Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị E Mere Ka Ha Dị Ọcha Maka Ezi Ọrụ

Ndị E Mere Ka Ha Dị Ọcha Maka Ezi Ọrụ

Ndị E Mere Ka Ha Dị Ọcha Maka Ezi Ọrụ

“Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.”—2 NDỊ KỌRINT 7:1.

1. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka ndị na-efe ya ofufe?

“ÒNYE ga-arịgo n’ugwu Jehova? Ònye ga-eguzosikwa ike n’ebe nsọ Ya?” Eze Devid nke Izrel oge ochie jụrụ ajụjụ ahụ na-akpali iche echiche banyere ofufe nke Jehova na-anakwere. Ọ zaziri ya, sị: “Onye nwere ọbụ aka abụọ na-emeghị ihe ọjọọ, na obi dị ọcha; onye na-ebulighị mkpụrụ obi ya nye ihe efu, ọ ṅụghịkwa iyi aghụghọ.” (Abụ Ọma 24:3, 4) Ka mmadụ wee bụrụ onye Jehova, onye bụ́ ịdị nsọ n’onwe ya, na-anakwere, ọ ghaghị ịdị ọcha ma dị nsọ. Tupu Devid ekwuo nke ahụ, Jehova chetaara mkpọkọta Izrel, sị: “Unu ga-edokwa onwe unu nsọ, wee dị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.”—Levitikọs 11:44, 45; 19:2.

2. Olee otú Pọl na Jems si mesie ike mkpa ịdị ọcha dị n’ofufe?

2 Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya nọ n’obodo Kọrint rụrụ arụ akwụkwọ, sị: “Ebe anyị nwere nkwa ndị a, ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ ọ bụla nke anụ ahụ́ na mmụọ, na-eme ka ịdị nsọ zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrint 7:1) Nke a meghachikwara ka ọ pụta ìhè na iji soro Chineke nwee mmekọrịta ma nweta ngọzi ndị o kwere ná nkwa, mmadụ aghaghị ịdị ọcha ma nwere onwe ya pụọ ná mmerụ anụ ahụ́ na nke ime mmụọ ma kwụsị ịkpa àgwà na-ezighị ezi. N’otu aka ahụ, n’ide banyere ofufe Chineke na-anakwere, Jems onye na-eso ụzọ kwuru, sị: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ site n’ụzọ Chineke na Nna anyị si ele ihe anya bụ nke a: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha, na mmadụ idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ n’ebe ụwa dị.”—Jems 1:27.

3. Ka ofufe anyị wee bụrụ nke Chineke na-anakwere, gịnị ka anyị na-aghaghị ichebasiri echiche ike?

3 Ebe ọ bụ na ịdị ọcha, ịdị nsọ, na ịbụ onye a na-emerụghị emerụ bụ ihe ndị dị mkpa otú a n’ezi ofufe, onye ọ bụla nke na-achọ inweta ihu ọma Chineke kwesịrị ichesi echiche ike banyere iru ha. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ndị mmadụ taa nwere ụkpụrụ na echiche dịrịtara nnọọ iche banyere ịdị ọcha, ọ dị anyị mkpa ịghọta ihe Jehova weere dị ka ihe dị ọcha na ihe a na-anakwere, ma na-eme ihe kwekọrọ na ya. Ọ dị anyị mkpa ịchọpụta ihe Chineke chọrọ n’aka ndị na-efe ya ofufe n’akụkụ a na ihe o meworo iji nyere ha aka ịghọ na ịnọgide bụrụ ndị dị ọcha na ndị ọ na-anakwere.—Abụ Ọma 119:9; Daniel 12:10.

Ndị Dị Ọcha Maka Ezi Ofufe

4. Kọwaa echiche Bible banyere ịdị ọcha.

4 Nye ọtụtụ ndị, ịdị ọcha pụtara nanị erughị unyi ma ọ bụ ịbụ onye na-enweghị mmetọ. Otú ọ dị, n’ime Bible, ụfọdụ okwu Hibru na nke Grik ndị na-enye echiche nke ịdị ọcha na-akọwa ya ọ bụghị nanị n’echiche nke anụ ahụ́ kama karịsịa n’echiche nke omume na nke ime mmụọ. Ya mere, otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma Bible na-ekwu, sị: “‘Ịdị ọcha’ na ‘adịghị ọcha’ bụ okwu ndị a na-adịghị ejikọkarị ha na nanị idebe ihe ọcha, kama ha bụ n’ụzọ bụ́ isi echiche okpukpe. N’ihi ya, ụkpụrụ nke ‘ịdị ọcha’ na-emetụta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ.”

