Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka o kwesịrị ekwesị ka nwanyị bụ́ Onye Kraịst yiri ihe mkpuchi isi maka ihe ụfọdụ metụtara ihe ime mmụọ?

“Nwanyị ọ bụla nke na-ekpuchighị isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere,” ka Pọl onyeozi dere. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi ụkpụrụ ịbụisi nke Chineke: “Isi nke nwanyị bụ nwoke.” Dị ka o kwesịrị, ikpe ekpere ma ọ bụ izi ihe n’ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ọrụ dịịrị nwoke. N’ihi ya, mgbe nwanyị bụ́ Onye Kraịst na-ahụ maka ihe ndị metụtara ofufe bụ́ nke ọ bụ di ya ma ọ bụ nwoke e mere baptizim kwesịrị ime, o kwesịrị iyi ihe mkpuchi isi.—1 Ndị Kọrint 11:3-10.

Ọnọdụ ebe Onye Kraịst bụ́ nwanyị kwesịrị iyi ihe mkpuchi isi pụrụ ịdị ná mmekọrịta alụmdi na nwunye ya. Dị ka ihe atụ, mgbe ezinụlọ bịakọtara ọnụ maka ọmụmụ Bible ma ọ bụ maka nri, ọ bụ di kwesịrị ibute ụzọ n’izi ha ihe nakwa idu ha n’ekpere nye Chineke. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ bụ onye na-ekweghị ekwe, ọrụ a pụrụ ịdịkwasị n’ubu nwunye ya. N’ihi ya, mgbe nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst na-ekpe ekpere n’olu dara ụda n’isi ya na n’isi ndị ọzọ ma ọ bụ mgbe ọ na-eduziri ụmụ ya ọmụmụ Bible n’ihu di ya, o kwesịrị iyi ihe mkpuchi isi. Ọ bụrụ na di ya anọghị ya, ọ dịghị mkpa ka nwunye ahụ yiri ihe mkpuchi isi, ebe ọ bụ na Chineke nyere ya ikike izi ụmụ ya ihe.—Ilu 1:8; 6:20.

Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na nwa okoro nta nọ n’ezinụlọ ahụ bụ ohu Jehova Chineke raara onwe ya nye, nke e mere baptizim? Ebe ọ bụ na nwa okoro nta ahụ so n’ọgbakọ Ndị Kraịst, o kwesịrị ịnata ntụziaka site n’aka ndị nwoke nọ n’ọgbakọ. (1 Timoti 2:12) Ọ bụrụ na nna ya bụ onye kwere ekwe, o kwesịrị izi ya ihe. Otú ọ dị, ọ bụrụ na nna ya anọghị ya, mgbe ahụ nne ya kwesịrị iyi ihe mkpuchi isi ma ọ bụrụ na ọ na-amụrụ nwa okoro ahụ e mere baptizim na ụmụaka ndị ọzọ Bible. Ọ bụ ya ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ ga-agwa nwa okoro ahụ e mere baptizim ka o duo n’ekpere n’ọmụmụ ihe dị otú ahụ ma ọ bụ n’oge nri. Ọ pụrụ iche na o ruchabeghị eru ime nke ahụ ma họrọ idu n’ekpere n’onwe ya. Ọ bụrụ na ọ họrọ ikpe ekpere n’oge dị otú ahụ, o kwesịrị iyi ihe mkpuchi isi.

Ọ pụrụ ịdị ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst mkpa iyi ihe mkpuchi isi mgbe ha na-ekere òkè n’ozi ụfọdụ nke ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ná nzukọ maka ozi ubi etiti izu, ọ pụrụ ịbụ nanị ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst nọ ya, n’enweghị nwoke e mere baptizim. A pụrụ inwe oge ndị ọzọ mgbe ndị ikom e mere baptizim na-anọghị ná nzukọ ọgbakọ. Ọ bụrụ na nwanna nwanyị ga-arụ ọrụ nke nwanna nwoke kwesịrị ịrụ ná nzukọ ọgbakọ haziri ma ọ bụ ná nzukọ maka ozi ubi, o kwesịrị iyi ihe mkpuchi isi.

