Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-egosi Ndị Nọ Ná Mkpa Obiọma Sitere n’Ịhụnanya

Na-egosi Ndị Nọ Ná Mkpa Obiọma Sitere n’Ịhụnanya

Na-egosi Ndị Nọ Ná Mkpa Obiọma Sitere n’Ịhụnanya

“Nweekwanụ ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] . . . , onye ọ bụla n’ahụ́ nwanne ya.”—ZEKARAỊA 7:9.

1, 2. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị igosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị ga-atụle?

OKWU Jehova Chineke na-adụ anyị ọdụ ịhụ “obiọma sitere n’ịhụnanya” n’anya. (Maịka 6:8, ihe odide ala ala peeji nke NW) Ọ gwakwara anyị ihe ndị mere anyị ji kwesị ime otú ahụ. Otu ihe kpatara ya bụ na “onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] bụ.” (Ilu 11:17) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Igosi ndị ọzọ obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya, na-eme ka e soro ha na-enwe mmekọrịta dị mma na nke na-adịgide adịgide. Nke ahụ ga-eme ka anyị nwee ndị enyi na-eguzosi ike n’ihe—ụgwọ ọrụ dị oké ọnụ ahịa n’ezie!—Ilu 18:24.

2 Ọzọkwa, Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị, sị: “Onye na-agbaso ezi omume na ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] na-achọta ndụ.” (Ilu 21:21) Ee, anyị ịchụso obiọma sitere n’ịhụnanya ga-eme ka Chineke hụ anyị n’anya, ọ ga-emekwa ka anyị nwee ohere nke inweta ngọzi n’ọdịnihu, gụnyere ndụ ebighị ebi. Ma olee otú anyị pụrụ isi na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya? Olee ndị anyị kwesịrị igosi ya? Obiọma sitere n’ịhụnanya ọ̀ dị iche n’obiọma nkịtị ma ọ bụ obiọma n’ozuzu?

Obiọma Nkịtị na Obiọma Sitere n’Ịhụnanya

3. Olee otú obiọma sitere n’ịhụnanya si dị iche n’obiọma nkịtị?

3 Obiọma nkịtị na obiọma sitere n’ịhụnanya dị iche n’ụzọ dịgasị iche iche. Dị ka ihe atụ, ndị na-egosi obiọma nkịtị na-emekarị ya n’enweghị nkekọ, ma ọ bụ mmekọrịta, miri emi n’ebe ndị ha na-egosi obiọma ahụ nọ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị egosi mmadụ obiọma sitere n’ịhụnanya, anyị na-eji ịhụnanya arapara n’ahụ́ onye ahụ. N’ime Bible, obiọma sitere n’ịhụnanya ụmụ mmadụ na-egosi ibe ha pụrụ ịdabere ná mmekọrịta dịburị adị. (Jenesis 20:13; 2 Samuel 3:8; 16:17) Ma ọ bụ ha pụrụ ịdabere ná mmekọrịta malitere n’ihi obiọma e gosiri n’oge gara aga. (Joshua 2:1, 12-14; 1 Samuel 15:6; 2 Samuel 10:1, 2) Iji gosipụta ọdịiche a, ka anyị tụlee ihe atụ abụọ ndị dị na Bible, otu bụ banyere obiọma nkịtị, nke ọzọ abụrụ banyere obiọma sitere n’ịhụnanya ndị ụmụ mmadụ gosiri ibe ha.

4, 5. Olee otú ihe atụ abụọ ndị sitere na Bible bụ́ ndị e zoro aka na ha n’ebe a si egosi ọdịiche dị n’etiti obiọma nkịtị na obiọma sitere n’ịhụnanya?

4 Otu ihe atụ nke obiọma nkịtị metụtara otu ìgwè nke ndị ụgbọ kpunahụrụ, gụnyere Pọl onyeozi. Ha rịgotara n’ikperé mmiri nke àgwàetiti Mọlta. (Ọrụ 27:37–28:1) Ọ bụ ezie na ndị bi na Mọlta ejibughị ndị njem a tọrọ atọ ụgwọ ma ọ bụ soro ha nwee mmekọrịta na mbụ, ha ji mgbasapụ aka nabata ndị njem ahụ, na-egosi ha “obiọma pụrụ iche.” (Ọrụ 28:2, 7) Nnabata ahụ ha nabatara ha bụ omume obiọma, ma e mere ya ná ndapụta nye ndị a na-amabughị. N’ihi ya, ọ bụ obiọma nkịtị.

