Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gbasoo Ụkpụrụ Ahụ A Tụpụtaara Ndị Eze

Gbasoo Ụkpụrụ Ahụ A Tụpụtaara Ndị Eze

Gbasoo Ụkpụrụ Ahụ A Tụpụtaara Ndị Eze

“Ọ ga-edepụtara onwe ya iwu a n’akwụkwọ, . . . ọ ga-adịkwa n’aka ya, ọ ga-agụkwa ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya.”—DEUTERỌNỌMI 17:18, 19.

1. Ole ndị ka Onye Kraịst pụrụ ịchọ ịdị ka ha?

Ọ PỤRỤ isiri gị ike iwere onwe gị dị ka eze ma ọ bụ eze nwanyị. Ọ̀ dị Onye Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi na onye mmụta Bible nke ga-ewere onwe ya dị ka onye ji ike ọchịchị eme ihe, dị ka ezigbo Eze Devid, Eze Josaịa, Eze Hezekaịa, ma ọ bụ Eze Jehoshafat? N’agbanyeghị nke ahụ, ị pụrụ ma kwesị ịdị ka ha, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’otu ụzọ pụrụ iche. Olee ụzọ ọ bụ? N’ihi gịnịkwa ka i ji kwesị ịdị ka ha n’akụkụ ahụ?

2, 3. Gịnị ka Jehova hụrụ na ọ ga-eme n’ọdịnihu banyere eze bụ́ mmadụ, gịnịkwa ka eze dị otú ahụ gaje ime?

2 N’oge Mozis, bụ́ ogologo oge tupu Chineke ekwere ka ụmụ Izrel nwee eze bụ́ mmadụ, O lepụrụ anya n’ihu ma hụ na ndị Ya ga-enwe ọchịchọ inwe eze. N’ihi ya, o nyere Mozis ike mmụọ nsọ ịgụnye ntụziaka ndị metụtara nke ahụ n’ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Ha bụ ntụziaka ndị e nyere ndị eze.

3 Chineke kwuru, sị: “Mgbe ị ga-aba n’ala ahụ nke Jehova, bụ́ Chineke gị, na-enye gị, i wee . . . sị, M ga-edo eze ka ọ bụrụ eze m, dị ka mba nile si eme ndị dị m gburugburu; ị ghaghị ido onye ahụ, onye Jehova, bụ́ Chineke gị, ga-ahọpụta, ka ọ bụrụ eze gị . . . Ọ ga-erukwa, mgbe ọ na-anọkwasị n’ocheeze nke alaeze ya, na ọ ga-edepụtara onwe ya iwu a n’akwụkwọ, . . . ọ ga-adịkwa n’aka ya, ọ ga-agụkwa ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya: ka o wee mụta ịtụ egwu Jehova, bụ́ Chineke ya, idebe okwu nile nke iwu a na ụkpụrụ ndị a, ime ha.”—Deuterọnọmi 17:14-19.

4. Gịnị ka a gụnyere ná ntụziaka Chineke nyere ndị eze?

4 Ee, eze nke Jehova ga-ahọpụtara ndị na-efe ya ofufe gaje idepụtara onwe ya ihe odide ndị ị pụrụ ịhụ n’ime Bible gị. E mesịa, eze ahụ gaje ịdị na-agụ nke ahụ o depụtara kwa ụbọchị, ugboro ugboro. Nke ahụ abụghị ịmụ ka e si ebu ihe n’isi. Ọ bụ ọmụmụ ihe, e bukwa ihe bara uru n’uche eme ya. Ọ dị eze nke ga-enweta ihu ọma Jehova mkpa ịdị na-enwe ọmụmụ ihe dị otú ahụ iji zụlite ma nọgide na-enwe ọnọdụ obi ziri ezi. Ọ dịkwa ya mkpa ịmụ ihe odide ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ iji bụrụ eze ihe na-agara nke ọma, nke nwere nghọta.—2 Ndị Eze 22:8-13; Ilu 1:1-4.

