Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Yiri Ka Ha Na-emegiderịta Onwe Ha Banyere Tertullian

Ihe Ndị Yiri Ka Ha Na-emegiderịta Onwe Ha Banyere Tertullian

Ihe Ndị Yiri Ka Ha Na-emegiderịta Onwe Ha Banyere Tertullian

‘OLEE ebe Onye Kraịst na onye ọkà ihe ọmụma nọ yie? olee ebe onye na-emerụ eziokwu na onye na-emezi ya emezi ma na-akụzi ya nọ yie? Nkwekọrịta dị aṅaa dị n’etiti Ụlọ Akwụkwọ Nkà Ihe Ọmụma na Chọọchị?’ Ọ bụ Tertullian, bụ́ onye edemede na narị afọ nke abụọ na nke atọ O.A., jụrụ ajụjụ ndị ahụ na-ama aka. A bịara mara ya dị ka “onye a kasị si n’aka ya nweta akụkọ banyere Chọọchị nke oge ya na ozizi ndị e ziri na ya.” Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ dịghị ihe ọ bụla metụtara okpukpe nke ọ na-amaghị.

Ikekwe e ji okwu ndị yiri ka ha na-emegiderịta onwe ha mara Tertullian nke ọma, ndị dị ka ndị a: “Chineke na-adịzi ukwuu karịsịa mgbe Ọ dị ntakịrị.” “A ghaghị ikwere [n’ọnwụ nke Ọkpara Chineke], n’ihi na ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị na ya.” “E liri [Jizọs], ya esikwa n’ọnwụ bilie; eziokwu ahụ doro anya, n’ihi na ọ pụghị ikwe omume.”

Ọ bụghị nanị okwu Tertullian bụ ihe ndị yiri ka ha na-emegiderịta onwe ha. Ọ bụ ezie na o bu n’uche ka ihe odide ya na-agọpụrụ eziokwu ma na-egosipụta izi ezi nke chọọchị na ozizi chọọchị, n’ezie, o merụrụ ezi ozizi. Ozizi ndị bụ́ isi o webatara na Krisendọm mesịrị ghọọ ebe ndị edemede e nwere ka oge na-aga dabeere wee chepụta ozizi Atọ n’Ime Otu. Iji ghọta otú nke a si mee, ka anyị buru ụzọ tụletụ banyere Tertullian n’onwe ya.

“Okwu Anaghị Akọ Ya n’Ọnụ”

A maara ihe dị nnọọ nta banyere ndụ Tertullian. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kweere na a mụrụ ya n’ihe dị ka 160 O.A. na Carthage, n’Ebe Ugwu Africa. Ihe àmà na-egosi na ọ gụrụ akwụkwọ nke ọma ma soro ndị ọkà ihe ọmụma nke oge ya kpakọrịta. N’ụzọ doro anya, ihe dọtara ya n’Iso Ụzọ Kraịst bụ njikere ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst dị ịnwụ n’ihi okwukwe ha. Banyere Ndị Kraịst e gburu n’ihi okwukwe ha, ọ jụrụ, sị: “Olee onye chechara ihe banyere ya nke na-agaghị enwe mkpali ịjụ ihe kpatara ya? olee onye na-agaghị anakwere nkwenkwe anyị mgbe ọ jụsịrị ase?”

Mgbe a tọghatasịrị Tertullian gaa n’ihe a sị na ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst, ọ ghọrọ onye edemede ụbụrụ ya na-aghọ nkọ nke nwere nkà n’ịkpọ okwu aha na n’iji akọ na-ekwu okwu. “[O] nwere nkà nke dị ụkọ n’etiti ndị ọkà mmụta okpukpe,” ka akwụkwọ bụ́ The Fathers of the Church na-ekwu. “Okwu anaghị akọ ya n’ọnụ.” Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Tertullian [nwere] onyinye n’ikwu okwu ọ bụghị n’ide ihe ede, ọ dịkwa mfe karị ịghọta okwu amamihe ya karịa ịghọta arụmụka ya. Ikekwe ọ bụ nke a mere e ji ehotakarị okwu ya ma a dịghị ehota ahịrịokwu ya ọtụtụ ugboro.”

Ịgbachitere Iso Ụzọ Kraịst

Akwụkwọ Tertullian a kasị mara bụ Apology, bụ́ nke e lere anya dị ka ihe odide kasị dị irè n’ịgbachitere ihe a sị na ọ bụ Iso Ụzọ Kraịst. E dere ya mgbe ìgwè ndị na-eme ihe ike nwere nkwenkwe ụgha kpagburu Ndị Kraịst ugboro ugboro. Tertullian gbachiteere Ndị Kraịst a ma mee mkpesa banyere ụzọ ezi uche na-adịghị na ya e si na-emeso ha. Ọ sịrị: “[Ndị mmegide] chere na ọ bụ Ndị Kraịst na-akpata ọdachi nile ọha mmadụ na-enwe na ihe ndabara ọjọọ ọ bụla na-adabara ndị mmadụ. . . . Ọ bụrụ na Naịl asọbaghị n’ubi, ọ bụrụ na ihu igwe agbanweghị, ọ bụrụ na e nwee ala ọma jijiji, ụnwụ nri, na ihe otiti—ozugbo ahụ, a na-eti mkpu sị: ‘Tụbara ọdụm Ndị Kraịst!’”

