Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

Ònye Bụ Chineke?

“CHINEKE bụ aha a na-akpọkarị isi iyi na ike kasịnụ n’eluigwe na ala na onye a na-efe ofufe,” ka akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu. Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kọwara okwu ahụ bụ́ “Chineke” dị ka “onye kasịnụ dị adị.” Gịnị bụ ọdịdị nke onye ahụ dị egwu dị adị?

Chineke ọ̀ bụ ikike na-abụghị onye ka ọ̀ bụ onye dị adị? Ò nwere aha? Ọ̀ bụ chi dị atọ ma bụrụ otu, Atọ n’Ime Otu, dị ka ọtụtụ ndị kweere? Olee otú anyị pụrụ isi mata Chineke? Bible na-enye azịza ndị bụ́ eziokwu na ndị na-eju afọ maka ajụjụ ndị a. N’ezie, ọ na-agba anyị ume ịchọ Chineke, na-asị: “Ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.”—Ọrụ 17:27.

Ikike Na-abụghị Onye Ka Ọ̀ Bụ Onye Dị Adị?

Ọtụtụ ndị kweere na Chineke na-eche na ọ bụ ikike, ọ bụghị onye. Dị ka ihe atụ, n’ọdịbendị ụfọdụ, e werewo ike okike dị iche iche dị ka chi. Ụfọdụ ndị nyochaworo ihe àmà ndị e nwetara site ná nnyocha sayensị banyere ọdịdị nke eluigwe na ala na banyere ndụ dị n’elu ala ekwubiwo na a ghaghị inwe Ihe Mbụ Kpatara Ihe. Otú o sina dị, ha na-ala azụ ikwu na Ihe a Kpatara Ihe bụ onye.

Ma, ọ̀ bụ na ịdị mgbagwoju anya nke ihe ndị e kere eke adịghị egosi na Ihe Mbụ ahụ Kpatara Ihe aghaghị inwewo ọgụgụ isi dị ukwuu? Ọgụgụ isi chọrọ uche. Uche dị nkọ nke e ji kee ihe nile bụ nke Chineke n’onwe ya. Ee, Chineke nwere ahụ́, ọ bụghị nke nkịtị dị ka nke anyị, kama ọ bụ ahụ́ mmụọ. “Ọ bụrụ na e nwere anụ ahụ́,” ka Bible na-ekwu, “e nwekwara ahụ́ nke mmụọ.” (1 Ndị Kọrint 15:44) N’ịkọwa ọdịdị nke Chineke, Bible na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Mmụọ nwere ụdị ndụ dị nnọọ iche na nke anyị, ụmụ mmadụ apụghịkwa ịhụ ya. (Jọn 1:18) E nwekwara ndị mmụọ e kere eke a na-adịghị ahụ anya. Ha bụ ndị mmụọ ozi—“ụmụ Chineke.”—Job 1:6; 2:1.

Ebe ọ bụ na Chineke bụ onye a na-ekeghị eke nke nwere ahụ́ mmụọ, n’ụzọ ezi uche dị na ya, o nwere ebe obibi. N’izo aka n’ógbè ndị bụ́ mmụọ, Bible na-agwa anyị na eluigwe bụ ‘ọnọdụ obibi guzosiri ike’ nke Chineke. (1 Ndị Eze 8:43) Ọzọkwa, onye so dee Bible bụ́ Pọl na-ekwu, sị: ‘Kraịst banyere n’ime eluigwe n’onwe ya ịpụta n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.’—Ndị Hibru 9:24.

E jikwa okwu ahụ bụ́ “mmụọ” mee ihe na Bible n’echiche ọzọ. N’ịgwa Chineke okwu n’ekpere, ọbụ abụ ahụ sịrị: “Ị na-ezipụ Mmụọ Gị, e kee ha.” (Abụ Ọma 104:30) Mmụọ a abụghị Chineke n’onwe ya kama ọ bụ ikike nke Chineke na-ezipụ, ma ọ bụ na-eji eme ihe iji mezuo ihe ọ bụla ọ chọrọ. Chineke ji ya kee eluigwe, ụwa, na ihe nile dị ndụ. (Jenesis 1:2; Abụ Ọma 33:6) A na-akpọ mmụọ ya, mmụọ nsọ. Chineke ji mmụọ nsọ ya kpalie ndị ikom dere Bible. (2 Pita 1:20, 21) N’ihi ya, mmụọ nsọ bụ ikike a na-adịghị ahụ anya nọ n’ọrụ bụ́ nke Chineke ji emezu nzube ya.

