Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ga-akwụsị n’Isi Nso!

Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ga-akwụsị n’Isi Nso!

Nsogbu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ Ga-akwụsị n’Isi Nso!

“ỌRỤ ịkwalite ọdịmma ndị mmadụ abachaghị uru ma ọ bụrụ na o soghị n’atụmatụ sara mbara na nke nwere nkwado ọchịchị bụ́ nke a na-eme iji gwọta isi ihe ndị na-akpata ọgba aghara. Ahụmahụ e nwere egosiwo ugboro ugboro na nanị ịrụ ọrụ iji kwalite ọdịmma ndị mmadụ apụghị ịgwọta nsogbu ndị metụtara ọchịchị n’ụzọ bụ́ isi.”—The State of the World’s Refugees 2000.

N’agbanyeghị ọrụ dị ukwuu a na-arụ iji kwalite ọdịmma ndị mmadụ, nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ nọgidere na-arị elu. Ọ̀ pụrụ ikwe omume iji ọchịchị gwọta ya n’ụzọ na-adịgide adịgide? N’eziokwu, o yichaghị ka ọ ga-ekwe omume. Ma olee ebe ọzọ anyị pụrụ ilega anya? N’akụkụ ihe odide kwesịrị ịrịba ama nke a na-ahụ ná mmalite akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’Efesọs, ọ kọwara otú Chineke ga-esi eweta nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ ná njedebe. Ọbụna o kwuru ihe Chineke ga-eji mee nke a—ihe ga-eweta isi ihe na-akpata nsogbu nile na-eti anyị ihe otiti taa ná njedebe. Gịnị ma ị tụlee ihe Pọl nwere ikwu? A na-achọta akụkụ ihe odide ahụ ná Ndị Efesọs 1:3-10.

“Ịchịkọtaghachi Ihe Nile n’Ime Kraịst”

Nzube Chineke, ka onyeozi ahụ na-ekwu, bụ maka ihe ọ kpọrọ “nlekọta ihe [ma ọ bụ ịchịkwa ihe ndị na-emenụ] n’ozuzu nke oge ahụ a kara aka.” Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na Chineke setịpụrụ oge mgbe ọ ga-eme ihe n’ụzọ nke “ịchịkọtaghachi ihe nile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.” (Ndị Efesọs 1:10) Ee, Chineke amalitewo ime ndokwa ime ka ihe nile dị n’eluigwe na n’ụwa dịghachi n’otu n’okpuru nduzi ya kpọmkwem. N’ụzọ na-akpali mmasị, banyere okwu a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “ịchịkọtaghachi,” ọkà mmụta Bible bụ́ J. H. Thayer na-ekwu, sị: “Ịchịkọtaghachiri onwe ya . . . ihe nile na mmadụ nile (bụ́ ndị mmehie kewaworo) n’otu òtù n’ime Kraịst.”

Nke ahụ na-ezo aka ná mkpa ọ dị ka Chineke mee nke a n’ihi otú adịghị n’otu sidị malite. Ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, sonyeere Setan bụ́ Ekwensu n’inupụrụ Chineke isi. Ha chọrọ nnwere onwe n’ụdị nke inwe ikike ikpebiri onwe ha ihe bụ́ ezi ihe na ihe ọjọọ. (Jenesis 3:1-5) N’ikwekọ n’ikpe ziri ezi nke Chineke, a chụpụrụ ha n’ezinụlọ Chineke, ha kwụsịkwara iso ya na-enwe mmekọrịta. Ha tinyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ime ezughị okè na ajọ ọdachi nile ọ na-akpata bụ́ ndị anyị na-enwe taa.—Ndị Rom 5:12.

