Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ilerukwu Anya n’Ụfọdụ Echiche Ụgha E Nwere Banyere Ọnwụ

Ilerukwu Anya n’Ụfọdụ Echiche Ụgha E Nwere Banyere Ọnwụ

Ilerukwu Anya n’Ụfọdụ Echiche Ụgha E Nwere Banyere Ọnwụ

N’AKỤKỌ ihe mere eme nile, atụmanya na-eyi egwu nke ọnwụ etinyewo ụmụ mmadụ n’ihe ijuanya nakwa n’egwu. Ọzọkwa, e jiriwo ngwakọta nke echiche okpukpe ụgha, omenala na-ewu ewu, na nkwenkwe ndị gbanyeworo mkpọrọgwụ n’ime ụmụ mmadụ, mee ka egwu a na-atụ ọnwụ ka njọ. Nsogbu dị n’ịtụ ọnwụ egwu bụ na ọ pụrụ ibibi ikike mmadụ nwere ịnụ ụtọ ndụ ma mee ka obi gharazie isi ya ike na ndụ nwere nzube.

Ọ bụ okpukpe ndị a ma ama ka ụta kasị dịrị maka ịkwalite ọtụtụ echiche ụgha na-ewu ewu banyere ọnwụ. Site n’iji eziokwu Bible nyochaa ole na ole n’ime ha, lee ma à pụrụ ime ka nghọta gị onwe gị nwere banyere ọnwụ doo anya.

Echiche Ụgha nke 1: Ọnwụ bụ ụzọ ebumpụta ụwa nke ndụ si ejedebe.

“Ọnwụ . . . bụ akụkụ dị oké mkpa nke ndụ anyị,” ka akwụkwọ bụ́ Death—The Final Stage of Growth, na-ekwu. Okwu ndị dị otú a na-egosipụta nkwenkwe bụ́ na ọnwụ bụ ihe dị otú o kwesịrị, ụzọ ebumpụta ụwa nke ihe nile dị ndụ si ejedebe. N’aka nke ya, nkwenkwe dị otú ahụ emewo ka ọtụtụ mmadụ nwee echiche bụ́ na ndụ enweghị isi na àgwà nke inweta ihe ọ bụla otú ọ bụla o si masị ha.

Ma, ọnwụ ọ̀ bụ n’ezie ụzọ ebumpụta ụwa nke ndụ si ejedebe? Ọ bụghị ndị nchọpụta nile kweere na nke ahụ. Dị ka ihe atụ, Calvin Harley, bụ́ ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ nke mụrụ banyere otú mmadụ si aka nká, kwuru n’otu ajụjụ ọnụ a gbara ya na ya ekweghị na ụmụ mmadụ ‘bụ ndị e mere ka ha na-anwụ anwụ.’ Ọkà mmụta banyere ahụ́ ịlụso ọrịa ọgụ bụ́ William Clark kwuru, sị: “E jikọghị ọnwụ na ndụ n’ụzọ a na-apụghị ịtọsa atọsa.” Seymour Benzer, nke Ụlọ Ọrụ Nkà na Ụzụ nke California, chere echiche kwuo na “a pụrụ ịkọwa ịka nká n’ụzọ ka mma ọ bụghị dị ka klọọkụ kama dị ka ọnọdụ, bụ́ nke anyị pụrụ ịtụ anya ịgbanwe.”

