Ha Nọgidere Na-eje Ije N’eziokwu Ahụ
Ha Nọgidere Na-eje Ije N’eziokwu Ahụ
“Ọ dịghị ihe ga-akpatara m inwe obi ekele nke karịrị ihe ndị a, na m ga na-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.”—3 JỌN 4.
1. Na gịnị ka “eziokwu nke ozi ọma ahụ” lekwasịrị anya?
JEHOVA na-anakwere nanị ndị na-efe ya ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) Ha na-erube isi n’eziokwu ahụ, na-anakwere akụkụ nile nke ozizi Ndị Kraịst bụ́ nke dabeere n’Okwu Chineke. “Eziokwu nke ozi ọma” a na-elekwasị anya n’ebe Jizọs Kraịst nọ nakwa n’igosi na o ruuru Jehova ịbụ ọkaaka site n’Alaeze ahụ. (Ndị Galeshia 2:14) Chineke kwere ka “ịrụ ọrụ nke njehie” na-erutere ndị họọrọ ụgha, ma nzọpụta na-adabere n’inwe okwukwe n’ozi ọma ahụ na ije ije n’eziokwu ahụ.—2 Ndị Tesalonaịka 2:9-12; Ndị Efesọs 1:13, 14.
2. Gịnị ka Jọn onyeozi nwere ekele maka ya karịsịa, oleekwa ụdị mmekọrịta dị n’etiti ya na Gaịọs?
2 Ndị nkwusa Alaeze bụ “ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ n’eziokwu.” Dị ka Jọn onyeozi na enyi ya bụ́ Gaịọs, ha na-anọgidesi ike n’eziokwu ahụ ma na-eje ije na ya. Jọn bu Gaịọs n’uche dee, sị: “Ọ dịghị ihe ga-akpatara m inwe obi ekele nke karịrị ihe ndị a, na m ga na-anụ na ụmụ m nọgidere na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 3-8) Ọ bụrụgodị na ọ bụghị Jọn merela agadi mere ka Gaịọs mata eziokwu ahụ, afọ ndụ onyeozi ahụ, ntozu okè ya dị ka Onye Kraịst, na ịhụnanya nke nna o nwere mere ka o kwesị ekwesị ya iwere onye a doro anya na ọ bụ nwa okorobịa dị ka otu n’ime ụmụ ime mmụọ ya.
Eziokwu ahụ na Ofufe Ndị Kraịst
3. Gịnị bụ nzube na uru nzukọ Ndị Kraịst oge mbụ gara bara?
3 Iji mụta eziokwu ahụ, Ndị Kraịst oge mbụ zukọrọ dị ka ọgbakọ, mgbe mgbe n’ebe obibi ndị mmadụ. (Ndị Rom 16:3-5) N’ihi ya, ha nwetara agbamume ma kpalirịta ibe ha inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ. (Ndị Hibru 10:24, 25) Banyere ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst mgbe nke ahụ gasịrị, Tertullian (ihe dị ka 155-mgbe 220 O.A., gasịrị) dere, sị: “Anyị zukọrọ iji gụọ akwụkwọ Chineke . . . Anyị ji okwu ndị ahụ dị nsọ nyejuo okwukwe anyị afọ, mee ka olileanya anyị dị elu, mee ka obi sikwuo anyị ike.”—Apology, isiakwụkwọ nke 39.
4. Òkè dị aṅaa ka ịbụ abụ kerewooro ná nzukọ Ndị Kraịst?
