Tetragrammaton nke Dị na Septuagint
Tetragrammaton nke Dị na Septuagint
E JI Tetragrammaton, ya bụ, mkpụrụ okwu Hibru anọ bụ́ יהוה (YHWH), egosipụta aha Chineke, bụ́ Jehova. Ọ dịwo anya e kweere na Tetragrammaton ahụ apụtaghị na Septuagint. Ya mere, a rụrụ ụka na ọ ga-abụ na ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ejighị aha Chineke mee ihe n’ihe odide ha mgbe ha na-ehota ihe site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.
Ọtụtụ nchọpụta ndị e mere na narị afọ gara aga ma ọ bụ karịa kpughere na n’ezie, aha Chineke pụtara na Septuagint. Otu akwụkwọ na-asị: “Ọchịchọ a chọrọ ichebe aha nsọ nke Chineke n’ụzọ ziri nnọọ ezi siri nnọọ ike nke na ndị Juu bi na Gris, mgbe ha na-asụgharị Bible Hibru gaa na Grik, denyere mkpụrụ okwu Tetragrammaton ahụ kpọmkwem n’etiti ihe odide Grik.”
Ibe papaịrọs nke e gosiri n’aka ekpe bụ nanị otu n’ime ọtụtụ n’ime ha bụ́ ndị dịgideworo ruo ugbu a. N’ịbụ nke a chọtara n’Oxyrhynchus, Ijipt, ma nye nọmba bụ́ 3522, ibe papaịrọs a dịwara laa azụ na narị afọ mbụ O.A. * Ọ dị sentimita 10.5 n’ogologo na sentimita 7 n’obosara ma buru akụkụ ihe odide nke sitere na Job 42:11, 12. E ji mkpụrụ okwu Hibru mbụ dee Tetragrammaton ahụ, bụ́ nke a kara ihe gburugburu ya na foto ahụ. *
Ya mere, aha Chineke ọ̀ pụtara ná ndepụta ndị mbụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst? Ọkà mmụta bụ́ George Howard na-ekwu, sị: “Ebe ọ bụ na a ka na-ede Tetragram ahụ na Bible Grik [Septuagint] bụ́ nke ihe mejupụtara ya bụ Akwụkwọ Nsọ nke chọọchị mbụ ji mee ihe, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na ndị dere A[gba] Ọ[hụrụ], n’ihota ihe site n’Akwụkwọ Nsọ, chekwara Tetragram ahụ n’ihe odide nke Bible.” O yiri ka n’oge na-adịghị anya nke a gasịrị, ndị na-edepụtaghachi ihe hà ji ihe nnọchianya ndị dị ka Kyʹri·os (Onyenwe Anyị) and The·osʹ (Chineke) dochie aha Chineke.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere papaịrọs ahụ a chọtara n’Oxyrhynchus, lee Ụlọ Nche nke February 15, 1992, peeji nke 26-28.
^ par. 4 Iji nwetakwuo ihe atụ ndị ọzọ na-egosi na aha nsọ ahụ dị ná nsụgharị dị iche iche nke Grik oge ochie, lee New World Translation of the Holy Scriptures−With References, ihe odide ntụkwasị nke 1C.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 30]
Site n’aka Egypt Exploration Society