Ghaa Ezi Omume, Ghọrọ Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Chineke
Ghaa Ezi Omume, Ghọrọ Obiọma Sitere n’Ịhụnanya nke Chineke
“A GHAGHỊ imejọ mmadụ, mgbe ọ nọwooro onye ala ọzọ ná mbe: ma onye na-akpọ ndị na-anara mmadụ n’aka ịbụ ndị mbe asị, ọ nọ ná ntụkwasị obi.” (Ilu 11:15) Lee ụzọ doro anya ilu a a kapịrị okwu ọnụ na ya si gbaa ume mmadụ ime ihe na-eburu n’uche na ọ ga-eburu ihe si na ya pụta! Nọọrọ onye ị na-amaghị ná mbé ma chee aka ghọrọ nsogbu. Zere ikwe n’aka—ihe e ji egosi mbịanye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta n’Izrel oge ochie—ma nwere onwe gị pụọ n’iji ụgwọ ego.
N’ụzọ doro anya, ụkpụrụ e ji mee ihe n’ebe a bụ: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) “Ghaaranụ onwe unu mkpụrụ n’ezi omume,” ka Hozia onye amụma kwuru, “werenụ ihe ubi dị ka [obiọma sitere n’ịhụnanya, NW] si dị.” (Hosea 10:12) Ee, ghaa ezi omume site n’ime ihe n’ụzọ nke Chineke, ma ghọrọ obiọma sitere n’ịhụnanya ya. N’iji ụkpụrụ a mee ihe ugboro ugboro, Eze Solomọn nke Izrel jiri nkwuwa okwu gbaa ume ka a na-eme ihe ziri ezi, na-ekwu okwu dị mma, ma na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị. N’ezie, inyocha okwu amamihe ya nke ọma ga-agba anyị ume ịghara onwe anyị mkpụrụ n’ezi omume.—Ilu 11:15-31.
Ghaa “Amara,” Ghọrọ “Nsọpụrụ”
“Nwanyị amara na-ejidesi nsọpụrụ ike,” ka eze ahụ maara ihe na-ekwu, “ndị na-eme ka mmadụ maa jijiji na-ejidesikwa akụ̀ ike.” (Ilu 11:16) Amaokwu a gosiri ọdịiche dị n’etiti nsọpụrụ na-adịgide adịgide nke nwanyị amara pụrụ inweta na akụ̀ na-adịru nwa mgbe nke onye na-eme ka mmadụ maa jijiji na-enweta.
Olee otú mmadụ pụrụ isi nwee amara nke na-eweta nsọpụrụ? “Chebe ezi amamihe na ikike iche echiche,” ka Solomọn na-adụ n’ọdụ, “ha ga-abụkwara . . . olu gị amara.” (Ilu 3:21, 22, NW) Ọbụ abụ ahụ kwukwara banyere ‘ịwụkwasị amara n’egbugbere ọnụ abụọ nke onye eze.’ (Abụ Ọma 45:1, 2) Ee, ezi amamihe, ikike iche echiche, na iji ire eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị na-eme ka mmadụ nwekwuo ùgwù na amara. N’ezie, nke ahụ bụ eziokwu banyere nwanyị nwere uche. Abigail, bụ́ nwunye onye nzuzu bụ́ Nebal, bụ otu ihe atụ. O “nwere ezi uche, maakwa mma n’ahụ́,” Eze Devid jakwara ya mma n’ihi “ezi uche” ya.—1 Samuel 25:3, 33.
Nwanyị na-asọpụrụ Chineke nke nwere ezi amara ga-enweta nsọpụrụ n’ezie. Ndị ọzọ ga-ekwu okwu ọma banyere ya. Ọ bụrụ na ọ lụrụ di, ọ ga-abụ onye kwesịrị nsọpụrụ n’anya di ya. N’ezie, ọ ga-ewetara ezinụlọ ya dum nsọpụrụ. Nsọpụrụ ya abụghịkwa nke na-adịru nwa oge. “Ihe a na-ahọpụta ka ezi aha bụ karịa ọtụtụ Ilu 22:1) Aha ọma ọ na-eme n’ebe Chineke nọ bara uru n’ụzọ na-adịgide adịgide.