Chineke Nwere Aha Pụrụ Iche

Onye so dee Bible bụ́ Agua jụrụ, sị: “Ònye chịkọtaworo ifufe n’ime nkwụkwụba aka Ya abụọ? Ònye kegideworo mmiri n’uwe Ya? Ònye meworo ka nsọtụ nile nke ụwa guzosie ike? Gịnị bụ aha Ya, gịnị bụkwa aha nwa Ya?” (Ilu 30:4) Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Agua na-ajụ sị, ‘Ị̀ maara aha ma ọ bụ usoro ọmụmụ nke mmadụ ọ bụla nke meworo ihe ndị a?’ Ọ bụ nanị Chineke nwere ike nke ịchịkwa ike ndị si n’okike. Ọ bụ ezie na ihe ndị e kere eke na-enye ihe àmà dị ike na Chineke dị adị, ha adịghị ekwu ihe bụ́ aha Chineke. N’ezie, anyị apụghị ịmata aha Chineke ma ọlị ọ gwụla ma Chineke n’onwe ya ọ gwara anyị ya. O mewokwa otú ahụ. “Mụ onwe m bụ Jehova,” ka Onye Okike na-asị, “nke ahụ bụ aha m.”—Aịsaịa 42:8.

Aha Chineke nke pụrụ iche, bụ́ Jehova, pụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ugboro 7,000 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nanị. Jizọs Kraịst mere ka ndị ọzọ mara aha ahụ ma too ya n’ihu ha. (Jọn 17:6, 26) A na-ahụ aha ahụ n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible dị ka akụkụ nke okwu ahụ bụ́ “Haleluja,” nke pụtara “toonụ Jaa.” “Jaa” bụkwa mkpọbiri nke aha ahụ bụ́ “Jehova.” (Mkpughe 19:1-6) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ Bible nke oge a ejikebeghị aha ahụ mee ihe. Ha na-ejikarị okwu bụ́ “ONYENWE ANY” ma ọ bụ “CHINEKE” eme ihe, bụ́ ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu iji mee ka ha dị iche n’utu aha ndị a na-ejikarị eme ihe bụ́ “Onyenwe anyị” na “Chineke.” Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-atụ aro na ọ pụrụ ịbụ na otú e si akpọpụta aha Chineke bụ Yahweh.

N’ihi gịnị ka e ji nwee echiche ndị dịrịtara iche otú ahụ banyere aha nke Onye kasị ukwuu n’eluigwe na ala? Nsogbu ahụ malitere ọtụtụ narị afọ gara aga mgbe ndị Juu ji n’ihi nkwenkwe ụgha kwụsị ịkpọ aha Chineke ma malite iji okwu Hibru e ji eme ihe maka “Eze Onyenwe Anyị” na-edochi aha Chineke n’ebe ọ bụla ha hụrụ ya ka ha na-agụ Akwụkwọ Nsọ. Ebe ọ bụ na e jighị ụdaume dee asụsụ Hibru nke oge Bible, ọ dịghị ụzọ a pụrụ isi mara kpọmkwem otú Mozis, Devid, na ndị ọzọ dịrị ndụ n’oge ochie si kpọpụta mkpụrụ akwụkwọ ndị mejupụtara aha Chineke. Otú ọ dị, a nọwo na-eji ụzọ Igbo e si akpọpụta ya, bụ́ Jehova, na-eme ihe eri ọtụtụ narị afọ, a na-anakwerekwa ụdị ya n’ọtụtụ asụsụ taa.—Ọpụpụ 6:3; Aịsaịa 26:4.

Ọ bụ ezie na e jighị n’aka otú e si kpọpụta aha Chineke na Hibru oge ochie, ihe ọ pụtara abụghị oké ihe omimi. Aha ya pụtara “Ọ Na-eme ka Ọ Ghọọ.” N’ụzọ dị otú a, Jehova Chineke na-eme ka a mara ya dị ka Onye Nzube Ukwu. Ọ na-eme mgbe nile ka nzube na nkwa ya nile mezuo. Ọ bụ nanị ezi Chineke ahụ, bụ́ onye nwere ike nke ime nke a, pụrụ izi ezi ịza aha ahụ.—Aịsaịa 55:11.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na aha ahụ bụ́ Jehova na-edo Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile iche pụọ n’ebe chi ọzọ nile dị. Ọ bụ ya mere aha ahụ ji pụta nnọọ ọtụtụ ugboro na Bible. Ọ bụ ezie na ọtụtụ nsụgharị ejighị aha Chineke mee ihe, Abụ Ọma 83:18 kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Gị onwe gị, Onye aha Gị bụ Jehova, nanị Gị, bụ Onye kachasị ihe nile elu n’elu ụwa nile.” N’oge ozi elu ala Jizọs Kraịst, ọ kụziiri ụmụazụ ya, sị: “Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’” (Matiu 6:9) Ya mere, anyị kwesịrị ịdị na-eji aha Chineke eme ihe mgbe anyị na-ekpe ekpere, mgbe anyị na-ekwu banyere ya, na mgbe anyị na-eto ya n’ihu ndị ọzọ.

Jizọs Ọ̀ Bụ Chineke?

Jehova Chineke n’onwe ya mere ka onye Ọkpara ya bụ doo anya. Ihe ndekọ Oziọma Matiu na-akọ na mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, “e nwekwara olu sitere n’eluigwe nke sịrị: ‘Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.’” (Matiu 3:16, 17) Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke.

