Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmụba Dị Ịrịba Ama Emee Ka Iwusawanye Ihe Ngwa Ngwa Dị Mkpa

Mmụba Dị Ịrịba Ama Emee Ka Iwusawanye Ihe Ngwa Ngwa Dị Mkpa

“Bịakwutenụ m, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nwee Ume Ọhụrụ”

Mmụba Dị Ịrịba Ama Emee Ka Iwusawanye Ihe Ngwa Ngwa Dị Mkpa

“BỊAKWUTENỤ m, . . . m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ,” ka Jizọs Kraịst kwuru. (Matiu 11:28) Lee òkù na-enye obi ụtọ ọ bụ nke sitere n’ọnụ onye ahụ bụ́ Isi nke ọgbakọ Ndị Kraịst! (Ndị Efesọs 5:23) Mgbe anyị tụgharịrị uche n’okwu ndị ahụ, anyị ga-eji isi ihe dị oké mkpa na-enye ume ọhụrụ akpọrọ ihe n’ezie—mkpakọrịta nke anyị na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ anyị ná nzukọ Ndị Kraịst. N’ezie, anyị na-ekwenyere ọbụ abụ ahụ bụ́ onye bụrụ, sị: “Lee, ka o si dị mma, ka o si dịkwa ụtọ nke ukwuu, bụ́ mbikọ nke ụmụnne, ọbụna ibikọ n’otu!”—Abụ Ọma 133:1.

N’ezie, ndị anyị na ha na-akpakọrịta ná nnọkọ ofufe ndị ahụ bụ ndị kasị mma, ọnọdụ ime mmụọ a na-enwe ebe ahụ dị nchebe ma dị mma. N’ihi ya, e nwere ezi ihe mere otu Onye Kraịst na-eto eto ji sị: “M na-aga akwụkwọ ụbọchị nile, ọ na-agwụkwa m ike. Ma nzukọ yiri ala mmiri nke dị n’ọzara, bụ́ ebe m na-enweta ume ọhụrụ iji nagide nsogbu nke ụbọchị na-esonụ n’ụlọ akwụkwọ.” Otu onye na-eto eto bụ́ onye Nigeria kwuru, sị: “Achọpụtawo m na mụ na ndị ọzọ hụrụ Jehova n’anya ịdị na-akpachi anya na-enyere m aka ịnọ ya nso.”

Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova na-egbo mkpa dị ukwuu dị ka ebe bụ́ isi maka ezi ofufe n’obodo. N’ọtụtụ ebe, a na-enwe nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ọ dịkarịa ala, ugboro abụọ n’izu, a na-agbakwa ndị mmụta Bible ume ịga n’oge ruo n’ókè o kwere omume ka ha wee rite uru ná mkpakọrịta na-enye ume ọhụrụ a na-enwe n’ebe ahụ.—Ndị Hibru 10:24, 25.

Mkpa Chọrọ Ime Ihe Ngwa Ngwa

Otú ọ dị, o kwesịrị ịrịba ama na ọ bụghị Ndịàmà Jehova nile nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị ekwesị. Mmụba dị ịrịba ama e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze n’ụwa nile emewo ka e nwee mkpa chọrọ ime ihe ngwa ngwa. A ka chọrọ ọtụtụ puku Ụlọ Nzukọ Alaeze, karịsịa n’ala ndị ka na-emepe emepe.—Aịsaịa 54:2; 60:22.

Iji maa atụ: E nwere nanị Ụlọ Nzukọ Alaeze iri maka ọgbakọ 290 dị n’isi obodo Democratic Republic of Congo. Mba ahụ nwere mkpa chọrọ ime ihe ngwa ngwa maka ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. N’Angola, ọtụtụ ọgbakọ na-ezukọ n’èzí n’ihi na e nwere nanị Ụlọ Nzukọ Alaeze ole na ole. E nwekwara mkpa ndị yiri ndị a n’ọtụtụ mba ndị ọzọ.

N’ihi ya, kemgbe 1999, a gbakọtawo aka na-eme mgbalị iji nye aka n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ala ndị na-enweghị ihe onwunwe buru ibu. Iji nye aka n’iwu ihe owuwu n’ala ndị ahụ, Ndịàmà nwere nkà ewepụtawo onwe ha n’afọ ofufo ije ozi. Mgbe a gbakọtara aka jiri mmụọ afọ ofufo mee mgbalị ndị dị otú ahụ site n’enyemaka nke ndị ọrụ afọ ofufo nọ n’ebe ndị ahụ, ihe ndị na-esi na ya apụta na-agba ume. N’aka nke ha, Ndịàmà si n’ala ndị ahụ na-erite uru site n’ọzụzụ ha na-anata. Ihe a nile na-enye aka egbo mkpa ndị e nwere maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ná mba ha dị iche iche.

