Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe Ịchụàjà Nye Chi A Na-akpọghị Aha

Ebe Ịchụàjà Nye Chi A Na-akpọghị Aha

Ebe Ịchụàjà Nye Chi A Na-akpọghị Aha

PỌL onyeozi letara Atens, Gris, n’ihe dị ka na 50 O.A. N’ebe ahụ, ọ hụrụ ebe ịchụàjà a raara nye chi a na-amaghị ama ma mesịa kpọtụ ya uche mgbe ọ na-agba ezi àmà banyere Jehova.

N’ịmalite okwu ya n’Ugwu Mars, ma ọ bụ Ariopagọs, Pọl kwuru, sị: “Ndị ikom Atens, ahụrụ m na n’ihe nile o yiri ka unu na-atụ chi dị iche iche egwu karịa otú ndị ọzọ na-atụ. Dị ka ihe atụ, ka m na-agafe ma na-eleru anya nke ọma n’ihe ndị unu na-enye nsọpụrụ, ahụkwara m otu ebe ịchụàjà nke e dekwasịworo, sị ‘Nye Chi A Na-amaghị Ama.’ Ya mere, ihe unu na-enye nsọpụrụ Chineke n’amaghị ama, nke a ka m na-ekwusara unu.”—Ọrụ 17:22-31.

Ọ bụ ezie na a hụbeghị ebe ịchụàjà Atens ahụ, ebe ịchụàjà ndị yiri ya dị n’akụkụ ndị ọzọ nke Gris. Dị ka ihe atụ, onye Gris bụ́ ọkà mmụta ọdịdị mbara ala na narị afọ nke abụọ bụ́ Pausanias, kwuru banyere ebe ịchụàjà nke “chi ndị A Kpọrọ Ndị A Na-amaghị Ama,” ndị dị na Phaleron bụ́ ebe na-adịghị anya site n’Atens. (Description of Greece, Attica I, 4) Dị ka otu akwụkwọ ahụ si kwuo, n’Olympia, e nwere “ebe ịchụàjà nke chi ndị A Na-amaghị Ama.”—Eleia I, XIV, 8.

N’akwụkwọ ya bụ́ The Life of Apollonius of Tyana (VI, III), onye edemede bụ́ onye Gris bụ́ Philostratus (ihe dị ka 170-ihe dị ka 245 O.A.) kwuru na n’Atens, “a na-ewuru ọbụna chi ndị a na-amaghị ama ebe ịchụàjà.” N’akwụkwọ bụ́kwa Lives of Philosophers (1.110), Diogenes Laertius (ihe dị ka 200-250 O.A.) dere na a pụrụ ịhụ “ebe ịchụàjà ndị na-enweghị aha” n’akụkụ dị iche iche nke Atens.

Ndị Rom wukwaara chi ndị a na-akpọghị aha ebe ịchụàjà. Nke e gosiri n’ebe a bụ nke dịwara kemgbe narị afọ mbụ ma ọ bụ nke abụọ T.O.A., bụ́kwa nke e chekwara n’Ebe Ndebe Ọrụ Nkà Ndị E Gwupụtara na Palatine, bụ́ nke dị na Rom, Ịtali. Ihe e ji asụsụ Latin dee na ya na-egosi na a raara ebe ịchụàjà a nye “chi ma ọ bụ chi nwanyị”—bụ́ nkebi ahịrị okwu “a na-ahụkarị n’ekpere ma ọ bụ n’okwu nraranye ndị e dere n’ahụ́ ihe ma ọ bụ ndị e dere n’akwụkwọ.”

A ka nwere ọtụtụ ndị na-amaghị “Chineke nke mere ụwa na ihe nile dị n’ime ya.” Ma dị ka Pọl gwara ndị Atens, Chineke a—Jehova—‘anọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.’—Ọrụ 17:24, 27.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 32]

Ebe Ịchụàjà: Soprintendenza Archeologica di Roma