Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Na-edu Ndị Ziri Ezi

Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Na-edu Ndị Ziri Ezi

Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Na-edu Ndị Ziri Ezi

“MMADỤ nke nwanyị mụrụ, ụbọchị ndụ ya dị mkpụmkpụ, afọ ejuwokwa ya n’ahụhụ,” ka Bible na-ekwu. (Job 14:1) Ihe mgbu na nhụjuanya yiri ka ọ bụ ahụmahụ ụmụ mmadụ na-enwetakarị ná ndụ. Leenụ, ọbụna ndụ a na-adị kwa ụbọchị jupụtara ná nchegbu na oké ọgba aghara! Gịnị ga-eduzi anyị inwe ihe ịga nke ọma n’imeri ọnọdụ ndị tara akpụ ma nyere anyị aka ịnọgide na-enwe nguzo dị mma n’ebe Chineke nọ?

Tụlee ihe atụ nke otu ọgaranya aha ya bụ Job, onye biri ndụ ihe dị ka afọ 3,500 gara aga n’ebe bụzi Arebia. Lee ọdachi Setan wetaara nwoke a na-atụ egwu Chineke! Anụ ụlọ ya nile funahụrụ ya, ụmụ ya ọ hụrụ n’anya nwụnahụkwara ya. Oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Setan ji ihe ohihi jọgburu onwe ya tie Job site n’isi ya ruo n’ọbọ ụkwụ ya. (Job, isi nke 1, 2) Job amaghị ihe mere ihe ọjọọ ji adakwasị ya. N’agbanyeghị nke ahụ, “Job ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.” (Job 2:10) “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga [iguzosi ike n’ezi ihe, NW] m,” ka o kwuru. (Job 27:5) Ee, iguzosi ike n’ezi ihe Job duziri ya n’oge ọnwụnwa ya.

A na-akọwa iguzosi ike n’ezi ihe dị ka omume dị mma ma ọ bụ zuo ezuo, ọ na-agụnyekwa ịbụ onye na-enweghị ụta na onye na-enweghị ntụpọ n’anya Chineke. Otú ọ dị, ọ pụtaghị na ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ́ ndị ọ na-apụghị ikwe omume iru ụkpụrụ Chineke n’ụzọ zuru ezu, ga-ezu okè n’okwu ọnụ na n’omume. Kama nke ahụ, mmadụ iguzosi ike n’ezi ihe pụtara iji obi dum ma ọ bụ obi zuru ezu na-asọpụrụ Jehova ma na-eme uche na nzube ya. Nsọpụrụ Chineke dị otú ahụ na-eduzi, ma ọ bụ na-edu, ndị ziri ezi n’ọnọdụ nile nakwa n’oge nile. Akụkụ nke mbụ nke isi 11 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ilu na-egosi otú iguzosi ike n’ezi ihe anyị pụrụ isi duzie anyị n’akụkụ dịgasị iche iche nke ndụ ma na-emesi anyị obi ike banyere ngọzi ndị ga-esochinụ. Ya mere, ka anyị were ezi mmasị tụlee ihe e dere n’ebe ahụ.

Iguzosi Ike n’Ezi Ihe Na-eduga n’Ime Ihe n’Eziokwu n’Achụmnta Ego

N’ime ka ụkpụrụ nke ime ihe n’eziokwu pụta ìhè, na-eji okwu uri kama iji okwu iwu mee ihe, Eze Solomọn nke Izrel oge ochie na-asị: “Ihe osìsì aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova: ma nkume isì ihe zuru ezu bụ ihe na-atọ Ya ụtọ.” (Ilu 11:1) Nke a bụ nke mbụ n’ime ebe anọ e ji ihe osìsì na nkume isì ihe mee ihe n’akwụkwọ Ilu iji gosi na Jehova na-achọ ka ndị na-efe ya ofufe na-eme ihe n’eziokwu ná mmekọrịta azụmahịa ha.—Ilu 16:11; 20:10, 23.