Nkwere E Kweere Ka Ajọ Omume Dịrị Ruo Nwa Oge

‘Gịnị mere Chineke ji kwere ka ha mee otú ahụ?’ ka ụfọdụ pụrụ ịjụ. ‘Gịnị mere na o jighị nnọọ ike ya kasịnụ mee ihe ma manye ha ime uche ya, si otú ahụ na-egbochi ihe mgbu na nhụjuanya nile anyị na-enwe ugbu a?’ A pụrụ ịkwali mmadụ iche otú ahụ. Ma gịnị ka iji ike dị ukwuu dị otú ahụ eme ihe ga-anwapụta n’ezie? Ị̀ na-enwe mmasị n’ebe mmadụ nọ ma ọ bụ na-akwado ya ma ọ bụrụ na, mgbe ọ bụla ọ hụrụ ntakịrị ihe àmà nke ekwenyeghị n’echiche ya, ya etipịasịa onye ọ bụla na-eguzogide ya n’ihi na o nwere ikike ime otú ahụ? N’ezie ị dịghị eme otú ahụ.

Ọ bụghị ike kasịnụ nke Chineke ka ndị nnupụisi ahụ mara aka n’ezie. Ihe ha mara aka karịsịa bụ oruru o ruuru ya ịchị na izi ezi nke ụzọ o si achị. Iji dozichaa ihe iseokwu ahụ bụ́ isi e welitere, Jehova nyere ihe o kere eke ohere ịchị onwe ha ruo oge ụfọdụ n’anọghị n’okpuru nchịkwa ya kpọmkwem. (Eklisiastis 3:1; Luk 21:24) Mgbe oge ahụ gwụrụ, ọ ga-eme ihe iji maliteghachi iji aka ya na-achịkwa ihe nile dị n’ụwa. Ka ọ na-erule mgbe ahụ, ọ ga-edo anya nke ọma na ụzọ o si achị bụ nanị ụzọ ndị bi n’ụwa ga-esi enweta udo, obi ụtọ, na ọganihu na-adịgide adịgide. Mgbe ahụ, a ga-ewepụ ndị mmegbu nile nọ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 72:12-14; Daniel 2:44.

“Tupu A Tọọ Ntọala Ụwa”

Ọ dịwo anya Jehova zubere ime nke a. Pọl na-ekwu na ọ bụ “tupu a tọọ ntọala ụwa.” (Ndị Efesọs 1:4) Nke ahụ abụghị tupu e kee ụwa ma ọ bụ Adam na Iv. Ụwa ahụ “dị mma nke ukwuu,” e nupụbeghịkwa isi. (Jenesis 1:31) Oleezi “ụwa” Pọl onyeozi bu n’uche? Ọ bụ ụwa nke ụmụ Adam na Iv—ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ na-eme mmehie ma bụrụ ndị na-ezughị okè bụ́ ndị nwere atụmanya nke ịbụ ndị a ga-agbapụta. Tupu a mụọ ụmụ ọ bụla, Jehova amaralarị otú Ọ ga-esi mee ihe iji wetara ụmụ Adam a pụrụ ịgbapụta agbapụta ahụ́ efe.—Ndị Rom 8:20.

N’ezie, nke a adịghị egosi na Eze eluigwe na ala aghaghị ime ihe dị ka ụmụ mmadụ si eme. N’ịghọta na a pụrụ inwe ọnọdụ mberede, ha na-eme atụmatụ dịgasị iche iche iji hụ maka ya. Ee e, nanị ihe Chineke nke pụrụ ime ihe nile na-eme bụ ikwupụta nzube ya ma mezuo ya. Otú o sina dị, Pọl kọwara otú Jehova si kpebie idozi ihe iji wetara ihe a kpọrọ mmadụ ahụ́ efe na-adịgide adịgide. Gịnị bụ ihe ndị ahụ ọ ga-eme?

Ònye Ga-eweta Ahụ́ Efe?

