Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Enwetara M Ụgwọ Ọrụ Site n’Igosipụta Nsọpụrụ Chineke

Enwetara M Ụgwọ Ọrụ Site n’Igosipụta Nsọpụrụ Chineke

Akụkọ Ndụ

Enwetara M Ụgwọ Ọrụ Site n’Igosipụta Nsọpụrụ Chineke

DỊ KA WILLIAM AIHINORIA SI KỌỌ

Etetara m n’ụra n’etiti abalị ka papa m na-asụ ude ọ na-asụkarị. O ji afọ ya aka na-atụrụgharị n’ala ụlọ. Mụ na mama m na nwanne m nwanyị nke tọrọ m gbara ya gburugburu. Mgbe o yiri ka ihe mgbu ahụ ọ kwụsịtụla, ọ nọdụrụ ala nke ọma, maa ọsụ, ma kwuo, sị: “Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova nwere udo n’ụwa a.” Ihe ahụ o kwuru juru m anya, ma o nwere mmetụta dị ukwuu n’ahụ́ m n’ihi na anụtụbeghị m banyere Ndịàmà Jehova. Anọ m na-eche ihe o bu n’uche.

IHE ahụ mere na 1953 mgbe m dị afọ isii. A mụrụ m n’ezinụlọ a lụbatara ọtụtụ nwunye na ya nke dị n’Ewossa, bụ́ otu obodo nta a na-arụ ọrụ ugbo na ya n’ebe etiti ọdịda anyanwụ Nigeria. Abụ m nwa nke abụọ na nwa nwoke mbụ n’ime ezinụlọ nke mesịrị mụbaa ịgụnye ndị nwunye 3 nke papa m na ụmụ 13. Anyị nile bi n’ụlọ ájá e ji akịrịka tụchie elu ya bụ́ nke nwere ọnụ ụlọ anọ nke nna m ochie wuru. Ndị ọzọ so n’ezinụlọ anyị gụnyekwara nne m ochie na ụmụnne papa m ndị nwoke atọ, nakwa ezinụlọ ha.

Ahụsiri m anya mgbe m bụ nwata. Ihe mere o ji dị otú a karịsịa bụ ọrịa papa m. Ọ na-arịa ọrịa afọ ọtịta na-adịghị ala ala bụ́ nke dịgidere ruo mgbe ọ nwụrụ ọtụtụ afọ n’ihu. Ọrịa a a na-amaghị aha ya ọ na-arịa anabataghị ọgwụgwọ ọ bụla ezinụlọ dara ogbenye n’Africa ga-akwụli ụgwọ ya—ma nke mkpọrọgwụ ma nke ọdịnala. Ọtụtụ abalị, anyị na-anọ na-ebe ákwá n’akụkụ papa m ka ọ na-atụrụgharị n’ala ụlọ n’ihi oké ihe mgbu ruo mgbe oké ọkpa ga-ebe n’ụtụtụ echi ya. N’ịchọ ọgwụgwọ maka ọrịa ya, ya na mama m na-esokarị eme njem, na-ahapụ mụ na ụmụnne m n’aka nne m ochie.

Ezinụlọ anyị na-akpata ihe oriri site n’ịkọ na ire ji, akpụ, na ọjị́. Anyị na-akakwa obere rọba iji mejutụ obere ego anyị na-akpata. Ihe oriri bụ́ isi anyị nwere bụ ji. Anyị na-eri ji n’ụtụtụ, rie ụtara ji n’ehihie, riekwa ji ọzọ n’abalị. Mgbe ụfọdụ, anyị na-agbanwetụ nri mgbe anyị riri ogede a hụrụ ahụ.

Otu akụkụ bụ́ isi nke ndụ anyị bụ ife ndị nna ochie. Ezinụlọ anyị na-enye osisi ndị e kenyere mkpokoro eju na ha nri. Papa m na-efekwa arụsị iji na-achụpụ ndị ajọ mmụọ na ndị amoosu.

Mgbe m dị afọ ise, anyị si n’obodo nta anyị kwaga, ruo nwa oge, n’otu ógbè a na-arụ ọrụ ugbo na ya bụ́ nke dị ihe dị ka kilomita 11 site n’obodo nta anyị. N’ebe ahụ, papa m butere ọrịa arịkwa mmiri, nke bụ́ ihe mmekpa ahụ́ n’elu ọrịa afọ ọ na-arịa. Ọ pụghị ịrụ ọrụ n’ehihie, ọrịa afọ ya na-emekpakwa ya ahụ́ n’abalị. Ebutere m ọrịa ọkà ntagbu, nke bụ́ otu ụdị nke ịba ahụ́ ọkụ. N’ihi ya, anyị bịara na-enweta ihe anyị na-eri n’aka ụmụnne papa m. Kama ịnwụ n’ogbenye ọnụ ntụ, anyị kwalatara n’obodo nta anyị bụ́ Ewossa. Nna m chọrọ ka m, bụ́ diọkpara ya, rụọ ọrụ ka ọrụ ugbo akpata erie mma. O chere na agụmakwụkwọ dị mma ga-enyere m aka ịkwalite ọnọdụ ibi ndụ nke ezinụlọ anyị ma nyere m aka ịzụlite ụmụnne m.