5. Ruo ókè ha aṅaa ka Iwu Mozis chịkwara ịdị ọcha ná ndụ ụmụ Izrel?

5 N’ezie, Iwu Mozis gụnyere ụkpụrụ na iwu nchịkwa ndị metụtara ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ nile nke ndụ ụmụ Izrel, na-eme ka ihe dị ọcha a na-anakwere na ihe na-adịghị ọcha a na-adịghịkwa anakwere pụta ìhè. Dị ka ihe atụ, na Levitikọs isi 11 ruo 15, anyị na-ahụ ntụziaka ndị zuru ezu metụtara ịdị ọcha na adịghị ọcha. Anụmanụ ụfọdụ adịghị ọcha, ụmụ Izrel agaghịkwa eri ha. Ịmụ nwa ga-eme ka nwanyị ghara ịdị ọcha ruo oge ụfọdụ a kpọrọ aha. N’otu aka ahụ, ọrịa akpụkpọ ahụ́ ụfọdụ, karịsịa ekpenta, na ọbara ma ọ bụ mwụsị ahụ́ isi n’akụkụ ahụ́ e ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwanyị apụta ga-eme ka mmadụ ghara ịdị ọcha. Iwu ahụ kapịrị okwu ọnụ banyere ihe e kwesịrị ime n’ọnọdụ ndị metụtara adịghị ọcha. Dị ka ihe atụ, n’Ọnụ Ọgụgụ 5:2, anyị na-agụ, sị: “Nye ụmụ Israel iwu, ka ha chụpụ n’ọmụma ụlọikwuu onye ekpenta ọ bụla, na onye ọ bụla nwere oruru, na onye ọ bụla rụrụ arụ site na mmadụ nwụrụ anwụ.”

6. N’ihi nzube dị aṅaa ka e ji nye iwu ndị ahụ metụtara ịdị ọcha?

6 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na iwu ndị a na iwu ndị ọzọ sitere n’aka Jehova bu echiche ndị metụtara nkà ọgwụ na ahụ́ ike bụ́ ndị were nnọọ ogologo oge tupu a mata banyere ha, ndị mmadụ ritekwara uru mgbe ha gbasoro ha. Ma, e nyeghị iwu ndị a nanị dị ka ụkpụrụ nchịkwa ahụ́ ike ma ọ bụ nanị dị ka ụkpụrụ nduzi nkà ọgwụ na ahụ́ ike. Ha bụ akụkụ nke ezi ofufe. Eziokwu ahụ bụ́ na ha metụtara ihe ndị mmadụ na-eme ná ndụ kwa ụbọchị—iri ihe, ịmụ nwa, mmekọrịta alụmdi na nwunye, na ihe ndị ọzọ—mesiri nnọọ ike isi ihe ahụ bụ́ na, dị ka Chineke ha, Jehova nwere ikike ikpebiri ha ihe kwesịrị ekwesị na ihe na-ekwesịghị ekwesị n’akụkụ nile nke ndụ ha, bụ́ nke ha rarawooro kpam kpam nye Jehova.—Deuterọnọmi 7:6; Abụ Ọma 135:4.

7. Site n’idebe Iwu ahụ, ngọzi dị aṅaa ka mba Izrel ga-enweta?

7 Ọgbụgba ndụ Iwu ahụ chebekwara ụmụ Izrel pụọ n’omume ndị na-emerụ emerụ nke mba ndị gbara ha gburugburu. Site n’iji ikwesị ntụkwasị obi na-edebe Iwu ahụ, gụnyere ihe nile a chọrọ n’aka ha iji nọgide na-adị ọcha n’anya Jehova, ụmụ Izrel ga-eru eru ijere Chineke ha ozi nakwa inweta ngọzi ya. Banyere nke a, Jehova gwara mba ahụ, sị: “Ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu m n’ezie, ọ bụrụkwa na unu edebe ọgbụgba ndụ m, unu ga-abụkwara m ihe nke aka m karịa ndị nile: n’ihi na ọ bụ Mụ nwe ụwa nile: unu onwe unu ga-abụkwara m alaeze ndị nchụàjà, na mba dị nsọ.”—Ọpụpụ 19:5, 6; Deuterọnọmi 26:19.