Ọganihu ndị na-eji ihe osìsì aghụghọ eme ihe—ma ọ bụ ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu—na-enwe pụrụ ịbụ ihe na-adọrọ adọrọ. Ma ànyị ga-achọ n’ezie ịhapụ ụkpụrụ Chineke nke ezi ihe na ihe ọjọọ site n’itinye aka n’achụmnta ego jọgburu onwe ya? Anyị agaghị eme otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị iguzosi ike n’ezi ihe na-eduzi. Anyị na-ajụ emeghị ihe n’eziokwu n’ihi na nkume isì ihe zuru ezu, bụ́ ihe osìsì kwesịrị ekwesị nke na-egosi ime ihe n’eziokwu, na-atọ Jehova ụtọ.

“N’ebe Ndị Dị Umeala n’Obi Nọ Ka Amamihe Dị”

Eze Solomọn gara n’ihu, sị: “Nganga bịa, nlelị abịakwa: ma n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.” (Ilu 11:2) Nganga—ma è gosipụtara ya site ná mpako, nnupụisi, ma ọ bụ anyaụfụ—na-akpata ihe ihere. N’aka nke ọzọ, iji obi umeala na-amata ebe ike anyị ruru bụ ihe amamihe dị na ya. Lee ka ihe atụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ si eme ka ịbụ eziokwu nke ilu a pụta ìhè!

Otu onye Livaị nwere anyaụfụ, bụ́ Kora, duuru ìgwè ndị nnupụisi gaa iguzogide ịbụisi nke ndị ohu Jehova a họpụtara ahọpụta bụ́ Mozis na Erọn. Gịnị si n’omume nganga ahụ pụta? ‘Ala saghere ọnụ ya, lodaa’ ụfọdụ n’ime ndị nnupụisi ahụ, ebe ọkụ ripịara ndị ọzọ, gụnyere Kora. (Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3, 16-35; 26:10; Deuterọnọmi 11:6) Lee nlelị ọ bụ! Tụleekwa Ụza, bụ́ onye ji nganga gaa jide igbe ọgbụgba ndụ ahụ iji gbochie ya ịda. E tigburu ya ozugbo ahụ. (2 Samuel 6:3-8) Lee ka o si dị oké mkpa ka anyị jụ nganga!

A dịghị elelị onye dị umeala n’obi ọbụna mgbe o mehiere ihe. Ọ bụ ezie na Job setịpụrụ ihe nlereanya n’ọtụtụ ụzọ, o zughị okè. Ọnwụnwa ya mere ka a hụ ntụpọ dị nnọọ njọ n’ụzọ ụfọdụ o si eche echiche. N’ịgọchitere onwe ya n’ebe ndị na-ebo ya ebubo nọ, Job bịara gahietụ. Ọbụna o nyere echiche na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke. (Job 35:2, 3) Olee otú Jehova si gbazie echiche Job?

N’ịrụtụ aka n’ụwa, oké osimiri, eluigwe kpakpando jupụtara, ụfọdụ n’ime ụmụ anụmanụ, na n’ihe ndị ọzọ dị ebube e kere eke, Jehova kụziiri Job otú mmadụ si pee mpe ma e jiri ya tụnyere ịdị ukwuu nke Chineke. (Job, isi 38-41) Ọ dịghị ebe ọ bụla n’okwu ya nke Jehova kwuru ihe mere Job ji na-ata ahụhụ. Ọ dịghị ya mkpa ime otú ahụ. Job dị umeala n’obi. O ji obi umeala ghọta nnukwu ọdịiche dị n’etiti ya na Chineke, n’etiti ezughị okè na adịghị ike nke ya na ezi omume na ike nke Jehova. “M na-ajụ onwe m ajụ,” ka o kwuru, “wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.” (Job 42:6) Iguzosi ike n’ezi ihe Job mere ka ọ nara ịdọ aka ná ntị ahụ ozugbo. Gịnị banyere anyị? N’ịbụ ndị iguzosi ike n’ezi ihe na-edu, ànyị ga-adị njikere ịnara ịdọ aka ná ntị ma ọ bụ mgbazi mgbe ọ dị mkpa?

