Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nwanyị Na-ejide Onwe Ya nke Ọma Ka Ị Bụ”

“Nwanyị Na-ejide Onwe Ya nke Ọma Ka Ị Bụ”

“Nwanyị Na-ejide Onwe Ya nke Ọma Ka Ị Bụ”

Ọ bụ nwa agbọghọ Moab ka a gwara okwu ịja mma ahụ. Ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Rut, nwunye nwa nwanyị Izrel, bụ́ Naomi. N’ịbụ onye biri n’Izrel n’ihe dị ka afọ 3000 gara aga, bụ́ mgbe ndị ikpe na-achị, Rut nwetara aha ọma. (Rut 3:11) Olee otú o si nweta aha ọma a? Olee ndị pụrụ irite uru site n’ihe nlereanya ya?

Ebe ọ bụ na Rut abụghị onye “na-eri nri umengwụ,” ọ rụsiri ọrụ ike ruo ọtụtụ awa dị ka onye na-achịkọta ihe a hapụrụ n’ubi, ọ dị nnọọ uchu ruo n’ókè nke na a jara ya mma. Ọbụna mgbe e mere ihe ga-eme ka ọrụ ya dị mfe, ọ nọgidere na-agba mbọ, na-eme ya karịa ka a tụrụ anya ya. N’ụzọ kwesịrị ịrịba ama, nkọwa Bible nyere banyere nwanyị kwesịrị ịja mma, nke na-ejide onwe ya nke ọma, na nke na-arụsi ọrụ ike kwesịịrị ya.—Ilu 31:10-31; Rut 2:7, 15-17.

Ọ bụ àgwà ime mmụọ Rut—ịdị umeala n’obi, mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà, na ezi ịhụnanya ya—bụ isi ihe mere o ji nwee aha ọma. N’ịhapụ nne na nna ya na obodo ya, n’enwechaghị olileanya nke ịnọ ná ntụkwasị obi alụmdi na nwunye pụrụ inye, ọ rapagidesiri ike n’ahụ́ Naomi. N’otu mgbe ahụ, Rut gosipụtara ọchịchọ ijere Jehova, bụ́ Chineke nke nne di ya, ozi. N’imesi ịdị oké ọnụ ahịa ya ike, ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu na ọ “dịịrị [Naomi] mma karịa ụmụ ndị ikom asaa.”—Rut 1:16, 17; 2:11, 12; 4:15.

Ọ bụ ezie na, n’ebe ndị mmadụ ibe ya nọ, aha ọma Rut kwesịrị ịja mma, nke ka mkpa bụ mmasị Chineke nwere n’àgwà ya na ojiji o ji ihe ùgwù nke ịghọ nne ochie Jizọs Kraịst kwụghachi ya ụgwọ. (Matiu 1:5; 1 Pita 3:4) Lee ezi ihe nlereanya Rut bụụrụ, ọ bụghị nanị ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst, kama ndị nile na-ekwu na ha na-efe Jehova!