Ònye Ka Ụta Dịịrị—Gị Ka Ọ̀ Bụ Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Gị?
Ònye Ka Ụta Dịịrị—Gị Ka Ọ̀ Bụ Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Gị?
NDỊ ọkà mmụta sayensị na-agbasi mbọ ike ịchọpụta otú mkpụrụ ndụ ihe nketa si akpata aṅụrụma, ndina ụdị onwe, inwe mmekọahụ aghara aghara, ime ihe ike, akparamàgwà ndị ọzọ jọgburu onwe ha, na ọbụna ọnwụ n’onwe ya. Ọ́ gaghị abụ ihe na-enye ahụ́ efe ịchọpụta na omume anyị esighị anyị n’aka kama na o sitere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị? Ọ bụ ihe ụmụ mmadụ bu pụta ụwa bụ́ ịta mmadụ ma ọ bụ ihe ọzọ ụta maka njehie ha.
Ọ bụrụ na ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa ka ụta dịịrị, ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ọ pụrụ ikwe omume ịgbanwe ha, na-ewepụ àgwà ndị na-adịghị mma site n’iji nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa mee ihe. Ihe ịga nke ọma e nwere na nso nso a n’ịhazi mkpụrụ ndụ ihe nketa nile dị mmadụ n’ahụ́ emewo ka atụmanya dị otú ahụ sikwuo ike.
Otú ọ dị, atụmanya a ịbụ nke a pụrụ imezu na-adabere n’echiche bụ́ na ọ bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị ka mmehie na njehie anyị nile si n’aka n’ezie. Nchọpụta ndị dabeere na nkà mmụta sayensị hà emewo ka e nwee ihe akaebe zuru ezu iji gbaa mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị akwụkwọ? N’ụzọ doro anya, azịza ya ga-emetụta n’ụzọ dị ukwuu, otú anyị si ele onwe anyị na ọdịnihu anyị anya. Otú ọ dị, tupu anyị enyochawa ihe akaebe ndị ahụ, ọ ga-abụ ihe na-enye ihe ọmụma ilebatụ anya n’otú ihe a kpọrọ mmadụ si malite.
Otú Ezughị Okè Si Malite
Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị mmadụ maara, ma ọ bụ, ma ọ dịghị ihe ọzọ, anụla ihe ndekọ banyere ọdịda mmadụ abụọ mbụ, bụ́ Adam na Iv, dara n’ogige Iden. È kenyere ha mkpụrụ ndụ ihe nketa nwere ntụpọ site ná mmalite, bụ́ ụdị ntụpọ sitere n’okike nke kpaliri ha ime mmehie na inupụ isi?
Onye Okike ha, bụ́ Jehova Chineke, bụ́ onye ọrụ ya nile zuru okè, kwupụtara na ihe nile o kere n’ụwa “dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31; Deuterọnọmi 32:4) Dị ka ihe ọzọ na-egosi na ọrụ ya juru ya afọ, ọ gọziri mmadụ abụọ mbụ ahụ ma nye ha ntụziaka ịmụ ọmụmụ, ime ka ihe e kere eke bụ́ mmadụ jupụta ụwa, na ilekọta ihe ndị o kere n’ụwa—n’ezie nke a abụtụghị ihe onye na-ejighị n’aka na ọrụ ya dị mma ga-eme.—Jenesis 1:28.
Bible na-agwa anyị banyere okike nke mmadụ abụọ mbụ ahụ, sị: “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo Ya, n’onyinyo Chineke ka O kere ya: nwoke na nwanyị ka O kere ha.” (Jenesis 1:27) Nke a apụtaghị na e kere ụmụ mmadụ iyi Chineke n’ọdịdị anụ ahụ́, n’ihi na “Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Kama, ọ pụtara na e kenyere ụmụ mmadụ àgwà Chineke na echiche nke omume ọma, akọ na uche. (Ndị Rom 2:14, 15) Ha nwekwaara onwe ha ime nhọrọ, na-enwe ikike ịtụle okwu na ikpebi ihe ha ga-eme.
Otú ọ dị, a hapụghị nne na nna anyị mbụ n’enyeghị ha ụkpụrụ nduzi. Kama nke ahụ, a dọrọ ha aka ná ntị banyere ihe omume ọjọọ ga-arụpụta. (Jenesis 2:17) Ya mere, ihe àmà na-egosi na mgbe Adam chere mkpebi metụtara omume ihu, ọ họọrọ ime ihe yiri n’anya ya ka ọ bara uru n’oge ahụ. O sonyeere nwunye ya n’ime ihe ọjọọ kama ịtụle mmekọrịta ya na Onye Okike ya ma ọ bụ mmetụta na-adịte aka omume ya ga-enwe. Mgbe e mesịrị, ọ nwakwara ịkwalara Jehova ụta, na-asị na nwunye O nyere ya rafuru ya.—Jenesis 3:6, 12; 1 Timoti 2:14.