Mụta Ihe Dị Ka Onye Eze

5. Olee akụkụ Bible ndị Eze Devid nwere idepụta na ịgụ, oleekwa mmetụta o nwere banyere nke a?

5 Gịnị ka i chere na nke ahụ ga-apụtaworo Devid mgbe ọ ghọrọ eze Izrel? Ọ ga-edepụtaworo onwe ya akwụkwọ ndị mejupụtara Pentateuch ahụ (Jenesis, Ọpụpụ, Levitikọs, Ọnụ Ọgụgụ, Deuterọnọmi). Chee banyere mmetụta ọ na-aghaghị inwewo n’uche na n’obi Devid iji anya ya na aka ya depụtara onwe ya Iwu ahụ. O yikwara ka ọ̀ bụ Mozis dere akwụkwọ Job nakwa Abụ Ọma nke 90 na nke 91. Devid ò depụtakwuru ha? Ikekwe o depụtara ha. Ọzọkwa, ma eleghị anya ọ ga-enwewo akwụkwọ Joshua, Ndị Ikpe, na Rut. Ya mere, ị pụrụ ịhụ na Eze Devid ga-enwewo akụkụ dị ukwuu nke Bible ịgụ na ịtụgharị uche na ha. I nwekwara ihe mere ị ga-eji kwere na o mere otú ahụ kpọmkwem, n’ihi na, rịba ama ihe o kwuru banyere Iwu Chineke, bụ́ nke anyị na-achọta ugbu a n’Abụ Ọma 19:7-11.

6. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na Jizọs, dị ka nna ya ochie bụ́ Devid, nwere mmasị n’Akwụkwọ Nsọ?

6 Devid Ka Ukwuu—Jizọs, Nwa Devid—gbasokwara ụkpụrụ yiri nke ahụ. Jizọs na-agakarị n’ụlọ nzukọ dị n’ógbè ya kwa izu. N’ebe ahụ, ọ na-anụ ka a na-agụ ma na-akọwa Akwụkwọ Nsọ. Nke ka nke ahụ, site n’oge ruo n’oge, Jizọs n’onwe ya ji olu dara ụda gụọ Okwu Chineke n’ihu ọha ma kọwaa otú o si mezuo. (Luk 4:16-21) Ọ pụrụ ịdịrị gị mfe ịghọta ókè ọ maruuru Akwụkwọ Nsọ. Gụọ nnọọ ihe ndekọ Oziọma ndị ahụ, ma rịba ama ugboro ole Jizọs sịrị “e dere, sị” ma ọ bụ jiri ụzọ ọzọ zoo aka kpọmkwem n’akụkụ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ. Leenụ, n’Ozizi Elu Ugwu ya dị ka Matiu si dekọọ ya, Jizọs hotara ihe ugboro 21 site n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.—Matiu 4:4-10; 7:29; 11:10; 21:13; 26:24, 31; Jọn 6:31, 45; 8:17.

7. Olee otú Jizọs si dị iche n’ebe ndị ndú okpukpe nọ?

7 Jizọs gbasoro ndụmọdụ ahụ dị n’Abụ Ọma 1:1-3: “Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu, . . . kama n’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị; ọ bụkwa n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị. . . . Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” Lee ka nke ahụ si dị iche n’ihe ndị ndú okpukpe nke oge ya mere, bụ́ ndị ‘nọkwasịworo n’oche Mozis’ ma leghara ‘iwu Jehova’ anya!—Matiu 23:2-4.

8. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe na-abaghị uru na ndị ndú okpukpe nke ndị Juu na-agụ ma na-amụ Bible?

