Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ha Rịdara’

‘Ha Rịdara’

‘Ha Rịdara’

“Ogbu mmiri na-ekpuchi ha: ha arịdawo na mmiri dị omimi dị ka nkume.”

OKWU ndị ahụ dị n’abụ Mozis na ụmụ Izrel ji mee ememe maka nnapụta a napụtara ha n’Oké Osimiri Uhie na mkpochapụ e kpochapụrụ ndị iro ha bụ́ ndị Ijipt na-achụ ha—Fero na usuu ndị agha ya.—Ọpụpụ 15:4, 5.

Ọ gaghị esiri onye ọ bụla nọ na-ekiri ihe omume ahụ dị egwu ike ịghọta ihe mmụta dị na ya. Ọ dịghị onye pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịma ikike Jehova aka ma ọ bụ n’iguzogide ya ma dị ndụ. Otú ọ dị, nanị n’ime ọnwa ole na ole mgbe e mesịrị, ndị Izrel a ma ama—Kora, Detan, Abaịram, na mmadụ 250 na-akwado ha—mara ikike Chineke nyere Mozis na Erọn aka n’ihu ọha.—Ọnụ Ọgụgụ 16:1-3.

Ná ntụziaka Jehova, Mozis dọrọ ụmụ Izrel aka ná ntị ka ha si n’ọmụma ụlọikwuu nke ndị nnupụisi ahụ wezụga onwe ha. Detan na Abaịram, n’ịbụ ndị ndị òtù ezinụlọ ha nọ n’akụkụ, jụwara isi ịgbanwe obi ha. Mgbe ahụ, Mozis mara ọkwà na n’ụzọ nke Ya, Jehova ga-eme ka o doo ndị Izrel anya na ndị ikom a “elelịwo Jehova.” Ozugbo ahụ, Jehova gbawara ala dị n’okpuru ụkwụ ha. “Ha wee rịda ná ndụ ruo [Shiol, NW], ha onwe ha na ihe nile ha nwere: ala wee mechie n’elu ha.” Gịnị banyere Kora na ndị nnupụisi ndị ọzọ? “Ọkụ . . . si n’ebe Jehova nọ pụta, ripịa [narị ndị ikom abụọ na iri ise] ahụ na-eweta nso ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.”—Ọnụ Ọgụgụ 16:23-35; 26:10.

Fero na usuu ndị agha ya, nakwa ndị ahụ nupụrụ isi n’ọzara, ha nile lara n’iyi n’ihi na ha anakwereghị ikike Jehova na mmasị o nwere n’ihe omume nke ndị ya. Ya mere, ọ dị ngwa na ndị nile Jehova ga-echebe n’ụbọchị ndị a pụrụ iche ga-amụta banyere Jehova ma rubere ya isi dị ka “Onye kachasị ihe nile elu” na “Onye pụrụ ime ihe nile.” Ka ha na-eme nke ahụ, ha pụrụ iburu n’uche okwu na-emesi obi ike Jehova kwuru, bụ́: “[Otu puku mmadụ] ga-ada n’akụkụ gị, [puku mmadụ iri] ga-adakwa n’aka nri gị; ma ọ gaghị abịaru gị nso. Ọ bụ nanị na Ị ga-eji anya gị abụọ legide, wee hụ nkwụghachi nke ndị na-emebi iwu. N’ihi na gị onwe gị asịwo, Jehova bụ ebe mgbaba m; n’ihi na ọ bụ Onye kachasị ihe nile elu ka i meworo ebe obibi gị.”—Abụ Ọma 91:1, 7-9.