Otú Chineke si meghachi omume ná mmehie Adam na Iv na-akụzi ihe. Ọ nwaghị idozi ụfọdụ ‘ntụpọ sitere n’okike’ ná mkpụrụ ndụ ihe nketa ha. Kama nke ahụ, o mere ihe ọ gwara ha na omume ha ga-arụpụta, bụ́ nke mesịrị duga n’ọnwụ ha. (Jenesis 3:17-19) Akụkọ ihe a mere ná mmalite ụwa na-eme ka anyị ghọtakwuo otú akparamàgwà mmadụ dị. *
Ihe Na-agba Akaebe na O Sighị Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa n’Aka
Ruo ogologo oge, ndị ọkà mmụta sayensị anọwo na-arụ nnukwu ọrụ nke ịchọpụta otú mkpụrụ ndụ ihe nketa si akpata ọrịa ma na-akpuzi akparamàgwà nke mmadụ, na ụzọ ha ga-esi gwọta ya. Mgbe otu ìgwè nke ndị nchọpụta dị mmadụ isii rụrụ ọrụ ruo afọ isii, ha chọpụtara mkpụrụ ndụ ihe nketa nke ha sị na ọ bụ ya na-akpata ọrịa Huntington, ọ bụ ezie na ndị nchọpụta ahụ amaghị otú mkpụrụ ndụ ihe nketa ahụ si akpata ọrịa ahụ. Otú ọ dị, n’ịkọ banyere nchọpụta a, akwụkwọ bụ́ Scientific American hotara ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ nke mahadum Harvard bụ́ Evan Balaban, bụ́ onye kwuru na ọ ‘ga-aka esigbu onwe ya n’ike ịchọpụta mkpụrụ ndụ ihe nketa na-akpata nsogbu nke akparamàgwà.’
N’ezie, nchọpụta ndị e mere iji gbalịa igosipụta na ụfọdụ mkpụrụ ndụ ihe nketa kpọmkwem na akparamàgwà mmadụ nwere njikọ akụwo afọ n’ala. Dị ka ihe atụ, n’akwụkwọ bụ́ Psychology Today, akụkọ a kọrọ banyere mgbalị ndị e mere iji chọpụta otú mkpụrụ ndụ ihe nketa si akpata ịda mbà n’obi na-ekwu, sị: “Ihe ndekọ ndị metụtara ntiwapụ na nchịkwa nke isi mgbaka na-eme ka o doo anya na a pụghị ikwu na ọ bụ nanị mkpụrụ ndụ ihe nketa na-akpata ha.” Akụkọ ahụ nyere otu ihe atụ: “Ndị America a mụrụ tupu 1905 nwere ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịda mbà n’obi dị otu pasent ka ha na-eru afọ 75. N’ime ndị America a mụrụ afọ iri ise mgbe e mesịrị, pasent 6 na-ada mbà n’obi ka ha na-erule afọ 24!” N’ihi ya, o kwubiri na ọ bụ nanị ihe ndị na-adịghị n’ahụ́ ma
ọ bụ ihe ndị si n’ọha pụrụ ime ka e nwee oké mgbanwe dị otú ahụ n’oge dị mkpirikpi otú ahụ.Gịnị ka nchọpụta ndị a na imerime ndị ọzọ na-agwa anyị? Ọ bụ ezie na mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ ikere òkè n’ịkpụzi ụdị mmadụ anyị bụ, o doro anya na e nwere ihe ndị ọzọ. Otu ihe bụ́ isi bụ gburugburu ebe obibi anyị, bụ́ nke gbanweworo n’ụzọ dị egwu n’oge a. Banyere ihe ndị ntorobịa taa na-ahụ ná ntụrụndụ ndị na-ewu ewu, akwụkwọ bụ́ Boys Will Be Boys na-ekwu na o yikarịghị ka ụmụaka ha ga-azụlite ụkpụrụ omume ndị dị mma mgbe ha “na-etolite na-eji ọtụtụ narị puku awa ekiri ihe omume na ihe nkiri TV bụ́ ndị a na-awakpo ndị mmadụ na ha, agba ha egbe, ama ha mma, achapụta eriri afọ ha, ebepụ ha isi, agba ha akpụkpọ, ma ọ bụ na-achụpụ ha, mgbe ụmụaka na-etolite na-ege egwú ndị na-akwalite ndina n’ike, igbu onwe onye, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, aṅụrụma, na nkwesi olu ike.”