N’ụzọ dị otú a, a na-enye nkwado dị irè site n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ụzọ dị mfe, bụ́ ndị e ji usoro na ngwá ọrụ ndị e ji ewu ihe n’ógbè ndị ahụ wuo. Ihe mgbaru ọsọ abụghị nanị igbo mkpa dị ukwuu e nwere maka Ụlọ Nzukọ Alaeze kamakwa iguzobe usoro a ga-eji na-elekọta ha bụ́ ndị kwekọrọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ógbè ndị ahụ.—2 Ndị Kọrint 8:14, 15.

Ihe Omume Ndị Na-enye Ume Ọhụrụ

Mmetụta dị aṅaa ka mgbalị ndị a a na-eme iji nwee ebe ofufe na-enwe n’ahụ́ ụmụ mmadụ? Ná mmalite afọ 2001, akụkọ si Malawi kwuru, sị: “Ihe a rụzuworo ná mba a na-akpali mmasị n’ezie. N’ọnwa abụọ na-abịanụ, anyị ga-arụcha Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọzọ anyị na-arụ. (Foto nke 1 na nke 2) Na Togo, ndị ọrụ afọ ofufo wuru ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị mfe n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya. (Foto nke 3) Ezi ọrụ ndị ọrụ afọ ofufo dị njikere ịrụ ọrụ rụrụ na-enyekwa aka n’ime ka e nwee Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị kwesịrị ekwesị na Mexico, Brazil, na ala ndị ọzọ.

Ọgbakọ dị iche iche na-achọpụta na mgbe e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị obodo na-ahụ na Ndịàmà Jehova agbanyela mkpọrọgwụ n’ebe ahụ. O yiri ka ọtụtụ ndị hà anọwo na-ala azụ isonyere Ndịàmà ruo mgbe e nwere ebe ofufe kwesịrị ekwesị. Ọgbakọ Nafisi nke dị na Malawi na-akọ, sị: “Ugbu a anyị nwetarala Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị ekwesị, ọ na-agba ezi àmà. N’ihi ya, ọ dị mfe ịmalite ọmụmụ Bible.”

Ndị nọ n’Ọgbakọ Krake dị na Benin diri ọtụtụ emo a kwara ha n’oge gara aga n’ihi na Ụlọ Nzukọ Alaeze mbụ ha dị nkịrịka ma e jiri ya tụnyere ụlọ chọọchị ụfọdụ. (Foto nke 4) Ugbu a, ọgbakọ ahụ nwere ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze nke na-eme ka a hụ ezi ofufe n’ụzọ dị mfe ma dị ùgwù. (Foto nke 5) Ọgbakọ a nwere ndị nkwusa Alaeze 34 na-enwe nkezi nke mmadụ 73 na-abịa nzukọ na Sunday, ma mmadụ 651 bịara maka nraranye nke Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ndị obodo ahụ, bụ́ ndị nwere obi ụtọ ịhụ na Ndịàmà ahụ wuliri ụlọ nzukọ n’oge dị nnọọ mkpirikpi. N’ichetaghachi ihe ndị mere n’oge gara aga n’akụkụ a, alaka Zimbabwe dere, sị: “N’ime otu ọnwa e wusịrị Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ, ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ na-arịkarị elu okpukpu abụọ.”—Foto nke 6 na nke 7.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ na-enye aka eme ka e nwee ebe Ndị Kraịst raara onwe ha nye nakwa ndị nwere mmasị na-enweta ume ọhụrụ n’ụzọ ime mmụọ. “Anyị nwere ọṅụ dị ukwuu,” ka otu Onyeàmà bụ́ onye Ukraine kwuru mgbe ọgbakọ dị n’ebe ahụ malitesịrị iji Ụlọ Nzukọ Alaeze ha wuru ọhụrụ na-eme ihe. “Anyị ji anya anyị hụ otú Jehova si enyere ndị ya aka.”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 10, 11]

A Na-enwe Ekele Maka Nkwado E Ji Mmesapụ Aka Na-enye

Obi na-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ ịhụ ọganihu dị ngwa e nweworo iji gboo mkpa chọrọ ime ihe ngwa ngwa e nwere maka Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ gburugburu ụwa. Ịrị elu a nọgidere na-enwe n’ọnụ ọgụgụ ndị na-efe Jehova ofufe ná mba dịgasị iche iche chọrọ ka e wuo ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ n’ọdịnihu. Leenụ, ná nkezi, e guzobere ọgbakọ 32 ọhụrụ kwa izu n’afọ ije ozi 2001! Ebe ndị a ga na-ezukọ ma na-efe ofufe dị ọgbakọ ndị dị otú ahụ mkpa.

