Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Ma Kụzie Ụkpụrụ Omume Ndị Kraịst

Mụta Ma Kụzie Ụkpụrụ Omume Ndị Kraịst

Mụta Ma Kụzie Ụkpụrụ Omume Ndị Kraịst

“Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị?”—NDỊ ROM 2:21.

1, 2. Olee ihe ndị mere ị ga-eji chọọ ịmụ Bible?

I NWERE ọtụtụ ihe mere ị ga-eji na-amụ Okwu Chineke. Ikekwe ị chọrọ ịmara ihe ndị dị na ya—banyere ndị mmadụ, ihe omume, ebe dị iche iche, na ihe ndị ọzọ. Ị chọrọ ịmara eziokwu banyere nkwenkwe, bụ́ nke dị iche n’ozizi ụgha nke okpukpe, dị ka Atọ n’Ime Otu ma ọ bụ ọkụ ala mmụọ. (Jọn 8:32) I kwesịkwara ịchọ ịmatakwu Jehova nke ọma ka i wee nwee ike ịdịkwu ka ya ma na-eje ije n’ihu ya n’ụzọ ziri ezi.—1 Ndị Eze 15:4, 5.

2 Ihe dị mkpa nke ya na nke ahụ yiri mere i ji kwesị ịmụ Okwu Chineke bụ iji kwadebe onwe gị nke ọma ịkụziri ndị ọzọ ihe—ndị ị hụrụ n’anya, ndị ị maara, na ọbụna ndị ọ pụrụ ịbụ na ị mabeghị. Nke a abụghị ihe ezi Ndị Kraịst na-ahọrọ ma ọ masị ha. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ya mere gaanụ mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

3, 4. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ùgwù nye gị izi ihe dị ka Jizọs nyere n’iwu?

3 Iji ọchịchọ nke ịkụziri ndị ọzọ ihe wee na-amụ Bible bụ ihe dị ùgwù, ọ pụkwara ịbụ ihe na-enye afọ ojuju na-adịgide adịgide. Ọ dịla anya ọrụ nkụzi nọgidere na-abụ ọrụ dị ùgwù. Akwụkwọ bụ́ Encarta Encyclopedia na-ekwu, sị: “N’etiti ndị Juu, ọtụtụ ndị meworo okenye weere ndị nkụzi dị ka ndị na-eduzi ndị mmadụ inweta nzọpụta ma gbaa ụmụaka ume ịsọpụrụ ndị nkụzi ha ọbụna karịa ndị mụrụ ha.” Ọ bụ ihe dị ùgwù karịsịa nye Ndị Kraịst ịkụziri onwe ha ihe site n’ịmụ Bible na imesị kụziere ndị ọzọ ihe.

4 “Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị mmadụ na-arụ ọrụ nkụzi karịa ọrụ ọ bụla ọzọ. Ihe dị ka nde ndị ikom na ndị inyom 48 gburugburu ụwa bụ ndị nkụzi.” (The World Book Encyclopedia) Ọ bụ ọrụ dịịrị onye nkụzi ụlọ akwụkwọ ịkpụzi uche ndị na-eto eto, ọ pụkwara inwe mmetụta n’ahụ́ ha ruo ọtụtụ afọ n’ihu. Mmetụta ahụ na-akadị adịte aka mgbe i rubere isi n’iwu Jizọs nke izi ndị ọzọ ihe; ihe i ziri ha pụrụ inwe mmetụta n’ahụ́ ha ruo mgbe ebighị ebi. Pọl onyeozi mere ka nke a pụta ìhè mgbe ọ gbara Timoti ume, sị: “Na-elezi onwe gị nakwa ozizi gị anya mgbe nile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime nke a, ị ga-azọpụta ma onwe gị ma ndị na-ege gị ntị.” (1 Timoti 4:16) Ee, ozizi gị metụtara inweta nzọpụta.