E Kpughepụ M Nye Okpukpe Dị Iche Iche

Mgbe anyị kwalatara n’obodo nta anyị, amalitere m ịga akwụkwọ. Nke a kpughepụrụ m nye okpukpe dị iche iche nke Krisendọm. N’afọ ndị 1950, ọ pụrụ isiri mmadụ ike igosi ọdịiche dị n’etiti agụmakwụkwọ sitere n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na okpukpe ndị ọcha na-achị mba anyị wetara. Ebe ọ bụ na m na-aga ụlọ akwụkwọ praịmarị nke ndị Katọlik, nke ahụ pụtara na aghaghị m ịbụ onye Roman Katọlik.

Na 1966, mgbe m dị afọ 19, abanyere m n’ụlọ akwụkwọ Pilgrim Baptist Secondary School nke dị n’obodo Ewohinmi, ihe dị ka kilomita asatọ site n’Ewossa. N’ebe ahụ, ọzụzụ okpukpe m gbanwere. Ebe ọ bụ na m na-agazi ụlọ akwụkwọ ndị Protestant, ndị ụkọchukwu Katọlik gbochiri m iso na-ekere òkè na Mas na Sunday.

Ọ bụ n’oge m nọ n’ụlọ akwụkwọ ndị Baptist a ka m gụrụ Bible na nke mbụ ya. Ọ bụ ezie na anọgidere m na-aga chọọchị Katọlik, ana m agụrụ onwe m Bible kwa Sunday mgbe a kasịrị ụka Katọlik. Ozizi Jizọs Kraịst kpaliri mmasị m, na-akpali m inwe ọchịchọ nke ibi ndụ nsọpụrụ Chineke bụ́ nke nwere nzube. Ka m na-agụkwu Bible, otú ahụ ka ihu abụọ nke ụfọdụ ndị ndú okpukpe na ụzọ ndụ rụrụ arụ nke ọtụtụ ndị aghasa bịara na-asọkwu m oyi. Ihe m hụrụ n’etiti ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst dị nnọọ iche n’ihe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya kụziri ma mee.

O nwere kpọmkwem ihe ndị merenụ wụrụ m akpata oyi. N’otu oge mgbe m gara n’ụlọ ahịa onye katkist anyị ịzụ chaplet, ahụrụ m ọtụmọkpọ e kowere n’ọnụ ụzọ ụlọ ahịa ahụ. N’oge ọzọ, onyeisi ụlọ akwụkwọ Baptist ahụ nwara imetọ m n’ụzọ mmekọahụ. Emesịrị m mata na ọ bụ onye na-edina ụdị onwe ya nakwa na o metọwo ndị ọzọ. Atụgharịrị m uche banyere ihe ndị a, na-eche n’obi m, sị, ‘Chineke ọ̀ na-anakwere okpukpe nke ndị òtù ya na ọbụna ndị ndú ya na-adịghị aza ajụjụ maka mmehie ndị dị oké njọ ha na-eme?’

Ịgbanwe Okpukpe

Otú ọ dị, ihe m gụtara na Bible masịrị m, ekpebisikwara m ike ịnọgide na-agụ ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka m malitere ịtụgharị uche n’ihe papa m kwuru n’ihe dị ka afọ 15 tupu mgbe ahụ: “Ọ bụ nanị Ndịàmà Jehova nwere udo n’ụwa a.” Ma ụjọ tụrụ m n’ihi na a na-eme ndị ntorobịa bụ́ Ndịàmà n’ụlọ akwụkwọ anyị akaje ma na-ata ha ahụhụ mgbe ụfọdụ n’ihi ịjụ isonye n’ekpere ụtụtụ. Ụfọdụ n’ime nkwenkwe ha dịkwa ịtụnanya. Dị ka ihe atụ, o siiri m ike ikwere na ọ bụ nanị 144,000 ga-aga eluigwe. (Mkpughe 14:3) Ebe ọ bụ ọchịchọ m ịga eluigwe, anọ m na-eche n’obi m ma ọnụ ọgụgụ a ò zuola tupu a mụọ m.