Mozis n’onwe ya dịkwa umeala n’obi. Mgbe ọ nọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ n’idozi nsogbu nke ndị ọzọ, nna nwunye ya, bụ́ Jetro, nyere ya ihe ngwọta dị irè: Kenye ndị ikom ndị ọzọ ruru eru ọrụ ụfọdụ. N’ịmata ebe ike ya ruru, Mozis ji amamihe nabata aro ahụ. (Ọpụpụ 18:17-26; Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Onye dị umeala n’obi adịghị ala azụ n’inyefe ndị ọzọ ikike, ọ dịghịkwa atụ egwu na ya na-anapụ onwe ya ikike n’ụzọ ụfọdụ site n’ikenye ndị ọzọ ruru eru ibu ọrụ kwesịrị ekwesị. (Ọnụ Ọgụgụ 11:16, 17, 26-29) Kama nke ahụ, ọ na-achọsi ike inyere ha aka inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. (1 Timoti 4:15) Ọ̀ bụ na o kwesịghị ịdị otú ahụ n’ebe anyị onwe anyị nọ?

‘Ụzọ Onye Na-enweghị Ụta Ziri Ezi’

N’ịghọta na iguzosi ike n’ezi ihe adịghị echebe ndị ziri ezi mgbe nile pụọ n’ihe ize ndụ ma ọ bụ ọdachi, Solomọn na-ekwu, sị: “[Iguzosi ike n’ezi ihe, NW] nke ndị ziri ezi na-edu ha: ma omume gbagọrọ agbagọ nke ndị na-aghọgbu aghọgbu ga-emebi ha.” (Ilu 11:3) N’ezie, iguzosi ike n’ezi ihe na-eduzi ndị ziri ezi ime ihe dị mma n’anya Chineke, ọbụna n’ọnọdụ ndị tara akpụ, ọ na-ewetakwa abamuru n’ikpeazụ. Job jụrụ ịhapụ iguzosi ike n’ezi ihe ya, Jehova “[gọzikwara] ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” (Job 42:12) Ndị na-aghọgbu aghọgbu pụrụ iche na ha ji ndị ọzọ emeta onwe ha mma, ọ pụkwara ọbụna iyi ka ihe ọ na-agaziri ha ruo oge ụfọdụ. Ma n’ikpeazụ, aghụghọ ha ga-ebibi ha.

“Akụ̀ adịghị aba uru n’ụbọchị nke nrubiga ókè nke iwe,” ka eze ahụ maara ihe na-ekwu, “ma ezi omume na-anapụta n’ọnwụ.” (Ilu 11:4) Lee ihe nzuzu ọ bụ ịgbara ihe onwunwe ohu ma na-eleghara ọmụmụ ihe onwe onye, ekpere, ịga nzukọ, na ozi ubi anya—kpọmkwem ihe omume ndị na-eme ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ mikwuo emie ma na-emekwu ka nsọpụrụ anyị nwere n’ebe ọ nọ sikwuo ike! Otú ọ sọkwara akụ̀ mmadụ ya hara, ọ pụghị ịnapụta ya n’oké mkpagbu ahụ na-abịanụ. (Matiu 24:21) Ọ bụ nanị ezi omume nke onye ziri ezi ga-eme ya. (Mkpughe 7:9, 14) Ya mere, anyị ga-abụ ndị maara ihe iburu arịrịọ Zefanaịa n’uche: “Mgbe ụbọchị iwe Jehova aka-abịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe O kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi.” (Zefanaịa 2:2, 3) Ka ọ dịgodị, ka anyị mee ka ọ bụrụ ebumnobi anyị ‘ịsọpụrụ Jehova site n’akụ̀ anyị.’—Ilu 3:9.

N’imesikwu ike uru ịgbaso ezi omume bara, Solomọn ji ihe ndị a na-apụghị ịta ụta na-enweta tụnyere ihe ndị na-emebi iwu na-enweta, na-asị: “Ezi omume nke onye [a na-apụghị ịta ụta] ga-eme ka ụzọ ya zie ezie: ma mmebi iwu nke aka ya ka onye na-emebi iwu ga-eji daa. Ezi omume nke ndị ziri ezi ga-anapụta ha: ma n’ọchịchọ nke ha na-achọsi ike ka a ga-anwụde ndị na-aghọgbu aghọgbu. Mgbe mmadụ nke na-emebi iwu nwụrụ, olileanya ya ga-ala n’iyi: ọzọ, nchere nke ajọ ihe nile alawo n’iyi. A dọpụtawo onye ezi omume n’ahụhụ, onye na-emebi iwu ewee baa n’ọnọdụ ya.” (Ilu 11:5-8) Onye a na-apụghị ịta ụta adịghị ada n’ụzọ ya, a dịghịkwa amata ya n’ọnyà n’ihe ndị ọ na-eme. Ụzọ ya kwụ ọtọ. N’ikpeazụ, a na-anapụta ndị ziri ezi ná nsogbu. Ndị ajọ omume pụrụ iyi ndị dị ike, ma nnapụta dị otú ahụ adịghịrị ha.