5. N’ihi gịnị ka ọrụ nkụzi Onye Kraịst na-arụ ji bụrụ ụdị kasịnụ?

5 Ọ bụ Isi Iyi kasịnụ, bụ́ Eze eluigwe na ala, nyere iwu na ntụziaka ka ị kụziere onwe gị ihe ma kụziekwara ndị ọzọ. Nke ahụ nanị mere ka ụdị ọrụ nkụzi a dị elu karịa ọrụ nkụzi ndị ọzọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ịkụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ, ịkụziri mmadụ ọrụ, ma ọ bụ ọbụna ịkụziri mmadụ otú e si agwọ ọrịa. Ọrụ nkụzi Onye Kraịst na-arụ na-agụnye ime ka onye ọ na-akụziri ihe mụta iṅomi Ọkpara Chineke, bụ́ Kraịst Jizọs, na ịkụziri ndị ọzọ ime otu ihe ahụ.—Jọn 15:10.

N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Kụziere Onwe Gị Ihe?

6, 7. (a) Gịnị mere na anyị aghaghị ibu ụzọ kụziere onwe anyị ihe? (b) N’echiche dị aṅaa ka ndị Juu narị afọ mbụ dara ada dị ka ndị nkụzi?

6 N’ihi gịnị ka e ji kwuo na anyị aghaghị ibu ụzọ kụziere onwe anyị ihe? Ihe kpatara ya bụ na anyị apụghị ịkụziri ndị ọzọ ihe nke ọma ma ọ bụrụ na anyị ebubeghị ụzọ kụziere onwe anyị ihe. Pọl mesiri eziokwu a ike n’ajụjụ na-akpali iche echiche ọ jụrụ bụ́ nke nwere ihe ọ pụtara nye ndị Juu laa azụ n’oge ahụ, bụkwa nke nwere ozi dị mkpa nye Ndị Kraịst taa. Pọl jụrụ, sị: “Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị? Gị, onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi? Gị, onye na-asị ‘Akwala iko,’ ị̀ na-akwa iko? Gị, onye na-ekwupụta na ị na-asọ arụsị oyi, ị̀ na-ezu ihe dị n’ụlọ arụsị? Gị, onye ji iwu akpa nganga, ị̀ na-esite n’imebi Iwu ahụ ghara inye Chineke nsọpụrụ?”—Ndị Rom 2:21-23.

7 Site n’iji ajụjụ na-achọghị nzaghachi mee ihe, Pọl hotara ihe ọjọọ abụọ Iwu Iri ahụ kapịrị okwu ọnụ banyere ha: Ezula ohi, na akwala iko. (Ọpụpụ 20:14, 15) Ụfọdụ ndị Juu nke oge Pọl kpara nganga na ha nwere Iwu Chineke. ‘E ji ọnụ kụziere ha ihe site n’Iwu ahụ ma mee ka ha kweta na ha bụ ndị nduzi nke ndị kpuru ìsì na ìhè maka ndị nọ n’ọchịchịrị, ndị na-ezi ụmụ ọhụrụ ihe.’ (Ndị Rom 2:17-20) Otú ọ dị, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị ihu abụọ n’ihi na ha nọ na-ezu ohi ma ọ bụ na-akwa iko na nzuzo. Nke ahụ ga-abụ ilelị Iwu ahụ na Onye nyere ya bụ́ onye nọ n’eluigwe. Ị pụrụ ịhụ na ha erutụghị eru ịkụziri ndị ọzọ ihe; n’ezie, ha adịghịdị akụziri onwe ha ihe.

