Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Fee Chineke “n’Ime Mmụọ”

Fee Chineke “n’Ime Mmụọ”

Fee Chineke “n’Ime Mmụọ”

“Ònyekwa ka unu ga-asị na Chineke yiri ya? ma ọ bụ ihe oyiyi gịnị ka unu ga-edo n’usoro n’ebe Ọ nọ?”—AỊSAỊA 40:18.

IKEKWE i ji ezi obi kwenyesie ike na iji ihe oyiyi efe Chineke bụ ihe a na-anakwere. Ị pụrụ iche na nke a na-eme ka ị bịarukwuo Onye Na-anụ Ekpere, bụ́ onye a na-adịghị ahụ anya ma bụrụ onye pụrụ iyi ka ọ bụghị onye, nso.

Ma, ànyị nweere onwe anyị kpam kpam iji aka anyị họrọ ụzọ anyị ga-esi na-abịakwute Chineke? Ọ́ bụghị Chineke n’onwe ya kwesịrị ịbụ o kwusịa o bie ma a bịa n’ihe a na-anakwere na ihe a na-adịghị anakwere? Jizọs kọwara echiche Chineke n’okwu a mgbe ọ sịrị: “Mụ onwe m bụ ụzọ, na eziokwu, na ndụ: ọ dịghị onye ọ bụla na-abịakwute Nna m, ma ọ́ bụghị site na Mụ.” (Jọn 14:6) * Okwu ndị ahụ nanị na-akagbu iji ihe oyiyi okpukpe ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị nsọ eme ihe.

Ee, e nwere kpọmkwem ụdị ofufe Jehova Chineke na-anakwere. Olee ụdị ofufe ọ bụ? N’oge ọzọ, Jizọs kọwara, sị: “Oge awa na-abịa, ugbu a ka ọ dịkwa, mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye Ya. Chineke bụ Mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye Ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.”—Jọn 4:23, 24.

À pụrụ iji ihe oyiyi gosipụta Chineke, onye ‘bụ́ mmụọ’? Ee e. Otú ọ sọkwara ihe oyiyi okpukpe ya maruo ná mma, a pụghị iji ya tụnyere ebube Chineke ma ọlị. N’ihi ya ihe oyiyi nke na-egosi Chineke apụghị igosipụta ya nke ọma. (Ndị Rom 1:22, 23) Mmadụ ọ̀ ga ‘na-efe ofufe n’eziokwu’ ma ọ bụrụ na ọ na-esi n’ihe oyiyi okpukpe mmadụ mere abịakwute Chineke?

Ozizi Doro Anya nke Bible

Iwu Chineke machibidoro imepụta ihe oyiyi dị ka ihe e ji eme ihe n’ofufe. Nke abụọ n’ime Iwu Iri ahụ kwuru, sị: “Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, ma ọ bụ nke dị na mmiri n’okpuru ụwa: gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe.” (Ọpụpụ 20:4, 5) Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst e ji ike mmụọ nsọ dee nyekwara iwu, sị: “Gbanahụnụ ikpere arụsị.”—1 Ndị Kọrint 10:14.

N’eziokwu, ọtụtụ ndị adịghị ekweta na ojiji ha ji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe bụ ikpere arụsị. Dị ka ihe atụ, Ndị Kraịst bụ́ ndị Ọtọdọks adịghị ekweta mgbe mgbe na ha na-efe ihe oyiyi okpukpe ndị ha na-akpọ isiala enye, egburu ikpere n’ala, ma na-ekpeku ekpere, ofufe n’ezie. Otu onye ụkọchukwu Ọtọdọks dere, sị: “Anyị na-akwanyere ha ùgwù n’ihi na ha bụ ihe ndị dị nsọ, nakwa n’ihi na anyị na-enye ihe Ihe Oyiyi Okpukpe ndị ahụ na-anọchi anya ha nsọpụrụ ofufe.”

Ma, ajụjụ ka bụ: Chineke ọ̀ na-akwado iji ihe oyiyi eme ihe maka ọbụna ihe a sị na ọ bụ nsọpụrụ ofufe e si n’aka ihe ọzọ enye? Ọ dịghị ebe ọ bụla Bible nyere ikike ime ihe dị otú ahụ. Mgbe ụmụ Izrel guzobere ihe oyiyi nwa ehi, nke ha sị na ọ bụ iji fee Jehova ofufe, o kwuru na ya akwadoghị ya ma ọlị, na-asị na ha esila n’ezi ofufe dapụ.—Ọpụpụ 32:4-7.

