Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Oyiyi Okpukpe—Ebe Ha Si Malite n’Oge Ochie

Ihe Oyiyi Okpukpe—Ebe Ha Si Malite n’Oge Ochie

Ihe Oyiyi Okpukpe—Ebe Ha Si Malite n’Oge Ochie

“Ihe oyiyi okpukpe bụ ụzọ jikọtara anyị na ịdị mma nakwa ịdị nsọ nke Chineke na Ndị Senti Ya.”—DAYỌSIS NKE ACHỊBISHỌP NKE ỌTỌDỌKS GRIS NKE AUSTRALIA.

N’ỤBỌCHỊ August a anyanwụ na-achasi ike, anyanwụ chakwasịrị nnọọ na steepụ ndị e ji simenti rụọ bụ́ ndị e si arịgo n’ebe obibi ndị mọnk nke “Nne Kasị Nsọ nke Chineke,” bụ́ nke dị n’àgwàetiti Tínos, n’Oké Osimiri Aegean. Anyanwụ ahụ na-achasi ike adịghị akụda mmụọ nke ihe karịrị ndị Ọtọdọks Gris 25,000 na-anụ ọkụ n’obi bụ́ ndị bịara njem ala nsọ, ndị ji nwayọọ nwayọọ na-aga ka ha na-anwa iru n’ihe oyiyi okpukpe na-egosi nne Jizọs bụ́ nke a chọrọ mma dị egwu.

Otu nwa agbọghọ, bụ́ onye ngwụrọ, nke o doro anya na ọ nọ n’ihe mgbu, nke ihu ya gbarụkwara agbarụ, ejiri ikpere ya na-agbasi ọbara ike kpụrụ akpụrụ na-aga. N’ebe na-adịghị anya site n’ebe ọ nọ, otu agadi nwanyị ike gwụrụla bụ́ onye si n’akụkụ nke ọzọ nke mba ahụ bịa, ana-adọga ịhụ na ya nọgidere na-aga ije. Oké ọsụsọ ana-agba otu nwoke kataworo ahụ́ ọ dị ọkụ n’obi ka o ji oké ọchịchọ na-adọga isi n’etiti ìgwè mmadụ ahụ nọkọtara ọnụ gafee. Ihe mgbaru ọzọ ha bụ isutụ ihe oyiyi okpukpe na-egosi Meri ọnụ ma kpọọ isiala nye ya.

Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị a na-anụrụ okpukpe ọkụ n’obi ji ezi obi na-achọ ife Chineke. Otú ọ dị, mmadụ ole maara na nsọpụrụ dị otú ahụ ha na-enye ihe oyiyi okpukpe malitere n’ihe ndị e mere ọtụtụ narị afọ tupu Iso Ụzọ Kraịst amalite?

Ojuju Ihe Oyiyi Okpukpe Juru Ebe Nile

N’ógbè ndị Ọtọdọks, ihe oyiyi okpukpe juru ebe nile. N’ime ụlọ chọọchị, ihe oyiyi okpukpe na-egosi Jizọs, Meri, na ọtụtụ “ndị sentị” na-adị n’ebe ndị bụ́ isi. Ndị na-aga chọọchị ndị ahụ na-ejikarị nsutụ ọnụ, ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na kandụl asọpụrụ ihe oyiyi okpukpe ndị ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na n’ebe obibi nile nke ndị Ọtọdọks, e nwere ebe a na-edebe ihe oyiyi okpukpe, bụ́ ebe ha na-anọ ekpe ekpere. Ọ bụ ihe a na-anụkarị bụ́ Ndị Kraịst bụ́ ndị Ọtọdọks ikwu na mgbe ha na-efe ihe oyiyi okpukpe ofufe, ha na-abịarukwu Chineke nso. Ọtụtụ ndị kweere na ihe oyiyi okpukpe nwere amara Chineke na ike nke ọrụ ebube.

Ikekwe ọ ga-eju ndị ahụ kweere n’ihe ndị a anya ịmata na Ndị Kraịst narị afọ mbụ akwadoghị iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe n’ofufe. Akwụkwọ bụ́ Byzantium na-ekwu, sị: “Ndị Kraịst mbụ, n’ịbụ ndị okpukpe Ndị Juu mere ka ha kpọọ ikpere arụsị asị, akwadoghị ofufe ọ bụla a na-efe foto nke ndị nsọ.” Otu akwụkwọ ahụ na-ekwu, sị: “Malite na Narị Afọ nke Ise gaa n’ihu, ihe oyiyi okpukpe . . . ghọrọ ihe e ji emewanye ihe n’ofufe ihu ọha nakwa na nke onwe onye.” Ọ bụrụ na ọ bụghị n’Iso Ụzọ Kraịst nke narị afọ mbụ ka iji ihe oyiyi okpukpe eme ihe si malite, ebee ka o si malite?

Ịchọ Ebe Ha Si Malite

Onye nchọpụta bụ́ Vitalij Ivanovich Petrenko dere, sị: “Iji ihe oyiyi eme ihe na ịgbaso ọdịnala ya na ya na-eso malitere laa azụ tupu oge Ndị Kraịst, ọ ‘malitekwara n’aka ndị na-ekpere arụsị.’” Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kweere, na-asị na ife ihe oyiyi ofufe malitere n’okpukpe nke ndị Babilọn, Ijipt, na Gris oge ochie. Dị ka ihe atụ, na Gris oge ochie, ihe oyiyi okpukpe na-adị n’ụdị nke ihe a kpụrụ akpụ. E kweere na ha nwere ike sitere n’aka Chineke. Ndị mmadụ chere na ọ bụghị aka ka e ji mee ụfọdụ n’ime ihe oyiyi ndị a kama na ha si n’eluigwe daa. N’oge ememe pụrụ iche, a na-eburu ihe oyiyi okpukpe ndị dị otú ahụ gagharịa n’obodo, a na-achụkwara ha àjà. “Ndị na-anụrụ okpukpe ọkụ n’obi lere ihe oyiyi okpukpe anya dị ka chi n’onwe ha, ọ bụ ezie na e mewo mgbalị . . . igosi ọdịiche dị n’etiti chi na ihe oyiyi ya,” ka Petrenko kwuru.