Ajụjụ a pụrụ ibilite, ‘Olee otú anyị si enweta ego maka ọrụ ndị dị ka iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ, karịsịa ná mba ebe ụmụnna anyị nwere ego dị nta?’ Azịza ya bụ ma nkwado Chineke ma mmesapụ aka nke ụmụ mmadụ.

Dị ka Jehova kwere ná nkwa, ọ na-awụsa mmụọ nsọ ya n’ahụ́ ndị ohu ya, na-enyere ha aka ‘ịrụ ọrụ ọma, ịba ọgaranya n’ezi ọrụ, imesapụ aka, ịdị njikere ikerịta ihe.’ (1 Timoti 6:18) Mmụọ Chineke na-akwali Ndịàmà Jehova ịkwado ọrụ nkwusa Alaeze ahụ n’ụzọ ọ bụla—na-etinye oge, ume, ike ọkpụkpụ aka, na ihe onwunwe ndị ọzọ, n’ọrụ Ndị Kraịst.

Ọ bụ mmụọ nke iji mmesapụ aka na-enye ihe na-akwali Ndịàmà na ndị ọzọ na-enye aka n’ụzọ ego ná mgbasawanye na n’ọrụ owuwu ihe. E wezụga inye aka ịkwụ mmefu ndị a na-enwe mgbe nile n’ọgbakọ, ha na-enye onyinye maka ọrụ ihe owuwu ndị a na-arụ n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa.

N’ọgbakọ ọ bụla, e nwere igbe ndị a mapawara akwụkwọ e dere n’ụzọ doro anya, “Contributions for the Worldwide Work—Matthew 24:14” (“Onyinye Maka Ọrụ ahụ Zuru Ụwa Ọnụ—Matiu 24:14”). Ndị mmadụ pụrụ itinye onyinye afọ ofufo ha n’ebe ndị ahụ ma ọ bụrụ na ha chọọ. (2 Ndị Eze 12:9) A na-enwe ekele maka onyinye nile, ma ò buru ibu ma ọ dị ntakịrị. (Mak 12:42-44) A na-eji ego ndị a eme ihe n’ụzọ dịgasị iche iche na-adabere ná mkpa e nwere, gụnyere iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze. A dịghị eji ego ndị ahụ akwụ ndị isi ụgwọ ọnwa n’ihi na Ndịàmà Jehova enweghị ndị isi dị otú ahụ.

Onyinye ndị a na-enye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ hà na-emezu nzube e ji enye ha? Ee, ha na-emezu ya. Alaka dị na Liberia—bụ́ mba agha obodo kpara aka ọjọọ—na-akọ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndịàmà nọ ná mba ahụ na-eche nsogbu nke enweghị ọrụ na nke enweghị ego ihu. Olee otú ndị Jehova nọ ná mba a pụrụ isi nweta ebe ofufe ndị kwesịrị ekwesị? “A ga-eji onyinye ụmụnna ndị nọ n’ala ndị ọzọ ji mmesapụ aka nye na-akwụ mmefu a na-eme maka ọrụ ahụ,” ka alaka ụlọ ọrụ ahụ na-ekwu. “Lee ndokwa amamihe dị na ya na nke ịhụnanya nke ahụ bụ!”

Ụmụnna nọ ná mba ndị ahụ na-enyekwa onyinye, n’agbanyeghị na ihe ha na-akpata dị ala. Mba Sierra Leone nke dị n’Africa na-akọ, sị: “Ụmụnna ndị nọ ná mba a na-akwado mgbalị ahụ ma na-enwe obi ụtọ itinye ike ọkpụkpụ aka ha na onyinye ego ọ bụla ha pụrụ inye iji kwadoo owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze.”

N’ozuzu, mgbalị a a na-eme iwu ihe owuwu ndị a na-ewetara Jehova otuto. Ụmụnna nọ na Liberia ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwu, sị: “Owuwu nke ebe ofufe ndị kwesịrị ekwesị ná mba a nile ga-egosi ndị mmadụ na ezi ofufe agbanyela mkpọrọgwụ, ọ ga-ebulikwa aha ukwu nke Chineke anyị elu ma chọọ ya mma.”