akụ̀, amara dịkwa mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.” (Nke ahụ dị iche n’ebe onye na-eme ka mmadụ maa jijiji nọ, bụ́ ‘onye dị obi ọjọọ.’ (Ilu 11:16, New International Version) A na-agụnye onye na-eme ka mmadụ maa jijiji ná ndị ajọ omume nakwa ná ndị iro nke ndị na-efe Jehova. (Job 6:23; 27:13) Onye dị otú ahụ ‘adịghị edo Chineke n’ihu ya.’ (Abụ Ọma 54:3) Site n’imegbu na irigbu ndị ọ na-adịghị nke ha maara, onye dị otú ahụ pụrụ ‘ịkwakọba ọlaọcha dị ka ájá.’ (Job 27:16) Ma, n’otu oge, ọ pụrụ idina ala ma ghara ibili, ụbọchị ọ bụla o meghekwara anya pụrụ ịbụ ụbọchị ọ ga-anwụ. (Job 27:19) Mgbe ahụ, akụ̀ ya na ihe nile o nwetara ga-aghọ ihe efu.—Luk 12:16-21.
Lee ihe dị mkpa Ilu 11:16 na-akụziri anyị! Site n’igosi anyị n’ụzọ doro anya amara na ihe ọjọọ nke onye ọ bụla ga-aghọrọ, eze Izrel na-agba anyị ume ịgha ezi omume.
“Obiọma Sitere n’Ịhụnanya” Na-eweta Ụgwọ Ọrụ
N’ịkụzikwu ihe banyere mmekọrịta mmadụ na ibe ya, Solomọn na-ekwu, sị: “Onye na-emeso mkpụrụ obi ya ezi ihe ka onye ebere bụ: ma onye na-emekpa anụ ahụ́ nke aka ya ahụ́ ka onye na-enweghị obi ebere bụ.” (Ilu 11:17) “Isi ihe dị n’ilu a,” ka otu ọkà mmụta na-ekwu, “bụ na àgwà mmadụ na-akpaso ndị ọzọ, ma ọ bụ nke ọma ma ọ bụ nke ọjọọ, ga-arụpụtara ya ihe ọ na-ebughị n’uche ma ọ bụ ihe ọ na-atụghị anya ya.” Tụlee ihe banyere otu nwa agbọghọ aha ya bụ́ Lisa. * Ọ bụ ezie na o bu ezi ihe n’obi, ọ na-apụtakarị n’azụ oge ma ya na mmadụ yie agba. Ọ bụghị ihe ọhụrụ ya ịpụta mgbe o jiri minit 30 ma ọ bụ karịa gafee oge o mere ndokwa isoro ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ zukọọ maka ọrụ nkwusa. Ihe Lisa na-eme adịghị abara ya uru. Ọ̀ pụrụ ịta ndị ọzọ ụta ma ọ bụrụ na ha akwụsị ịnọ na-atụfu oge bara uru ma ghara isozi ya na-eyi agba?
Onye na-achọkarị izu okè—onye na-esetịpụ ụkpụrụ dị elu gabiga ókè banyere ihe ọ chọrọ ịrụzu—na-emekpakwa onwe ya ahụ́. Site n’ịnọgide na-adọlị iji ruo ihe mgbaru ọsọ ya a na-apụghị iru eru, ọ na-etinye onwe ya n’ọnọdụ nke pụrụ ịkpata ike ọgwụgwụ na ndakpọ olileanya. N’aka nke ọzọ, anyị na-emeso onwe anyị ihe n’ụzọ bara uru mgbe anyị setịpụrụ ihe mgbaru ọsọ ndị a pụrụ iru eru na ndị ezi uche dị na ha. Ikekwe anyị adịghị aghọta ihe ngwa ngwa dị ka ndị ọzọ. Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na ọrịa ma ọ bụ ime agadi emewo ka anyị ghara imeli ihe ụfọdụ. Ka anyị ghara iwe iwe ma ọlị n’ihi otú ọganihu ime mmụọ anyị si aga, kama ka anyị nọgide mgbe nile na-egosipụta ezi uche n’ịnagide erughị eru anyị. Anyị na-enwe obi ụtọ mgbe anyị ‘mere ike anyị nile’ dị ka o kwere anyị.—2 Timoti 2:15; Ndị Filipaị 4:5.