8 Otú ọ dị, otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke a pụrụ ịkọwa dị ka a ga-asị na Jizọs adịghị akwado ịmụ Bible pụrụ ịgbagwoju ụfọdụ ndị anya. Na Jọn 5:39, 40, anyị na-agụ ihe Jizọs gwara ụfọdụ ndị n’oge ya: “Unu na-enyocha Akwụkwọ Nsọ, n’ihi na unu chere na site na ya unu ga-enwe ndụ ebighị ebi; ọ bụkwa ihe ndị a na-agba àmà banyere m. Ma unu achọghịkwa ịbịakwute m ka unu wee nwee ndụ.” Site n’okwu ahụ, Jizọs adịghị akụda ndị Juu na-ege ya ntị mmụọ ịmụ Akwụkwọ Nsọ. Kama nke ahụ, ọ nọ na-ekpughe ihu abụọ ha ma ọ bụ otú ihe ha na-eme na ihe ha na-agụ na-esighị kwekọọ. Ha maara na Akwụkwọ Nsọ pụrụ iduzi ha inweta ndụ ebighị ebi, ma otu Akwụkwọ Nsọ ahụ ha na-enyocha kwesịkwara idugawo ha n’ebe Mezaịa ahụ, bụ́ Jizọs, nọ. Ka o sina dị, ha jụrụ ịnakwere ya. N’ihi ya, ịmụ ihe abaghịrị ha uru n’ihi na ha enweghị ezi obi, a pụghị izi ha ihe.—Deuterọnọmi 18:15; Luk 11:52; Jọn 7:47, 48.

9. Ezi ihe nlereanya dị aṅaa ka ndịozi na ndị amụma oge gboo setịpụrụ?

9 Lee ka ndị na-eso ụzọ Jizọs, gụnyere ndịozi ahụ, si dị iche! Ha mụrụ “ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka [mmadụ] mara ihe maka nzọpụta.” (2 Timoti 3:15) Na nke a, ha dị ka ndị amụma oge gboo bụ́ ndị ‘jụrụ ase nke ọma ma jiri nlezianya mee nnyocha.’ Ndị amụma ahụ eleghị nnyocha ahụ anya dị ka nanị ịmụsi ihe ike otu ugboro n’ime ọnwa ole na ole ma ọ bụ otu afọ. Pita onyeozi na-ekwu na “ha nọgidere na-eme nchọpụta,” karịsịa banyere Kraịst ahụ na ebube ndị dị n’òkè o keere n’ịzọpụta ihe a kpọrọ mmadụ. N’akwụkwọ ozi mbụ ya, Pita hotara ihe ugboro 34 site n’akwụkwọ iri nke Bible.—1 Pita 1:10, 11.

10. N’ihi gịnị ka onye nke ọ bụla n’ime anyị ji kwesị inwe mmasị n’ọmụmụ Bible?

10 Ya mere, n’ụzọ doro anya, iji nlezianya na-amụ Okwu Chineke bụ ọrụ e nyere ndị eze n’Izrel oge ochie. Jizọs gbasoro ụkpụrụ a. Ịmụ ya bụkwa ọrụ dịịrị ndị ga-eso Kraịst chịa dị ka eze n’eluigwe. (Luk 22:28-30; Ndị Rom 8:17; 2 Timoti 2:12; Mkpughe 5:10; 20:6) Ụkpụrụ a a tụpụtaara ndị eze dị nnọọ ndị nile na-atụ anya ngọzi n’ụwa n’okpuru ịchịisi Alaeze mkpa taa dị ka ọ dị mgbe ahụ.—Matiu 25:34, 46.

Ọ Bụ Ọrụ Dịịrị Ndị Eze, Dịkwara Gị

11. (a) Olee ihe ize ndụ na-eche Ndị Kraịst ihu n’ihe banyere ịmụ ihe? (b) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

11 Anyị pụrụ iji imesi okwu ike na obi eziokwu kwuo na ezigbo Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịdị na-enyocha Bible n’onwe ya. Nke ahụ abụghị ihe a chọrọ nanị mgbe mbụ i so Ndịàmà Jehova mụọ Bible. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebisi ike izere ịdị ka ụfọdụ ndị n’oge Pọl onyeozi bụ́ ndị leghaara ọmụmụ ihe onwe onye anya ka oge na-aga. Ha mụtara “ihe ndị mbụ nke okwu dị nsọ nke Chineke” dị ka “ozizi mmalite banyere Kraịst ahụ.” Ma, ha anọgideghị na-amụ ihe, n’ihi ya kwa, ha ‘ejisighị ike ruo ntozu okè.’ (Ndị Hibru 5:12–6:3) N’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú ọmụmụ ihe onwe onye nke Okwu Chineke na-adị m, n’agbanyeghị ma èsowo m ọgbakọ Ndị Kraịst kpakọrịta ruo nwa oge ma ọ bụkwanụ ruo ọtụtụ iri afọ? Pọl kpere ekpere ka Ndị Kraịst nke oge ya nọgide “na-aba ụba n’ezi ihe ọmụma nke Chineke.” Àna m egosi na m nwere otu ọchịchọ ahụ?’—Ndị Kọlọsi 1:9, 10.

