Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nnwere Onwe Pụọ n’Ụnwụ Nri Dị Nso!

Nnwere Onwe Pụọ n’Ụnwụ Nri Dị Nso!

Nnwere Onwe Pụọ n’Ụnwụ Nri Dị Nso!

‘OLEE ụdị ụnwụ nri ọ bụ?’ ka ị pụrụ ịjụ. Ọ bụ ụnwụ nke nri ime mmụọ! Otu onye amụma Hibru oge ochie buru amụma banyere ụnwụ nri a, sị: “Lee, ụbọchị na-abịa, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta), mgbe M ga-ezite oké ụnwụ n’ala, ọ bụghị oké ụnwụ nke nri, ọ bụghịkwa akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri, kama ọ bụ nke ịnụ okwu nile nke Jehova.” (Emọs 8:11) Iji nye aka belata ụnwụ nri ime mmụọ a, mmadụ 48 si na klas nke 112 nke Watchtower Bible School of Gilead, nke dị na Patterson, New York, na-aga n’ala 19 dịgasị iche iche dị na kọntinent 5 nakwa n’àgwàetiti dị iche iche nke oké osimiri.

Ha bujuru ihe na-aga, ọ bụghị anụ na ọka nkịtị, kama ọ bụ ihe ọmụma, ahụmahụ, na ọzụzụ. Ruo ọnwa ise, ha enwewo ọmụmụ Bible kpụ ọkụ n’ọnụ bụ́ nke a haziri iji wusie okwukwe ha ike maka ije ozi n’ubi ala ọzọ. Na March 9, 2002, mmadụ 5,554 bịara maka usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ha ji obi ụtọ gee ntị.

Stephen Lett, bụ́ onye na-eje ozi dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova, ji ịnụ ọkụ n’obi meghee usoro ihe omume ahụ. Ọ nabatara ọtụtụ ndị ọbịa ahụ sitere n’akụkụ dị iche iche nke ụwa n’ụzọ pụrụ iche. Mgbe ahụ ọ gara n’ihu iji okwu Jizọs bụ́, “Unu bụ ìhè nke ụwa” mee ihe n’ebe ọrụ nke ndị ahụ gaje ịghọ ndị ozi ala ọzọ dị. (Matiu 5:14) Ọ kọwara, sị: ‘N’ebe ndị a ga-ekenye unu ọrụ, unu ga-eme ka akụkụ dịgasị iche iche nke ọrụ ndị dị ebube nke Jehova “pụta ìhè,” na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịhụ ịma mma nke Jehova na nzube ya.’ Nwanna Lett gbara ndị ozi ala ọzọ ahụ ume iji ìhè nke Okwu Chineke kpughee ọchịchịrị nke nkwenkwe ụgha ma nye ndị na-achọ eziokwu ahụ nduzi.

Àgwà Kwesịrị Ekwesị Dị Oké Mkpa Iji Nwee Ihe Ịga nke Ọma

Mgbe onyeisi oche kwusịrị okwu mmeghe, Baltasar Perla, onye so na Kọmitii Alaka nke United States, kwuru okwu mbụ n’ime usoro isiokwu ndị a haziri iji nyere ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ aka ịghọ ndị ozi ala ọzọ na-enwe ihe ịga nke ọma. O kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Dị Ike, Nweekwa Ume, Mee Ya.” (1 Ihe E Mere 28:20) Eze Solomọn nke Izrel oge ochie natara ọrụ siri ike bụ́ ime ihe ọ na-emetụbeghị mbụ—iwu ụlọ nsọ na Jeruselem. Solomọn mere ihe n’ezie, sitekwa ná nkwado Jehova, e wuchara ụlọ nsọ ahụ. N’iji ihe mmụta dị na ya mee ihe n’ebe ndị klas ahụ nọ, Nwanna Perla kwuru, sị: ‘Ị natawo ọrụ ọhụrụ, nke ịbụ onye ozi ala ọzọ, ọ dịkwa gị mkpa ịdị ike na inwe ume.’ N’ezie, ụmụ akwụkwọ ahụ nwetara nkasi obi ná mmesi obi ike bụ́ na Jehova agaghị agbahapụ ha ma ọ bụrụhaala na ha anọgide na-anọ ya nso. Nwanna Perla kwuru ihe metụrụ ndị na-ege ntị n’ahụ́ site n’iji ihe ọ chọpụtara n’onwe ya mechie okwu ya: ‘Unu pụrụ ịrụzu ihe dị nnọọ mma dị ka ndị ozi ala ọzọ. Ọ bụ ndị ozi ala ọzọ wetaara mụ na ezinụlọ m eziokwu ahụ!’