8. Olee otú ọ pụrụ isi bụrụ na ụfọdụ ndị Juu n’oge Pọl nọ ‘na-ezu ihe dị n’ụlọ nsọ’?

8 Pọl kwuru banyere izu ihe dị n’ụlọ nsọ. Ndị Juu ụfọdụ hà mere nke ahụ n’ụzọ nkịtị? Gịnị ka Pọl bu n’uche? N’eziokwu, n’ihi ihe ọmụma na-ezughị ezu e nyere n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, anyị ejighị n’aka otú ụfọdụ ndị Juu si ‘zuo ihe dị n’ụlọ nsọ.’ Tupu mgbe ahụ, onye nlekọta obodo Efesọs kwuru na Pọl na ndị ibe ya abụghị “ndị na-ezu ihe dị n’ụlọ nsọ,” bụ́ nke na-enye echiche na, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ ndị chere na aka ndị Juu adịghị ọcha n’ebubo ahụ. (Ọrụ 19:29-37) Hà ji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa sitere n’ụlọ arụsị ndị ndị meriri mba n’agha ma ọ bụ ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi kwakọọrọ na-eme ihe ma ọ bụkwanụ na-ere ha ere? Dị ka Iwu Chineke si kwuo, e kwesịrị ibibi ọlaedo na ọlaọcha nke arụsị, mmadụ ekwesịghị iwere ha mee ihe dịịrị ya. (Deuterọnọmi 7:25) * Ya mere, ọ pụrụ ịbụ na Pọl nọ na-ezo aka n’ebe ndị Juu leghaara iwu Chineke anya ma jiri ihe ndị sitere n’ụlọ arụsị mee ihe ma ọ bụ rite uru na ha, nọ.

9. Olee omume ọjọọ ndị metụtara ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem bụ́ ndị ha na izu ihe dị n’ụlọ nsọ ahụ pụrụ ịbụ otu ihe?

9 N’aka nke ọzọ, Josephus kọrọ banyere akụkọ ọjọọ a nụrụ na Rom banyere ihe ndị Juu anọ, bụ́ ndị onye ndú ha bụ onye nkụzi nke Iwu ahụ, mere. Mmadụ anọ ahụ mere ka otu nwanyị Rom, bụ́ onye na-eso ụzọ ndị Juu, kwenye inye ha ọlaedo na ihe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa dị ka onyinye maka ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem. Ozugbo ha nwetara akụ̀ ndị ahụ n’aka ya, ha weere ha mee ihe dịịrị ha—si otú ahụ na-ezu ihe dị n’ụlọ nsọ. * Ndị ọzọ nọ na-ezu ihe dị n’ụlọ nsọ Chineke site n’iji anụmanụ ndị nwere nkwarụ wee na-achụ àjà nakwa site n’ịkwalite azụmahịa anyaukwu na mbara èzí nke ụlọ nsọ ahụ, na-eme ka ụlọ nsọ ahụ bụrụ “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.”—Matiu 21:12, 13; Malakaị 1:12-14; 3:8, 9.

Kụzie Ụkpụrụ Omume Ndị Kraịst

10. Olee isi ihe dị n’okwu Pọl e dekọrọ ná Ndị Rom 2:21-23 nke anyị na-ekwesịghị ileghara anya?

10 N’agbanyeghị otú e si zuo ohi, kwaa iko, ma zuo ihe dị n’ụlọ nsọ na narị afọ mbụ bụ́ ndị Pọl nọ na-ezo aka na ha, ka anyị ghara ileghara isi ihe dị n’okwu ya anya. Ọ jụrụ, sị: “Otú ọ dị, gị onye na-akụziri onye ọzọ ihe, ị́ dịghị akụziri onwe gị?” Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na ihe atụ ndị Pọl nyere metụtara omume. N’ebe a, onyeozi ahụ elekwasịghị anya n’ozizi ma ọ bụ n’akụkọ ndị a kọrọ na Bible. Ịkụziri onwe onye na ndị ọzọ ihe bụ́ nke Pọl zoro aka na ya metụtara ụkpụrụ omume Ndị Kraịst.