5 Jiri nke ahụ tụnyere nnabata Eze Devid nabatara Mefiboshet, bụ́ nwa enyi ya bụ́ Jonatan. Devid gwara Mefiboshet, sị: “Gị onwe gị ga-erikwa nri na tebụl nke m mgbe nile.” N’ịkọwa ihe mere o ji na-eme ndokwa a, Devid gwara ya, sị: “Aghaghị m imere gị ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] n’ihi Jonatan, bụ́ nna gị.” (2 Samuel 9:6, 7, 13) N’ụzọ dabara adaba, e zoro aka ná nnabata na-adịghị agha agha Devid nabatara ya dị ka obiọma sitere n’ịhụnanya, ọ bụghị obiọma nkịtị, n’ihi na ọ bụ ihe àmà na-egosi iguzosi ike n’ihe ya n’ebe mmekọrịta dịbu adị dị. (1 Samuel 18:3; 20:15, 42) N’otu aka ahụ taa, ndị ohu Chineke na-egosi ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha obiọma nkịtị. Ma, ha na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya, ma ọ bụ ezi ịhụnanya, n’ebe ndị ha na ha so Chineke na-enwe ezi mmekọrịta nọ.—Matiu 5:45; Ndị Galeshia 6:10.

6. Ihe ndị dị aṅaa e ji amata obiọma sitere n’ịhụnanya n’etiti ụmụ mmadụ ka a na-ahụ nke ọma n’Okwu Chineke?

6 Iji kọwakwuo ụfọdụ ihe ndị ọzọ e ji amata obiọma sitere n’ịhụnanya, anyị ga-atụle, n’ụzọ dị mkpirikpi, ihe ndekọ atọ nke Bible bụ́ ndị e gosipụtara àgwà a na ha. Site na ha, anyị ga-arịba ama na obiọma sitere n’ịhụnanya nke mmadụ bụ (1) nke e ji ime ihe doro anya egosipụta, (2) nke e ji ọchịchọ obi egosipụta, na (3) nke a na-egosi ndị nọ ná mkpa karịsịa. Ọzọkwa, ihe ndekọ ndị a na-egosi otú anyị pụrụ isi na-egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya taa.

Nna Egosi Obiọma Sitere n’Ịhụnanya

7. Gịnị ka ohu Ebreham gwara Betuel na Leban, okwu dịkwa aṅaa ka ohu ahụ welitere?

7 Jenesis 24:28-67 kọtọpụrụ akụkọ banyere ohu Ebreham, bụ́ nke e kwuru okwu ya n’isiokwu bu ụzọ. Mgbe o zutesịrị Rebeka, a kpọbatara ya n’ụlọ nna ya, bụ́ Betuel. (Amaokwu nke 28-32) N’ebe ahụ, ohu ahụ kọrọ n’ụzọ zuru ezu banyere nwunye ọ na-achọrọ nwa Ebreham. (Amaokwu nke 33-47) O mesiri ya ike na ya na-ele ihe ịga nke ọma ya nweworo ka ọ dị mgbe ahụ anya dị ka ihe ịrịba ama sitere n’aka Jehova, “Onye duru m rịị n’ụzọ eziokwu ịlụtara nwa onye nwe m nwa nwanne ya nwoke na nwunye.” (Amaokwu nke 48) Obi abụọ adịghị ya na ohu ahụ nwere olileanya na iji ezi obi kọọ ihe ahụ merenụ ga-eme ka Betuel na nwa ya nwoke bụ́ Leban kwere na aka Jehova dị n’ozi a. N’ikpeazụ, ohu ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na unu gaje ime ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] na eziokwu n’ebe onye nwe m nọ, gosinụ m: ma ọ bụrụ na unu agaghị eme ya, gosinụ m; ka m wee chee ihu n’aka nri, ma ọ bụ n’aka ekpe.”—Amaokwu nke 49.