4 O yiri ka ịbụ abụ o so n’ihe Ndị Kraịst oge mbụ mere ná nzukọ. (Ndị Efesọs 5:19; Ndị Kọlọsi ) Prọfesọ Henry Chadwick na-ede na otu onye nkatọ nke dịrị ndụ na narị afọ nke abụọ bụ́ Celsus hụtara abụ ndị o doro anya na ha dị ụtọ, bụ́ ndị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst bụrụ, dị ka ndị “dị nnọọ ụtọ nke na otú ha si emetụ ya n’ahụ́ wutere ya nke ukwuu n’ezie.” Chadwick na-agbakwụnye, sị: “Clement nke Aleksandria bụ Onye Kraịst mbụ bụ́ onye edemede nke kwuru banyere ụdị abụ Ndị Kraịst kwesịrị iji na-eme ihe. O nyere ntụziaka na o kwesịghị ịbụ ụdị ha na egwú ndị a na-agba n’ụzọ na-akpali mmekọahụ nwere njikọ.” (The Early Church, peeji nke 274-275) Dị nnọọ ka o doro anya na Ndị Kraịst oge mbụ bụrụ abụ mgbe ha zukọrọ ọnụ, n’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova na-abụkarị abụ ndị dabeere na Bible bụ́ ndị na-agụnye ukwe ndị bụ́ ịgba e ji ebuli Chineke na Alaeze ahụ elu. 3:16
5. (a) Olee otú e si nye nduzi ime mmụọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ? (b) Olee otú ezi Ndị Kraịst siworo tinye okwu Jizọs nke e dekọrọ na Matiu 23:8, 9 n’ọrụ?
5 N’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ, ndị nlekọta kụziri eziokwu ahụ, ndị ohu na-eje ozi nyekwaara ndị kwere ekwe ibe ha aka n’ụzọ dịgasị iche iche. (Ndị Filipaị 1:1) Òtù na-achị isi nke dabeere n’Okwu Chineke na mmụọ nsọ nyere nduzi ime mmụọ. (Ọrụ 15:6, 23-31) E jighị utu aha okpukpe mee ihe n’ihi na Jizọs enyewo ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu nile bụ ụmụnna. Ọzọkwa, unu akpọla onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, bụ́ Onye nke eluigwe.” (Matiu 23:8, 9) N’akụkụ a nakwa n’ọtụtụ akụkụ ndị ọzọ, Ndị Kraịst oge mbụ na Ndịàmà Jehova yiri ibe ha.
Ndị A Kpagburu Maka Ikwusa Eziokwu Ahụ
6, 7. Ọ bụ ezie na ha na-akpọsa ozi udo, olee otú e siworo mesoo ezi Ndị Kraịst ihe?
6 Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst oge mbụ kwusara ozi Alaeze ahụ bụ́ nke udo, a kpagburu ha, ọbụna dị ka a kpagburu Jizọs. (Jọn 15:20; 17:14) Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ John L. von Mosheim kpọrọ Ndị Kraịst oge mbụ “ìgwè nke ndị na-adịtụghị ize ndụ, bụ́ ndị na-adịtụbeghị mgbe ha bu ọchịchọ ma ọ bụ echiche dị njọ megide ọdịmma nke ọchịchị n’obi.” Dr. Mosheim kwuru na ihe mere “ndị Rom ji wesa Ndị Kraịst iwe bụ n’ihi ịdị mfe nke ofufe ha, bụ́ nke na-eyighị ememe nsọ nke ndị ọ bụla ọzọ.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Ha adịghị achụ àjà, ha enweghị ụlọ nsọ, ihe oyiyi, agbara, ma ọ bụ iwu si n’aka ndị nchụàjà; nke a zukwara iji mee ka ìgwè ndị na-amaghị nke a na-akọ, bụ́ ndị chere na a pụghị inwe okpukpe ma ihe ndị a adịghị, kọchaa ha. N’ihi ya, e lere ha anya dị ka ndị na-ekweghị na Chineke dị; dịkwa ka iwu ndị Rom si dị, a na-ekwu na ndị a mara ikpe dị ka ndị na-ekweghị na Chineke dị bụ ndị na-enye ọha mmadụ nsogbu.”
7 Ndị nchụàjà, ndị ọrụ nkà, na ndị ọzọ bụ́ ndị ji ikpere arụsị eri ihe kpaliri ọha mmadụ imegide Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-ekereghị òkè n’ikpere arụsị. (Ọrụ 19:23-40; 1 Ndị Kọrint 10:14) Tertullian dere, sị: “Ha weere Ndị Kraịst dị ka ndị na-akpata ọdachi ọ bụla na-adakwasị ọchịchị, ndị na-akpata ihe ndabara ọjọọ ọ bụla na-adabara ndị mmadụ. Ọ bụrụ na osimiri Tiber etoruo ná mgbidi, ọ bụrụ na osimiri Naịl asọbaghị n’ubi, ọ bụrụ na mmiri ezoghị ma ọ bụ ala ọma jijiji emee, ọ bụrụ na e nwee ụnwụ nri, ọ bụrụ na e nwee ihe otiti, mkpu a na-eti ozugbo na-abụ: ‘Tụbara ọdụm Ndị Kraịst!’” N’agbanyeghị ihe si na ya pụta, ezi Ndị Kraịst ‘chere onwe ha nche pụọ n’arụsị.’—1 Jọn 5:21.