N’ụzọ doro anya, Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa a,” emewo ka e nwee gburugburu ebe obibi nke na-eme ka ọchịchọ ụmụ mmadụ dịkwuo njọ. Ònyekwa pụrụ ịrụ ụka banyere mmetụta dị ike gburugburu ebe obibi dị otú ahụ na-enwe n’ahụ́ anyị nile?—Jọn 12:31; Ndị Efesọs 6:12; Mkpughe 12:9, 12.
Mkpọrọgwụ nke Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ
Dị ka anyị hụwororịị, nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ malitere mgbe mmadụ abụọ mbụ ahụ mehiere. Gịnị si na ya pụta? Ọ bụ ezie na ọ bụghị ọgbọ nke ụmụ Adam ka mmehie Adam si n’aka, ka o sina dị, ha nile ketara mmehie, ezughị okè, na ọnwụ site n’ọmụmụ dị ka ihe nketa ha ná ndụ. Bible na-akọwa, sị: “Ọ bụ ya mere na, dị nnọọ ka mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.”—Ndị Rom 5:12.
Ezughị okè nke ụmụ mmadụ mere nnọọ ka ihe siere ha ike. Ma nke ahụ adịghị eme ka ha ghara inwe ibu ọrụ ọ bụla n’ụzọ omume. Bible na-egosi na ndị nwere okwukwe ná ndokwa Jehova mere maka ndụ ma na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Chineke ga-enweta ihu ọma ya. N’ihi obiọma ya sitere n’ịhụnanya, Jehova ji obi ebere mee ndokwa ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ, ịzụtaghachi ihe Adam tụfuru, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Ndokwa ahụ bụ àjà mgbapụta nke Ọkpara ya zuru okè, bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ onye kwuru, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke na-egosipụta okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16; 1 Ndị Kọrint 15:21, 22.
Pọl onyeozi gosipụtara ekele miri emi o nwere maka ndokwa a. O ji oké olu kwuo, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-anwụ ọnwụ a? Ọ bụ Chineke site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị!” (Ndị Rom 7:24, 25) Pọl maara na ọ bụrụ na ya adaba ná mmehie n’ihi adịghị ike ya, na ya pụrụ ịrịọ Chineke mgbaghara ná ndabere nke ájá mgbapụta Jizọs Kraịst. *
Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, taa ọtụtụ ndị biburu ndụ ọjọọ ma ọ bụ ndị ọnọdụ ha yiri ka olileanya adịghị na ya enwetawo ezi ihe ọmụma nke eziokwu Bible, mee mgbanwe ndị dị mkpa, ma sonye ná ndị ga-enweta ngọzi Chineke. Mgbanwe ndị ha mere adịghị mfe, ọtụtụ n’ime ha na ọchịchọ ọjọọ ka na-alụkwa. Ma site n’enyemaka Chineke, ha nọgidere na-eguzosi ike n’ezi ihe ma na-achọta ọṅụ n’ijere ya ozi. (Ndị Filipaị 4:13) Tụlee nanị otu ihe atụ nke onye mere mgbanwe dị ukwuu iji na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ.
Ahụmahụ Na-agba Ume
“Mgbe m ka bụ nwatakịrị nwoke nke bi n’ụlọ akwụkwọ, etinyere m aka n’omume idina ụdị
onwe, ọ bụ ezie na ọ dịbeghị mgbe m lere onwe m anya dị ka onye na-edina ụdị onwe ya. Ndị mụrụ m gbara alụkwaghịm, ịhụnanya sitere n’aka nne na nna bụ́ nke a na-egositụbeghị m gụsikwara m agụụ ike. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ, ejere m ozi agha a manyere m amanye ije. E nwere ìgwè ndị na-edina ụdị onwe ha n’ogige ndị dịketere nke m. Ụzọ ndụ ha dọrọ m akpịrị, n’ihi ya amalitere m iso ha na-akpakọrịta. Mgbe mụ na ha kpakọrịtasịrị ruo otu afọ, amalitere m ile onwe m anya dị ka onye na-edina ụdị onwe ya. ‘Ọ bụ otú a ka e si kee m,’ ka m chere n’echiche, ‘ọ dịghịkwa ihe ọ bụla m pụrụ ime banyere ya.’“Amalitere m ịmụ asụsụ e ji mara ndị na-edina ụdị onwe ha ma na-aga klọb ha, bụ́ ebe a na-enye ọgwụ ọjọọ na ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya n’efu. Ọ bụ ezie na n’elu ahụ́, o yichara ihe na-akpali nnọọ akpali, n’ezie, ọ bụ ihe na-asọ oyi. N’ime obi m, achọpụtara m na ụdị mmekọrịta a adịghị ka e si kee m, na ọ gaghị adịgidekwa.