Ihe Ize Ndụ Zoro Ezo

Iji ihe oyiyi a na-ahụ anya eme ihe n’ofufe bụ ihe dị ize ndụ. Ọ pụrụ n’ụzọ dị mfe ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị a ratara ife ihe oyiyi ahụ ofufe kama ife Chi nke e kwuru na ihe oyiyi ahụ na-anọchite anya ya. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ihe oyiyi okpukpe ahụ na-aghọ ebe e lekwasịrị anya wee na-ekpere arụsị.

E mere otú ahụ n’ebe ọtụtụ ihe oyiyi dị n’oge ụmụ Izrel. Dị ka ihe atụ, Mozis mere agwọ ọla kọpa n’oge ha na-aga n’ọzara. Na mbụ, ihe nnọchianya ahụ yiri agwọ nke dị n’elu osisi rụrụ ọrụ dị ka ihe na-eweta ọgwụgwọ. Ndị e ji agwọ ọtịta taa ahụhụ pụrụ ilegide anya n’agwọ ọla kọpa ahụ ma nweta enyemaka Chineke. Ma mgbe ndị ahụ batasịrị biri n’Ala Nkwa ahụ, o yiri ka ha mere ihe oyiyi a ịbụ arụsị, dị ka a ga-asị na agwọ ọla kọpa ahụ n’onwe ya nwere ikike ịgwọ ọrịa. Ha sureere ya ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, ọbụnakwa nye ya aha, bụ́ Nehushtan.—Ọnụ Ọgụgụ 21:8, 9; 2 Ndị Eze 18:4.

Ụmụ Izrel nwakwara iji igbe ọgbụgba ndụ ahụ mee ihe dị ka ọtụmọkpọ megide ndị iro ha, nke a rụpụtakwara ihe ndị dị mwute. (1 Samuel 4:3, 4; 5:11) N’oge Jeremaịa kwa, ụmụ amaala Jeruselem nwere nchegbu banyere ụlọ nsọ ahụ karịa ka ha nwere banyere Chi a na-efe n’ebe ahụ.—Jeremaịa 7:12-15.

Ọchịchọ nke ife ihe ofufe n’ọnọdụ Chineke ka zukwara ebe nile. Onye nchọpụta bụ́ Vitalij Ivanovich Petrenko kwuru, sị: “Ihe oyiyi okpukpe . . . na-aghọ ihe a na-efe ofufe na ihe na-etinye mmadụ n’ihe ize ndụ nke ikpere arụsị . . . Mmadụ aghaghị ikweta na nke a bụ n’ụzọ bụ́ isi echiche ndị na-ekpere arụsị bụ́ nke e si na nkwenkwe ndị na-ewu ewu webata n’ife ihe oyiyi ofufe.” N’ụzọ yiri nke ahụ, ụkọchukwu Ọtọdọks nke Gris bụ́ Demetrios Constantelos kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ Understanding the Greek Orthodox Church, sị: “O kwere omume Onye Kraịst ime ka ihe oyiyi okpukpe bụrụ ihe ọ na-efe ofufe.”

Nzọrọ ahụ a na-azọrọ na ihe oyiyi bụ nanị ihe na-enye aka n’ofufe bụ nnọọ ihe a na-enyo enyo. N’ihi gịnị? Ọ dị mma, ọ́ bụghị eziokwu na a pụrụ iwere ihe oyiyi okpukpe ụfọdụ na-egosi Meri ma ọ bụ “ndị senti” dị ka ndị e kwesịrị inye nsọpụrụ na ndị bara uru karịa ihe oyiyi okpukpe ndị ọzọ na-egosi otu onye ahụ nwụworonụ eri ogologo oge? Dị ka ihe atụ, otu ihe oyiyi na-egosi Meri nke dị na Tínos, Gris, nwere ìgwè ndị Ọtọdọks na-efe ya ofufe, ha dịkwa iche n’ìgwè ndị na-efe ihe oyiyi okpukpe ọzọ na-egosi Meri bụ́ nke dị na Soumela, n’ebe ugwu Gris. Nke ọ bụla n’ime ìgwè ndị ahụ kweere na ihe oyiyi okpukpe nke ha ka elu, na-arụ ọrụ ebube karịa nke ọzọ, n’agbanyeghị na ha abụọ na-anọchite anya otu onye ahụ nwụworonụ eri ogologo oge. Ya mere, ndị mmadụ na-ekwu site n’omume ha na ihe oyiyi okpukpe ụfọdụ nwere ikike ma na-efe ha ofufe.