Eziokwu ahụ na Ememe Okpukpe
8. N’ihi gịnị ka ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ na-ejighị eme ememe Krismas?
8 Ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ na-ezere ememe ndị na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ n’ihi na ‘ìhè na ọchịchịrị enweghị òkè.’ (2 Ndị Kọrint 6:14-18) Dị ka ihe atụ, ha adịghị eme ememe Krismas, bụ́ nke a na-eme na December 25. “Ọ dịghị onye maara kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Kraịst,” ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekweta. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana (Mbipụta nke 1956) na-asị: “Saturnalia, bụ́ ememe ndị Rom nke a na-eme n’etiti ọnwa December, setịpụrụ ụkpụrụ maka ọtụtụ n’ime omenala mkpori ndụ ndị a na-eme na Krismas.” Akwụkwọ bụ́ Cyclopædia nke M’Clintock na Strong dere na-ekwu, sị: “Ememe Krismas esighị n’aka Chineke, o bidoghịkwa n’A[gba] Ọ[hụrụ].” Akwụkwọ bụ́ Daily Life in the Time of Jesus na-ekwukwa, sị: “Ìgwè atụrụ . . . na-anọ n’ime ụlọ ruo mgbe oge oyi gafere; sitekwa na nke a nanị, a pụrụ ịhụ na oge ahụ e ji eme Krismas kemgbe ụwa, bụ́ oge oyi, yiri ka o zighị ezi, ebe ọ bụ na Oziọma ndị ahụ na-ekwu na ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’èzí.”—Luk 2:8-11.
9. N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova n’oge gara aga na n’oge a jiworo zere ememe Ista?
9 E kweere na Ista bụ ememe e ji echeta mbilite n’ọnwụ Kraịst, ma akwụkwọ ndị a pụrụ ịdabere na ha na-ekwu na ọ malitere n’ofufe ụgha. Akwụkwọ bụ́ The Westminster Dictionary of the Bible na-ekwu na Ista bụ “na mbụ ememe a na-eme n’oge opupu ihe ubi nke e ji echeta chi nwanyị ìhè na nke oge opupu ihe ubi nke a maara n’asụsụ ndị Germany bi n’England dị ka Eastre,” ma ọ bụ Eostre. Otú o sina dị, Encyclopædia Britannica (Mbipụta nke 11) na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ihe ọ bụla na-egosi na e mere ememe Ista n’Agba Ọhụrụ.” Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememe Ista, ndị Jehova adịghịkwa eme ya taa.
10. Olee ememe Jizọs guzobere, oleekwa ndị nọgideworo na-eme ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị?
10 Jizọs enyeghị ụmụazụ ya iwu ime ma ememe ọmụmụ ya ma nke mbilite n’ọnwụ ya, kama o guzobere Ememe Ncheta ọnwụ ịchụ àjà ya. (Ndị Rom 5:8) N’ezie, nke a bụ nanị ememe o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha na-eme. (Luk 22:19, 20) N’ịbụkwa nke a na-akpọ Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Ndịàmà Jehova ka na-eme ememe a a na-eme kwa afọ.—1 Ndị Kọrint 11:20-26.
E Kwusaa Eziokwu ahụ n’Ụwa Nile
11, 12. Olee otú ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ siworo na-akwado ọrụ nkwusa ha mgbe nile?