12. N’ihi gịnị ka ịnọgide na-enwe mmasị n’Okwu Chineke ji dị mkpa?

12 Otu isi ihe ga-enyere gị aka ịzụlite àgwà dị mma nke ịmụ ihe bụ inwe mmasị n’Okwu Chineke. Abụ Ọma 119:14-16 na-arụtụ aka n’ịtụgharị uche mgbe nile n’Okwu Chineke n’ụzọ nwere nzube dị ka ụzọ ọ pụrụ isi malite tọwa gị ụtọ. Ọzọkwa, nke ahụ bụ eziokwu n’agbanyeghị ogologo oge ị nọworo na-abụ Onye Kraịst. N’imesi nke ahụ ike, cheta ihe nlereanya Timoti. Ọ bụ ezie na Onye Kraịst a bụ́ okenye anọworị na-eje ozi dị ka “ezi onye agha nke Kraịst Jizọs,” Pọl gbara ya ume ime ike ya nile ‘n’ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.’ (2 Timoti 2:3, 15; 1 Timoti 4:15) N’ụzọ doro anya, ime “ike gị nile” na-agụnye inwe àgwà dị mma nke ịmụ ihe.

13. (a) Olee otú a pụrụ isi wepụtakwuo oge maka ọmụmụ Bible? (b) Mgbanwe ndị dị aṅaa ka i nwere ike ime iji nwekwuo oge maka ọmụmụ ihe?

13 Otu nzọụkwụ na-eduga gị n’inwe àgwà dị mma nke ịmụ ihe bụ iwepụta oge mgbe nile maka ọmụmụ Bible. Olee otú i si eme n’akụkụ ahụ? Ihe ọ sọrọ gị jiri ezi obi zaa, ì chere na ị ga-erite uru site n’itinyekwu oge n’ọmụmụ ihe onwe onye? Ị pụrụ iche, sị, ‘Olee otú m pụrụ isi wepụta oge maka nke ahụ?’ Ụfọdụ ndị amụbawo oge ha ji enwe ọmụmụ Bible dị irè site n’ibili n’oge n’ụtụtụ karịa ka ha na-emebu. Ha pụrụ iji minit 15 gụọ Bible ma ọ bụ nwee ọmụmụ ihe onwe onye. Ihe ọzọ ị pụrụ ime bụ, gịnị ma ị na-agbanwetụ usoro ihe omume gị kwa izu? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị na-agụkarị akwụkwọ akụkọ ọtụtụ ụbọchị ma ọ bụ na-egekarị akụkọ ụwa a na-akọ na telivishọn n’uhuruchi, ọ̀ ga-ekwe gị mee ịdị na-ahapụ ya nanị otu ụbọchị n’izu? Ị pụrụ itinyekwu oge ahụ n’oge i ji enwe ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na ị hapụ ịdị na-ege akụkọ ụwa otu ụbọchị ma were minit 30 ma ọ bụ ihe yiri ya na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye, ị ga-atụkwasị ihe karịrị awa 25 n’oge i ji amụ ihe n’ime otu afọ. Cheedị uru dị n’ịtụkwasị awa 25 n’oge i ji agụ ma ọ bụ na-amụ Bible! Aro ọzọ bụ: N’izu na-abịanụ, tụlee ihe omume gị n’ọgwụgwụ nke ụbọchị ọ bụla. Lee ma ọ̀ dị ihe ọ bụla ị pụrụ ịhapụ ma ọ bụ igbubilata oge ya iji nwekwuo oge maka ịgụ ma ọ bụ ịmụ Bible.—Ndị Efesọs 5:15, 16.

14, 15. (a) N’ihi gịnị ka ihe mgbaru ọsọ ji dị mkpa ma a bịa n’ọmụmụ ihe onwe onye? (b) Olee ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ isetịpụ banyere ọgụgụ Bible?