O doro anya na Ndịàmà dị iche n’omume na àgwà ha. Ha adịghị etinye aka n’omume rụrụ arụ nakwa n’ihe ike ndị ntorobịa ndị ọzọ nọ n’ụlọ akwụkwọ na-eme. Nye m, ha nọpụrụ nnọọ iche n’ụwa, dị ka m gụtara na Bible na ndị na-ekpe ezi okpukpe kwesịrị ịnọpụ.—Jọn 17:14-16; Jems 1:27.

Ekpebiri m inyochakwu ha. Na September 1969, enwetara m akwụkwọ bụ́ “Ezi-Okwu Ahu Nke Nedubà ná Ndu Ebigh-Ebi.” N’ọnwa sochiri ya, otu onye ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, malitere ịmụrụ m ihe. N’ịbụ onye ihe mbụ a mụụrụ m kpaliri, amalitere m ịgụ akwụkwọ Ezi-Okwu ahụ n’otu abalị Saturday ma gụchaa ya n’ehihie echi ya. Ozugbo, amalitere m ịkọrọ ụmụ akwụkwọ ibe m ihe ndị dị ebube m gụtara. Ụmụ akwụkwọ na ndị nkụzi chere na okpukpe ọhụrụ m na-agba m ara. Ma amaara m na ara adịghị agba m.—Ọrụ 26:24.

A kọọrọ ndị mụrụ m na m na-ekwusa banyere okpukpe ọhụrụ. Ha gwara m ka m lọta ụlọ ozugbo ka ha wee nwee ike ịchọpụta ihe bụ́ nsogbu m. Ọ dịghị onye m pụrụ ịgakwuru maka ndụmọdụ, ebe ọ bụ na Ndịàmà ahụ nile agaala otu n’ime mgbakọ distrikti ha n’Ilesha. Mgbe m lọtara ụlọ, mama m na ndị ikwu m ndị ọzọ jụkasịrị m ajụjụ ahụ́ ma katọọ m nke ukwuu. Agbalịrị m ike m ịgbachitere ihe m na-amụta na Bible.—1 Pita 3:15.

Mgbe nwanne papa m nke nwoke kụsịrị afọ n’ala ná mgbalị ya igosi na Ndịàmà Jehova bụ ndị ozizi ụgha, ọ nwara iji ụzọ ọzọ mee ihe. Ọ rịọrọ m, sị: “Cheta na ị gara ụlọ akwụkwọ iji mụta akwụkwọ. Ọ bụrụ na ị hapụ ihe ọmụmụ gị mewe nkwusa, ị gaghị agụcha akwụkwọ gị ma ọlị. Ya mere, gịnị ma i chere ruo mgbe ị gụsịrị akwụkwọ tupu ị banye n’okpukpe ọhụrụ a.” N’oge ahụ, nke ahụ yiri ihe ezi uche dị na ya, n’ihi ya, akwụsịrị m iso Ndịàmà na-amụ ihe.

Na December 1970, ozugbo m gụsịrị akwụkwọ, agara m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze n’egbughị oge, anọwokwa m na-aga nzukọ nke Ndịàmà Jehova kemgbe ahụ. N’August 30, 1971, e mere m baptizim ná ngosipụta nke nrara m raara onwe m nye Chineke. Ọ bụghị nanị ndị mụrụ m ka nke ahụ wụrụ akpata oyi n’ahụ́ kamakwa ndị nile nọ n’ógbè ahụ. Ha kwuru na mụ emechuwo ha ihu ebe ọ bụ na m bụ onye mbụ n’ime Ewossa ma ọ bụ gburugburu ya nwetara ihe nrite agụmakwụkwọ n’efu n’aka gọọmenti. Ọtụtụ ndị na-atụ anya na m ga-enwe ọganihu dị ukwuu. Ha na-atụ anya na m ga-eji akwụkwọ m gụrụ mepee ógbè ahụ.

Ihe Ndị Si ná Mgbanwe M Mere Pụta

Ezinụlọ m na ndị okenye nke obodo ahụ zipụrụ ndị nnọchianya ha ịgbalị ime ka m kwenye ịjụ okwukwe m. Mgbalị ha gụnyere ọbụbụ ọnụ. “Ọ bụrụ na ị hapụghị okpukpe a,” ka ha kwuru, “ihe ọjọọ na-echere gị n’ọdịnihu. Ị gaghị enweta ọrụ. Ị gaghị arụ ụlọ nke aka gị. Ị gaghị enwe ike ịlụ nwanyị ma nwee ezinụlọ.”