8. N’ihi gịnị ka Ndị Kraịst taa ji kwesị ilebara ihe e kwuru n’Iwu ahụ banyere ịdị ọcha anya?

8 Ebe ọ bụ na Jehova gụnyere ihe ndị dị otú ahụ n’Iwu ahụ iji nye ụmụ Izrel ntụziaka otú ha pụrụ isi dịrị ọcha, dịrị nsọ, ma bụrụ ndị ọ na-anakwere, ọ̀ bụ na o kwesịghị ekwesị ka Ndị Kraịst taa jiri nlezianya tụlee otú ha pụrụ isi mezuo ihe ndị a? Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu ahụ, ha aghaghị iburu n’uche na, dị ka Pọl kọwara, ihe nile e dere n’Iwu ahụ “bụ onyinyo nke ihe ndị gaje ịbịa, ma ihe bụ ezie dịịrị Kraịst ahụ.” (Ndị Kọlọsi 2:17; Ndị Hibru 10:1) Ọ bụrụ na Jehova Chineke, bụ́ onye sịrị, “Mụ onwe m, . . . agbanweghị,” lere ịdị ọcha na ịbụ onye a na-emerụghị emerụ anya n’oge ahụ dị ka ihe dị mkpa otú ahụ n’ezi ofufe, anyị onwe anyị taa aghaghị iji okwu metụtara ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ omume, na n’ụzọ ime mmụọ kpọrọ ihe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihu ọma na ngọzi ya.—Malakaị 3:6; Ndị Rom 15:4; 1 Ndị Kọrint 10:11, 31.

Ịdị Ọcha n’Ụzọ Anụ Ahụ́ Na-eme Ka A Mata Anyị

9, 10. (a) N’ihi gịnị ka ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ ji dị Ndị Kraịst mkpa? (b) Olee ihe ndị a na-ekwukarị banyere mgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova?

9 Ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ ọ̀ ka bụ akụkụ dị mkpa nke ezi ofufe? Ọ bụ ezie na ịdị ọcha anụ ahụ́ nanị adịghị eme ka mmadụ bụrụ onye na-efe Chineke, n’ezie, ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na onye na-efe ezi ofufe ga-adị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ ruo ókè ọnọdụ ya kwere ya mee. Karịsịa taa, bụ́ mgbe ọtụtụ mmadụ na-adịghị elebachara idebe onwe ha, ejiji ha, ma ọ bụ gburugburu ebe obibi ha ọcha anya, ndị mmadụ na-arịbakarị ndị na-eme otú ahụ ama. Nke a pụrụ ịrụpụta ezi ihe, dị nnọọ ka Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrint, sị: “Ọ dịghị ụzọ ọ bụla anyị si na-eweta ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ, ka e wee ghara ịhụta mmejọ n’ozi anyị; kama n’ụzọ ọ bụla anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke.”—2 Ndị Kọrint 6:3, 4.

10 Ugboro ugboro, ndị ọchịchị ajawo Ndịàmà Jehova mma n’ihi àgwà na omume ha nke ịdị ọcha, ime ihe n’usoro, na nke ịkwanyere mmadụ ùgwù, bụ́ nke a na-ahụ karịsịa ná mgbakọ ukwu ha dị iche iche. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ La Stampa kwuru banyere otu mgbakọ e mere n’ógbè Savona, Ịtali, sị: “Ihe kasị apụta ìhè ka mmadụ na-agagharị n’ihe owuwu ndị ahụ bụ ịdị ọcha na ime ihe n’usoro nke ndị ji ha eme ihe.” Mgbe Ndịàmà mesịrị mgbakọ n’otu ámá egwuregwu dị na São Paulo, Brazil, otu onye na-arụ ọrụ n’ámá egwuregwu ahụ gwara onye nlekọta nke ndị na-azachasị ámá egwuregwu ahụ, sị: “Site ugbu a gaa n’ihu, anyị chọrọ ka a na-azacha ámá egwuregwu a dị ka Ndịàmà Jehova si zachaa ya.” Onye ọzọ na-arụ ọrụ n’otu ámá egwuregwu ahụ kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova chọrọ ịgbaziri ámá egwuregwu a, nanị ihe anyị na-enwe nchegbu banyere ya bụ ụbọchị ndị ha ga-eji ya eme ihe. Ọ dịghị ihe ọ bụla ọzọ na-enye anyị nsogbu.”