Ọ bụ ezie na a na-ebokarị Ndị Kraịst ebubo na ha adịghị eguzosi ike n’ihe nye Ọchịchị, Tertullian gbalịsiri ike igosi na, n’ógbè ha nile, ha bụ n’ezie ụmụ amaala a pụrụ ịtụkwasị obi karịsịa. Mgbe ọ dọrọsịịrị uche gaa n’ọtụtụ mgbalị e mere ịkwatu ọchịchị, o chetaara ndị na-ekwugide ya na ndị na-agba izu mmegide ahụ bụ n’ezie ndị ọgọ mmụọ, ọ bụghị Ndị Kraịst. Tertullian mere ka ọ pụta ìhè na mgbe e gburu Ndị Kraịst, ọ bụ Ọchịchị na-enwe mfu n’ezie.

Akwụkwọ ndị ọzọ nke Tertullian kọrọ banyere ndụ Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, n’ihe odide ya bụ́ On the Shows, Tertullian dụrụ ọdụ megide ịnọ n’ebe ụfọdụ a na-eme ihe ntụrụndụ, egwuregwu ndị ọgọ mmụọ, na ihe nkiri. N’ụzọ doro anya, e nwere ndị a tọghatara ọhụrụ bụ́ ndị na-ahụghị mmegiderịta ọ bụla dị n’izukọta maka ntụziaka sitere na Bible na imesị gaa kirie egwuregwu ndị ọgọ mmụọ. N’ịgbalị ịkpali ikike iche echiche ha, Tertullian dere, sị: “Lee ka o si dị oké njọ isi na chọọchị Chineke gawa na nke ekwensu—isi n’ihe omume ime mmụọ gaa n’ihe omume anụ ọhịa.” O kwuru, sị: “Ihe unu jụrụ n’omume, unu ekwesịghị ịnabata ya n’okwu ọnụ.”

O Merụọ Eziokwu Ebe Ọ Na-agọpụrụ Ya

Tertullian malitere edemede ya nke isiokwu ya bụ́ Against Praxeas site n’ịsị: “Ekwensu emegidewo ma guzogide eziokwu n’ụzọ dịgasị iche iche. Mgbe ụfọdụ, nzube ya abụwo ibibi eziokwu site n’ịgọpụrụ ya.” A maghị onye a kpọrọ Praxeas n’edemede a nke ọma, ma Tertullian rụrụ ozizi ya banyere Chineke na Kraịst ụka. O lere Praxeas anya dị ka onye ọrụ Setan nke ji aghụghọ na-agbalị imerụ Iso Ụzọ Kraịst.

Otu ihe iseokwu dị ịrịba ama n’etiti ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst n’oge ahụ bụ mmekọrịta dị n’etiti Chineke na Kraịst. O siiri ụfọdụ n’ime ha ike, karịsịa ndị a zụlitere dị ka ndị Gris, ịghọta nkwekọ dị n’etiti nkwenkwe n’otu Chineke na ọrụ Jizọs dị ka Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta. Praxeas nwara idozi nsogbu ha site n’ịkụzi na Jizọs bụ nanị ụdị ọzọ nke Nna ahụ nakwa na ọ dịghị ihe dị iche n’etiti Nna ahụ na Ọkpara ahụ. Ozizi a, nke a maara dị ka ihe nwere ụdị dịgasị iche iche, na-ekwu na Chineke mere ka a mara ya “dị ka Nna n’oge Okike na n’oge ọ na-enye Iwu ahụ, dị ka Ọkpara ahụ n’ebe Jizọs Kraịst nọ, nakwa dị ka Mmụọ Nsọ mgbe Kraịst rịgosịrị n’eluigwe.”