È Kwesịrị Ikpeku “Ndị Senti” Ma Ọ Bụ Meri Ekpere?

Otú ọ dị, gịnị banyere inye ndị mmadụ, dị ka Meri ma ọ bụ “ndị senti” nsọpụrụ ofufe? Jizọs, n’ịzaghachi Setan okwu mgbe ọ na-anwa ya ọnwụnwa, zoro aka na Deuterọnọmi 6:13 ma kwuo, sị: “Onyenwe anyị Chineke gị ka ị ga-akpọ isiala nye, ọ bụkwa nanị Ya ka ị ga-ekpere.” (Matiu 4:10) O mesịrị kwuo na ndị na-efe ezi ofufe ga-efe “Nna” ya ofufe, ọ dịghị onye ọzọ. (Jọn 4:23) N’ịghọta nke a, otu mmụọ ozi baara Jọn onyeozi mba maka ịnwa ife ya ofufe, na-asị: ‘Emela ya: kpọọ isiala nye Chineke.’—Mkpughe 22:9.

Ò kwesịrị ekwesị ikpeku nne elu ala nke Jizọs, bụ́ Meri, ma ọ bụ “ndị senti” ụfọdụ ekpere, na-arịọ ha ka ha rịọchitere anyị arịrịọ n’ihu Chineke? Azịza doro anya Bible na-enye bụ: “Otu Onye ogbugbo dịkwa n’agbata Chineke na mmadụ, Onye Ya onwe ya bụ mmadụ, bụ́ Kraịst Jizọs.”—1 Timoti 2:5.

Chebe Mmekọrịta Gị na Chineke

Iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe n’ofufe, bụ́ nke megidere ozizi doro anya nke Bible, apụghị inyere ndị mmadụ aka inweta ihu ọma Chineke ma nweta nzọpụta. N’ụzọ dị iche, Jizọs kwuru na inweta ndụ ebighị ebi dabeere n’anyị ịmara onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ, na-amata àgwà ya ndị na-enweghị atụ nakwa nzube ya na otú o si emeso ụmụ mmadụ ihe. (Jọn 17:3) Ihe oyiyi ndị na-adịghị ahụ ụzọ, enwe mmetụta, ma ọ bụ ekwu okwu adịghị enyere mmadụ aka ịmara Chineke na ife ya ofufe n’ụzọ ọ na-anara nke ọma. (Abụ Ọma 115:4-8) Ọ bụ nanị site n’ịmụ Okwu Chineke, bụ́ Bible, ka a pụrụ isi nweta ọzụzụ kasị mkpa.

E wezụga na ọ dịghị uru ọ bụla ọ bara, iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe pụrụ ịdị ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ. N’ụzọ dị aṅaa? Nke mbụ, ọ pụrụ imebi mmekọrịta mmadụ na Jehova. Banyere Izrel, bụ́ ndị “ji arụsị ndị rụrụ arụ kpasuo ya iwe,” Chineke buru amụma, sị: “M ga-ezopụ ihu m n’ebe ha nọ.” (Deuterọnọmi 32:16, 20, The New American Bible) Ha ime ka mmekọrịta ha na Chineke dịghachi mma na-apụta ha ‘ịjụ arụsi ha na-emehie emehie.’—Aịsaịa 31:6, 7, NAB.

Ya mere, lee ka ndụmọdụ a sitere n’Akwụkwọ Nsọ si kwesị ekwesị: “Ụmụntakịrị m, cheenụ onwe unu nche ka unu ghara ikpere arụsị”!—1 Jọn 5:21.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ọ gwụla ma e dere nsụgharị ọzọ, akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile e hotara n’isiokwu a sitere na Bible Nsọ nke Union Version.

[Igbe dị na peeji nke 6]

E Nyeere Ha Aka Ife Ofufe “n’Ime Mmụọ”