11, 12. (a) Ụkpụrụ dị aṅaa nke Bible ka anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe a bịara n’ihe metụtara ịdị ọcha onwe onye? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ banyere àgwà na ụzọ ndụ anyị?

11 Ọ bụrụ na ịdị ọcha na ịdị n’usoro n’ebe anyị na-anọ efe ofufe pụrụ iwetara Chineke anyị na-efe ofufe otuto, n’ezie, igosipụta àgwà ndị a ná ndụ anyị dịkwa mkpa. Otú ọ dị, n’ebe obibi anyị, anyị pụrụ iche na anyị nweere onwe anyị ileghara ihe ụfọdụ anya ma na-eme ihe masịrị anyị. A bịakwa n’ihe banyere uwe na ejiji, n’ezie anyị nweere onwe anyị ịhọrọ ihe anyị chere na ọ ga-enye anyị ntụsara ahụ́ ma dị mma ile anya! Ma, ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu, a kpaara nnwere onwe a ókè. Cheta na mgbe Pọl na-atụle nhọrọ mmadụ nwere iri ihe oriri ụfọdụ, ọ dụrụ Ndị Kraịst ibe ya ọdụ, sị: “Na-elezinụ anya ka ikike a unu nwere ghara isi n’ụzọ ọ bụla ghọọ ihe ịsụ ngọngọ nye ndị na-adịghị ike.” O kwupụtaziri otu ụkpụrụ bara uru, sị: “Iwu kwadoro ihe nile; ma ọ bụghị ihe nile bara uru. Iwu kwadoro ihe nile; ma ọ bụghị ihe nile na-ewuli elu.” (1 Ndị Kọrint 8:9; 10:23) Olee otú ndụmọdụ Pọl si metụta anyị n’ihe banyere ịdị ọcha?

12 Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya na ndị mmadụ kwesịrị ịtụ anya ka onye ozi Chineke dị ọcha ma na-eme ihe n’usoro n’ụzọ o si ebi ndụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ijide n’aka na otú ebe obibi anyị na gburugburu ya dị adịghị ekwu ihe dị iche n’ihe anyị na-azọrọ na anyị bụ, ya bụ, ndị ozi nke Okwu Chineke. Ụdị àmà ma ọ bụ akaebe dị aṅaa ka ebe obibi anyị na-agba banyere anyị na nkwenkwe anyị? Ọ̀ na-egosi n’ezie na anyị na-atụsi anya ike ibi n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke dị ọcha ma dịrị n’usoro, bụ́ nke anyị na-enye ndị ọzọ agbamume siri ike banyere ya? (2 Pita 3:13) N’otu aka ahụ, ọdịdị anyị—ma mgbe anyị na-atụrụ ndụ ma mgbe anyị nọ n’ozi—pụrụ ime ka ozi anyị na-ezisa masịkwuo ndị ọzọ ma ọ bụ mee ka ọ ghara ịmasịcha ha. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe a onye nta akụkọ nke otu akwụkwọ akụkọ na Mexico kwuru: “N’ezie ọnụ ọgụgụ ka ukwuu n’ime Ndịàmà Jehova bụ ndị na-eto eto, ihe kasịkwa apụta ìhè bụ ụdị isi ha na-akpa, ịdị ọcha ha, na uwe kwesịrị ekwesị ha na-eyi.” Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ inwe ndị na-eto eto dị otú ahụ n’etiti anyị!

13. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji jide n’aka na akụkụ nile nke ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị dị ọcha ma dị n’usoro?

13 N’ezie, ịhụ na anyị onwe anyị, ihe onwunwe anyị, na ebe obibi anyị dị ọcha mgbe nile ma dị n’usoro na-adị mfe ikwu ya ekwu karịa ime ya eme. Ihe dị mkpa abụghị inwe ọtụtụ ngwá ụlọ ndị bụ́ ọkpọka, kama ọ bụ ezi nhazi na ịnọgide na-eme mgbalị. Anyị aghaghị iwepụta oge maka ịsa ahụ́, ịsa uwe anyị, ihichasị ebe obibi anyị, ụgbọala anyị, na ihe ndị ọzọ. Iji ọrụ n’aka n’ozi, ịga nzukọ, na inwe ọmụmụ ihe onwe onye—tinyere ịrụ ọrụ ndị ọzọ a na-arụ ná ndụ kwa ụbọchị—adịghị ewepụrụ anyị mkpa ọ dị ịnọgide na-adị ọcha ma bụrụ ndị a na-anakwere n’ihu Chineke na mmadụ. Ụkpụrụ ahụ a ma ama bụ́ “ihe ọ bụla nwere oge” na-emetụtakwa akụkụ a nke ndụ anyị.—Eklisiastis 3:1.