Tertullian gosiri na Akwụkwọ Nsọ mere ka ọdịiche dị n’etiti Nna ahụ na Ọkpara ahụ doo anya. Mgbe o hotasịrị 1 Ndị Kọrint 15:27, 28, ọ tụgharịrị uche, sị: “Onye doro (ihe nile) n’okpuru, na Onye e doro ha n’okpuru ya—aghaghị ịbụ Ndị abụọ dị iche.” Tertullian dọọrọ uche gaa n’okwu Jizọs n’onwe ya kwuru, sị: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) N’iji akụkụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, dị ka Abụ Ọma 8:5, mee ihe, o gosiri otú Bible si akọwa “ịdị ala” nke Ọkpara ahụ. “Ya mere, Nna ahụ dị iche n’Ọkpara ahụ, ebe ọ bụ na ọ ka Ọkpara ahụ ukwuu,” ka Tertullian kwubiri. “Ebe ọ bụ na Onye mụrụ amụ bụ otu onye, Onye a mụkwara bụ onye ọzọ; Onye zitekwara ezite bụ otu onye, Onye e zitekwara bụ onye ọzọ; ọzọkwa, Onye kere eke bụ otu onye, Onye e sikwa n’aka ya kee ihe bụ onye ọzọ.”

Tertullian lere Ọkpara ahụ anya dị ka onye nọ n’okpuru Nna ahụ. Otú ọ dị, n’ịgbalị ịgbagha ozizi nke ihe nwere ụdị dịgasị iche iche, ọ ‘gabigara ihe ndị e dere ede.’ (1 Ndị Kọrint 4:6) Ka Tertullian gbalịrị n’ụzọ na-ezighị ezi iji ozizi ọzọ gosi na Jizọs bụ chi, o chepụtara ụkpụrụ nke “otu ihe nke ndị atọ mejupụtara.” N’iji echiche a mee ihe, ọ gbalịrị igosi na Chineke, Ọkpara ya, na mmụọ nsọ bụ ndị atọ dị iche bụ́ ndị dị n’otu ihe bụ́ Chineke. N’ụzọ dị otú a, Tertullian ghọrọ onye mbụ ji ụdị Latịn nke okwu bụ́ “atọ n’ime otu” mee ihe n’ebe Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na mmụọ nsọ nọ.

Kpachara Anya Maka Nkà Ihe Ọmụma Ụwa

Olee otú Tertullian si nwee ike ichepụta ozizi nke “otu ihe nke ndị atọ mejupụtara”? A na-achọta azịza ya n’ihe ọzọ na-emegide onwe ya banyere nwoke a—echiche ya banyere nkà ihe ọmụma. Tertullian kpọrọ nkà ihe ọmụma, “‘nkwenkwe’ mmadụ na ‘nke ndị mmụọ ọjọọ.’” Ọ katọrọ n’ihu ọha, omume nke iji nkà ihe ọmụma akwado eziokwu nke Ndị Kraịst. “Zere mgbalị nile a na-eme iguzobe Iso Ụzọ Kraịst e merụrụ emerụ nke Stoic, Plato, na Socrates,” ka o kwuru. N’agbanyeghị nke ahụ, Tertullian n’onwe ya jiri nkà ihe ọmụma ụwa mee ihe nke ukwuu mgbe o kwekọrọ n’echiche nke ya.—Ndị Kọlọsi 2:8.

Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu, sị: “Echiche na usoro ndị Gris dị mkpa maka nchepụta nke nkà mmụta okpukpe banyere Atọ n’Ime Otu.” Akwụkwọ bụ The Theology of Tertullian na-ekwukwa, sị: “[Ọ bụ] ngwakọta Tertullian ji nlezianya gwakọta echiche na okwu iwu na nke nkà mmụta okpukpe, nyeere ya aka ichepụta nkwenkwe Atọ n’Ime Otu n’ụzọ, ọ bụ ezie na o rughị eru ma zuo okè, nyere echiche e mesịrị dabere na ya guzobe nkwenkwe ahụ na Kansụl nke Nicaea.” N’ihi ya, echiche Tertullian—ndị atọ dị n’otu ihe bụ́ chi—keere okè bụ́ isi n’ịgbasa ihie ụzọ okpukpe na Krisendọm nile.

Tertullian boro ndị ọzọ ebube nke ibibi eziokwu ka ha na-agbalị ịgọpụrụ ya. Otú ọ dị, n’ụzọ na-emegide onwe ya, site n’iji Bible sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke gwakọta na nkà ihe ọmụma mmadụ, ọ dabara n’otu ọnyà ahụ. N’ihi ya, ka anyị buru n’uche ịdọ aka ná ntị Akwụkwọ Nsọ megide ‘ịṅa ntị n’okwu nduhie ndị sitere ná mkpali nke mmụọ na ozizi ndị mmụọ ọjọọ.’—1 Timoti 4:1.

[Foto dị na peeji nke 29, 30]

Tertullian katọrọ nkà ihe ọmụma ma jiri ya kwalite echiche nke ya

[Foto dị na peeji nke 31]

Ezi Ndị Kraịst na-ezere ịgwakọta eziokwu Bible na nkà ihe ọmụma mmadụ

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 29]

Peeji nke 29 na 30: © Cliché Bibliothèque nationale de France, Paris