14 Gịnị ga-eme ka ọmụmụ ihe dịkwuoro gị mfe ma na-atọkwu gị ụtọ? Ọ bụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ. Olee ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha ị pụrụ isetịpụ n’ihe banyere ịmụ ihe? Ihe mgbaru ọsọ mbụ dị mma ọtụtụ ndị na-esetịpụ bụ ịgụchapụ Bible. Ikekwe ruo ugbu a, ị gụwo akụkụ ụfọdụ nke Bible ugboro ugboro ma rite uru na ha. Ị̀ pụrụ ikpebisi ike ugbu a ịgụchapụ Bible? Ihe mgbaru ọsọ mbụ ị ga-esetịpụ iji mezuo nke ahụ pụrụ ịbụ ịgụ Oziọma anọ ndị ahụ, e mesịa i setịpụ ihe mgbaru ọsọ nke abụọ, dị ka ịgụchapụzi akụkụ fọdụrụnụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Ozugbo i nwetara afọ ojuju na uru ndị na-esi na ya apụta, ihe mgbaru ọsọ ọzọ ị pụrụ isetịpụ ga-abụ iji nwayọọ nwayọọ gụchapụ akwụkwọ ndị ahụ Mozis dere na akwụkwọ ndị ahụ e dekọrọ akụkọ ihe mere eme na ha, gụrụ ya ruo n’akwụkwọ Esta. Mgbe i mezuru nke ahụ, ị ga-ahụ na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịgụchapụzi akụkụ Bible ndị fọdụrụnụ. Otu nwanyị, bụ́ onye dị ihe dị ka afọ 65 mgbe ọ ghọrọ Onye Kraịst, dere n’ime mkpo Bible ya, ụbọchị ọ malitere ịgụ ya na, mgbe e mesịrị, ụbọchị ọ gụchapụrụ ya. Ugbu a, o depụtawo akara ụbọchị ole na-egosi na ọ gụchapụla ya ugboro ise! (Deuterọnọmi 32:45-47) Kama ịgụ ya site na kọmputa ma ọ bụ n’akwụkwọ ọzọ, ọ na-agụ ya site na Bible.

15 Ụfọdụ ndị ruworo ihe mgbaru ọsọ nke ịgụchapụ Bible na-ewere nzọụkwụ ndị ọzọ iji mee ka ọmụmụ ihe ha bụ́ nke na-aga n’ihu nọgide na-amị mkpụrụ ma na-enye ụgwọ ọrụ. Otu ụzọ bụ site n’ịgụ akwụkwọ ụfọdụ e ji amụ ihe tupu a na-agụ akwụkwọ Bible nke ọ bụla. Na “All Scripture Is Inspired of God and Beneficial” nakwa n’Insight on the Scriptures, mmadụ pụrụ ịchọta ihe ọmụma bụ́ ịgba banyere ebe akụkọ ndị a kọrọ na nke ọ bụla n’ime akwụkwọ Bible nọ mee, otú e si dee ya, na uru ndị a pụrụ irite na ya. *

16. Olee ihe nlereanya anyị kwesịrị izere ma a bịa n’ọmụmụ Bible?

16 N’oge ị na-amụ ihe, zere ịgbaso ụzọ ọtụtụ ndị sị na ha bụ ndị ọkà mmụta Bible na-agbasokarị. Ha na-elekwasị anya n’ụzọ gabigara ókè n’ịkọwa akụkụ ihe odide dị iche iche dị ka a ga-asị na Bible sitere n’aka mmadụ. Ụfọdụ n’ime ha na-agbalị ikwu ụdị ndị ọ bụ ha kwesịrị ịdị na-agụ akwụkwọ nke ọ bụla ma ọ bụ ichepụta nzube na ihe ha weere na ọ bụ ihe onye edemede bụ́ mmadụ nke dere akwụkwọ nke ọ bụla bu n’uche wee dee ya. Mmetụta echiche dị otú ahụ nke mmadụ na-enwe pụrụ ịbụ ime ka a na-ele akwụkwọ ndị dị na Bible anya dị ka ndị na-akọ nanị akụkọ ihe mere eme ma ọ bụ dị ka ndị na-egosipụta ụzọ e si eme ka okpukpe na-eto. Ndị ọkà mmụta ndị ọzọ na-emikpu onwe ha n’inyocha okwu, dị ka nkà mmụta nke okwu ndị e ji dee Bible. Ha na-emikpu onwe ha karị n’ịmụ otú okwu si malite nakwa n’izo aka n’ihe okwu pụtara n’asụsụ Hibru na Grik karịa ná mkpa ozi Chineke dị. Ì chere na isi otú ahụ na-amụ ihe pụrụ ma eleghị anya ime ka i nwee nkwali na okwukwe siri ike?—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

17. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ile Bible anya dị ka akwụkwọ nwere ozi maka mmadụ nile?

17 Ihe ndị ọkà mmụta ahụ na-ekwubi hà zidịrị ezi? Ọ̀ bụ eziokwu na akwụkwọ nke ọ bụla dị na Bible nwere nanị otu isi ihe ọ na-ekwu ma ọ bụ na e nwere ndị ọ bụ nanị ha kwesịrị ịdị na-agụ ya? (1 Ndị Kọrint 1:19-21) Nke bụ́ eziokwu bụ na akwụkwọ ndị dị n’Okwu Chineke nwere abamuru na-adịgide adịgide nye ndị nọ n’afọ ndụ nile na ndị a zụlitere n’ebe nile. Ọ bụrụgodị na ọ bụ otu onye ka e degaara otu akwụkwọ na mbụ, dị ka Timoti ma ọ bụ Taịtọs, ma ọ bụ ya abụrụ otu ìgwè kpọmkwem, ikekwe ndị Galeshia ma ọ bụ ndị Filipaị, anyị nile pụrụ ma kwesị ịmụ akwụkwọ ndị ahụ. Ha dị mkpa nye anyị nile, otu akwụkwọ pụkwara ịtụle ọtụtụ isiokwu ma baara ọtụtụ ndị uru. Ee, ozi dị na Bible metụtara ụwa nile, bụ́ nke na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere e jiworo sụgharịa ya n’asụsụ nke ndị mmadụ gburugburu ụwa.—Ndị Rom 15:4.

Ọ Baara Gị Uru, Bakwaara Ndị Ọzọ

18. Ka ị na-agụ Okwu Chineke, gịnị ka i kwesịrị ịdị na-atụgharị uche na ya?

18 Ka ị na-amụ ihe, ị ga-ahụta ya dị ka ihe bara nnọọ uru ịchọ ịghọta Bible nakwa ịgbalị ịchọpụta njikọ dị n’etiti ihe ndị e dere na ya. (Ilu 2:3-5; 4:7) Ihe Jehova kpughere site n’Okwu ya na nzube ya nwere njikọ chiri anya. Ya mere, ka ị na-agụ ya, chọpụta otú eziokwu na ndụmọdụ ndị ahụ si metụta nzube Chineke. Ị pụrụ ịtụgharị uche n’otú otu ihe merenụ, echiche, ma ọ bụ amụma si metụta nzube Jehova. Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka nke a na-agwa m banyere Jehova? Olee otú o si metụta nzube Chineke ịbụ nke a na-emezu site n’Alaeze ya?’ Ị pụkwara ịtụgharị uche, sị: ‘Olee otú m pụrụ isi jiri ihe ọmụma a mee ihe? M̀ pụrụ iji ya mee ihe mgbe m ji Akwụkwọ Nsọ na-ezi ndị ọzọ ihe ma ọ bụ na-enye ha ndụmọdụ?’—Joshua 1:8.

