Gịnị n’Ezie Bụ Hel?
Gịnị n’Ezie Bụ Hel?
N’AGBANYEGHỊ ihe ọ bụla ị na-eche banyere okwu ahụ bụ́ “hel,” ọtụtụ ndị na-ewere hel dị ka ebe ntaramahụhụ maka mmehie. Banyere mmehie na ihe ọ ga-arụpụta, Bible na-asị: “Mmehie sitere n’otu mmadụ bata n’ụwa, ọnwụ esitekwa ná mmehie, ọnwụ ewee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ nile n’ihi na ha nile emehiewo.” (Ndị Rom 5:12) Akwụkwọ Nsọ kwukwara, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ebe ọ bụ na ntaramahụhụ maka mmehie bụ ọnwụ, ajụjụ dị mkpa n’ịmata otú hel dị n’ezie bụ: Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?
À na-anọgide na-adị ụdị ndụ ụfọdụ, n’ụdị ụfọdụ, mgbe a nwụsịrị? Gịnị bụ hel, oleekwa ụdị ndị na-aga ebe ahụ? Ndị nọ na hel hà nwere olileanya ọ bụla? Bible na-enye azịza ndị bụ́ eziokwu na ndị na-eju afọ maka ajụjụ ndị a.
À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
Ọ̀ dị ihe dị n’ime anyị, dị ka mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ, nke na-adị ndụ mgbe ahụ́ nwụsịrị? Tụlee otú nwoke mbụ, bụ́ Adam, si nwee ndụ. Bible na-ekwu, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7) Ọ bụ ezie na iku ume mere ka ọ dị ndụ, ikunye “ume ndụ” n’oghere imi ya gụnyere ihe karịrị nanị ikunye ikuku n’akpa ume ya. Ọ pụtara na Chineke tinyere ihe ji ndụ—“ike ndụ”—n’ime ahụ́ na-enweghị ndụ nke Adam, bụ́kwa nke na-arụ ọrụ n’ime ihe nile e kere eke. (Jenesis 6:17, NW; 7:22) Bible na-ezo aka n’ebe ike ndụ a dị dị ka “mmụọ.” (Jems 2:26) A pụrụ iji mmụọ ahụ tụnyere ike eletrik nke na-enye ígwè ma ọ bụ ngwá ọrụ ike ma na-eme ka o nwee ike ịrụ ọrụ ya. Dị nnọọ ka ọ na-adịghị mgbe ike eletrik ga-enwe ọdịdị nke ngwá ọrụ ọ na-enye ike nwere, ike ndụ adịghị enwe njimara ọ bụla nke ihe ndị e kere eke ọ na-eme ka ha na-adị ndụ. O nweghị àgwà, o nweghịkwa ikike iche echiche.
Gịnị na-eme mmụọ mgbe mmadụ nwụrụ? Abụ Ọma 146:4 na-asị: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” Mgbe mmadụ nwụrụ, mmụọ ya nke na-abụghị onye adịghị anọgide na-adị ndụ n’ógbè ọzọ dị ka mmụọ e kere eke. Ọ ‘na-alaghachikwuru Chineke Onye nyere ya.’ (Eklisiastis 12:7) Nke a na-apụta na olileanya ọ bụla nke onye ahụ nwere ịdịghachi ndụ n’ọdịnihu dị kpam kpam n’aka Chineke.
Ndị ọkà ihe ọmụma Gris oge ochie bụ́ Socrates na Plato kweere na mkpụrụ obi nke dị n’ime mmadụ na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị, na ọ dịghị anwụ anwụ ma ọlị. Gịnị ka Bible na-akụzi banyere mkpụrụ obi? Adam “wee Jenesis 2:7 na-ekwu. Ọ nataghị mkpụrụ obi; ọ bụ mkpụrụ obi—mmadụ n’ozuzu ya. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere mkpụrụ obi ịbụ nke a mụrụ, nke agụụ na-agụ, nke nri juru afọ, na nke na-eme ihe ndị ọzọ. (Jenesis 46:18; Deuterọnọmi 12:20; Ilu 27:7) Ee, mmadụ n’onwe ya bụ mkpụrụ obi. Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụ mkpụrụ obi ahụ nwụrụ.—Ezikiel 18:4.
ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ,” kaMgbe ahụ, gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Mgbe Jehova na-ama Adam ikpe, o kwuru, sị: “Ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alọta.” (Jenesis 3:19) Ebee ka Adam nọ tupu Chineke ejiri ájá sitere n’ala kpụọ ya ma nye ya ndụ? Ọ dịghị adị ma ọlị! Mgbe Adam nwụrụ, ọ laghachiri n’ọnọdụ ahụ nke adịghị adị ma ọlị. E mere ka ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ doo anya n’Eklisiastis 9:5, 10, bụ́ ebe anyị na-agụ, sị: “Ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Shiol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.” Dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo, ọnwụ bụ ọnọdụ nke adịghị adị. Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, ha adịghị enwe mmetụta, ha adịghị eche echiche.
Ọ̀ Bụ Ebe Mmekpa Ahụ́ Na-enweghị Nkwụsị Ka Ọ̀ Bụ Ili Nkịtị?
Ebe ọ bụ na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, hel apụghị ịbụ ebe mmekpa ahụ́ nke ọkụ na-enwu na ya bụ́ ebe ndị ajọ omume na-ata ahụhụ mgbe ha nwụsịrị. Gịnịzi bụ hel? Inyocha ihe mere Jizọs mgbe ọ nwụsịrị ga-enye aka n’ịza ajụjụ ahụ. Onye so dee Bible bụ́ Luk na-akọ, sị: “A gbahapụghị [Jizọs] na Hedis [hel, King James Version], anụ ahụ́ ya ahụghịkwa ire ure.” * (Ọrụ 2:31) Ebee ka hel nke ọbụna Jizọs gara dị? Pọl onyeozi dere, sị: “Enyefere m unu . . . na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo; nakwa na e liri ya, ee, na a kpọlitewo ya n’ụbọchị nke atọ dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo.” (1 Ndị Kọrint 15:3, 4) N’ihi ya, Jizọs nọrọ na hel, ili, ma a gbahapụghị ya n’ebe ahụ, n’ihi na a kpọlitere ya, ma ọ bụ mee ka o si n’ọnwụ bilie.
Tụleekwa ihe banyere nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job, bụ́ onye tara ahụhụ nke ukwuu. Mgbe ọ na-achọ inwere onwe ya pụọ n’ọnọdụ ọjọọ ya, ọ rịọrọ, sị: “Ònye ga-emere m ihe a, ka i chebe m na hel [Shiol], zobekwa m ruo mgbe iwe gị ga-agabiga?” * (Job 14:13, Douay Version) Lee ka o si bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya iche na Job chọrọ ịga n’ebe na-enwu ọkụ maka nchebe! Nye Job, “hel” bụ nanị ili, bụ́ ebe ahụhụ ya ga-akwụsị. Ya mere, hel e kwuru banyere ya na Bible bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ bụ́ ebe ma ndị ọma ma ndị ọjọọ na-aga.
Ọkụ Hel—Ọ̀ Bụ Mbibi Kpam Kpam?
Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọkụ nke hel bụ ihe atụ nke mbibi kpam kpam? N’igosi ọdịiche dị n’etiti Mkpughe 20:14.