“Legara Jehova Anya Maka Inwe Ihe Ịga nke Ọma” bụ isiokwu nke okwu Samuel Herd, bụ́ onye ọzọ so n’Òtù Na-achị Isi, kwuru. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-aga ịrụ ọrụ ozi ala ọzọ, ihe ịga nke ọma ha ga-enwe ga-adaberekwa n’ụzọ dị ukwuu ná mmekọrịta ha na Jehova. Nwanna Herd dụrụ ha ọdụ, sị: ‘Unu enwetawo ihe ọmụma dị ukwuu nke Bible site n’ọmụmụ ihe unu na Gilead. Unu ejiriwo ọṅụ na-anara ihe. Ma ugbu a, iji nwee ezigbo ihe ịga nke ọma, unu gaje ịmalite inye ihe unu mụtaworo.’ (Ọrụ 20:35) Ndị ozi ala ọzọ ahụ ga-enwe ọtụtụ ohere ime nke a ka ha ‘na-awụpụ onwe ha’ n’ihi ndị ọzọ.—Ndị Filipaị 2:17.

Ndụmọdụ dị aṅaa ka ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ ahụ ga-eji sị ụmụ akwụkwọ ha gaa nke ọma? Mark Noumair mere ka isiokwu ya dabere na Rut 3:18, “Nọdụ Duu Ruo Mgbe Ị Maara Ihe Ga-esi n’Okwu ahụ Pụta.” N’iji ihe atụ nke Naomi na Rut mee ihe, ọkà okwu ahụ gwara ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ ka ha nwee obi ike zuru ezu ná ndokwa nke nzukọ elu ala nke Chineke meworo ma na-akwanyere ịchịisi ọchịchị Chineke ùgwù. N’ikwu okwu ruru ụmụ akwụkwọ ahụ n’obi, Nwanna Noumair sịrị: ‘A pụrụ inwe mgbe ị na-amataghị ihe mere e ji mee otu mkpebi nke metụtara gị ma ọ bụ mgbe ị pụrụ iche nnọọ na e kwesịrị ime ihe n’ụzọ dị iche. Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ga-ebili ma mee ihe n’onwe gị ka ị̀ ‘ga-anọdụ duu,’ na-atụkwasị obi ná nduzi Chineke, na-enwe obi ike na, ka oge na-aga, ọ ga-eme ka nanị ezi ihe si na ya pụta.’ (Ndị Rom 8:28) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndụmọdụ o nyere ka ‘e tinye uche n’ime ka ihe ndị metụtara Alaeze ahụ na-aga n’ihu, na-elekwasị anya n’ihe nzukọ Jehova na-eme kama ilekwasị anya n’àgwà ndị mmadụ,’ ga-abara ndị ahụ gaje ịghọ ndị ozi ala ọzọ uru n’ebe ndị e kenyere ha ọrụ ná mba ọzọ.

Wallace Liverance, onye bụ́ onye ozi ala ọzọ n’onwe ya nke na-ejezi ozi dị ka onye nkụzi Gilead, kwuru okwu ikpeazụ nke usoro isiokwu mmalite ahụ. Isiokwu nke okwu ya bụ “Legide Anya n’Otu Ebe, Nọgide n’Ozi Chineke.” O gosiri na site n’ịhụ ọdịda Babilọn na site n’ihe Jeremaịa buworo n’amụma, Daniel onye amụma ghọtara na ntọhapụ nke ụmụ Izrel site ná ndọrọ n’agha dị nso. (Jeremaịa 25:11; Daniel 9:2) Daniel maara banyere usoro ọgụgụ oge Jehova, nke ahụ nyekwaara ya aka ilegide anya ná mmezu nke nzube Chineke. N’ụzọ dị iche, ụmụ Izrel nke oge Hagaị onye amụma kwuru, sị: “Oge ịbịa erughị.” (Hagaị 1:2) Ha elegideghị anya n’oge ha na-ebi n’ime ya, ha lekwasịrị anya ná ntụsara ahụ́ na n’imeju ọchịchọ onwe ha ma hapụ ọrụ e ji maka ya tọhapụ ha na Babilọn, bụ́ iwughachi ụlọ nsọ ahụ. Nwanna Liverance kwubiri, sị: “Ya mere, na-elegide anya n’otu ebe site n’iburu nzube Jehova n’uche mgbe nile.”