Mgbe ndị ọkà mmụta sayensị na-amụ otú e si kee mmadụ, ọ na-eju ha anya. Ha na-achọpụta na e kenyere anyị ikike ndị anyị pụrụ iji mee ihe ruo oge karịrị nnọọ afọ 70 ruo 80 anyị na-adị ndụ. Dị ka ihe atụ, ndị ọkà mmụta sayensị achọpụtawo na ụbụrụ mmadụ nwere ikike ncheta dị ukwuu. Otu onye na-eme nchọpụta mere atụmatụ na ụbụrụ anyị ga-ebuli ihe ọmụma “ga-eju akwụkwọ dị ihe dị ka nde iri abụọ, ihe haruru ka akwụkwọ ndị dị n’ọbá akwụkwọ kasị ukwuu n’ụwa.” Ụfọdụ ndị ọkà mmụta akwara ozi kweere na n’ogologo ndụ nile nke mmadụ, ọ na-eji nanị otu ụzọ n’ụzọ otu narị nke otu pasent (.0001) nke ikike ụbụrụ ya eme ihe. O kwesịrị ekwesị ịjụ, sị, ‘Gịnị mere anyị ji nwee ụbụrụ nwere ikike dị ukwuu otú ahụ ebe anyị na-eji nanị akụkụ pere nnọọ mpe n’ime ya eme ihe n’oge ndụ anyị?’

Tụleekwa mmeghachi omume ụmụ mmadụ n’ebe ọnwụ dị, na-egosi na ọ bụghi ihe ha bu pụta ụwa! Nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ, ọnwụ nke nwunye, di, ma ọ bụ nwa pụrụ ịbụ ahụmahụ kasị akpasu iwe ná ndụ. Mgbe mgbe, obi na-agbawa ndị mmadụ ruo ogologo oge mgbe onye ha hụrụ n’anya nke ukwuu nwụrụ. Ọbụna ọ na-esiri ndị na-azọrọ na ọnwụ bụ ụzọ ebumpụta ụwa ụmụ mmadụ si abịa ná njedebe, ike ikwere echiche bụ́ na ọnwụ nke ha ga-apụta na ihe nile banyere ha abịala ná njedebe. Akwụkwọ bụ́ British Medical Journal kwuru banyere “echiche a ma ama ndị ọkachamara nwere nke bụ́ na onye ọ bụla chọrọ ịdị ndụ ruo ogologo oge o kwere mee.”

N’ihi otú mmadụ si emeghachi omume n’ozuzu banyere ọnwụ, ikike dị ịtụnanya o nwere icheta na ịmụta ihe, na oké ọchịchọ ọ na-achọ ịdị ndụ ebighị ebi, ọ̀ bụ na o doghị anya na e kere ya ka ọ nọgide na-adị ndụ? N’ezie, Chineke kere ụmụ mmadụ, ọ bụghị ka ọnwụ bụrụ ihe ha bu pụta ụwa nke ga-adakwasị ha n’ikpeazụ, kama ka ha nwee atụmanya nke ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Rịba ama ihe Chineke setịpụụrụ mmadụ abụọ mbụ dị ka ihe ga-abụ ọdịnihu ha: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ́ azụ̀ nke oké osimiri, na n’ahụ́ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ́ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.” (Jenesis 1:28) Lee ọdịnihu dị ebube ma na-adịgide adịgide nke ahụ bụ!

Echiche Ụgha nke 2: Chineke na-eme ka ndị mmadụ nwụọ ka ha wee bịa nọnyere ya.

Otu nne dị afọ 27 nke nọ n’ọnụ ọnwụ ma na-ahapụ ụmụ atọ gwara otu nọn Katọlik, sị: “Abatakwala ebe a ịgwa m na nke a bụ uche Chineke maka m. . . . Ọ na-ewe m iwe ma onye ọzọ gwa m ya.” Ma, nke a bụ ihe ọtụtụ okpukpe na-akụzi banyere ọnwụ—na Chineke na-akpọrọ ndị mmadụ ịnọ ya nso.

