Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ bụrụ na mmadụ egbuo onwe ya, ò kwesịrị ekwesị ka onye ozi bụ́ Onye Kraịst kwuo okwu olili ozu ya?

Onye ozi ọ bụla bụ́ Onye Kraịst ga-ekpebi n’onwe ya ma akọ na uche dị ọcha ọ̀ ga-ekwe ya kwuo okwu olili ozu nke onye o yiri ka o gburu onwe ya. Mgbe ọ na-eme mkpebi ahụ, o kwesịrị ịtụle ajụjụ ndị na-esonụ: Olee otú Jehova si ele igbu onwe onye anya? Onye ahụ ọ̀ ma ụma gbuo onwe ya n’ezie? Ọ̀ bụ isi ma ọ bụ uche mgbasasị kpaliri ya igbu onwe ya? Olee otú e si ele igbu onwe onye anya n’ógbè ahụ?

Dị ka Ndị Kraịst, anyị nwere mmasị n’otú Jehova si ele mmadụ igbu onwe ya anya. Nye Jehova, ndụ mmadụ dị oké ọnụ ahịa ma dị nsọ. (Jenesis 9:5; Abụ Ọma 36:9) Mmadụ ịma ụma gbuo onwe ya dị njọ n’anya Chineke. (Ọpụpụ 20:13; 1 Jọn 3:15) Nke ahụ ọ̀ kagburu ikwu okwu olili ozu maka onye na-amaghị ụma gbuo onwe ya?

Tụlee ihe banyere Eze Sọl nke Izrel. Mgbe ọ chọpụtara na ya agaghị alanahụ n’agha ikpeazụ o busoro ndị Filistịa, kama ikwe ka ndị iro ya jiri ya mee akaje, ‘Sọl weere mma agha ya, dakwasị ya.’ Mgbe ndị Filistịa hụrụ ozu ya, ha kwụnyere ya ná mgbidi nke obodo Bet-shin. Mgbe ndị bi na Jebesh-gilied chọpụtara ihe ndị Filistịa mere, ha bupụrụ ozu ahụ ma suo ya ọkụ. Ha achịrịzie ọkpụkpụ ya ma lie ha. Ọbụna ha buru ọnụ ruo ụbọchị asaa, bụ́ ihe omume ọdịnala ndị Izrel na-eme ma ha na-eru újú. (1 Samuel 31:4, 8-13; Jenesis 50:10) Mgbe Devid, bụ́ onye Jehova e tere mmanụ, chọpụtara ihe ndị Jebesh-gilied meworo, ọ sịrị: “Ndị a gọziri agọzi dịịrị Jehova ka unu bụ, na unu emeworo onyenwe unu, bụ́ Sọl, ebere a, unu wee lie ya. Ma ugbu a Jehova meere unu ebere na eziokwu.” (2 Samuel 2:5, 6) Ihe ndekọ ahụ sitere n’aka Chineke ekwughị na a katọrọ ndị Jebesh-gilied maka imere Eze Sọl ihe a pụrụ iwere dị ka ememe olili ozu. Jiri nke ahụ tụnyere ndị a na-agaghị eli eli n’ihi ajọ omume ha. (Jeremaịa 25:32, 33) Onye ozi bụ́ Onye Kraịst pụrụ ịtụle ihe ndekọ banyere Sọl n’ikpebi ma ọ̀ pụrụ ikwu okwu olili ozu maka onye na-amaghị ụma gbuo onwe ya.