8. Gịnị bụ mmeghachi omume Betuel n’okwu banyere Rebeka?

8 Jehova egosilarị Ebreham obiọma sitere n’ịhụnanya. (Jenesis 24:12, 14, 27) Betuel ọ̀ ga-adị njikere ime otu ihe ahụ site n’ikwe ka Rebeka soro ohu Ebreham laa? À ga-ejikọta obiọma sitere n’ịhụnanya nke mmadụ na obiọma sitere n’ịhụnanya nke Chineke ka o wee mezuo nzube ya? Ka ogologo njem ohu ahụ mere ọ̀ ga-ala n’iyi? Ọ ghaghị ịbụworo nnọọ ohu Ebreham ihe na-akasị obi ịnụ ka Leban na Betuel sịrị: “N’aka Jehova ka okwu a siteworo.” (Amaokwu nke 50) Ha ghọtara aka Jehova tinyere n’okwu ahụ ma nakwere mkpebi ya n’egbughị oge. Mgbe nke ahụ gasịrị, Betuel gosipụtara obiọma sitere n’ịhụnanya ya site n’ịgbakwụnye, sị: “Lee, Rebeka nọ n’ihu gị, kuru ya, laa, ka ọ ghọọrọ nwa onye nwe gị nwunye, dị ka Jehova kwuworo.” (Amaokwu nke 51) Rebeka jiri ọchịchọ obi soro ohu Ebreham, n’oge na-adịghịkwa anya, ọ ghọrọ nwunye Aịzik hụrụ n’anya.—Amaokwu nke 49, 52-58, 67.

Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Nwa Gosiri

9, 10. (a) Gịnị ka Jekọb rịọrọ nwa ya nwoke bụ́ Josef ka o meere ya? (b) Olee otú Josef si gosi nna ya obiọma sitere n’ịhụnanya?

9 E gosikwara nwa nwa Ebreham bụ́ Jekọb obiọma sitere n’ịhụnanya. Dị ka Jenesis isi 47 si kọọ, Jekọb bi n’Ijipt n’oge ahụ, “ụbọchị [ọ] ga-anwụ wee ruo nso.” (Amaokwu nke 27-29) O nwere nchegbu n’ihi na ọ na-aga ịnwụ n’ebe na-abụghị ala ahụ Chineke kwere Ebreham ná nkwa. (Jenesis 15:18; 35:10, 12; 49:29-32) Otú ọ dị, Jekọb achọghị ka e lie ya n’Ijipt, n’ihi ya, o mere ndokwa ka e buga ozu ya n’ala Kenan. Ọ̀ dị onye ọzọ ga-anọ n’ọnọdụ ka mma ịhụ na e mezuru uche ya ma ọ́ bụghị nwa ya nwoke a na-asọpụrụ, bụ́ Josef?

10 Ihe ndekọ ahụ na-ekwu, sị: “[Jekọb wee] kpọọ nwa ya Josef, sị ya, Biko, ọ bụrụ na ahụtawo m amara n’ihu gị, . . . meekwara m ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] na eziokwu; biko, elila m n’Ijipt: kama mụ na nna m hà ga-edina, ị ga-esikwa n’Ijipt bupụ m, liekwa m n’ili ha.” (Jenesis 47:29, 30) Josef kwere nkwa imezu arịrịọ a, n’oge na-adịghịkwa anya mgbe nke ahụ gasịrị, Jekọb nwụrụ. Josef na ụmụ Jekọb ndị ọzọ bubatara ozu ya “n’ala Kenan, lie ya n’ọ́gbà nke ọhịa Makpila, nke Abraham zụtara.” (Jenesis 50:5-8, 12-14) N’ụzọ dị otú a, Josef gosiri nna ya obiọma sitere n’ịhụnanya.

Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Nwunye Nwa Gosiri

11, 12. (a) Olee otú Rut si gosi obiọma sitere n’ịhụnanya n’ebe Naomi nọ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka obiọma sitere n’ịhụnanya Rut gosiri “n’ikpeazụ” si dị mma karịa nke o gosiri “na mbụ”?

11 Akwụkwọ Rut na-akọ otú nwanyị di ya nwụrụ bụ́ Naomi si bụrụ onye nwunye nwa ya nke di ya nwụkwarala, bụ́ Rut onye Moab, gosiri obiọma sitere n’ịhụnanya. Mgbe Naomi kpebiri ịlaghachi Betlehem nke dị na Juda, Rut gosipụtara obiọma sitere n’ịhụnanya nakwa mkpebi siri ike, na-asị: “Ebe ị na-eje ka m ga-eje; ọ bụkwa ebe ị na-anọ ọnọdụ abalị ka m ga-anọ ọnọdụ abalị: ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Rut mesịrị gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya mgbe o mere ka a mara na ya dị njikere ịlụ otu onye ikwu Naomi kataworo ahụ́ bụ́ Boaz. * (Deuterọnọmi 25:5, 6; Rut 3:6-9) Ọ gwara Rut, sị: “I mewo ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] nke ọma n’ikpeazụ karịa na mbụ, ebe ị na-ejesoghị ụmụ okorobịa, ma ọ bụ onye na-enweghị ike ma ọ bụ ọgaranya.”—Rut 3:10.