Ndị inyom bụ́ Ndị Kraịst hà ga-eyirịrị ihe mkpuchi isi mgbe ha na-atụgharị okwu dabeere na Bible gaa n’asụsụ ọzọ ma ọ bụ n’asụsụ ndị ogbi ma ọ bụ na-agụpụta paragraf dị iche iche n’ihu ọha site n’akwụkwọ e ji amụ Bible bụ́ nke e ji na-eme ihe ná nzukọ ọgbakọ? Ee e. Ọ bụghị ụmụnna nwanyị ndị na-arụ ọrụ ndị a na-eduzi ma ọ bụ na-ezi ihe. N’otu aka ahụ, ihe mkpuchi isi adịghị mkpa maka ụmụnna nwanyị ndị na-eme ihe ngosi, ndị na-akọ ahụmahụ, ma ọ bụ ndị na-eme ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.

Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị ikom e mere baptizim na-ezi ihe n’ọgbakọ, ma ndị ikom ma ndị inyom nwere ọrụ nke ime nkwusa na izi ihe n’ebe na-abụghị n’ọgbakọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) N’ihi ya, mgbe nwanyị bụ́ Onye Kraịst na-agwa ndị nọ n’èzí banyere Okwu Chineke n’ihu Onyeàmà Jehova bụ́ nwoke, ọ gaghị adị mkpa ka o yiri ihe mkpuchi isi.

Otú ọ dị, nke ahụ dị iche mgbe a nọ n’ebe obibi na-eduzi ọmụmụ Bible e mere ndokwa ya bụ́ nke a na-eduzi mgbe nile, ya abụrụkwa na nwoke raara onwe ya nye e mere baptizim nọ ya. Nke a bụ oge izi ihe nke e buworo ụzọ mee ndokwa maka ya bụ́ ebe onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ na-edu ndú n’ezie. N’ọnọdụ ndị a, ọmụmụ ihe na-aghọ akụkụ nke ọgbakọ. Ọ bụrụ na nwanyị bụ́ Onyeàmà e mere baptizim ga-eduzi ọmụmụ ihe ahụ ebe nwoke e mere baptizim nọ ya, ọ ga-ekwesị ekwesị ka o yiri ihe mkpuchi isi. Otú ọ dị, nwanna nwoke ahụ raara onwe ya nye ga-edu n’ekpere. Nwanna nwanyị agaghị ekpe ekpere n’ihu nwanna nwoke raara onwe ya nye ọ gwụla ma e nwere ihe pụrụ iche kpatara ya, dị ka ma ọ bụrụ na nwanna nwoke ahụ apụghị ikwu okwu.

Mgbe ụfọdụ, nwoke bụ́ onye nkwusa Alaeze a na-emebeghị baptizim pụrụ iso nwanna nwanyị bụ́ Onye Kraịst gaa iduzi ọmụmụ Bible. Ọ bụrụ na nwanna nwanyị ahụ achọọ, ọ pụrụ ịgwa nwoke ahụ bụ́ onye nkwusa ka o duzie ọmụmụ ihe ahụ. Ma ebe ọ bụ na ọ pụghị ịnọchite anya nwanna nwanyị ahụ e mere baptizim nke ọma n’ekpere nye Jehova, ọ ga-ekwesị ekwesị ka nwanna nwanyị ahụ kpee ekpere n’ọmụmụ ihe ahụ. Mgbe nwanna nwanyị na-eduzi ọmụmụ ihe ma ọ bụ na-ekpe ekpere n’ọnọdụ ndị a, ọ ga-adị mkpa ka o kpuchie isi ya. Ọ bụ ezie na e mebeghị nwoke ahụ bụ́ onye nkwusa baptizim, ndị nọ n’èzí maara ya dị ka onye so n’ọgbakọ n’ihi nkwusa ọ na-eme.

‘Nwanyị kwesịrị inwe ihe àmà nke ikike n’isi ya n’ihi ndị mmụọ ozi,’ ka Pọl onyeozi dere. Ee, ụmụnna nwanyị bụ́ Ndị Kraịst nwere ihe ùgwù nke ịbụ ezi ihe nlereanya nye ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi bụ́ ndị ji iguzosi ike n’ihe nọgide na-edo onwe ha n’okpuru Jehova. Lee ka o si kwesị ekwesị ka ndị inyom bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke lebara iyi ihe mkpuchi isi anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe ọnọdụ chọrọ ka ha mee otú ahụ!

[Foto dị na peeji nke 26]

Ihe mkpuchi isi bụ ihe àmà nke nkwanye ùgwù maka ịbụisi