Onye ozi ahụ pụkwara ịchọ ịtụle nzube e ji ekwu okwu olili ozu. N’adịghị ka ndị kweere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, Ndịàmà Jehova adịghị ekwu okwu olili ozu n’ihi echiche na-ezighị ezi nke iziga onye ahụ nwụrụ anwụ n’ụwa ọzọ. Kama ịbụ maka abamuru nke onye ahụ nwụrụ anwụ, nzube bụ́ isi e ji ekwu okwu olili ozu bụ iji kasie ndị na-eru újú obi na iji gbaara ndị bịaranụ àmà banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. (Eklisiastis 9:5, 10; 2 Ndị Kọrint 1:3-5) Ihe ọzọ dị mkpa mere e ji ekwu okwu olili ozu bụ iji nyere ndị nile bịaranụ aka ịtụgharị uche n’ịdị mkpụmkpụ nke ndụ. (Eklisiastis 7:2) À ga-emezu nzube ndị a site n’ikwu okwu olili ozu maka onye na-amaghị ụma gbuo onwe ya?

N’eziokwu, ụfọdụ ndị pụrụ iche na onye ahụ ma ụma gbuo onwe ya, na-amara nke ọma na ya na-eme mmehie megide Jehova. Ma, ọ̀ pụrụ ikwe omume mgbe nile ịnwapụta echiche dị otú ahụ? Ọ̀ pụrụ ịbụ na o mere ya ná mkpali? Ụfọdụ ndị nwara igbu onwe ha na-akwa ụta ma ghara imezu ya. Mmadụ apụghị ichegharị n’ihe o meworo mgbe ọ nwụsịrị.

Ihe ọzọ dị mkpa bụ ihe banyere isi ma ọ bụ uche mgbasasị bụ́ nke na-akpali ọtụtụ ndị igbu onwe ha. N’ezie, a pụrụ ikwu na ha bụ ndị a kpaliri igbu onwe ha. Dị ka ihe ndekọ ụfọdụ na-egosi, pasent 90 nke ndị gburu onwe ha nwetụrụ isi ma ọ bụ uche mgbasasị, ma ọ bụ nsogbu nke ihe iri ahụ́. Jehova ọ̀ ga-agbaghara ndị gburu onwe ha mgbe ha nọ n’ọnọdụ uche dị otú ahụ? Ọ bụghị anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma onye ahụ nwụrụ anwụ ò mere mmehie na-enweghị mgbaghara n’anya Jehova. Onye ozi bụ́ Onye Kraịst pụrụ iburu n’uche ọnọdụ na ihe ndekọ ahụ́ ike nke onye ahụ na-amaghị ụma gbuo onwe ya mgbe ọ na-ekpebi ma ọ̀ ga-ekwu okwu olili ozu ya.

Ọ dị ihe ọzọ a ga-atụle: Olee otú ndị obodo onye ahụ si ele mmadụ igbu onwe ya na ọnwụ onye ahụ anya? Ndị okenye, bụ́ ndị na-achọsi ike ịhụ na ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị n’ógbè ha nwere aha ọma, kwesịrị ichebara nke a echiche karịsịa. Na-adabere n’otú ndị mmadụ n’ozuzu ha si ele igbu onwe onye anya n’ógbè ahụ, nakwa karịsịa kpọmkwem ọnwụ nke onye ahụ, ndị okenye pụrụ ịhọrọ ịghara ịkwado okwu olili ozu ahụ ma ọ bụ kwe ka e kwuo ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Ma, ọ bụrụ na a kpọrọ onye ozi bụ́ Onye Kraịst ka o kwuo okwu olili ozu ahụ, ọ pụrụ ikpebi ma ya pụrụ ime otú ahụ n’onwe ya. Ọ bụrụ na o kpebie ime otú ahụ, o kwesịrị iji ezi uche mee ihe site n’ịghara ịkapị okwu ọnụ n’ihe banyere ma ọ̀ ga-ekwe omume ịkpọlite onye ahụ n’ọnwụ. Atụmanya ọ bụla nke onye ahụ nwụrụ anwụ ga-enwe n’ọdịnihu dị n’aka Jehova, ọ dịghị onye ọ dịịrị ikwu ma a ga-akpọlite onye ahụ n’ọnwụ ma ọ bụ na a gaghị akpọlite ya. Onye ozi ahụ pụrụ ikwu okwu nanị n’eziokwu Bible banyere ọnwụ ma gwa ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ okwu nkasi obi.