12 Obiọma sitere n’ịhụnanya Rut gosiri “na mbụ” na-ezo aka n’oge ọ hapụrụ ndị ya ma rapagidesie ike n’ahụ́ Naomi. (Rut 1:14; 2:11) Ọbụna obiọma sitere n’ịhụnanya o gosiri “n’ikpeazụ”—njikere Rut dị ịlụ Boaz—karịrị nke o gosiri n’oge ahụ. Rut ga-enwezi ike ịmụtara Naomi, bụ́ onye toferela ịmụ nwa, nwa. Ha lụrụ, mgbe Rut mesịkwara mụọ nwa, ndị inyom Betlehem tiri mkpu, sị: “A mụrụ nwa nwoke nye Naomi.” (Rut 4:14, 17) N’ezie, Rut bụ “nwanyị na-ejide onwe ya nke ọma,” bụ́ onye Jehova ji ihe ùgwù dị ebube nke ịghọ nne ochie nke Jizọs Kraịst gọzie n’ihi ya.—Rut 2:12; 3:11; 4:18-22; Matiu 1:1, 5, 6.

Nke E Ji Omume Egosipụta

13. Olee otú Betuel, Josef, na Rut si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ha?

13 Ị̀ rịbara ama otú Betuel, Josef, na Rut si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ha? Ọ bụghị nanị okwu ọma ka ha ji mee ya kama ha mere ihe kpọmkwem. Ọ bụghị nanị na Betuel sịrị, ‘Lee Rebeka’ kamakwa o ‘zilagara Rebeka’ n’ezie. (Jenesis 24:51, 59) Ọ bụghị nanị na Josef sịrị, “Mụ onwe m ga-eme dị ka okwu gị si dị” kama ya na ụmụnne ya meere Jekọb “dị ka o nyere ha n’iwu.” (Jenesis 47:30; 50:12, 13) Ọ bụghị nanị na Rut sịrị, “Ebe ị na-eje ka m ga-eje” kama ọ hapụrụ ndị ya ma soro Naomi, nke mere ka “ha abụọ wee na-eje ruo mgbe ha bara Betlehem.” (Rut 1:16, 19) Na Juda, Rut mekwara “dị ka ihe nile si dị nke nne di ya nyere ya n’iwu.” (Rut 3:6) Ee, Rut ji omume gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya, dịkwa ka ndị ọzọ mere.

14. (a) Olee otú ndị ohu Chineke n’oge a si eji omume ha egosi obiọma sitere n’ịhụnanya? (b) Olee ihe ndị ị maara Ndị Kraịst nọ n’ógbè unu na-eme nke bụ́ igosi obiọma sitere n’ịhụnanya?

14 Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ ịhụ otú ndị ohu Chineke taa si nọgide na-eji omume ha egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya. Dị ka ihe atụ, chee banyere ndị na-enye ndị kwere ekwe ibe ha bụ́ ndị na-adịkwaghị ike, ndị dara mbà n’obi, ma ọ bụ ndị na-eru újú nkwado na-adịte aka n’ụzọ mmetụta uche. (Ilu 12:25) Ma ọ bụ tụlee ọtụtụ Ndịàmà Jehova bụ́ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-eji ụgbọala ebuga ndị agadi n’Ụlọ Nzukọ Alaeze iji hụ na ha na-aga nzukọ ọgbakọ ndị a na-enwe kwa izu. Anna, bụ́ onye dị afọ 82 ma na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo, na-ekwuchitere ọtụtụ ndị ọzọ mgbe ọ sịrị: “Ịbụ onye e ji ụgbọala ebuga ná nzukọ nile bụ ngọzi sitere n’aka Jehova. Ana m ekele ya site n’ala ala obi m maka inye m ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị dị otú ahụ na-ahụ n’anya.” Ị̀ na-ekere òkè n’ọrụ ndị dị otú ahụ n’ọgbakọ gị? (1 Jọn 3:17, 18) Ọ bụrụ na ị na-eme ya, jide n’aka na a na-enwe ekele miri emi maka obiọma sitere n’ịhụnanya gị.

Nke E Ji Ọchịchọ Obi Egosi

15. Ihe dị aṅaa e ji amata obiọma sitere n’ịhụnanya ka e mekwuru ka ọ pụta ìhè n’ihe ndekọ atọ ahụ anyị tụleworo site na Bible?