11 Ndị maara eziokwu ahụ na-ewere itinye oge, ume, na ihe onwunwe ha n’ọrụ ikwusa ozi ọma ahụ dị ka ihe ùgwù. (Mak 13:10) E ji onyinye afọ ofufo kwadoo ọrụ nkwusa nke Ndị Kraịst oge mbụ. (2 Ndị Kọrint 8:12; 9:7) Tertullian dere, sị: “Ọ bụrụgodị na e nwere ụdị igbe ụfọdụ, ego dị na ya abụghị ego a kwụrụ iji banye, dị ka a ga-asị na okpukpe bụ azụmahịa. Nwoke ọ bụla na-eweta obere mkpụrụ ego kwa ọnwa—ma ọ bụ mgbe ọ bụla ọ chọrọ, ọ bụkwa ma ọ chọọ, nakwa ma ọ bụrụ na ọ pụrụ ime ya; n’ihi na ọ dịghị onye a na-amanye amanye; ọ bụ onyinye afọ ofufo.”—Apology, isiakwụkwọ nke 39.
12 E jikwa onyinye afọ ofufo akwado ọrụ nkwusa Alaeze zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova. E wezụga Ndịàmà, ndị nwere mmasị bụ́ ndị nwere ekele na-ewere iji onyinye ha na-akwado ọrụ a dị ka ihe ùgwù. N’ebe a kwa, Ndị Kraịst oge mbụ na Ndịàmà Jehova yiri.
Eziokwu ahụ na Àgwà Onwe Onye
13. N’ihe banyere omume ha, olee ndụmọdụ Pita nke Ndịàmà Jehova na-erube isi na ya?
13 Dị ka ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ, Ndị Kraịst oge mbụ rubere isi na ndụmọdụ Pita onyeozi bụ́: “Nọgidenụ na-eme omume dị mma n’etiti mba nile, ka, ha n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide ùnu na ha dị ka unu bụ ndị ajọ omume, wee nye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ya n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.” (1 Pita 2:12) Ndịàmà Jehova na-eburu okwu ndị ahụ n’uche.
14. Olee otú Ndị Kraịst si ele ntụrụndụ rụrụ arụ anya?
14 Ọbụna mgbe ndapụ n’ezi ofufe batara, ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst zeere omume rụrụ arụ. W. D. Killen, bụ́ prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme nke chọọchị, dere, sị: “Na narị afọ nke abụọ na nke atọ, ụlọ egwuregwu dị n’obodo ukwu ọ bụla bụ ebe ndị mmadụ na-agakarị; n’agbanyeghịkwa na ndị na-eme egwuregwu ndị ahụ bụ n’ozuzu ha ndị omume ha rụrụ nnọọ arụ, egwuregwu ha na-eme nọgidere na-emejụ ọchịchọ ọjọọ nke ndị biri ndụ n’oge ahụ. . . . Ezi Ndị Kraịst nile eleghị ọgbọ egwuregwu ndị ahụ anya ọma. . . . Ihe ndị rụrụ arụ a na-eme na ya na-awụ ha akpata oyi; mmasị ọ nọgidekwara na-enwe n’ebe chi na chi nwanyị dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ nọ wutekwara ha n’ihi nkwenkwe okpukpe ha.” (The Ancient Church, peeji nke 318-319) Ụmụazụ Jizọs taa na-ezerekwa ụdị ntụrụndụ ndị na-asọ oyi ma rụọ arụọ n’ụzọ omume.—Ndị Efesọs 5:3-5.
Eziokwu ahụ na “Ikike Ndị Ka Elu”
15, 16. Olee ndị bụ́ “ikike ndị ka elu,” oleekwa otú ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ siworo na-ele ha anya?
15 N’agbanyeghị àgwà ọma nke Ndị Kraịst oge mbụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị eze ukwu nke Rom ghọtahiere ha. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ E. G. Hardy na-ekwu na ndị eze ukwu lere ha anya dị ka “ndị na-anụ ọkụ n’obi na-abachaghị uru.” Akwụkwọ ozi Gọvanọ Pliny nke Nta si Bitinia na Eze Ukwu Trajan derịtara na-egosi na ndị na-achị achị n’ozuzu ha amaghị otú Iso Ụzọ Kraịst dị n’ezie. Olee otú Ndị Kraịst si ele ọchịchị anya?