11. N’ihi gịnị ka i ji kwesị ichebara ụkpụrụ omume Ndị Kraịst echiche ka ị na-amụ Okwu Chineke?

11 Anyị itinye ihe mmụta dị ná Ndị Rom 2:21-23 n’ọrụ na-apụta na anyị ga-amụta ụkpụrụ omume Ndị Kraịst site n’Okwu Chineke, na-eme ihe kwekọrọ n’ihe anyị na-amụta, ma na-akụzikwara ndị ọzọ ime otu ihe ahụ. Ya mere, ka ị na-amụ Bible, nọrọ na nche iji chọpụta ebe ndị e gosipụtara ụkpụrụ Jehova, bụ́ ndị ezigbo ụkpụrụ omume nke Ndị Kraịst hiwere isi na ha. Tụgharịa uche na ndụmọdụ na ihe mmụta ndị ị hụrụ na Bible. Mgbe ahụ, jiri obi ike tinye ihe ị na-amụta n’ọrụ. Ime otú ahụ na-achọkwa obi ike na mkpebi siri ike. Ọ dịịrị ụmụ mmadụ na-ezughị okè mfe ịgọpụwara onwe ha, ikwu ihe ndị mere ọnọdụ ụfọdụ ji enye ohere maka ma ọ bụ ọbụna na-achọ mmadụ ileghara ụkpụrụ omume Ndị Kraịst anya n’otu oge kpọmkwem. Ikekwe ndị Juu bụ́ ndị Pọl kwuru banyere ha na-echekarị ụdị echiche aghụghọ ahụ bụ́ nke a na-eche iji gọpụrụ onwe onye ma ọ bụ iji duhie ndị ọzọ. Otú ọ dị, okwu Pọl na-egosi na mmadụ ekwesịghị ime ka ụkpụrụ omume Ndị Kraịst dị ala ma ọ bụ leghara ya anya otú o si masị ya.

12. Olee otú omume ọma ma ọ bụ omume ọjọọ si emetụta Jehova Chineke, n’ihi gịnịkwa ka o ji bụrụ ihe enyemaka iburu eziokwu a n’uche?

12 Onyeozi ahụ mere ka otu isi ihe mere ị ga-eji mụta ma tinyezie ụkpụrụ omume ndị ị hụrụ n’ime Bible n’ọrụ pụta ìhè. Omume ọjọọ nke ndị Juu metụtara Jehova: “Gị, onye ji iwu akpa nganga, ị̀ na-esite n’imebi Iwu ahụ ghara inye Chineke nsọpụrụ? N’ihi na ‘a na-ekwulu aha Chineke n’ihi unu n’etiti ndị mba ọzọ.’” (Ndị Rom 2:23, 24) Ọ bụkwa eziokwu ugbu a na ọ bụrụ na anyị eleghara ụkpụrụ omume Ndị Kraịst anya, anyị na-akparị Isi Iyi ya. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na anyị agbasochie ụkpụrụ Chineke anya, ọ na-emetụta ya n’ụzọ dị mma, na-enye ya nsọpụrụ. (Aịsaịa 52:5; Ezikiel 36:20) Gị ịmara nke a pụrụ ime ka mkpebi i mere sikwuo ike ma ọ bụrụ na i chee ọnwụnwa ihu ma ọ bụ ọnọdụ ebe ndị ileghara ụkpụrụ omume Ndị Kraịst anya pụrụ iyi ụzọ kasị mfe ma ọ bụ nke kasị dị ntụsara ahụ́ isi mee ihe. Ọzọkwa, okwu Pọl na-akụziri anyị ihe ọzọ. E wezụga ịmara n’onwe gị na omume gị na-emetụta Chineke, ka ị na-akụziri ndị ọzọ ihe, nyere ha aka ịhụ na otú ha si etinye ụkpụrụ omume ndị ha na-amụta n’ọrụ ga-emetụta Jehova. Ọ bụghị nanị na ụkpụrụ omume Ndị Kraịst na-akwalite afọ ojuju ma na-echebe ahụ́ ike mmadụ. Ọ na-emetụtakwa Onye ahụ tụpụtara ma na-agba ume ka a na-agbaso ụkpụrụ omume ahụ.—Abụ Ọma 74:10; Jems 3:17.

13. (a) Olee otú Bible si enyere anyị aka n’ihe banyere omume? (b) Kọọ isi ihe dị na ndụmọdụ ahụ dị ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-7.