Onye Okike ọ̀ dị obi ọjọọ n’ezie nke na ọ ga-eji obi ịta mmiri mee ka anyị na-anwụ anwụ, ebe ọ maara na nke a na-agbawa anyị obi? Ee e, ọ bụghị Chineke nke Bible. Dị ka 1 Jọn 4:8, si kwuo, “Chineke bụ ịhụnanya.” Rịba ama na ọ sịghị na Chineke nwere ịhụnanya ma ọ bụ na Chineke na-ahụ n’anya, kama ọ sịrị na Chineke bụ ịhụnanya. Ịhụnanya Chineke siri nnọọ ike, dị nnọọ ọcha, zuo nnọọ okè, bamiekwa nnọọ n’akụkụ nile nke àgwà na omume ya nke na a pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ọ bụ ịhụnanya n’onwe ya. Nke a abụghị Chineke nke na-eme ka ndị mmadụ nwụọ ka ha wee nọrọ ya nso.

Okpukpe ụgha etigharịwo ọtụtụ mmadụ anya banyere ebe ndị nwụrụ anwụ nọ na ihe bụ́ ọnọdụ ha. Eluigwe, ala mmụọ, pọgatrị, Limbo—ụfọdụ n’ime ebe ndị a na ebe ndị ọzọ dịgasị iche iche ha sị na ndị nwụrụ anwụ nọ dị mgbagwoju anya, ndị ọzọ ana-emenyekwa nnọọ egwu. N’aka nke ọzọ, Bible na-agwa anyị na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla; ha nọ n’ọnọdụ ọ kasị mma iji ụra atụnyere. (Eklisiastis 9:5, 10; Jọn 11:11-14) N’ihi ya, ọ dịghị anyị mkpa ichegbuwe onwe anyị banyere ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụsịrị, dị nnọọ ka anyị na-adịghị echegbu onwe anyị mgbe anyị hụrụ onye na-ehi ụra n’ụzọ dị jụụ. Jizọs kwuru banyere oge “ndị nile nọ n’ili ncheta” ‘ga-apụta’ iji dịghachi ndụ n’ụwa paradaịs.—Jọn 5:28, 29; Luk 23:43.

Echiche Ụgha nke 3: Chineke na-akpọrọ ụmụaka ịghọ ndị mmụọ ozi.

Elisabeth Kübler-Ross bụ́ onye nyochara ndị rịara ọrịa gburu ha, zoro aka n’echiche ọzọ na-ewu ewu n’etiti ndị na-ekpe okpukpe. Ka ọ na-akọ banyere otu ihe mere eme n’ezie, o kwuru na “ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ịgwa nwatakịrị nwanyị nke nwanne ya nwoke nwụnahụrụ na Chineke hụrụ obere ụmụ nwoke n’anya nke ukwuu nke mere o ji kpọrọ nwanne ya nwoke gaa eluigwe.” Okwu dị otú ahụ na-enye echiche jọgburu onwe ya banyere Chineke, ọ dịghịkwa egosipụta ụdị onye ọ bụ na àgwà ya. Dr. Kübler-Ross gara n’ihu, sị: “Mgbe nwatakịrị nwanyị a ghọrọ nne nwanyị, ọ nọgidere na-ewesa Chineke iwe, bụ́ nke kpataara ya isi mgbaka mgbe obere nwa ya nwoke nwụnahụrụ ya afọ 30 mgbe e mesịrị.”

N’ihi gịnị ka Chineke ga-eji kpọrọ nwatakịrị n’ike iji nweta mmụọ ozi ọzọ—dị ka a ga-asị na nwa ahụ dị Chineke mkpa karịa ka ọ dị ndị mụrụ ya? Ọ bụrụ na ọ bụ eziokwu na Chineke na-akpọrọ ụmụaka, nke ahụ ọ́ gaghị eme ka ọ bụrụ Onye Okike na-adịghị ahụ n’anya, nke na-achọ ọdịmma onwe ya nanị? N’ụzọ dị iche n’echiche dị otú ahụ, Bible na-asị: “Ịhụnanya sitere na Chineke.” (1 Jọn 4:7) Chineke nke ịhụnanya ọ̀ ga-akpata mfu nke ọbụna ụmụ mmadụ, n’agbanyeghị otú omume ha jọruru ná njọ, na-agaghị anabata?