“N’otu obodo nta, ahụrụ m Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova mgbe nzukọ na-aga n’ihu. Abanyere m n’ime ya ma gee okwu a nọ na-ekwu, bụ́ nke kwuru banyere ọnọdụ ndị ga-adị na Paradaịs na-abịanụ. Mgbe e mesịrị, agakwuuru m ụfọdụ n’ime Ndịàmà, ha kpọkwara m iso ha gaa mgbakọ. Agara m, nke ahụ meghekwara m anya—ahụrụ m ezinụlọ ndị na-enwe obi ụtọ ka ha na-efekọ ofufe ọnụ. Amalitere m iso Ndịàmà na-amụ Bible.
“Ọ bụ ezie na ọ bụụrụ m ọgụ na mgba, amalitere m itinye ihe ndị m na-amụta na Bible n’ọrụ. Abịara m hapụ omume m nile na-adịghị ọcha. Mgbe m mụsịrị ihe ruo ọnwa 14, araara m ndụ m nye Jehova, e meekwa m baptizim. Na nke mbụ ya ná ndụ m, enwetara m ezi ndị enyi. Enyeworo m ndị ọzọ aka ịmụta eziokwu sitere na Bible, ana m ejekwa ozi ugbu a dị ka ohu na-eje ozi n’ọgbakọ Ndị Kraịst. N’ezie, Jehova agọziwo m.”
Anyị Ga-aza Ajụjụ
Ịnwa ịkwalara mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị ụta nile maka omume ọjọọ anyị enweghị nnọọ isi. Kama inyere anyị aka idozi ma ọ bụ imeri nsogbu anyị, ka akwụkwọ bụ́ Psychology Today na-ekwu, ime otú ahụ “pụrụ ịdị na-akụziri anyị iche na anyị enweghị ike inyere onwe anyị aka nke bụ́ isi ihe na-akpata ọtụtụ n’ime nsogbu anyị. Kama ibelata nsogbu ndị a, nke a yiri ka o mewo ka ha mụbaa.”
Ọ bụ eziokwu na anyị aghaghị ịlụso ikike ọjọọ ndị bụ́ isi ọgụ, gụnyere ọchịchọ mmehie anyị na mgbalị ndị Setan na-eme ịdọpụ uche anyị n’irubere Chineke isi. (1 Pita 5:8) Ọ bụkwa eziokwu na mkpụrụ ndụ ihe nketa anyị pụrụ imetụta anyị n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. Ma n’ezie, anyị abụghị ndị na-apụghị inyere onwe anyị aka. Ezi Ndị Kraịst nwere ndị na ihe ndị dị ike ha na ha kwụ—Jehova, Jizọs Kraịst, mmụọ nsọ Chineke, Okwu ya bụ́ Bible, na ọgbakọ Ndị Kraịst.—1 Timoti 6:11, 12; 1 Jọn 2:1.
Tupu mba Izrel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Mozis chetaara ndị ahụ ibu ọrụ ha n’ebe Chineke nọ, na-asị: “Ndụ na ọnwụ, ngọzi ahụ na nkọcha ahụ, ka m tinyeworo n’ihu gị: gị họrọkwa ndụ, ka i wee dị ndụ, gị onwe gị na mkpụrụ gị: ịhụ Jehova, bụ́ Chineke gị, n’anya, na ige ntị olu Ya, na ịrapara n’ahụ́ Ya.” (Deuterọnọmi 30:19, 20, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.) N’otu aka ahụ taa, iwu ji onye ọ bụla isi zuru okè ime mkpebi nke aka ya banyere ijere Chineke ozi na imezu ihe ọ na-achọ n’aka ya. Gị ka ọ dị n’aka ịhọrọ.—Ndị Galeshia 6:7, 8.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Lee Teta! nke October 8, 1996, peeji nke 15-19.
^ par. 19 Lee akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, peeji nke 62-69, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Adam na Iv hà bụ ndị nwere ọchịchọ ime mmehie n’ihi ntụpọ ụfọdụ e nwere ná mkpụrụ ndụ ihe nketa ha?
[Foto ndị dị na peeji nke 10]
Ò kwesịrị ka onye ọ bụla zaa ajụjụ maka mkpebi ya?
[Ebe E Si Nweta Foto]
Onye ji ọgwụ ọjọọ eme ihe: Godo-Foto
[Foto dị na peeji nke 11]
Mgbalị ndị e mere iji chọpụta otú mkpụrụ ndụ ihe nketa si akpuzi akparamàgwà mmadụ akụwo afọ n’ala
[Foto dị na peeji nke 12]
Itinye ihe Bible na-ekwu n’ọrụ pụrụ inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịgbanwe