Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Eziokwu ahụ n’Ebe A Na-atụghị Anya Ya

Ịchọta Eziokwu ahụ n’Ebe A Na-atụghị Anya Ya

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Ịchọta Eziokwu ahụ n’Ebe A Na-atụghị Anya Ya

Ọ BỤ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:3, 4) Iji mezuo nke ahụ, Ndịàmà Jehova ebipụtawo ma kesaa ọtụtụ nde Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Mgbe ụfọdụ, akwụkwọ ndị a enyeworo ndị nwere obi eziokwu aka ịmụta eziokwu ahụ n’ụzọ ndị a na-atụghị nnọọ anya ha. Banyere nke a, ndị nkwusa Alaeze nọ na Freetown, Sierra Leone, na-akọ ahụmahụ na-esonụ.

Osman bụ nwoke nke abụọ n’ime ezinụlọ e nwere ụmụ itoolu. N’ịbụ onye tolitere n’ezinụlọ ji okpukpe kpọrọ ihe, ọ na-eso nna ya mgbe nile aga ụka. Otú ọ dị, ihe okpukpe Osman na-akụzi banyere ọkụ ala mmụọ nyere ya nsogbu n’obi nke ukwuu. Ọ pụghị ịghọta otú Chineke dị obi ebere ga-esi na-emekpa ndị ajọ omume ahụ́ site n’ịkpọ ha ọkụ. Nkọwa nile e nyere iji nyere Osman aka ịghọta ozizi ọkụ ala mmụọ emeghị ka obi ruo ya ala.

Otu ụbọchị, mgbe Osman dị afọ 20, ọ hụrụ otu akwụkwọ na-acha anụnụ anụnụ nke fọrọ nke nta ka ahịhịa kpuchie ya n’ime ihe e ji ekpofu ahịhịa. N’ịbụ onye akwụkwọ na-amasịkarị, o welitere ya, hichaa ya, ma hụ isiokwu ya—Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi. *

‘Olee eziokwu a na-ekwu okwu ya?’ ka Osman chere n’echiche. N’ịbụ onye nwere nnọọ ọchịchọ ịmata ya, Osman weere akwụkwọ ahụ laa n’ebe obibi ya ma gụchapụ ya ozugbo. Lee obi ụtọ o nwere ịmụta na Chineke nwere aha aka—Jehova! (Abụ Ọma 83:18) Osman mụtakwara na àgwà bụ́ isi nke Chineke bụ ịhụnanya nakwa na ọbụna echiche nke imekpa ndị mmadụ ahụ́ n’ebe na-ere ọkụ bụ ihe arụ n’anya Ya. (Jeremaịa 32:35; 1 Jọn 4:8) N’ikpeazụ, Osman gụtara na Jehova ga-eweta ụwa paradaịs n’isi nso bụ́ nke ndị mmadụ ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4) Lee eziokwu dị ebube sitere n’aka Chineke nke dị obi ebere ma na-ahụ n’anya ọ bụ! Osman ji obi ya nile kelee Jehova maka ikwe ka ọ chọta eziokwu ahụ n’ebe a na-atụghị nnọọ anya na ọ ga-achọta ya.

Ụbọchị ole na ole mgbe nke ahụ gasịrị, site n’enyemaka nke ụfọdụ ndị enyi ya, Osman chọtara Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova ma gaa nzukọ nke mbụ ya. Mgbe ọ nọ n’ebe ahụ, ọ gwara otu Onyeàmà ka ọ mụọrọ ya Bible. N’agbanyeghị mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ sitere n’aka ndị ezinụlọ ya, Osman nọgidere na-enwe ọganihu ime mmụọ, e mekwara ya baptizim. (Matiu 10:36) Taa, ọ na-eje ozi dị ka okenye n’ọgbakọ. Lee ka o si dị ịtụnanya na ihe a nile malitere site n’ịchọta akwụkwọ e ji amụ Bible n’ime ihe e ji ekpofu ahịhịa!

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Nke Ndịàmà Jehova bipụtara na 1970.