Gịnịzi mere ụmụaka ji anwụ? E dekọrọ otu n’ime azịza ya ndị dị na Bible n’Eklisiastis 9:11: “Mgbe na ihe ndapụta na-adabara ha nile.” Abụ Ọma 51:5 na-agwakwa anyị na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, na anyị bụ ndị mmehie site n’oge a tụụrụ ime anyị, na ihe ndapụta na-adabara mmadụ nile ugbu a bụ ọnwụ nke ọtụtụ ihe na-akpata. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-anwụ tupu a mụọ ya, bụ́ nke na-akpata ịmụ nwa nwụrụ anwụ. N’ọnọdụ ndị ọzọ, ụmụaka na-anwụ n’ihi ọnọdụ ọjọọ ma ọ bụ ha enwee ihe ọghọm ma nwụọ. Ihe ndabara dị otú ahụ esighị Chineke n’aka.

Echiche Ụgha nke 4: A na-emekpa ụfọdụ ndị ahụ́ mgbe ha nwụsịrị.

Ọtụtụ okpukpe na-akụzi na ndị ajọ omume ga-aga na hel na-ere ọkụ ma bụrụ ndị a ga-emekpa ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi. Ozizi a ọ̀ bụ nke ezi uche dị na ya na nke dabeere n’Akwụkwọ Nsọ? A kpaara afọ ndụ mmadụ ókè ịbụ afọ 70 ma ọ bụ 80. Ọ bụrụgodị na mmadụ mebigara ajọ omume ókè ná ndụ ya nile, mmekpa ahụ́ ebighị ebi ọ̀ ga-abụ ntaramahụhụ kwesịrị ya? Ee e. Ọ ga-abụ nnọọ ikpe mkpegbu bụ́ imekpa mmadụ ahụ́ ruo mgbe ebighị ebi maka mmehie o mere n’oge ndụ dị mkpirikpi.

Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ikpughe ihe na-eme mmadụ mgbe ọ nwụrụ, o mewokwa otú ahụ n’Okwu ya e dere ede, bụ́ Bible. Lee ihe Bible na-ekwu: “Dị ka ọnwụ nke anụmanụ si dị, otú a ka ọnwụ nke mmadụ dị; ee, otu mmụọ ka ha nile nwere; . . . Ha nile na-ala n’otu ebe; ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.” (Eklisiastis 3:19, 20) Ọ dịghị ebe e kwuru banyere hel na-ere ọkụ n’ebe a. Ụmụ mmadụ na-alaghachi n’ájá—n’adịghị adị—mgbe ha nwụrụ.

Ka e wee mekpaa mmadụ ahụ́, ọ ghaghị ịma ihe na-emenụ. Ndị nwụrụ anwụ hà maara ihe na-emenụ? Ọzọkwa, Bible na-aza ya, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla, ọ dịghịkwa ụgwọ ọrụ ha nwere ọzọ; n’ihi na e chezọwo ncheta ha.” (Eklisiastis 9:5) O kweghị omume na ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị “na-amaghị ihe ọ bụla,” ga-enweta oké ihe mgbu n’ebe ọ bụla.

Echiche Ụgha nke 5: Ọ bụrụ na anyị anwụọ, ọ pụtara na anyị agaghị adịkwa adị ọzọ ma ọlị.

Anyị na-akwụsị ịdị adị mgbe anyị nwụrụ, ma nke a adịchaghị apụta na okwu agwụla. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job maara na ya ga-aga n’ili, Shiol, ma ya nwụọ. Ma gee ntị n’ihe o kpegaara Chineke n’ekpere: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na I zobe m [na Shiol, NW], ma a sị na I debe m na nzuzo, ruo mgbe iwe Gị laghachiri, ma a sị na Ị kpaara m ókè, wee cheta m! Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ? . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị.”—Job 14:13-15.