Otú ọ dị, ụfọdụ ndị okpukpe na-asị na Jizọs bụ Chineke. Ndị ọzọ na-asị na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu. Dị ka ozizi a si kwuo, “Nna ahụ bụ Chineke, Ọkpara ahụ bụ Chineke, Mmụọ Nsọ bụ Chineke, ma otú ọ dị, e nweghị Chineke atọ kama ọ bụ otu Chineke.” E kweere na ha atọ “na-adịru ebighị ebi, harakwa nhata.” (The Catholic Encyclopedia) Echiche ndị dị otú ahụ hà ziri ezi?

Banyere Jehova, Akwụkwọ Nsọ e dere n’ike mmụọ nsọ na-asị: “Ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi, Gị onwe gị bụ Chineke.” (Abụ Ọma 90:2) Ọ bụ “Eze mgbe ebighị ebi”—o nweghị mmalite ma ọ bụ ọgwụgwụ. (1 Timoti 1:17) N’aka nke ọzọ, Jizọs bụ “onye e buru ụzọ mụọ n’ime ihe nile e kere eke,” “mmalite nke ihe Chineke kere.” (Ndị Kọlọsi 1:13-15; Mkpughe 3:14) N’izo aka n’ebe Chineke nọ dị ka Nna ya, Jizọs sịrị: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Jizọs kọwakwara na e nwere ihe ụfọdụ ndị ya na ndị mmụọ ozi na-amaghị kama bụrụ ndị nanị Chineke maara. (Mak 13:32) Ọzọkwa, Jizọs kpekuru Nna ya ekpere, na-asị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:42) Ònye ka ọ na-ekpegara ekpere ma ọ bụghị Onye ka ya elu? Ọ bụkwa Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ bụghị Jizọs n’onwe ya.—Ọrụ 2:32.

Ya mere, dị ka Akwụkwọ Nsọ si gosi, Jehova bụ Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile, Jizọs bụkwa Ọkpara ya. Ha abụọ ahaghị nhata tupu Jizọs abịa n’ụwa ma ọ bụ n’oge ọ dị ndụ n’ụwa; Jizọs ahaghịkwa ka Nna ya mgbe a kpọlitesịrị ya n’ọnwụ gaa n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 11:3; 15:28) Dị ka anyị hụworo, onye ahụ a sị na ọ bụ onye nke atọ n’Atọ n’Ime Otu, bụ́ mmụọ nsọ, abụghị onye. Kama nke ahụ, ọ bụ ikike Chineke na-eji emezu ihe ọ bụla ọ chọrọ. N’ihi ya, Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. * “Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otu,” ka Bible na-ekwu.—Deuterọnọmi 6:4.

Mara Chineke nke Ọma Karị

Iji hụ Chineke n’anya ma fee ya ofufe a na-ekewaghị ekewa nke ruuru ya, ọ dị anyị mkpa ịmara ya otú ọ dị n’ezie. Olee otú anyị pụrụ isi mata Chineke nke ọma karị? “Àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya bụ ndị a na-ahụ nke ọma site n’okike nke ụwa gaa n’ihu,” ka Bible na-ekwu, “n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ ike ebighị ebi na ịbụ Chineke ya.” (Ndị Rom 1:20) Otu ụzọ isi mara Chineke nke ọma karị bụ site n’iji obi ekele na-ekiri ma na-atụgharị uche n’ihe ndị o kere.

Otú ọ dị, ihe ndị e kere eke adịghị agwa anyị ihe nile dị anyị mkpa ịma banyere Chineke. Dị ka ihe atụ, iji ghọta na ọ bụ Onye bụ́ mmụọ n’ezie nke nwere aha pụrụ iche, ọ dị anyị mkpa inyoba anya na Bible. N’ezie, ịmụ Bible bụ ụzọ kasị mma isi mata Chineke nke ọma karị. N’Akwụkwọ Nsọ, Jehova na-agwa anyị ihe dị nnọọ ukwuu banyere ụdị Chineke ọ bụ. Ọ na-ekpughekwara anyị nzube ya dị iche iche ma na-ezi anyị ihe n’ụzọ ya. (Emọs 3:7; 2 Timoti 3:16, 17) Lee ka anyị pụrụ isi nwee obi ụtọ na Chineke na-achọ ka anyị “bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu” ka anyị wee nwee ike irite uru site ná ndokwa ịhụnanya ya! (1 Timoti 2:4) Ya mere, ka anyị mee mgbalị nile iji mụta ihe nile anyị pụrụ ịmụta banyere Jehova.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 19 Maka ntụle zuru ezu nke isokwu a, lee broshuọ bụ́ Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Chineke ji mmụọ nsọ ya kee ụwa, jirikwa ya kpalie ndị mmadụ ide Bible

[Foto dị na peeji nke 5]

Olu sitere n’eluigwe sịrị: “Nke a bụ Ọkpara m”

[Foto dị na peeji nke 7]

Jizọs kpegaara Chineke ekpere—Onye ka ya elu

[Foto dị na peeji nke 7]

Jizọs mere ka ndị ọzọ mara aha Chineke

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Anyị pụrụ ịmata Chineke nke ọma karị