Pọl na-akọwa na ndị na-eso ụzọ Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ nwere ọrụ pụrụ iche ha ga-arụ n’imezi ihe ọjọọ nke mmehie Adam kpatara. Jehova “họọrọ anyị n’ịdị n’otu nke anyị na [Kraịst],” ka Pọl na-ekwu, iso Jizọs chịa n’Alaeze eluigwe ya. N’ịkọwakwu nke a, Pọl na-ekwu na Jehova “họpụtara anyị tupu oge eruo ido anyị dị ka ụmụ nye onwe ya site n’aka Jizọs Kraịst.” (Ndị Efesọs 1:4, 5) N’ezie, Jehova ahọrọghị ma ọ bụ họpụta ha n’otu n’otu. Otú ọ dị, ọ họpụtara otu òtù nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi raara onwe ha nye bụ́ ndị ga-eso Kraịst kere òkè n’imezi ihe ọjọọ Setan bụ́ Ekwensu na Adam na Iv wetaara ezinụlọ mmadụ.—Luk 12:32; Ndị Hibru 2:14-18.

Lee ihe dị ịtụnanya nke ahụ bụ! N’ịma aka mbụ ọ mara ọbụbụeze Chineke, Setan nyere echiche na ụmụ mmadụ Chineke kere gbara ọrụ—na ọ bụrụ na a kpagbuo ma ọ bụ nwaa ha n’ụzọ siri ike, ha nile ga-enupụ isi megide ịchịisi Chineke. (Job 1:7-12; 2:2-5) N’igosipụta “obiọma ya na-erughịrị mmadụ nke dị ebube” n’ụzọ doro anya, ka oge na-aga, Jehova Chineke gosiri obi ike o nwere n’ebe ihe o kere eke nọ n’ụwa nọ site n’ido ụfọdụ ndị sitere n’ezinụlọ na-eme mmehie nke Adam dị ka ụmụ ime mmụọ ya. A ga-akpọrọ ndị sitere ná ntakịrị ìgwè a ịga jee ozi n’eluigwe. Maka nzube dị aṅaa?—Ndị Efesọs 1:3-6; Jọn 14:2, 3; 1 Ndị Tesalonaịka 4:15-17; 1 Pita 1:3, 4.

Ndị a Chineke doro dị ka ụmụ, ka Pọl onyeozi na-ekwu, ghọrọ “ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe” n’Alaeze eluigwe. (Ndị Rom 8:14-17) Dị ka ndị eze na ndị nchụàjà, ha ga-ekere òkè n’ime ka ezinụlọ mmadụ nwere onwe ya pụọ n’ihe mgbu na nhụjuanya nke ọ na-enwe ugbu a. (Mkpughe 5:10) N’eziokwu, “ihe nile e kere eke nọgidere na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” Otú ọ dị, n’isi nso, ụmụ Chineke a a họọrọ n’ụzọ pụrụ iche ga-eso Jizọs Kraịst rụọ ọrụ, a ga-emekwa ka ụmụ mmadụ nile na-erube isi ‘nwere onwe ha ọzọ pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.’—Ndị Rom 8:18-22.

Ndị “E Ji Ihe Mgbapụta Tọhapụ

E sitewo n’ihe na-aghaghị ịbụ ngosipụta kasị dị ukwuu ma dịkwa ịrịba ama nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke nwere n’ebe ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ a pụrụ ịgbapụta agbapụta nọ—àjà mgbapụta nke Jizọs Kraịst—mee ka ihe a nile kwe omume. Pọl na-ede, sị: “Site n’aka [ Jizọs Kraịst] ka e ji ihe mgbapụta tọhapụ anyị site n’ọbara nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie anyị, dị ka ịba ụba nke obiọma ya na-erughịrị mmadụ si dị.”Ndị Efesọs 1:7.

Jizọs Kraịst bụ onye bụ́ isi n’imezu nzube Chineke. (Ndị Hibru 2:10) Àjà mgbapụta ya nyere ihe iwu kwadoro nke Jehova ga-adabere na ya doo ụfọdụ ụmụ Adam dị ka ụmụ ya ka ha wee sonye n’ezinụlọ eluigwe ya na ime ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya pụọ n’ihe ndị mmehie Adam kpatara, n’emebighị obi ike e nwere n’iwu na ụkpụrụ Ya. (Matiu 20:28; 1 Timoti 2:6) Jehova emewo ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ezi omume ya ma mezuo ihe ikpe zuru okè chọrọ.—Ndị Rom 3:22-26.