15 Akụkọ Bible ndị ahụ anyị tụleworo na-egosikwa na e ji ọchịchọ obi egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya, ọ bụghị ná mmanye. Betuel ji ọchịchọ obi kwenyere ohu Ebreham, otú ahụkwa ka Rebeka mere. (Jenesis 24:51, 58) Ndị ọzọ amanyeghị Josef igosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya ya. (Jenesis 50:4, 5) Rut ‘gbara obi ya ume iso Naomi jee.’ (Rut 1:18) Mgbe Naomi tụụrụ Rut aro ịgakwuru Boaz, obiọma sitere n’ịhụnanya kpaliri nwanyị Moab ahụ ikwu, sị: “Ihe nile ị sịrị m, m ga-eme ya.”— Rut 3:1-5.

16, 17. Gịnị mere obiọma sitere n’ịhụnanya Betuel, Josef, na Rut gosiri ji nwee nzube karịsịa, gịnịkwa kpaliri ha igosipụta àgwà a?

16 Obiọma sitere n’ịhụnanya Betuel, Josef, na Rut gosiri dị ịrịba ama karịsịa n’ihi na Ebreham, Jekọb, na Naomi anọghị n’ọnọdụ nke ịrụgide ha. E kwuwerị, iwu ejighị Betuel ikewapụ ada ya n’ebe ya onwe ya nọ. Ọ pụrụ ịdịworo ya mfe ịgwa ohu Ebreham, sị: ‘Ee e, achọrọ m ka nwa m nwanyị a na-agba mbọ nọrọ m nso.’ (Jenesis 24:18-20) N’otu aka ahụ, Josef nweere onwe ya ikpebi ma ọ̀ ga-eme ihe nna ya gwara ya ma ọ bụ na ọ gaghị eme ya, n’ihi na Jekọb ga-anwụ, ọ pụghịkwa ịmanye ya imezu ihe o kwuru. Naomi n’onwe ya kwuru na Rut nweere onwe ya ịnọgide na Moab. (Rut 1:8) Rut nwekwaara onwe ya ịlụ otu n’ime “ụmụ okorobịa” kama ịlụ Boaz meworo agadi.

17 Betuel, Josef, na Rut ji ọchịchọ obi ha gosi obiọma sitere n’ịhụnanya; obi ha kpaliri ha ime otú ahụ. Ha nwere mmetụta nke inwe ibu ọrụ n’ụzọ omume igosipụta àgwà a n’ebe ndị ha na ha nwere mmekọrịta nọ, ọbụna dị ka o mesịrị dị Eze Devid ka iwu o ji ya igosipụta ya n’ebe Mefiboshet nọ.

18. (a) Àgwà dị aṅaa ka Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye ji ‘azụ ìgwè atụrụ ahụ’? (b) Olee otú otu okenye si kwupụta mmetụta ọ na-enwe banyere inyere ndị kwere ekwe ibe ya aka?

18 Obiọma sitere n’ịhụnanya ka bụ ihe e ji amata ndị Chineke, gụnyere ndị ikom na-azụ ìgwè atụrụ Chineke. (Abụ Ọma 110:3; 1 Ndị Tesalonaịka 5:12) Ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta, dị otú ahụ na-enwe mmetụta nke inwe ibu ọrụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ọrụ e nyefere ha site ná nhọpụta a họpụtara ha. (Ọrụ 20:28) Ya bụrụgodị otú ahụ, ọrụ ọzụzụ atụrụ na ihe ndị ọzọ ha na-eme iji na-egosi ọgbakọ obiọma sitere n’ịhụnanya “[abụghị] ná mmanye, kama n’ọchịchọ obi.” (1 Pita 5:2) Ndị okenye na-azụ ìgwè atụrụ ahụ n’ihi na ha nwere ma ibu ọrụ ma ọchịchọ ime otú ahụ. Ha na-egosi atụrụ Kraịst obiọma sitere n’ịhụnanya n’ihi na ha kwesịrị ma chọọ ime ya. (Jọn 21:15-17) “Ọ na-amasị m ịga n’ebe obibi nke ụmụnna ma ọ bụ ịkpọ ha nanị iji gosi ha na m na-eche banyere ha,” ka otu Onye Kraịst bụ́ okenye na-ekwu. “Inyere ụmụnna aka bụ otu nnukwu isi iyi m si enweta ọṅụ na afọ ojuju!” Ndị okenye na-ahụ n’anya n’ebe nile ji obi ha nile ekweta na nke ahụ bụ eziokwu.