“Obi Ndị Obodo Ha Na-atọ Ha Ụtọ”

Iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị ziri ezi na ajọ omume nke ndị na-emebi iwu na-emetụtakwa ndị ọzọ. “Ọnụ ya ka onye e merụrụ emerụ ji ebibi mmadụ ibe ya,” ka eze Izrel na-ekwu, “ma ihe ọmụma ka a ga-eji dọpụta ndị ezi omume.” (Ilu 11:9) Olee onye na-agaghị ekweta na nkwutọ, asịrị na-emerụ ahụ́, njakịrị, na ekwurekwu na-emetụta ndị ọzọ n’ụzọ dị njọ? N’aka nke ọzọ, okwu onye ezi omume na-adị ọcha, bụrụ nke e chere echiche nke ọma, ma chebara ndị ọzọ echiche, wee kwuo. A na-anapụta ya n’ihi ihe ọmụma n’ihi na iguzosi ike n’ezi ihe ya na-agbara ya akaebe dị mkpa iji gosi na ndị na-ebo ya ebubo na-agha ụgha.

“N’ọdịmma nke ndị ezi omume obi ndị obodo ha na-atọ ha ụtọ,” ka eze ahụ gara n’ihu ikwu, “ọzọ, mgbe ndị na-emebi iwu na-ala n’iyi, iti mkpu ọṅụ dị.” (Ilu 11:10) N’ozuzu, ndị ọzọ na-ahụ ndị ezi omume n’anya, ha na-emekwa ka obi na-atọ ndị agbata obi ha ụtọ—ha na-eme ka ha na-enwe obi ụtọ na ọṅụ. Ọ dịghị onye na-enwe mmasị n’ezie n’ebe “ndị na-emebi iwu” nọ. Mgbe onye na-emebi iwu nwụrụ, ndị mmadụ n’ozuzu ha adịkebeghị eruru ya újú. N’ezie, a gaghị eru újú ọ bụla mgbe Jehova ‘ga-ebipụ ndị na-emebi iwu n’ụwa ma fopụ ndị na-aghọ aghụghọ na ya.’ (Ilu 2:21, 22) Kama nke ahụ, a ga-aṅụrị ọṅụ n’ihi na e kpochapụla ha. Ma gịnị banyere anyị? Anyị ga-eme nke ọma ịtụle ma otú anyị si ebi ndụ ọ̀ na-eme ka ndị ọzọ na-enwekwu ọṅụ.

‘E Bulie Obodo’

N’ijikwu mmetụta ndị ziri ezi na-enwe n’obodo tụnyere nke ndị na-emebi iwu na-enwe, Solomọn na-ekwu, sị: “E ji ngọzi nke ndị ziri ezi bulie obodo: ma e ji ọnụ ndị na-emebi iwu akwada ya.”Ilu 11:11.

Ndị obodo bụ́ ndị na-agbaso ụzọ ziri ezi na-akwalite udo na ọdịmma ma na-ewuli ndị ọzọ nọ n’obodo ha elu. N’ụzọ dị otú a, a na-ebuli obodo elu—ọ na-enwe ọganihu. Ndị na-ekwu okwu nkwutọ, okwu na-akpasu iwe, na nke na-adịghị mma na-akpata obi erughị ala, obi ilu, nkewa, na nsogbu. Ọ dị otú a karịsịa ma ọ bụrụ na mmadụ ndị dị otú ahụ bụ ndị a na-akwanyere ùgwù. Obodo dị otú ahụ na-enwe ọgba aghara, nrụrụ aka, na ndakpọ nke omume na ikekwe nke akụ̀ na ụba.