19. Olee ndị na-erite uru ka ị na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ị mụtara? Kọwaa.

19 Iche banyere ndị ọzọ bakwara uru n’ụzọ ọzọ. Ka ị na-agụ ma na-amụ Bible, ị ga-amụta ma ghọta ihe ọhụrụ. Gbalịa ịdị na-ekwu banyere ha mgbe gị na ndị òtù ezinụlọ gị ma ọ bụ ndị ọzọ na-enwe mkparịta ụka na-ewuli elu. Ọ bụrụ na i jiri obi umeala na-eme ya n’oge na n’ụzọ kwesịrị ekwesị, obi abụọ adịghị ya na mkparịta ụka dị otú ahụ ga-abụ ihe na-akwụghachi ụgwọ. O yiri ka gị iji ezi obi na ịnụ ọkụ n’obi na-akọ ihe ị mụtara ma ọ bụ ihe ndị masịrị gị na ya ga-eme ka ọ kpalikwuo mmasị ndị ọzọ. N’ụzọ ka ukwuu, ọ ga-abara gị onwe gị uru. N’ụzọ dị aṅaa? Ndị ọkachamara ekwuwo na ọ ga-ete aka tupu mmadụ echezọọ ihe ọ mụtara ma ọ bụ gụọ ma ọ bụrụ na mgbe ihe ọmụma ahụ ka dị ọhụrụ n’obi ya, ya ejiri ya na-eme ihe ma ọ bụ na-ekwughachi ya, dị ka mgbe ọ na-akọrọ ya ndị ọzọ. *

20. Gịnị mere o ji baa uru ịgụ Bible ugboro ugboro?

20 Oge ọ bụla ị gụchapụrụ otu akwụkwọ Bible, ị ga-enwetarịrị ihe ọmụma ọhụrụ. Ị ga-enwekwu mmasị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị na-adịchaghị akpali mmasị gị na mbụ. Ị ga-aghọtakwu ha. Nke a kwesịrị imesi ya ike na kama ịbụ akwụkwọ ọgụgụ nkịtị sitere n’aka mmadụ, akwụkwọ ndị dị na Bible bụ akụ̀ ndị i kwesịrị ịmụ ugboro ugboro ma rite uru na ha. Cheta, onye eze, dị ka Devid, aghaghị ‘ịgụ ihe dị n’ime ya ụbọchị nile nke ndụ ya.’

21. Ụgwọ ọrụ dị aṅaa ka ị pụrụ ịtụ anya ya site n’ịmụba oge ị na-etinye n’ịmụ Okwu Chineke?

21 Ee, ndị na-ewepụta oge iji mụọ Bible n’ụzọ miri emi na-erite uru dị ukwuu. Ha na-enweta akụ̀ na nghọta ime mmụọ. Mmekọrịta ha na Chineke na-aghọ nke sikwuru ike ma chikwuo anya. Ha na-anọgidekwa na-aghọ ndị dị oké ọnụ ahịa nye ndị òtù ezinụlọ ha, ụmụnna ha ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, na ndị ka ga-aghọ ndị na-efe Jehova ofufe.—Ndị Rom 10:9-14; 1 Timoti 4:16.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 15 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara akwụkwọ ndị a e ji amụ ihe, e nwekwara ha n’ọtụtụ asụsụ.

^ par. 19 Lee Ụlọ Nche nke August 15, 1993, peeji nke 13-14.

Ị̀ Na-echeta?

• Gịnị ka a chọrọ ka ndị eze Izrel na-eme?

• Ihe nlereanya ndị dị aṅaa ka Jizọs na ndịozi setịpụrụ ma a bịa n’ọmụmụ Bible?

• Mgbanwe ndị dị aṅaa ka ị pụrụ ime iji mụbaa oge i ji enwe ọmụmụ ihe onwe onye?

• Olee echiche i kwesịrị inwe banyere ịmụ Okwu Chineke?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Igbe dị na peeji nke 15]

“N’aka Anyị”

“Ọ bụrụ na anyị chọrọ . . . ndepụta nke okwu ndị dị na Bible, ọ dịghị ngwá ọrụ dị mma anyị pụrụ ịchọta karịa Intanet. Ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịgụ Bible, ịmụ ya, ichebara ya echiche, ịtụgharị uche na ya, anyị kwesịrị iji ya n’aka anyị, n’ihi na nke ahụ bụ nanị ụzọ anyị ga-esi mee ka ọ banye anyị n’uche na n’obi.”—Gertrude Himmelfarb, bụ́ prọfesọ a ma ama na City University, New York, bụ́ onye laworo ezumike nká.