13 Omume mmadụ na-emetụtakwa ndị ọzọ. Ị pụrụ ịhụ nke ahụ n’ihe atụ ndị dị n’Okwu Chineke bụ́ ndị na-egosi uru itinye ụkpụrụ omume nke Chineke n’ọrụ bara na ihe ndị ileghara ha anya na-arụpụta. (Jenesis 39:1-9, 21; Joshua 7:1-25) Ị pụkwara ịhụ ndụmọdụ ndị a kapịrị ọnụ banyere omume dị ka: “Nke a bụ uche Chineke, ka unu bụrụ ndị e doro nsọ, ka unu na-asọ ịkwa iko asọ; ka onye ọ bụla n’ime unu mara ụzọ isi chịkwaa arịa nke onwe ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị n’agụụ mmekọahụ nke ọchịchọ anyaukwu bụkwa ụdị nke mba ndị na-amaghị Chineke nwere; ka onye ọ bụla ghara ịgaru n’ókè nke imebi ihe ma tinye aka n’ihe ndị ruuru nwanna ya n’okwu a, . . . n’ihi na Chineke kpọrọ anyị, ọ bụghị n’inye ohere maka adịghị ọcha, kama n’ihe metụtara ịdị nsọ.”—1 Ndị Tesalonaịka 4:3-7.

14. Gịnị ka ị pụrụ ịjụ onwe gị banyere ndụmọdụ ahụ dị ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-7?

14 Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ site n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na mmekọahụ rụrụ arụ na-emebi ụkpụrụ omume Ndị Kraịst. Ma, ị pụrụ inweta nghọta miri emi banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ a. Ụfọdụ akụkụ ihe odide na-emeghe ụzọ maka ọmụmụ ihe na ntụgharị uche dị ukwuu, na-eme ka e nwetakwuo nghọta. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ịtụgharị uche n’ihe Pọl bu n’uche mgbe ọ sịrị na ịkwa iko pụrụ ime ka mmadụ garuo “n’ókè nke imebi ihe ma tinye aka n’ihe ndị ruuru nwanna ya n’okwu a.” Ihe ndị dị aṅaa ruuru ndị ọzọ ka nke a na-agụnye, oleekwa otú ịghọtakwu ya nke ọma ga-esi kwalikwuo gị ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume Ndị Kraịst? Olee otú ihe si ná nnyocha dị otú ahụ pụta pụrụ isi kwadebekwuo gị ịkụziri ndị ọzọ ihe ma nyere ha aka ịsọpụrụ Chineke?

Na-amụ Ihe Iji Kụzie Ihe

15. Olee ngwá ọrụ ndị ị pụrụ iji kụziere onwe gị ihe site n’ọmụmụ ihe onwe onye?

15 Ndịàmà Jehova nwere ngwá ọrụ ndị ha ji enyocha ajụjụ ma ọ bụ okwu ndị biliterenụ ka ha na-amụ ihe iji na-akụziri onwe ha na ndị ọzọ ihe. Otu ngwá ọrụ e nwere n’ọtụtụ asụsụ bụ Watch Tower Publications Index. Ọ bụrụ na ọ ga-eru gị aka, ị pụrụ iji ya chọta ihe ọmụma n’akwụkwọ ndị dabeere na Bible nke Ndịàmà Jehova bipụtara. Ị pụrụ ịchọ ya n’okpuru okwu ndị bụ́ isi ma ọ bụ n’okpuru ndepụta nke amaokwu ndị dị na Bible. Ngwá ọrụ ọzọ Ndịàmà Jehova nwere n’ọtụtụ asụsụ ndị bụ́ isi bụ Watchtower Library. Usoro ihe omume kọmputa a dị na CD-ROM na-ebu ọtụtụ akwụkwọ n’ụdị ígwè ọrụ electronic. Ihe ndị dị na ya na-eme ka mmadụ nwee ike inyocha isiokwu na ajụjụ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụ na nke ọ bụla n’ime ngwá ọrụ abụọ a ma ọ bụ ha abụọ ruru gị aka, jiri ha na-eme ihe mgbe nile ka ị na-amụ Okwu Chineke iji kụziere ndị ọzọ ihe.

16, 17. (a) Ebee ka ị pụrụ ịchọta okwu ndị na-enye ihe ọmụma banyere ihe ndị ruuru mmadụ bụ́ ndị e kwuru okwu ha ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:6? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ịkwa iko pụrụ isi bụrụ itinye aka n’ihe ndị ruuru ndị ọzọ?