Gosi Ndị Nọ ná Mkpa Obiọma Sitere n’Ịhụnanya

19. Eziokwu dị aṅaa banyere obiọma sitere n’ịhụnanya ka ihe ndekọ Bible ndị ahụ anyị tụlere n’isiokwu a na-emesi ike?

19 Ihe ndekọ Bible ndị ahụ anyị tụleworo na-emesikwa ike eziokwu ahụ bụ́ na ọ bụ ndị nwere mkpa ha na-agaghị egboli n’onwe ha ka a na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya. Iji hụ na ámá ya echighị, nkwado Betuel dị Ebreham mkpa. Iji hụ na e bugara ozu ya Kenan, enyemaka Josef dị Jekọb mkpa. Ijikwa mụta onye ga-eketa ihe o nwere, enyemaka Rut dị Naomi mkpa. Ma Ebreham, Jekọb, ma Naomi adịghị onye nke pụrụ igbo mkpa ndị ahụ n’enwetaghị enyemaka. N’otu aka ahụ taa, ọ bụ ndị nọ ná mkpa ka e kwesịrị igosi obiọma sitere n’ịhụnanya karịsịa. (Ilu 19:17) Anyị kwesịrị iṅomi nna ochie ahụ bụ́ Job, bụ́ onye lebaara ‘onye e wedara n’ala nke na-etiku ya anya, ya na nwa mgbei, bụ́ onye na-enweghị onye na-enyere ya aka’ nakwa “onye na-ala n’iyi.” Job ‘mekwara obi nwanyị di ya nwụrụ ka o tie mkpu ọṅụ’ ma ghọọrọ ‘onye ìsì anya, ghọọkwara onye ngwụrọ ụkwụ.’—Job 29:12-15.

20, 21. Olee ndị obiọma anyị sitere n’ịhụnanya dị mkpa, gịnịkwa ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 N’ezie, e nwere ‘ndị e wedara n’ala na-eti mkpu enyemaka’ n’ọgbakọ nile nke Ndị Kraịst. Nke a pụrụ ịbụ n’ihi ihe ndị dị ka owu ọmụma, nkụda mmụọ, mmetụta nke ịbụ onye na-abaghị n’ihe, mmechuihu sitere n’aka ndị ọzọ, ọrịa dị oké njọ, ma ọ bụ ọnwụ nke onye a hụrụ n’anya. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya kpatara ya, ndị nile dị otú ahụ anyị hụrụ n’anya nwere mkpa ndị anyị pụrụ ma kwesị iji obiọma sitere n’ịhụnanya nke sitere n’ọchịchọ obi anyị ma na-adịgide adịgide gboo.—1 Ndị Tesalonaịka 5:14.

21 Ya mere, ka anyị nọgide na-eṅomi Jehova Chineke, bụ́ onye “na-aba ụba n’ebere [“obiọma sitere n’ịhụnanya,” NW] na eziokwu.” (Ọpụpụ 34:6; Ndị Efesọs 5:1) Anyị pụrụ ime otú ahụ site n’iji ọchịchọ obi na-eme ihe ụfọdụ kpọmkwem, karịsịa maka ọdịmma nke ndị nọ ná mkpa. N’eziekwa, anyị ga-asọpụrụ Jehova ma nweta ọṅụ dị ukwuu ka anyị ‘na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya, onye ọ bụla n’ahụ́ nwanne ya.’—Zekaraịa 7:9.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 11 Maka nkọwa zuru ezu banyere ụdị alụmdi na nwunye e mere ebe a, lee Mpịakọta nke 1, peeji nke 370, nke Insight on the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee otú obiọma sitere n’ịhụnanya si dị iche n’obiọma nkịtị?

• N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Betuel, Josef, na Rut si gosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya?

• Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji na-egosipụta obiọma sitere n’ịhụnanya?

• Olee ndị ọ dị mkpa ka anyị na-egosi obiọma sitere n’ịhụnanya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee otú Betuel si gosi obiọma sitere n’ịhụnanya?

[Foto dị na peeji nke 21]

Ezi ịhụnanya Rut bụụrụ Naomi ngọzi

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Obiọma sitere n’ịhụnanya nke mmadụ bụ nke e ji ọchịchọ obi egosipụta, nke e ji ime ihe doro anya egosipụta, na nke a na-egosi ndị nọ ná mkpa