Onye nkụzi Gilead, bụ́ Lawrence Bowen duziri akụkụ ihe omume ahụ nke isiokwu ya bụ “Jehova Na-agọzi Ndị Na-eji Okwu ahụ Dị Ndụ Eme Ihe.” (Ndị Hibru 4:12) Akụkụ a metụtara ahụmahụ ndị e nwetara n’ozi ubi, na-egosipụta otú Jehova si agọzi ndị na-eji Bible eme ihe mgbe ha na-eme nkwusa ma na-akụzi ihe. Onye nduzi ahụ kwuru na Jizọs Kraịst setịpụụrụ ndị ozi nile nke Chineke ezi ihe nlereanya: ‘Jizọs pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na ihe ọ kụziri esiteghị n’uche nke aka ya, kama o kwuru Okwu Chineke.’ Ndị nwere obi eziokwu matara eziokwu ahụ ma nakwere ya nke ọma. (Jọn 7:16, 17) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa.

Ọzụzụ Gilead Na-akwadebe Mmadụ Maka Ezi Ọrụ Nile Ọ Bụla

Mgbe e mesịrị, ndị òtù ezinụlọ Betel ndị nọteworo aka bụ́ Richard Abrahamson na Patrick LaFranca gbara mmadụ isii gụsịwororị akwụkwọ na Gilead bụ́ ndị na-eje ozi ugbu a n’ụdị dị iche iche nke ozi oge nile pụrụ iche ajụjụ ọnụ. Ndị klas nke 112 ahụ na-agụsị akwụkwọ nwetara agbamume ịnụ na ka ọtụtụ afọ gasịrị, n’agbanyeghị ọrụ ha na-arụ ugbu a, mmadụ isii ahụ nọgidere jiri ọzụzụ ha natara na Gilead n’ihe metụtara ọmụmụ Bible, ime nnyocha, nakwa n’iso ndị ọzọ na-emekọrịta ihe nke ọma, na-eme ihe.

Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru okwu bụ́ isi nke usoro ihe omume ahụ. Isiokwu ya bụ “Ihe A Na-arụzu Site n’Idi Ịkpọasị Setan.” N’ime ọnwa ise gafeworonụ, ụmụ akwụkwọ ahụ anọwo na-ebi n’ebe ịhụnanya dị nakwa n’ebe e ji usoro ọchịchị Chineke eme ihe. Otú ọ dị, dị ka e kwuru n’ihe ọmụmụ ha na klas ha, anyị na-ebi n’ụwa onye iro. A na-awakpo ndị Jehova n’ụwa nile. (Matiu 24:9) Site n’iji ihe ndekọ dị iche iche nke Bible mee ihe, Nwanna Jaracz kwuru na ‘Ekwensu lekwasịrị anyị anya n’ụzọ pụrụ iche. Anyị aghaghị ime ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike ma bụrụ ndị e wusiri ike ịnagide ule dị iche iche.’ (Job 1:8; Daniel 6:4; Jọn 15:20; Mkpughe 12:12, 17) Nwanna Jaracz kwuru na n’agbanyeghị asị a nọgidere na-akpọ ndị Chineke, ‘ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide anyị, dị ka Aịsaịa 54:17 na-ekwu, nke ga-aga nke ọma. Jehova ga-ahụ na a napụtara anyị n’oge nke ya na n’ụzọ nke ya.’

N’ịbụ “ndị a kwadebere nke ọma,” ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ahụ na-agụsị akwụkwọ na klas nke 112 nke Gilead ga-eme ihe dị ukwuu n’ibelata ụnwụ nri ime mmụọ n’ala ebe ndị ha ga-eje ozi. (2 Timoti 3:16, 17) Anyị na-atụsi anya ike ịnụ akụkọ banyere otú ha si ezi ndị nọ n’ala ndị a ozi ahụ na-edozi ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 23]

IHE BANYERE KLAS AHỤ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 6

Ọnụ ọgụgụ mba ndị e zigara ha: 19

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Nkezi afọ ndụ ha: 33.2

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 15.7

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12.2

[Foto dị na peeji nke 24]

Klas nke 112 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

(1) Parotte, M.; Hooker, E.; Anaya, R.; Reynolds, J.; Gesualdi, K.; Gonzalez, J. (2) Robinson, C.; Phillips, B.; Maidment, K.; Moore, I.; Noakes, J.; Barnett, S. (3) Stires, T.; Palmer, B.; Yang, C.; Groothuis, S.; Groppe, T.; Bach, C. (4) Anaya, R.; Soukoreff, E.; Stewart, K.; Simozrag, N.; Simottel, C.; Bach, E. (5) Stewart, R.; Yang, H.; Gilfeather, A.; Harris, R.; Barnett, D.; Parotte, S. (6) Maidment, A.; Moore, J.; Groothuis, C.; Gilfeather, C.; Noakes, S.; Stires, T. (7) Gesualdi, D.; Groppe, T.; Soukoreff, B.; Palmer, G.; Phillips, N.; Simottel, J. (8) Harris, S.; Hooker, P.; Gonzalez, J.; Simozrag, D.; Reynolds, D.; Robinson, M.