“Ihe Nzuzo Dị Nsọ” nke Chineke

Ruo ọtụtụ puku afọ, Chineke ekpugheghị kpọmkwem otú ọ ga-esi emezu nzube ya maka ụwa. Na narị afọ mbụ nke O.A., “o mere ka [Ndị Kraịst] mara ihe nzuzo dị nsọ nke uche ya.” (Ndị Efesọs 1:9) Pọl na Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ ghọtara nke ọma ọrụ dị ukwuu e kenyere Jizọs Kraịst ná mmezu nke nzube Chineke. Ha malitekwara ịghọta ọrụ ha pụrụ iche dị ka ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe n’Alaeze eluigwe. (Ndị Efesọs 3:5, 6, 8-11) Ee, ọchịchị Alaeze ahụ nke dị n’aka Jizọs Kraịst na ndị ha na ya ga-eso chịa bụ ihe Chineke ga-eji eweta udo na-adịgide adịgide ọ bụghị nanị n’eluigwe kamakwa n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) Site na ya, Jehova ga-eweghachi ụwa a n’ọnọdụ o zubere na mbụ maka ya.—Aịsaịa 45:18; 65:21-23; Ọrụ 3:21.

Oge ọ kara aka maka ime ihe n’onwe ya iji wepụ mmegbu na ikpe na-ezighị ezi n’ụwa dị nso. Ma Jehova malitere usoro mweghachi n’ezie na Pentikọst 33 O.A. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịmalite mgbe ahụ ịchịkọta “ihe ndị dị n’eluigwe,” bụ́ ndị ga-eso Kraịst chịa n’eluigwe. Ndị a gụnyere Ndị Kraịst nọ n’Efesọs. (Ndị Efesọs 2:4-7) N’oge na-adịbeghị nnọọ anya, n’oge anyị, Jehova anọwo na-achịkọta “ihe ndị dị n’ụwa.” (Ndị Efesọs 1:10) Site n’ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, ọ na-eme ka mba nile nụ ozi ọma banyere ọchịchị Alaeze ya nke dị n’aka Jizọs Kraịst. Ugbu a, a na-achịkọta ndị na-anabata ya n’ebe a na-enweta nchebe na ọgwụgwọ ime mmụọ. (Jọn 10:16) N’isi nso, n’ụwa paradaịs e mere ka ọ dị ọcha, ha ga-enwere onwe ha kpam kpam pụọ n’ikpe na-ezighị ezi na nhụjuanya nile.—2 Pita 3:13; Mkpughe 11:18.

‘E werewo ọtụtụ nzọụkwụ ndị dị nnọọ mma n’ịga n’ihu’ n’ọrụ ebere ndị a na-arụ iji nyere ndị a na-emegbu emegbu aka. (The State of the World’s Children 2000) Ma, nzọụkwụ kasị nnọọ mma ga-abụ ihe Kraịst Jizọs na ndị ga-eso ya chịa n’ọchịchị Alaeze eluigwe ga-eme n’isi nso. Ha ga-edozi kpam kpam ihe nile na-akpata ọgba aghara na ihe ọjọọ nile ọzọ na-adakwasị anyị. Ha ga-eweta nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ ná njedebe.—Mkpughe 21:1-4.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Ọrụ ndị a na-arụ iji kwalite ọdịmma nke ụmụ mmadụ agwọtabeghị nsogbu nke ihe a kpọrọ mmadụ

[Foto dị na peeji nke 6]

Àjà mgbapụta Kraịst mere ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ya pụọ ná mmehie Adam

[Foto dị na peeji nke 7]

O kwere omume ịchọta nchebe na ọgwụgwọ ime mmụọ taa

[Foto dị na peeji nke 7]

N’isi nso, site n’Alaeze Mezaịa, ụmụ mmadụ ga-enwere onwe ha kpam kpam pụọ ná nsogbu