N’ịkọwakwu otú onye ezi omume si abara onwe ya uru, ebe onye nwere obi ọjọọ na-emerụ onwe ya ahụ́, eze ahụ maara ihe na-ekwu, sị: “Onye na-emebi iwu na-arụta ego ọrụ okwu ụgha: ma onye na-agha ezi omume dị ka mkpụrụ na-arụta ụgwọ ọrụ kwesịrị ntụkwasị obi. Onye na-eguzosi ike n’ezi omume ga-eru ná ndụ: ma onye na-agbaso ihe ọjọọ ga-eru n’ọnwụ nke aka ya. Ihe arụ n’anya Jehova ka ndị gbagọrọ agbagọ n’obi bụ: ma ihe na-atọ ya ụtọ ka ndị zuru okè n’ụzọ ha bụ. Site n’aka ruo aka, a gaghị agụ onye ọjọọ n’onye na-emeghị ihe ọjọọ: ma mkpụrụ ndị ezi omume ga-ewepụga onwe ha.”—Ilu 11:18-21.
N’ụzọ dịgasị iche iche, amaokwu ndị a mesiri isi ihe a ike: Ghaa ezi omume ma ghọrọ ụgwọ ọrụ ya. Onye na-emebi iwu pụrụ ịghọ aghụghọ ma ọ bụ gwuo wayo iji nweta ihe n’emefughị ihe ọ bụla. Ebe ụgwọ ọrụ ndị dị otú ahụ bụ ndị nke ụgha, ọ pụrụ inweta mmechuihu. Onye na-eji ịkwụwa aka ọtọ arụ ọrụ na-enweta ụgwọ ọrụ kwesịrị ntụkwasị obi n’ụdị na ọ na-anọ ná ntụkwasị obi. N’ihi inwe ihu ọma Chineke, onye a na-apụghị ịta ụta nwere olileanya nke inweta ndụ. Ma gịnị banyere onye ọjọọ? Ọ bụ ezie na onye na-emebi iwu na-akpa nkata aghụghọ “site n’aka ruo aka,” ọ gaghị agbanahụ ntaramahụhụ. (Ilu 2:21, 22) Lee agbamume dị mma nke a bụụrụ anyị ịdị na-agha ezi omume!
Ezi Ịma Mma Maka Onye Nwere Uche
“Dị ka mgbaaka ọlaedo n’imi ezì, otú a ka nwanyị mara mma nke na-esi n’ezi uche wezụga onwe ya dị,” ka Solomọn gara n’ihu ikwu. (Ilu 11:22) Mgbaaka imi bụ ihe ịchọ mma a ma ama n’oge Bible. Mgbaaka imi ọlaedo nke e tinyere n’akụkụ imi ma ọ bụ n’etiti oghere imi abụọ bụ ọla a na-ahụ ọsọ ọsọ n’ahụ́ nwanyị. Lee ka ihe ịchọ mma dị otú ahụ mara mma na-agaghị esi kwesị ekwesị ịdị n’imi ezì! Ya na onye mara mma ahụ́ ma ghara inwe “ezi uche” yiri. Ihe ịchọ mma ekwesịghị nnọọ onye ahụ, ma ọ̀ bụ nwoke ma ọ bụ nwanyị. Ọ dabaghị adaba—ọ dịghị adọrọ mmasị ma ọlị.
N’eziokwu, inwe nchegbu banyere otú ndị ọzọ si ele ọdịdị ahụ́ anyị anya bụ ihe e bu pụta ụwa. Ma gịnị mere anyị ga-eji na-echegbubiga onwe anyị ókè ma ọ bụ ghara inwe afọ ojuju banyere ihu anyị ma ọ bụ ọdịdị ahụ́ anyị? Anyị apụghị ịchịkwa ọtụtụ akụkụ nke ọdịdị ahụ́ anyị. Ọdịdị elu ahụ́ abụghịkwa ihe kasị mkpa. Ọ́ bụghị eziokwu na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ bụ ndị na-amaghị oké mma? Ịma mma elu ahụ́ abụghị isi ihe na-eweta obi ụtọ. Ihe dị mkpa n’ezie bụ mma ime ahụ́, bụ́ àgwà nsọpụrụ Chineke ndị na-adịgide adịgide. Ya mere, ka anyị nwee ezi uche ma na-azụlite àgwà ndị dị otú ahụ.