Obi nke A Na-emerụghị Emerụ

14. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na ịdị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ dị mkpa ọbụna karịa ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́?

14 Dị nnọọ ka ọ dị mkpa ilebara ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ anya, ọ dị mkpa ọbụna karị ichebasiri ịdị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ echiche ike. Anyị na-ekwubi otú a site n’icheta na Jehova jụrụ mba Izrel, ọ bụghị n’ihi na ha adịghị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́, kama n’ihi na ha bịara rụọ arụọ n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ. Site n’ọnụ Aịzaịa onye amụma, Jehova gwara ha na n’ihi ha ịbụ “mba mmehie, ndị ajọ omume na-anyịgbu,” àjà ha dị iche iche, ememe ọnwa ọhụrụ na nke ụbọchị izu ike ha, ee, ọbụna ekpere ha aghọworo ya ibu arọ. Gịnị ka ha kwesịrị ime iji nwetaghachi ihu ọma Jehova? Jehova, sịrị: “Saanụ ahụ́, meenụ onwe unu ka unu dị ọcha; wezụganụ ihe ọjọọ nke omume unu nile n’ihu anya m abụọ; hapụnụ ime ihe ọjọọ.”—Aịsaịa 1:4, 11-16.

15, 16. Gịnị ka Jizọs kwuru na ọ na-emerụ mmadụ, oleekwa otú anyị pụrụ isi rite uru site n’okwu Jizọs?

15 Iji ghọtakwuo mkpa ịdị ọcha nke omume na nke ime mmụọ dị, tụlee ihe Jizọs kwuru mgbe ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ kwuru na ndị na-eso ụzọ ya adịghị ọcha n’ihi na ha akwọghị aka ha tupu ha eriwe ihe. Jizọs doziri okwu site n’ịsị: “Ọ bụghị ihe na-abanye mmadụ n’ọnụ na-emerụ ya; kama ọ bụ ihe na-esi n’ọnụ mmadụ apụta na-emerụ ya.” Jizọs kwuziri, sị: “Ihe ndị na-apụta n’ọnụ na-esi n’obi, ihe ndị ahụ na-emerụkwa mmadụ. Dị ka ihe atụ, n’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta. Ọ bụ ihe ndị a na-emerụ mmadụ; ma iji aka a na-akwọghị akwọ rie nri adịghị emerụ mmadụ.”—Matiu 15:11, 18-20.

16 Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’okwu Jizọs? Jizọs na-eme ka ọ pụta ìhè na omume ọjọọ, omume rụrụ arụ, na omume na-adịghị ọcha na-esite n’ọchịchọ ọjọọ, ọchịchọ rụrụ arụ, na ọchịchọ na-adịghị ọcha nke obi apụta. Dị ka Jems onye na-eso ụzọ si kwuo ya, “a na-anwa onye ọ bụla site n’ọchịchọ nke aka ya ịrapụta ya ma raa ya ụrà.” (Jems 1:14, 15) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị achọghị ịdaba ná mmehie ndị ahụ dị oké njọ Jizọs kọwara, anyị aghaghị iwepụcha n’obi anyị ọchịchọ ọ bụla nke ime ihe ndị dị otú ahụ ma ghara ikwe ka ha dịgide na ya. Nke ahụ pụtara na anyị aghaghị ikpachara anya banyere ihe anyị na-agụ, ihe anyị na-ekiri, na ihe anyị na-ege. Taa, n’aha nnwere onwe ikwu okwu na iti egwú, ụlọ ọrụ ndị na-eme ihe ntụrụndụ na ndị nke na-akpọsa ngwá ahịa anọwo na-emepụta ọtụtụ egwú na ihe osise ndị na-amasị ọchịchọ anụ ahụ́ dara ada. Anyị kwesịrị ikpebisi ike ịghara ikwe ka echiche ndị dị otú ahụ gbanye mkpọrọgwụ n’obi anyị. Isi ihe dị na ya bụ, ka anyị wee bụrụ ndị na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na ndị ọ na-anakwere, anyị aghaghị ịnọ na nche mgbe nile iji nọgide na-enwe obi dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ.—Ilu 4:23.