Olee otú echiche na omume ndị dị otú ahụ si gbebata n’Iso Ụzọ Kraịst? Otu onye nchọpụta ahụ kwuru na, na narị afọ ndị dịrị mgbe ndịozi Kraịst nwụsịrị, karịsịa n’Ijipt, “a gwakọtara echiche Ndị Kraịst na ‘nkwenkwe ndị na-ekpere arụsị’—ndị sitere n’ihe omume na nkwenkwe nke ndị Ijipt, ndị Gris, ndị Juu, ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na ndị Rom, bụ́ ndị a gwakọtara ha na nkwenkwe na ihe omume Ndị Kraịst.” N’ihi ya, “ndị ọrụ aka bụ́ Ndị Kraịst bịara nabata usoro [ngwakọta ofufe] ma jiri ihe oyiyi nke ndị na-ekpere arụsị mee ihe, na-agbanwe ha ikwekọ n’Iso Ụzọ Kraịst, ọ bụ ezie na ha emeghị ka ha dị ọcha kpam kpam pụọ ná mmetụta nke ndị na-ekpere arụsị.”

N’oge na-adịghị anya, ihe oyiyi okpukpe bịara ghọọ ihe e ji eme ihe ma n’ofufe onwe onye ma na nke ihu ọha. N’akwụkwọ bụ́ The Age of Faith, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Will Durant na-akọwa otú nke a si mee, na-asị: “Ka ọnụ ọgụgụ nke ndị senti a na-efe ofufe mụbara, a bịara nwee mkpa maka ịmata na icheta ha; e mepụtara foto ha na nke Meri n’ọnụ ọgụgụ dị ukwuu; a bịakwa n’ihe banyere Kraịst, ọ bụghị nanị otú e chere na ọ dị kama obe Ya ghọrọ ihe a na-enye nsọpụrụ ofufe—ọbụna, nye ndị na-ekwere ihe n’ajụghị ase, ọ ghọrọ ihe e ji eme majik. Ikike ichepụta ihe nke ndị ahụ bu pụta ụwa mere ka ha gbanwee ihe onwunwe ndị senti, foto, na ihe oyiyi, bụ́ ndị dị nsọ ịghọ ihe a na-enye nsọpụrụ ofufe; ndị mmadụ kpọrọ isiala nye ha, sutụ ha ọnụ, mụnyere ha kandụl na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, kpunye ha okooko osisi n’isi, ma chọọ ọrụ ebube site n’ike anwansi ha. . . . Ndị Fada na ndị kansụl nke Chọọchị kọwara ugboro ugboro na ihe oyiyi ndị ahụ abụghị chi, kama na ha bụ ihe ndị e ji echeta chi; ndị ahụ achọghị ịma banyere ọdịiche dị otú ahụ.”

Taa, ọtụtụ ndị ji ihe oyiyi okpukpe eme ihe ga-arụ ụka n’otu aka ahụ na nanị ihe ha na-enye ihe oyiyi bụ nsọpụrụ—ọ bụghị ofufe. Ha pụrụ ịzọrọ na ihe osise okpukpe bụ ihe iwu kwadoro—ọbụna ihe dị oké mkpa—nke na-enye aka n’ife Chineke ofufe. Ikekwe i chere otú ahụ. Ma ajụjụ bụ, Olee otú Chineke si ele ya anya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na ịkwanyere ihe oyiyi ùgwù na ife ya ofufe bụ otu ihe? Omume dị otú ahụ hà pụrụ n’ezie ịkpata ihe ize ndụ ndị zoro ezo?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 4]

Gịnị Bụ Ihe Oyiyi Okpukpe?

E nwere ụdị ihe oyiyi okpukpe dịgasị iche iche. E nwere ihe oyiyi ndị a kpụrụ akpụ. A na-atụ ụfọdụ atụ. Ọtụtụ ndị Roman Katọlik na-eji ha eme ihe n’ofufe. E nwekwara ihe oyiyi ndị e sere ese na-egosi Kraịst, Meri, “ndị senti,” ndị mmụọ ozi, ndị mmadụ na ihe omume ndị a kọrọ banyere ha n’ime Bible, ma ọ bụ ihe ndị a kọrọ n’akụkọ ihe mere eme nke Chọọchị Ọtọdọks. A na-esekarị ha na bọọdụ osisi ndị a pụrụ ibugharị ebugharị.

Dị ka Chọọchị Ọtọdọks si kwuo, “n’ihe oyiyi . . . ndị na-egosi Ndị Senti, foto ha anaghị adị ka foto ụmụ mmadụ nkịtị.” Dị ka ọ na-adịkarị, “ọ dịghị enwe onyinyo, ma ọ bụ ụzọ isi gosi ehihie na abalị.” E kwekwara na osisi na ágbá e ji see ihe oyiyi pụrụ ịbụ nke “Chineke nọ na ya.”

[Foto dị na peeji nke 4]

Iji ihe oyiyi eme ihe malitere n’aka ndị na-ekpere arụsị

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

© AFP/CORBIS