N’ụzọ dị iche n’amụma ọjọọ ndị ahụ ha buru, ọnwa iri ka m gụsịrị akwụkwọ, enwetara m ọrụ dị ka onye nkụzi. N’October 1972, alụrụ m nwunye m m hụrụ n’anya, bụ́ Veronica. Mgbe e mesịrị, gọọmenti nyere m ọzụzụ n’ihe banyere ọrụ ugbo. Azụrụ m ụgbọala mbụ m ma malite iwu ụlọ anyị. Na November 5, 1973, anyị mụrụ ada anyị, bụ́ Victory, n’ime afọ ndị sochikwaranụ, anyị mụkwara Lydia, Wilfred, na Joan. Na 1986 anyị mụrụ nwa ikpeazụ anyị, bụ́ Micah. Ha nile egosiwo na ha bụ ụmụ dị oké ọnụ ahịa, ihe nketa si n’aka Jehova bịa.—Abụ Ọma 127:3.

N’ileghachi anya azụ, apụrụ m ikwu na ọfọ ọjọọ nile ndị obodo gọọrọ m ghọchara ngọzi. Ọ bụ ya mere m ji gụọ ada m Victory (Mmeri). N’oge na-adịbeghị anya, ndị obodo detaara m akwụkwọ ma kwuo, sị: “Biko, anyị chọrọ ka ị lọta ụlọ ma tinye aka n’imepe obodo anyị ugbu a Chineke na-agọzi gị.”

Ịzụlite Ụmụ n’Ụzọ nke Chineke

Mụ na nwunye m maara na anyị apụghị ijikọta ọrụ Chineke nyere anyị bụ́ ịzụlite ụmụ anyị na ịchụso akụ̀ na ụba. N’ihi ya, anyị amụtawo inwe afọ ojuju n’ibi ndụ dị mfe. Anyị họọrọ ibi ụdị ndụ a kama iche ihe ndị na-esi n’ịhọrọ ụzọ ndụ dị iche apụta ihu.

Ọ bụ ihe a na-emekarị n’akụkụ ebe anyị bi n’ụwa bụ́ iso ọtụtụ ezinụlọ biri n’otu ụlọ, na-eji otu ụlọ ịsa ahụ́, kichin, na ihe ndị ọzọ eme ihe. Obi dị anyị ụtọ inwe ike ịdị na-enweta ụlọ nanị ezinụlọ anyị na-ebi n’obodo ọ bụla e zigara m dị ka onye ọrụ Bekee. N’eziokwu, ebe obibi ndị dị otú ahụ dara ọnụ karị, ma inweta ha mere ka mmetụta na-adịghị mma ụmụ anyị gaara enweta belata. Ekelere m Jehova na n’afọ ndị gafeworonụ, anyị enwewo ike ịzụlite ụmụ anyị na gburugburu ebe ndị dị mma n’ụzọ ime mmụọ.

Tụkwasị na nke ahụ, nwunye m anọgidewo na-anọ n’ụlọ iji na-anọnyere ma na-elekọta ụmụ anyị. Mgbe m rụsịrị ọrụ, anyị na-agbalịsi ike imekọ ihe ọnụ dị ka ezinụlọ. Ihe ọ bụla anyị na-eme, anyị na-eme ya dị ka otu ìgwè. Nke a na-agụnye ọmụmụ Bible ezinụlọ, ịkwadebe maka na ịga nzukọ ọgbakọ, ikere òkè n’ozi Ndị Kraịst, nakwa ịga ihe omume ọha.

Anyị agbalịwo ịgbaso ndụmọdụ dị na Deuterọnọmi 6:6, 7, nke na-agba ndị nne na nna ume izi ụmụ ha ihe ọ bụghị nanị n’ebe obibi kama n’ohere ọ bụla dapụtaranụ. Nke a emewo ka ụmụ anyị na-achọ ndị enyi n’ime ọgbakọ kama ịchọ ha n’èzí. Site n’ihe nlereanya anyị, ha amụtawo inyocha nke ọma ndị ha na ha na-akpakọrịta n’ihi na mụ na Veronica adịghị etinye oge dị ukwuu n’iso ndị anyị na ha na-anọghị n’otu okpukpe akpakọrịta.—Ilu 13:20; 1 Ndị Kọrint 15:33.