16 Dị ka ụmụazụ Jizọs n’oge mbụ, Ndịàmà Jehova na-edo onwe ha n’okpuru “ikike ndị ka elu” n’ụzọ a kpaara ókè. (Ndị Rom 13:1-7) Ọ bụrụ na ihe mmadụ kwuru ka e mee emegide uche Chineke, nguzo ha na-abụ: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ 5:29) Akwụkwọ bụ́ After Jesus—The Triumph of Christianity na-ekwu, sị: “Ọ bụ ezie na Ndị Kraịst nwere ike ha ekereghị òkè n’ofufe eze ukwu, ha abụghị ndị na-akpali ọgba aghara, okpukpe ha kwa, ọ bụ ezie na ọ dị iche ma bụrụ nke jọgburu onwe ya n’anya ndị na-ekpere arụsị, abụghịrị alaeze ukwu ihe iyi egwu.”
17. (a) Olee ọchịchị Ndị Kraịst oge mbụ kwadoro? (b) Olee otú ezi ụmụazụ Kraịst siworo tinye okwu ndị dị n’Aịsaịa 2:4 n’ọrụ ná ndụ ha?
17 Ndị Kraịst oge mbụ bụ ndị na-akwado Alaeze Chineke, ọbụna dị ka ndị nna ochie bụ́ Ebreham, Aịzik, na Jekọb gosipụtara okwukwe ‘n’obodo ahụ Chineke mere’ bụ́ nke e kwere ná nkwa. (Ndị Hibru 11:8-10) Dị ka Onye Nwe ha, ndị na-eso ụzọ Jizọs “abụghị akụkụ nke ụwa.” (Jọn 17:14-16) A bịakwa n’agha na esemokwu nke ụmụ mmadụ, ha agbasowo udo site ‘n’ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè.’ (Aịsaịa 2:4) N’ịrịba otu myirịta na-akpali mmasị ama, onye na-akụzi akụkọ ihe mere na chọọchị bụ́ Geoffrey F. Nuttall kwuru, sị: “Àgwà Ndị Kraịst oge mbụ nwere n’ebe agha dị yiri nnọọ nke ndị ahụ kpọrọ onwe ha Ndịàmà Jehova, nke a bụkwa eziokwu na-esiri anyị ike ikweta.”
18. Gịnị mere na ọ dịghị ọchịchị nwere ihe mere ọ ga-eji na-atụ Ndịàmà Jehova ụjọ?
18 Dị ka ndị nọpụrụ iche bụ́ ndị doro onwe ha n’okpuru “ikike ndị ka elu,” Ndị Kraịst oge mbụ abụghị ihe iyi egwu nye ọchịchị ọ bụla, Ndịàmà Jehova abụghịkwa. “Ọ na-ewe echiche ịkpọasị na nke ịtụ egwu na-enweghị isi iji kwere na Ndịàmà Jehova na-akpata ụdị iyi egwu ọ bụla nye ọchịchị ọ bụla,” ka otu onye Ebe Ugwu America nke na-ede uche akwụkwọ akụkọ dere. “Ha bụ nnọọ ndị na-adịghị akwatu ọchịchị na ndị na-ahụ udo n’anya dị ka a pụrụ ịtụ anya ya n’aka òtù okpukpe.” Ndị ọchịchị ma nke a na-akọ maara na ọ dịghị ihe ọ bụla ha ga-atụrụ egwu n’ebe Ndịàmà Jehova nọ.
19. Banyere ụtụ isi, gịnị ka a pụrụ ikwu banyere Ndị Kraịst oge mbụ na Ndịàmà Jehova?
19 Otu ụzọ Ndị Kraịst oge mbụ si kwanyere “ikike ndị ka elu” ùgwù bụ site n’ịtụ ụtụ isi ha. N’idegara Eze Ukwu Rom bụ́ Antoninus Pius (138-161 O.A.) akwụkwọ, Justin Martyr kwuru na Ndị Kraịst ‘ji ọchịchọ obi ha atụ ụtụ isi ha karịa ndị ọzọ nile.’ (First Apology, isiakwụkwọ nke 17) Tertullian gwakwara ndị ọchịchị Rom na ndị na-anakọtara ha ụtụ isi ji “Ndị Kraịst Mak 12:17) Ndị Jehova taa na-agbaso ndụmọdụ a, a jawokwa ha mma maka ime ihe n’eziokwu ha, dị ka n’ịtụ ụtụ isi.—Ndị Hibru 13:18.
