Chineke nwere n’ebe anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ. Pọl onyeozi kwuru, sị: “O sitekwara n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum, o kpebikwara oge a kara aka na ókè a kpaara ebe obibi nke ụmụ mmadụ, ka ha wee chọọ Chineke, ma ọ bụrụ na ha ga-asọ ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na, n’eziokwu, ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:26, 27) Cheedị banyere ya! Ọ bụ ezie na anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, anyị ka pụrụ iso Onye Okike anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova Chineke, nwee mmekọrịta.

Ya mere, anyị pụrụ iji obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu, na-amara na Chineke na-eche banyere anyị nakwa na o jiriwo ịhụnanya mee ndokwa ga-abara anyị uru n’ụzọ na-adịgide adịgide. (1 Pita 5:7; 2 Pita 3:13) Ya mere, n’ezie, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji mụtakwuo banyere Chineke anyị na-ahụ n’anya site n’ịmụ Okwu ya, bụ́ Bible.