Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Zere Ịbụ Onye A Ghọgburu

Zere Ịbụ Onye A Ghọgburu

Zere Ịbụ Onye A Ghọgburu

AGHỤGHỌ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ malitere mgbe ihe a kpọrọ mmadụ malitere. Otu n’ime ihe ndị mbụ e dekọrọ n’akụkọ ihe mere eme bụ omume aghụghọ. Nke ahụ bụ mgbe Setan ghọgburu Iv n’ogige Iden.—Jenesis 3:13; 1 Timoti 2:14.

Ọ bụ ezie na kemgbe ahụ, ọ dịbeghị mgbe aghụghọ na-abaghị ụba n’ụwa, o zuru ebe nile n’oge a karịsịa. N’ilega anya n’oge a, Bible dọrọ aka ná ntị, sị: “Ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga-anọgide na-ajọwanye njọ, na-eduhie ma bụrụ ndị a na-eduhie.”—2 Timoti 3:13.

A na-aghọgbu ndị mmadụ n’ihi ihe ndị dịgasị iche iche. Ndị aghụghọ na ndị wayo na-aghọgbu ndị mmadụ iji nweta ego ha. Ụfọdụ ndị na-azọ ọchịchị na-aghọgbu ndị tụụrụ ha vootu, na-ekpebisi ike ịnọgide n’ọchịchị n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha. Ọbụna ndị mmadụ na-aghọgbu onwe ha. Kama ikwere eziokwu na-adịghị ha ụtọ, ha na-agwa onwe ha na ọ dịghị ihe mmerụ ahụ́ dị n’ịgbaso omume ndị dị ize ndụ, dị ka ise siga, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, ma ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ.

A na-aghọkwa aghụghọ n’ihe ndị metụtara okpukpe. Ndị ndú okpukpe nke oge Jizọs ghọgburu ndị mmadụ. Jizọs kwuru banyere ndị aghụghọ ahụ, sị: “Ha bụ ndị nduzi kpuru ìsì. Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduzie onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’ime olulu.” (Matiu 15:14) Ọzọkwa, ndị mmadụ na-aghọgbu onwe ha n’ihe ndị metụtara okpukpe. Ilu 14:12 na-ekwu, sị: “Ụzọ dị nke ziri ezi n’ihu mmadụ, ma nsọtụ ya bụ ụzọ nile nke ọnwụ.”

Dị ka ọ dị n’oge Jizọs, a na-aghọgbu ọtụtụ ndị taa n’ihe ndị metụtara okpukpe, nke ahụ abụghịkwa ihe ijuanya! Pọl onyeozi kwuru na Setan “[emewo] ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì, ka ìhè nke ozi ọma ahụ dị ebube banyere Kraịst ahụ, onye bụ́ onyinyo Chineke, wee ghara inwupụta.”—2 Ndị Kọrint 4:4.

Ọ bụrụ na onye wayo aghọgbuo anyị, ihe ga-efunahụ anyị bụ ego. Ọ bụrụ na onye ọchịchị aghọgbuo anyị, nnwere onwe ụfọdụ pụrụ ifunahụ anyị n’ihi ya. Ma, ọ bụrụ na Setan aghọgbuo anyị nke na anyị jụrụ eziokwu banyere Jizọs Kraịst, ndụ ebighị ebi ga-efunahụ anyị! N’ihi ya, zere ịbụ onye a ghọgburu. Meghee uche gị na obi gị nye otu isi iyi a na-apụghị ịgbagha agbagha nke eziokwu, bụ́ Bible. Ọ dị ọtụtụ ihe ga-efunahụ anyị ma ọ bụrụ na anyị emee ihe dị iche.—Jọn 17:3.