Ụkpụrụ ahụ e kwupụtara n’Ilu 11:11 metụtakwara ndị Jehova n’otu aka ahụ ka ha na ibe ha na-emekọrịta ihe n’ọgbakọ ha ndị yiri obodo. Ọgbakọ nke ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe—ndị ziri ezi bụ́ ndị iguzosi ike n’ezi ihe na-edu—na-enwe mmetụta n’ahụ́ ndị nọ na ya, bụ ìgwè nke ndị na-enwe obi ụtọ, ndị na-arụsi ọrụ ike, na ndị na-enye aka, na-ewetara Chineke nsọpụrụ. Jehova na-agọzi ọgbakọ ahụ, ọ na-enwekwa ọganihu n’ụzọ ime mmụọ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ ole na ole bụ́ ndị pụrụ ịdị na-ewe iwe ma ghara inwe afọ ojuju, ndị pụrụ ịdị na-akatọ ma na-ekwu okwu ọjọọ banyere ụzọ e si na-eme ihe, yiri ‘mkpọrọgwụ nsí dị na ya’ bụ́ ndị pụrụ ịgbasa ma merụọ ndị ọzọ bụ́ ndị na-enwebughị ụdị echiche ahụ. (Ndị Hibru 12:15) Ndị dị otú ahụ na-achọkarị ikike na ùgwù ka ukwuu. Ha na-eme ka a malite ịnụ kepu kepu na e nwere ikpe na-ezighị ezi, ajọ mbunobi agbụrụ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ha, n’ọgbakọ ma ọ bụ n’ebe ndị okenye nọ. N’ezie, ọnụ ha pụrụ ịkpata nkewa n’ọgbakọ. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ileghara okwu ha anya ma na-agbalịsi ike ịbụ ndị ji ihe ime mmụọ akpọrọ ihe bụ́ ndị na-akwalite udo na ịdị n’otu n’ọgbakọ?

N’ịga n’ihu, Solomọn na-asị: “Onye na-eleda mmadụ ibe ya anya, obi amamihe kọrọ ya: ma onye nghọta na-agba nkịtị. Onye na-ejegharị dị ka onye na-agba àmà ọjọọ na-ekpughe izu nzuzo: ma onye mmụọ ya kwesịrị ntụkwasị obi na-ekpuchi okwu.”Ilu 11:12, 13.

Lee oké ihe onye na-enweghị nghọta, ma ọ bụ onye “obi amamihe kọrọ” na-emebi! Ọ na-anọgide na-ekwubiga okwu ókè ruo n’ókè nke nkwutọ ma ọ bụ mkparị. Ndị okenye a họpụtara ahọpụta aghaghị ịdị ngwa n’ịkwụsị mmetụta dị otú ahụ na-adịghị mma. N’adịghị ka onye “obi amamihe kọrọ,” onye nwere nghọta na-ama mgbe o kwesịrị ịgba nkịtị. Kama ịbụ nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu, ọ na-ekpuchi okwu ahụ. N’ịmara na ire a na-akwaghị ngá pụrụ imebi ihe dị ukwuu, onye nwere nghọta ‘na-ekwesị ntụkwasị obi ná mmụọ ya.’ Ọ na-eguzosi ike n’ihe nye ndị kwere ekwe ibe ya, ọ dịghịkwa ekpughe izu nzuzo ndị pụrụ itinye ha n’ihe ize ndụ. Lee ngọzi ndị dị otú ahụ na-eguzosi ike n’ezi ihe bụụrụ ọgbakọ!

Iji nyere anyị aka ije ije n’ụzọ nke ndị a na-apụghị ịta ụta, Jehova na-enye anyị nri ime mmụọ n’ụba bụ́ ndị a na-akwadebe site ná nduzi nke “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45) Anyị na-enwetakwa enyemaka dị ukwuu n’onwe anyị site n’aka Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye nọ n’ọgbakọ anyị ndị yiri obodo. (Ndị Efesọs 4:11-13) N’ezie, anyị na-enwe ekele maka ha, n’ihi na “mgbe ọ na-adịghị ezi ndụmọdụ ọ bụla dị, ndị ahụ ga-ada: ma nzọpụta dị n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ.” (Ilu 11:14) Ihe ọ sọkwara ya mee, ka anyị kpebisie ike ‘ije ije n’iguzosi ike n’ezi ihe anyị.’—Abụ Ọma 26:1.

[Blueb on peeji 26]

Lee ihe nzuzu ọ bụ ịgbara ihe onwunwe ohu ma na-eleghara ọrụ ọchịchị Chineke anya!

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Iguzosi ike n’ezi ihe Job duziri ya, Jehova gọzikwara ya

[Foto dị na peeji nke 25]

Ụza nwụrụ n’ihi nganga ya