“Mkpụrụ Obi nke Na-agọzi Agọzi Ka A Ga-eme Ka Ọ Maa Abụba”
“Ihe ndị ezi omume na-achọsi ike bụ nanị ezi ihe,” ka Eze Solomọn na-ekwu, “ma olileanya nke ndị na-emebi iwu bụ nrubiga ókè nke iwe.” N’igosi otú nke a si bụrụ eziokwu, ọ na-agbakwụnye, sị: “O nwere onye na-aghasa aghasa, ma a nọ na-atụkwasịrị ya ihe karị; o nwekwara onye na-egbochi egbochi karịa nke ziri ezi, ma ọ na-eduba nanị n’ịkọ ụkọ.”—Ilu 11:23, 24.
Ka anyị ji ịdị uchu na-aghasa—na-akụziri ndị ọzọ—ihe ọmụma nke Okwu Chineke, n’ezie anyị na-aghọtakwu “ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” ya. (Ndị Efesọs 3:18) N’aka nke ọzọ, onye na-adịghị eji ihe ọmụma ya eme ihe nọ n’ihe ize ndụ nke ịtụfu ihe o nwere. Ee, “onye na-agha mkpụrụ n’aka ntagide ga-aghọrọ mkpụrụ n’aka ntagide; onye na-aghakwa mkpụrụ n’ụba ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.”—2 Ndị Kọrint 9:6.
“Mkpụrụ obi nke na-agọzi agọzi ka a ga-eme ka ọ maa abụba,” ka eze ahụ gara n’ihu ikwu, “ọzọ, onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.” (Ilu 11:25) Mgbe anyị ji mmesapụ aka jiri oge na ihe onwunwe anyị na-eme ihe iji kwalite ezi ofufe, ihe anyị ga-adị Jehova ezi mma. (Ndị Hibru 13:15, 16) Ọ ‘ga-emeghe windo nile nke eluigwe, wụsara anyị ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.’ (Malakaị 3:10) Legodị ọganihu ime mmụọ nke ndị ohu ya na-enwe taa!
N’inyekwu ihe atụ ọzọ nke ọdịiche dị n’etiti ọchịchọ nke onye ezi omume na nke onye na-emebi iwu, Solomọn na-ekwu, sị: “Onye na-egbochi ọka, ọha mmadụ ga-akọcha ya: ma ngọzi ga-adị n’isi onye na-ere ya.” (Ilu 11:26) Ịzụ ngwá ahịa buru ibu mgbe ọnụ ego ya dị ala ma chekwaa ya ruo mgbe ọ dịrị ụkọ, ọnụ ahịa ya arịakwa elu, pụrụ ime ka e nwee uru. Ọ bụ ezie na ezi ihe ụfọdụ pụrụ isi n’ịghara imefusi ihe na ichekwa ihe apụta, ndị mmadụ n’ozuzu ha na-akpọ onye na-eme nke a n’ihi ọchịchọ ọdịmma onwe ya nanị asị. N’aka nke ọzọ, onye na-aghara irite uru dị ukwuu mgbe ihe dị ụkọ na-enweta ihu ọma nke ndị mmadụ.
N’ịgba anyị ume ịnọgide na-achọ ihe dị mma, ma ọ bụ ihe ziri ezi, eze Izrel ahụ na-ekwu, sị: “Onye na-achọsi ezi ihe ike na-achọ ka ihe ya na-atọ Chineke ụtọ: ma onye na-achọ ihe ọjọọ, ihe ahụ ga-abịakwute ya. Onye na-atụkwasị obi n’akụ̀ ya, onye ahụ ga-ada: ma dị ka akwụkwọ ndụ ka ndị ezi omume ga-epu.”—Ilu 11:27, 28.
Onye Ezi Omume Na-eweta Mkpụrụ Obi
N’igosi otú omume nzuzu si arụpụta ajọ ihe, Solomọn na-ekwu, sị: “Onye na-emekpa ezinụlọ ya ahụ́ ga-eketa ifufe.” (Ilu 11:29a) Ajọ omume Ekan ‘mekpara ya ahụ́,’ e jikwa nkume tụgbuo ma ya ma ndị ezinụlọ ya. (Joshua, isi 7) Taa, onyeisi ezinụlọ Ndị Kraịst na ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya pụrụ itinye aka n’ihe ọjọọ bụ́ nke pụrụ ime ka a chụpụ ha n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Mmadụ na-ewetara ezinụlọ ya mmekpa ahụ site n’ịghara ime ihe kwekọrọ n’iwu Chineke na ịgbachi nkịtị ka mmehie dị oké njọ dịgide n’ezinụlọ ya. A na-achụpụ ya na, ma eleghị anya, ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ya ná mkpakọrịta Ndị Kraịst dị ka ndị mmehie na-enweghị nchegharị. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) Gịnịkwa ka ọ ga-enweta? Nanị ifufe—ihe na-abaghị ezigbo uru ọ bụla.
