Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Dị Anyị Mkpa Ịmata Onye Chineke Bụ

Ọ Dị Anyị Mkpa Ịmata Onye Chineke Bụ

Ọ Dị Anyị Mkpa Ịmata Onye Chineke Bụ

Ọ̀ BỤ na ị dịghị enwe obi ụtọ ịhụ eluigwe nke jupụtara na kpakpando n’abalị ihu ígwé ya gbachapụrụ agbachapụ? Ọ̀ bụ na ísì okooko osisi ndị tụrụ àgwà amaghị mma? Ọ̀ bụ na ọ dịghị atọ gị ụtọ igere egwu ụmụ nnụnụ na ụda nke ahịhịa ndị ikuku na-ebugharị? Leekwa ka azụ̀ whale ndị dị ike na anụ ndị ọzọ bi n’osimiri si bụrụ ihe ndị na-adọrọ mmasị! E nwekwara ụmụ mmadụ na akọ na uche ha bu pụta ụwa nakwa ụbụrụ dị nnọọ mgbagwoju anya. Ì si aṅaa akọwa otú ihe nile dị ebube gbara anyị gburugburu si malite ịdị?

Ụfọdụ kweere na ihe a nile pụtara na mberede. Ma ọ bụrụ otú ahụ, n’ihi gịnị ka ụmụ mmadụ ji kwere na Chineke? N’ihi gịnị ka ọgwụ dịgasị iche iche bụ́ ndị gwakọtara ọnụ na mberede ga-eji mepụta mmadụ ndị nwere mkpa ime mmụọ?

“Ikpe okpukpe bụ nnọọ ihe e bu pụta ụwa, ndị nọ n’ọnọdụ ọ bụla n’ụzọ akụ̀ na ụba na mmụta na-ekpekwa ya.” Okwu a chịkọtara nnyocha Prọfesọ Alister Hardy mere bụ́ nke o depụtara n’akwụkwọ ya bụ́ The Spiritual Nature of Man. Nnwale ndị e mere n’oge na-adịbeghị anya n’ụbụrụ emewo ka ndị ọkà mmụta sayensị banyere akwara ahụ́ kwuo na ọ pụrụ ịbụwo na “e kenyere” ụmụ mmadụ ikike ikpe okpukpe. Akwụkwọ bụ́ Is God the Only Reality? na-ekwu, sị: “Isi n’okpukpe na-achọ nzube . . . bụ ihe a ma ama n’ọdịbendị na ọgbọ nile kemgbe ihe a kpọrọ mmadụ malitere.”

Tụlee ihe otu nwoke gụrụ akwụkwọ kwubiri ihe dị ka afọ 2,000 gara aga. O dere, sị: “Ụlọ ọ bụla nwere onye wuru ya, ma onye wuru ihe nile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) N’ezie, amaokwu mbụ nke Bible na-ekwu, sị: “Na mbụ Chineke kere eluigwe na ụwa.”—Jenesis 1:1.

Otú ọ dị, ònye bụ Chineke? Ihe a kpọrọ mmadụ nwere azịza dịgasị iche iche nye ajụjụ a. Mgbe a jụrụ otu onye Japan dị afọ iri na ụma onye aha ya bụ́ Yoshi onye Chineke bụ, ọ zara, sị: “O doghị m anya. Abụ m onye Buddha, ọ dịbeghịkwa m mkpa ịma onye Chineke bụ.” Otú ọ dị, Yoshi kwetara na ọtụtụ ndị weere Buddha n’onwe ya dị ka chi. Nick, bụ́ ọchụ ntá ego dị afọ 60 na ụma, kweere na Chineke ma na-eche na ọ bụ ikike kasị ike. Mgbe a gwara Nick ka ọ kọwaa ihe ọ maara banyere Chineke, mgbe ọ gbachisịrị nkịtị ruo ogologo oge, ọ zara, sị: “Nnaa, ajụjụ ahụ tara nnọọ akpụ. Nanị ihe m pụrụ ikwu bụ na e nwere Chineke. Ọ dị adị”

Ụfọdụ ndị “na-efe ma na-ejere ihe Chineke kere eke ozi kama ife Onye Okike n’onwe ya.” (Ndị Rom 1:25, Today’s English Version) Ọtụtụ nde mmadụ na-efe ndị nna nna ha nwụrụ anwụ ofufe, na-ekwere na Chineke nọ ebe dị nnọọ anya nke na a pụghị iru ya eru. N’okpukpe Hindu, e nwere ọtụtụ chi na chi nwanyị. E fere ọtụtụ chi ndị dị ka Zus na Hamis ofufe n’oge ndịozi Jizọs Kraịst. (Ọrụ 14:11, 12) Ọtụtụ chọọchị nke Krisendọm na-akụzi na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu, nke ihe mejupụtara ya bụ Chineke Nna, Chineke Ọkpara, na Chineke Mmụọ Nsọ.

N’ezie, “e nwere ọtụtụ ‘chi’ na ọtụtụ ‘ndị nwenụ,’” ka Bible na-ekwu. Otú ọ dị, ọ na-agbakwụnye, sị: “Nye anyị e nwere n’ezie otu Chineke bụ́ Nna, onye ihe nile si n’aka ya dịrị.” (1 Ndị Kọrint 8:5, 6) Ee, e nwere nanị otu ezi Chineke. Ma ònye ka ọ bụ? Gịnị ka ọ dị ka ya? Ọ dị anyị mkpa ịmata azịza nke ajụjụ ndị a. Jizọs n’onwe ya kwuru n’ekpere o kpekuru Onye a, sị: “Nke a pụtara ndụ ebighị ebi, ha inweta ihe ọmụma banyere gị, bụ́ nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) E nwere ihe mere anyị ga-eji kwere na ọdịmma ebighị ebi anyị dabeere n’ịmata eziokwu banyere Chineke.

[Foto ndị dị na peeji nke 3]

Olee otú ha si malite ịdị?

[Ebe E Si Nweta Foto]

Azụ̀ whale: Site n’aka Tourism Queensland

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

IHU AKWỤKWỌ: Index Stock Photography © 2002