16 Ka anyị tụlee ihe atụ ahụ e hotara n’elu, ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-7. A jụrụ ajụjụ banyere ihe ndị ruuru mmadụ. Ihe ndị ruuru ònye? Oleekwa otú a pụrụ isi tinye aka n’ihe ndị ahụ ruuru mmadụ? Site n’iji ngwá ọrụ ndị ahụ e ji amụ ihe bụ́ ndị e kwuru okwu ha mee ihe, ị pụrụ ma eleghị anya ịhụ ọtụtụ okwu ndị na-enye ihe ọmụma banyere amaokwu ndị a, ọbụna banyere ihe ndị ruuru mmadụ nke Pọl kwuru okwu ya. Ị pụrụ ịgụ banyere ha n’Insight on the Scriptures, Mpịakọta nke 1, peeji nke 863-864; Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, peeji nke 145; Ụlọ Nche, November 15, 1989, peeji nke 31.

17 N’ịga n’ihu n’ihe ọmụmụ ahụ, ị ga-ahụ na akwụkwọ ndị ahụ na-egosi otú okwu Pọl si bụrụ eziokwu. Onye na-akwa iko na-emehie megide Chineke ma na-ekpughepụ onwe ya nye ọrịa dị iche iche. (1 Ndị Kọrint 6:18, 19; Ndị Hibru 13:4) Nwoke nke na-akwa iko na-etinye aka n’ihe ndị dịgasị iche iche ruuru nwanyị ya na ya mekọrọ mmehie. Ọ na-anapụ ya omume dị ọcha na ezi akọ na uche. Ọ bụrụ na ọ lụbeghị di, nwoke ahụ na-etinye aka n’oruru o ruuru ya ịlụ di dị ka nwanyị na-amaghị nwoke nakwa n’oruru o ruuru nwoke ga-alụ ya ịtụ anya na ọ mabeghị nwoke. Ọ na-akpasu ndị mụrụ nwanyị ahụ iwe, na-akpasukwa di ya iwe ma ọ bụrụ na ọ lụwo di. Nwoke ahụ na-eme omume rụrụ arụ na-emebi ihe ruuru ezinụlọ nke ya ịbụ nke e ji omume dị ọcha mara. Ọ bụrụ na ọ nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ na-ewetara ya nkọcha, na-enye ya aha ọjọọ.—1 Ndị Kọrint 5:1.

18. Olee otú i si erite uru site n’ọmụmụ Bible metụtara ụkpụrụ omume Ndị Kraịst?

18 Ihe ndị ahụ e kwuru banyere ihe ndị ruuru mmadụ ọ́ dịghị eme ka ị ghọtakwuo amaokwu ahụ? Ụdị ọmụmụ ihe ahụ bụ n’ezie ihe bara oké uru. Ka ị na-amụ ya, ị na-akụziri onwe gị ihe. Nghọta i nwere banyere ịbụ eziokwu nke ozi Chineke na mmetụta ọ na-enwe n’ahụ́ gị na-amụba. Ị na-eme ka mkpebi i mere ịnọgide na-agbaso ụkpụrụ omume Ndị Kraịst sikwuo ike, n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla pụrụ ibilite. Cheekwa otú ị pụrụ isi dịkwuo irè dị ka onye ozizi! Dị ka ihe atụ, ka ị na-akụziri ndị ọzọ eziokwu Bible, ị pụrụ ime ka ha ghọtakwuo 1 Ndị Tesalonaịka 4:3-7, na-eme ka nghọta ha nwere maka ụkpụrụ omume Ndị Kraịst na otú ha si ele ya anya dịkwuo ukwuu. N’ụzọ dị otú a, ihe ị na-amụ pụrụ inyere gị na ọtụtụ ndị ọzọ aka ịsọpụrụ Chineke. N’ebe a kwa, anyị hotara nanị otu ihe atụ, nke sitere n’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Tesalonaịka. E nwere ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ nke ụkpụrụ omume Ndị Kraịst, e nwekwara ọtụtụ ihe atụ na okwu ndụmọdụ ndị ọzọ metụtara ha dị na Bible bụ́ ndị ị pụrụ ịmụ, tinye n’ọrụ, ma kụziere ndị ọzọ.

19. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa ka ị nọgide na-agbaso ụkpụrụ omume Ndị Kraịst?