N’ezie, nduzi anyị na-enye na ihe anyị na-akụzi abụghị nanị mmetụta dị mma e nwere ná ndụ ụmụ anyị. Anyị anọwo na-anabata ma ka nọgide na-anabata Ndị Kraịst na-anụ ọkụ n’obi, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ozi na-ejegharị ejegharị nke Ndịàmà Jehova. Oge Ndị Kraịst a jiworo soro ezinụlọ anyị nọkọọ enyewo ụmụ anyị ohere ịhụ na ịmụta ihe site n’ụzọ ndụ ha nke ịchụ onwe onye n’àjà. Nke a emewo ka ihe anyị na-ezi ha gbanyekwuo mkpọrọgwụ, ụmụ anyị emewokwa ka eziokwu Bible bụrụ nke ha.

A Kwụrụ M Ụgwọ Ọrụ Maka Igosipụta Nsọpụrụ Chineke

Taa, mụ na nwunye m, tinyere ụmụ anyị anọ, nọ n’ozi oge nile. Oge mbụ m malitere ịsụ ụzọ bụ na 1973. N’ime afọ ndị gafeworonụ, anọwo m na-akwụsịtụ ozi oge nile m site n’oge ruo n’oge n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba. Site n’oge ruo n’oge, enwewokwa m ihe ùgwù nke izi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Alaeze, bụ́ nke na-enye Ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta nke Ndịàmà Jehova ọzụzụ. Ka ọ dị ugbu a, enwere m ihe ùgwù nke ije ozi na Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ, nakwa nke ịbụ onye nlekọta obodo nke Uhonmora.

Ụmụ m ndị nwanyị abụọ mbụ, bụ́ Victory na Lydia, lụrụ ezigbo Ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, ha na-enwekwa obi ụtọ. Ha na di ha na-eje ozi dị ka ndị òtù nke alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’Igieduma, Nigeria. Diọkpara anyị, bụ́ Wilfred, na-eje ozi dị ka ohu na-eje ozi, nwa ikpeazụ anyị, bụ́ Micah, na-arụkwa ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge. Na 1997, Joan gụsịrị kọleji ma malite ije ozi ọsụ ụzọ oge nile.

Otu n’ime ahụmahụ ndị kasị enye ụgwọ ọrụ m nweworo ná ndụ bụ inyere ndị ọzọ aka ijere Jehova Chineke ozi. Ha na-agụnye ụfọdụ n’ime ndị ikwu m. Nna m mere mgbalị ijere Jehova ozi, ma ịlụ ọtụtụ nwanyị dọlara ya azụ. Site n’oge m bụ okorobịa gaa n’ihu, anọwo m na-ahụ ndị mmadụ n’anya. Mgbe m hụrụ ka ndị ọzọ na-ata ahụhụ, ọ na-adị m ka a ga-asị na nsogbu nke m adịghị ihe ọ bụ. Ana m eche na ha na-achọpụta na m ji ezi obi enwe ọchịchọ inyere ha aka, nke a na-emekwa ka ọ dịkwuoro ha mfe iso m kwurịta okwu.

Otu n’ime ndị m nyeere aka ịmara nzube Chineke bụ otu nwa okorobịa na-adịghị esi n’ákwà ebili. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ eletrik nke nwere ihe ọghọm eletrik ka ọ na-arụ ọrụ bụ́ nke kpọnwụrụ ahụ́ ya site n’obi gbadaa. O kwere ka e duziere ya ọmụmụ Bible ma jiri nke nta nke nta na-anabata ihe ọ na-amụta. Oge e mere ya baptizim n’October 14, 1995, n’otu iyi dị nso n’ebe obibi anyị, bụ oge mbụ n’ime afọ 15 o si n’ihe ndina ya pụọ. O kwuru na ọ bụ ụbọchị kasị enye ya obi ụtọ ná ndụ. Ugbu a, ọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ.

Aghaghị m ikwu na adịghị m akwa ụta maka ịhọrọ, n’ihe dị ka afọ 30 gara aga, iso ndị Jehova dị n’otu, ndị raara onwe ha nye ya, na-ejere ya ozi. Ahụla m ka a na-egosipụta ezi ịhụnanya n’ezie n’etiti ha. A sịgodị na ndụ ebighị ebi esoghị n’ụgwọ ọrụ Jehova ga-enye ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi, aka m ga-achọ ibi ndụ nsọpụrụ Chineke. (1 Timoti 6:6; Ndị Hibru 11:6) Ọ bụ ụzọ nke kpụziworo ndụ m ma mee ka ọ kwụrụ chịm, na-ewetara mụ na ezinụlọ m ọṅụ, afọ ojuju, na obi ụtọ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Mụ na nwunye m na ụmụ m na 1990

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na nwunye m na ụmụ m na ndị ọgọ m nwoke abụọ