“Ohu ka onye gbagọrọ agbagọ n’uche ya ga-abụkwara onye obi ya maara ihe,” ka amaokwu ahụ gara n’ihu ikwu. (Ilu 11:29b) Ebe ọ bụ na onye uche ya gbagọrọ agbagọ enweghị ezi amamihe, a gaghị enye ya ọrụ dị ukwuu. Ọzọkwa, ahazilighị ihe omume onwe ya nke ọma pụrụ ime ka o jiri onye ọzọ ụgwọ n’ụzọ ụfọdụ. Onye dị otú ahụ na-amaghị ihe pụrụ ọbụna ịghọrọ “onye obi ya maara ihe” ohu. Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ọ dị oké mkpa ka anyị jiri ezi uche na izuzu na-eme ihe nile anyị na-eme.
“Mkpụrụ onye ezi omume na-amị bụ osisi na-enye ndụ,” ka eze ahụ maara ihe na-emesi anyị obi ike, “onye na-ewetara Chineke mkpụrụ obi mmadụ ka onye maara ihe bụ.” (Ilu 11:30) Olee otú nke a si eme? Site n’okwu ọnụ na omume ya, onye ezi omume na-eme ka ahụ́ dị ndị ọzọ mma n’ụzọ ime mmụọ. A na-agba ha ume ijere Jehova ozi, ha pụkwara imesị nweta ndụ nke Chineke na-eme ka o kwe omume.
‘A Ga-akwụghachi Onye Ajọ Omume Ụgwọ Ọrụ Ọbụna Karị’
Lee ka ilu ndị ahụ a tụrụ n’elu si agbasi anyị ume ike ịgha ezi omume! N’ijikwa ụkpụrụ ahụ bụ́ “mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke a ka ọ ga-aghọrọ” mee ihe n’ụzọ ọzọ, Solomọn na-ekwu, sị: “Lee, a ga-akwụghachi onye ezi omume ụgwọ n’ụwa: à ga-esikwa aṅaa ghara ịkwụghachi onye na-emebi iwu na onye mmehie?”—Ilu 11:31.
Ọ bụ ezie na onye ezi omume na-eme mgbalị ime ihe ziri ezi, ọ na-ehie ụzọ mgbe ụfọdụ. (Eklisiastis 7:20) N’ihi ihie ụzọ ya kwa, a ga-eji ịdọ aka ná ntị ‘kwụghachi ya ụgwọ.’ Otú ọ dị, gịnị banyere onye ajọ omume nke ma ụma họrọ ụzọ ndụ ọjọọ ma ghara ime mgbalị ọ bụla ịlaghachi n’ụzọ ziri ezi? Ọ̀ bụ na ‘a gaghị akwụghachi ya ụgwọ’ dị ukwuu karị—ntaramahụhụ siri ike? “Ọ bụrụkwa na o siiri onye ezi omume ike ịbụ onye a zọpụtara,” ka Pita onyeozi dere, “olee ebe a ga-ahụ onye na-adịghị asọpụrụ Chineke na onye mmehie?” (1 Pita 4:18) N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike mgbe nile ịdị na-aghara onwe anyị mkpụrụ n’ezi omume.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 11 E ji aha nnọchianya mee ihe n’ebe a.
[Foto dị na peeji nke 28]
“Amara” wetaara Abigail “nsọpụrụ”
[Foto ndị dị na peeji nke 30]
‘Onye na-emebi iwu na-arụta ego ọrụ okwu ụgha, onye ezi omume na-arụta ụgwọ ọrụ kwesịrị ntụkwasị obi’
[Foto dị na peeji nke 31]
‘Na-agha mkpụrụ n’ụba, na-aghọrọ mkpụrụ n’ụba’