Olivera bụ onye ji Chọọchị Ọtọdọks kpọrọ ihe n’Albania. Mgbe mba ahụ machibidoro ikpe okpukpe ọ bụla iwu na 1967, Olivera nọgidere na-ekpe okpukpe ya na nzuzo. O ji ihe ka ukwuu n’obere ụgwọ ezumike nká a na-akwụ ya na-azụ ihe oyiyi ọlaedo na nke ọlaọcha, ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na kandụl. O zoro ha n’ihe ndina ya, mgbe mgbe, ọ na-ehi ụra n’oche dịketere ya nso n’ihi ụjọ ọ na-atụ na a pụrụ ịhụ ha ma ọ bụ zuo ha n’ohi. Mgbe Ndịàmà Jehova bịara na nke Olivera ná mmalite afọ 1990, ọ ghọtara na eziokwu Bible dị n’ozi ha. Ọ hụrụ ihe Bible na-ekwu banyere ezi ofufe ịbụ nke a na-efe “n’ime mmụọ,” ọ mụtakwara otú iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe n’ofufe na-adị Chineke. (Jọn 4:24, Bible Nsọ nke Union Version) Onyeàmà nke mụụrụ ya Bible chọpụtara na n’oge ọ bụla ọ bịara n’ụlọ Olivera, ihe oyiyi okpukpe na-adị na ya na-adịkwu ole na ole. N’ikpeazụ, ọ dịghịzi nke fọdụrụnụ. Mgbe e mesịrị Olivera baptizim, o kwuru, sị: “Taa, kama iji ihe oyiyi okpukpe ndị na-abaghị uru na-eme ihe, enwere m mmụọ nsọ Jehova. Enwere m nnọọ ekele na ihe oyiyi okpukpe adịghị mmụọ ya mkpa iji ruo m ahụ́.”

Athena, bụ́ onye si n’àgwàetiti Lesbos nke dị na Gris, bụ onye na-anụbigara Chọọchị Ọtọdọks ọkụ n’obi ókè. O so n’òtù ndị ukwe, ọ gbasochikwara ọdịnala okpukpe, gụnyere iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe, anya. Ndịàmà Jehova nyeere Athena aka ịghọta na ọ bụghị ihe nile a kụziiri ya kwekọrọ na Bible. Nke a na-agụnye iji ihe oyiyi okpukpe na obe eme ihe n’ofufe. Athena siri ọnwụ na ya ga-eji aka ya mee nchọpụta banyere otú ihe oyiyi okpukpe ndị a si malite. Mgbe o nyochasịrị ọtụtụ akwụkwọ ntụaka, ọ bịara kwenyesie ike na ihe oyiyi okpukpe ndị a esighị n’aka Ndị Kraịst. Ọchịchọ o nwere ife Chineke “n’ime mmụọ” dugara ya n’ịtụfu ihe oyiyi ya, n’agbanyeghị na ha dara oké ọnụ. Otú ọ dị, obi dị Athena ụtọ inwe mfu ọ bụla iji fee Chineke n’ụzọ dị ọcha na nke ọ na-anakwere n’ụzọ ime mmụọ.—Ọrụ 19:19.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ihe Oyiyi Okpukpe Hà Bụ Nanị Ọrụ Nkà?

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, a chịkọtawo ihe oyiyi okpukpe dị iche iche nke ndị Ọtọdọks gburugburu ụwa. Ndị chịkọtara ha na-ewerekarị ihe oyiyi okpukpe ndị ahụ, ọ bụghị dị ka ihe ndị dị nsọ e ji eme ihe n’okpukpe, kama dị ka ọrụ nkà ndị na-egosipụta ọdịbendị ndị Byzantium. Ọ bụghị ihe ijuanya ịhụ ihe oyiyi okpukpe ndị dị otú ahụ ka e ji ha chọọ ebe obibi ma ọ bụ ụlọ ọrụ nke onye na-azọrọ na ya ekweghị na Chineke dị, mma.

Otú ọ dị, ezi Ndị Kraịst adịghị echefu nzube bụ́ isi nke ihe oyiyi okpukpe. Ọ bụ ihe e ji eme ihe n’ofufe. Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst adịghị agbagha ikike ndị ọzọ nwere inwe ihe oyiyi okpukpe, ha adịghị enwe ihe oyiyi okpukpe n’onwe ha, ọbụna dị ka ihe e wekọtara ewekọta. Nke a kwekọrọ n’ụkpụrụ dị na Deuterọnọmi 7:26: “Emekwala ka ihe arụ [ihe oyiyi okpukpe ndị e ji eme ihe n’ofufe] baa n’ụlọ gị, i wee ghọọ ihe e wezụgara ka e bibie ya dị ka ya: ị ga-ajụsị ya ajụ, kpọọkwa ya ihe rụsịrị arụ.”

[Foto dị na peeji nke 7]

Chineke anabataghị iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe

[Foto dị na peeji nke 8]

Inweta ihe ọmụma sitere na Bible na-enyere anyị aka ife Chineke n’ime mmụọ