19 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ime otú ahụ bụ ihe amamihe dị na ya. Jems 3:17 na-asị na “amamihe nke sitere n’elu,” nke sitere n’aka Jehova Chineke n’onwe ya, “bu ụzọ dị ọcha.” N’ụzọ doro anya, nke ahụ na-apụta ịgbaso ụkpụrụ omume nke Chineke. N’ezie, Jehova na-achọ ka ndị na-anọchite anya ya n’ịkụzi Bible bụrụ ezi ndị nlereanya “n’ịdị ọcha.” (1 Timoti 4:12) Ụzọ ndụ nke ndị na-eso ụzọ nke oge mbụ dị ka Pọl na Timoti na-agba akaebe na nke ahụ bụ eziokwu; ha zeere omume rụrụ arụ, ọbụna Pọl dere, sị: “Ka a ghara ihotadị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ; ma ọ bụ omume ihere ma ọ bụ okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ.”—Ndị Efesọs 5:3, 4.

20, 21. Gịnị mere i ji kweta n’ihe Jọn onyeozi dere, dị ka e dekọrọ ya na 1 Jọn 5:3?

20 Ọ bụ ezie na ụkpụrụ omume ndị e depụtara n’Okwu Chineke doro anya ma kpọọ okwu aha, ha abụghị ibu na-anyịgbu anyịgbu. Nke a doro Jọn anya, bụ́ onyeozi kasị dịtee ndụ aka. Dabere n’ihe ọ chọpụtaworo n’ime ọtụtụ iri afọ ọ dịrị ndụ, ọ maara na ụkpụrụ omume Ndị Kraịst adịghị emerụ ahụ́. Kama nke ahụ, ọ dị mma, baa uru, ma na-eweta ngọzi. Jọn mesiri nke a ike, na-ede, sị: “Nke a bụ ịhụnanya Chineke: ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu. Ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa anyịgbu anyị.”—1 Jọn 5:3, New English Translation.

21 Otú ọ dị, rịba ama na Jọn adịghị ekwu na irubere Chineke isi site n’ịgbaso ụkpụrụ omume Ndị Kraịst bụ ụzọ kasị mma nanị n’ihi na ọ na-echebe anyị pụọ ná nsogbu, pụọ n’ihe ndị dị njọ na-esi n’ime ihe dị iche apụta. O nyere echiche ziri ezi site n’ibu ụzọ kweta na ọ bụ ngosipụta nke ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova Chineke nọ, ohere dị oké ọnụ ahịa nke igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ. N’ezie, ịkụziri onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ ịhụ Chineke n’anya na-achọ na anyị ga-anakwere ma tinye ụkpụrụ ya ndị dị elu n’ọrụ. Ee, ọ pụtara ịkụziri onwe anyị na ndị ọzọ ụkpụrụ omume Ndị Kraịst.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 8 Ka ọ na-egosipụta ndị Juu dị ka ndị aka ha na-adịghị n’ilelị ihe ndị dị nsọ, Josephus si otú a kwughachi ihe e kwuru n’iwu Chineke: “Ka onye ọ bụla ghara ikwulu chi obodo ndị ọzọ na-efe, ma ọ bụ zuo ihe dị n’ụlọ nsọ ndị ala ọzọ, ma ọ bụkwanụ were akụ̀ ndị a raara nye chi ọ bụla.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’aka akwụkwọ dị iche.)—Jewish Antiquities, Akwụkwọ nke 4, isiakwụkwọ nke 8, paragraf nke 10.

^ par. 9 Jewish Antiquities, Akwụkwọ nke 18, isiakwụkwọ nke 3, paragraf nke 5.

Ị̀ Na-echeta?

• N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji mụọ ihe iji kụziere onwe anyị ihe tupu anyị ana-akụziri ndị ọzọ?

• Olee otú omume anyị pụrụ isi metụta Jehova?

• Ole ndị ka onye na-akwa iko pụrụ ịdị na-etinye aka n’ihe ndị ruuru ha?

• Gịnị ka i kpebisiri ike ime banyere ụkpụrụ omume Ndị Kraịst?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 22]

‘Ihe ndị o nyere n’iwu adịghị anyịgbu anyị’