Job kweere na ọ bụrụ na ya anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, na Chineke ga-echeta ya ma kpọlite ya n’ọnwụ ka oge na-aga. Ihe a ka ndị nile bụ́ ndị ohu Chineke n’oge ochie kweere. Jizọs n’onwe ya mesiri olileanya a ike ma gosi na Chineke ga-eji ya onwe ya kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ihe Kraịst n’onwe ya kwuru na-enye mmesi obi ike a: “Oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta, ndị mere ezi ihe gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ, ndị mere ajọ omume gaa ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.”—Jọn 5:28, 29.

N’isi nso, Chineke ga-ekpochapụ ajọ omume nile ma guzobe ụwa ọhụrụ nke ga-adị n’okpuru ịchịisi eluigwe. (Abụ Ọma 37:10, 11; Daniel 2:44; Mkpughe 16:14, 16) Ihe ga-esi na ya pụta ga-abụ paradaịs ga-ezu ụwa ọnụ, bụ́ nke ndị na-ejere Chineke ozi ga-ebi na ya. Anyị na-agụ n’ime Bible, sị: “M wee nụ ka otu oké olu si n’ocheeze ahụ na-asị: ‘Lee! Ụlọikwuu nke Chineke na-adịnyere ihe a kpọrọ mmadụ, ya na ha ga-ebikwa, ha ga-abụkwa ndị nke ya. Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ agabigawo.’”—Mkpughe 21:3, 4.

Nnwere Onwe Pụọ n’Egwu

Ịmara banyere olileanya mbilite n’ọnwụ nakwa ịmara Onye bụ́ isi iyi nke ndokwa ahụ pụrụ ịkasi gị obi. Jizọs kwere nkwa, sị: “Unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.” (Jọn 8:32) Nke ahụ na-agụnye ime ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’egwu ọnwụ. Ọ bụ nanị Jehova pụrụ n’ezie ịgbanwe usoro nke ịka nká na ọnwụ ma nye anyị ndụ ebighị ebi. Ị̀ pụrụ ikwere ná nkwa Chineke? Ee, i pụrụ n’ihi na Okwu Chineke na-emezu mgbe nile. (Aịsaịa 55:11) Anyị na-agba gị ume ịmụtakwu banyere nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Nsogbu dị n’ịtụ egwu ọnwụ bụ na ọ pụrụ ibibi ikike mmadụ nwere ịnụ ụtọ ndụ

[Igbe dị na peeji nke 7]

ECHICHE ỤGHA ỤFỌDỤ GỊNỊ KA AKWỤKWỌ NSỌ NA-EKWU?

A MA AMA BANYERE ỌNWỤ

● Ọnwụ bụ ụzọ ebumpụta ụwa Jenesis 1:28; 2:17;

nke ndụ si ejedebe Ndị Rom 5:12

● Chineke na-eme ka ndị mmadụ Job 34:15; Abụ Ọma 37:11, 29;

nwụọ ka ha wee bịa nọnyere ya 115:16

● Chineke na-akpọrọ obere ụmụaka Abụ Ọma 51:5; 104:1, 4;

ịghọ ndị mmụọ ozi Ndị Hibru 1:7, 14

● A na-emekpa ụfọdụ ndị ahụ́ mgbe Abụ Ọma 146:4;

ha nwụsịrị Eklisiastis 9:5, 10;

Ndị Rom 6:23

● Ọ bụrụ na anyị anwụọ, ọ pụtara Job 14:14, 15; Jọn 3:16; 17:3;

na anyị agaghị adịkwa adị Ọrụ 24:15

ọzọ ma ọlị

[Foto dị na peeji nke 8]

Ịmara eziokwu banyere ọnwụ na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’egwu

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 5]

Barrators—Giampolo/The Doré Illustrations For Dante’s Divine Comedy/Dover Publications Inc.