ọkụ na Hedis, ma ọ bụ hel, Akwụkwọ Nsọ na-asị: “A tụbakwara ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ.” “Ọdọ ọkụ ahụ” a kpọtụrụ uche n’ebe a bụ ihe atụ, ebe ọ bụ na ọnwụ na hel (Hedis) a tụbara n’ime ya apụghị ire ọkụ n’ụzọ nkịtị. “Ọdọ ọkụ ahụ pụtara ọnwụ nke abụọ”—ọnwụ nke enweghị olileanya ịdịghachi ndụ.—Ihe ọdọ ọkụ ahụ pụtara yiri ihe “Gehena na-ere ọkụ [ọkụ hel, King James Version]” nke e kwuru okwu ya pụtara. (Matiu 5:22; Mak 9:47, 48) Gehena pụtara ugboro 12 n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọ na-ezokwa aka na ndagwurugwu nke Hinọm, bụ́ nke dị n’azụ mgbidi Jeruselem. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e ji ndagwurugwu a mere ebe mkpofu ahịhịa, “bụ́ ebe a na-atụnye ozu ndị omempụ, na ozu anụmanụ, na ụdị ihe ọ bụla rere ure.” (Smith’s Dictionary of the Bible) A na-eme ka ọkụ ya nọgide na-enwu site n’itinye ya sọlfọ ka o rechapụ ihe mkpofu ndị ahụ. Jizọs jiri ndagwurugwu ahụ mee ihe dị ka ihe atụ kwesịrị ekwesị nke mbibi ebighị ebi.
Dị ka ọ dị n’ebe Gehena dị, ọdọ ọkụ ahụ bụ ihe atụ nke mbibi ebighị ebi. ‘A tụbara’ ọnwụ na Hedis n’ime ya n’ụdị na a ga-ebibi ha mgbe a ga-eme ka ihe a kpọrọ mmadụ nwere onwe ha pụọ ná mmehie na amamikpe nke ọnwụ. Ndị ma ụma na-eme mmehie ma jụ ichegharị ga-eketakwa “òkè” n’ọdọ ọkụ ahụ. (Mkpughe 21:8) A ga-ebibikwa ha ruo mgbe ebighị ebi. N’aka nke ọzọ, ndị nọ ná ncheta Chineke, bụ́ ndị nọ na hel—ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ—nwere olileanya magburu onwe ya.
E Mee Ka Hel Tọgbọrọ Chakoo!
Mkpughe 20:13 na-asị: “Oké osimiri hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na Hedis hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha.” Ee, a ga-eme ka hel nke Bible kwuru okwu ya tọgbọrọ chakoo. Dị ka Jizọs kwere ná nkwa, “oge awa na-abịa mgbe ndị nile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Ọ bụ ezie na ha adịghịzi adị n’ụdị ọ bụla ugbu a, a ga-akpọlite ọtụtụ nde ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Jehova Chineke n’ọnwụ, ma ọ bụ mee ka ha dịghachi ndụ, na paradaịs elu ala nke e weghachiri eweghachi.—Luk 23:43; Ọrụ 24:15.
N’ụwa ọhụrụ Chineke, ọ gaghị adị ụmụ mmadụ a kpọlitere n’ọnwụ bụ́ ndị mere ihe kwekọrọ n’iwu ezi omume ya mkpa ịnwụ ọzọ ma ọlị. (Aịsaịa 25:8) Jehova “ga-ehichapụkwa anya mmiri ọ bụla n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru újú ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” N’ezie, ‘ihe mbụ ga-agabigawo.’ (Mkpughe 21:4) Lee aha ngọzi na-echere ndị nọ na hel—‘ili ncheta’! N’ezie, ngọzi a bụ ezi ihe mere anyị ga-eji na-enwetakwu ihe ọmụma nke Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst.—Jọn 17:3.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Na King James Version, a sụgharịrị okwu Grik bụ́ Hades ịbụ “hel” na nke ọ bụla n’ebe iri ọ pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Nsụgharị ya na Luk 16:19-31 kpọtụrụ mmekpa ahụ́ uche, ma ihe ndekọ ahụ dum bụ ihe atụ. Lee isi 88 nke Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
^ par. 11 Okwu Hibru bụ́ Sheol pụtara ugboro 65 n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, a sụgharịkwara ya ịbụ “hel,” “ili,” na “olulu” na King James Version.
[Foto dị na peeji nke 5]
Job kpere ekpere ka e chebe ya na hel
[Foto dị na peeji nke 6]
Gehena na-ere ọkụ—ihe atụ nke mbibi ebighị ebi
[Foto dị na peeji nke 7]
‘Ndị nọ n’ili ncheta ga-apụta’