Ndị E Mere Ka Ha Dị Ọcha Maka Ezi Ọrụ

17. N’ihi gịnị ka Jehova jiworo mee ka ndị ya dị ọcha?

17 N’ezie, ọ bụ ngọzi na ihe nchebe na, site n’enyemaka Jehova, anyị pụrụ inwe nguzo dị ọcha n’ihu ya. (2 Ndị Kọrint 6:14-18) Ma, anyị na-aghọtakwa na Jehova emewo ka ndị ya dị ọcha maka otu nzube. Pọl gwara Taịtọs na Kraịst Jizọs “nyere onwe ya maka anyị ka o wee gbapụta anyị n’ụdị mmebi iwu ọ bụla ma mee ka ndị bụ ndị nke ya n’ụzọ pụrụ iche dị ọcha nye ya, bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ.” (Taịtọs 2:14) Dị ka ndị e mere ka ha dị ọcha, olee ọrụ ndị anyị kwesịrị ịdị na-anụ ọkụ n’obi na ha?

18. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ?

18 Nke mbụ, anyị kwesịrị ịrụsi ọrụ ike n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ihu ọha. (Matiu 24:14) Site n’ime otú ahụ, anyị na-eme ka ndị mmadụ nọ n’ebe nile nwee olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa nke ụdị mmetọ ọ bụla na-agaghị adị na ya. (2 Pita 3:13) Ezi ọrụ anyị na-agụnyekwa igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị, si otú ahụ na-eto Nna anyị nke eluigwe. (Ndị Galeshia 5:22, 23; 1 Pita 2:12) Anyị adịghịkwa echefu ndị na-anọghị n’eziokwu ahụ bụ́ ndị ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ ndị ndị mmadụ na-akpata pụrụ ịkpa aka ọjọọ. Anyị na-eburu n’uche ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ya mere, n’ezie, ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ nile nọ, ma karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (Ndị Galeshia 6:10) Ozi nile dị otú ahụ, bụ́ ndị e ji obi dị ọcha na ezi ebumnobi na-eje, na-atọ Chineke ezi ụtọ.—1 Timoti 1:5.

19. Ngọzi ndị dị aṅaa na-echere anyị ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-enwe ụkpụrụ dị elu nke ịdị ọcha—n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ omume, na n’ụzọ ime mmụọ?

19 Dị ka ndị ohu nke Onye Kasị Ihe Nile Elu, anyị na-eburu n’uche okwu Pọl bụ́: “Ụmụnna m, esitere m n’ọmịiko nke Chineke na-arịọsi unu ike ka unu na-enyefe ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke Chineke na-anara nke ọma, ozi dị nsọ site n’ikike iche echiche unu.” (Ndị Rom 12:1) Ka anyị nọgide na-enwe ekele maka ihe ùgwù nke ịbụ ndị Jehova mere ka ha dị ọcha ma na-eme ike anyị iji nọgide na-agbaso ụkpụrụ dị elu nke ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́, n’ụzọ omume, na n’ụzọ ime mmụọ. Ọ bụghị nanị na ime otú ahụ ga-eme ka anyị nwee ùgwù onwe onye na afọ ojuju ugbu a kamakwa, ọ ga-eme ka anyị nwee olileanya nke ịhụ ka “ihe mbụ”—ajọ usoro ihe dị ugbu a nke e merụrụ emerụ—ga-agabiga mgbe Chineke ‘ga-eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ.’—Mkpughe 21:4, 5.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka e ji nye ụmụ Izrel ọtụtụ iwu banyere ịdị ọcha?

• Olee otú ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ si eme ka ozi anyị na-ekwusa na-amasịkwu ndị mmadụ?

• N’ihi gịnị ka ịdị ọcha n’omume na n’ụzọ ime mmụọ ji dị mkpa ọbụna karịa ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́?

• Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị bụ ndị “na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ”?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 21]

Ịdị ọcha n’ụzọ anụ ahụ́ na-eme ka ozi anyị na-ekwusa na-amasịkwu ndị mmadụ

[Foto dị na peeji nke 22]

Jizọs dọrọ aka ná ntị na echiche ọjọọ na-eduga n’omume ọjọọ

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Dị ka ndị e mere ka ha dị ọcha, Ndịàmà Jehova na-anụ ọkụ n’obi maka ezi ọrụ