ụgwọ ekele” maka otú ha si nnọọ atụzu ụtụ isi ha. (Apology, isiakwụkwọ nke 42) Ndị Kraịst ritere uru site na Pax Romana, Udo nke Rom, ya na iwu ya nile, ezigbo ụzọ, na njem ụgbọ mmiri ya na-adịkarịghị ize ndụ. N’ịghọta ụgwọ ha ji ọha mmadụ, ha na-erube isi n’okwu Jizọs bụ́: “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” (Eziokwu Ahụ—Ihe Na-eme Ka A Dị n’Otu
20, 21. A bịa n’ihe banyere òtù ụmụnna dị n’udo, gịnị bụworo eziokwu banyere ma Ndị Kraịst oge mbụ ma ndị ohu Jehova n’oge a?
20 Ebe ọ bụ na ha jere ije n’eziokwu ahụ, e jikọrọ Ndị Kraịst oge mbụ ọnụ n’òtù ụmụnna dị n’udo, ọbụna dị ka e jikọrọ Ndịàmà Jehova taa. (Ọrụ 10:34, 35) Otu akwụkwọ ozi nke e bipụtara n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Moscow Times kwuru, sị: “A maara [Ndịàmà Jehova] nke ọma dị ka ndị ezigbo mmadụ, ndị nwere obiọma, na ndị dị umeala n’obi bụ́ ndị ọ dị mfe isoro mekọọ ihe, ha adịghị arụgide ndị ọzọ ma ọlị, ha na-achọkwa udo mgbe nile ná mmekọrịta ha na ndị ọzọ . . . E nweghị ndị na-eri ngo, ndị aṅụrụma ma ọ bụ ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ n’etiti ha, ihe kpatara ya dokwara anya: Ha na-agbalị nnọọ ịbụ ndị nkweta ha ndị dabeere na Bible na-eduzi n’ihe ọ bụla ha na-eme ma ọ bụ na-ekwu. Ọ bụrụ na mmadụ nile nọ n’ụwa na-agbalịtụ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ na Bible dị ka Ndịàmà Jehova na-eme, ụwa anyị a nwere obi ọjọọ gaara nnọọ adị iche.”
21 Akwụkwọ bụ́ Encyclopedia of Early Christianity na-ekwu, sị: “Chọọchị oge mbụ hụtara onwe ya dị ka otu agbụrụ ọhụrụ nke mmadụ bụ́ nke ndị bụbu ndị iro, ndị Juu na ndị Jentaịl, pụrụ ibikọ ọnụ n’udo na ya.” Ndịàmà Jehova bụkwa òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ hụrụ udo n’anya—n’ezie òtù ụwa ọhụrụ. (Ndị Efesọs 2:11-18; 1 Pita 5:9; 2 Pita 3:13) Mgbe onyeisi ndị nche nke ogige Pretoria Show Grounds dị na South Africa hụrụ otú Ndịàmà si n’agbụrụ nile bịa mgbakọ si zukọọ n’ebe ahụ n’udo, o kwuru, sị: “Mmadụ nile kpara ma na-akpa àgwà ọma, ndị mmadụ na-agwa ibe ha okwu n’ụzọ dị mma, àgwà e gosipụtara n’ụbọchị ole na ole gara aga—ha nile na-agba akaebe nye ụdị ndị so n’òtù unu, nakwa na unu nile na-ebikọ ọnụ dị ka otu ezinụlọ nwere obi ụtọ.”
Ndị A Gọziri Maka Ịkụzi Eziokwu Ahụ
22. Gịnị nọworo na-eme n’ihi na Ndị Kraịst anọwo na-eme ka eziokwu ahụ pụta ìhè?
22 Site n’omume ha na ọrụ nkwusa ha, Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ ‘mere ka eziokwu ahụ pụta ìhè.’ (2 Ndị Kọrint 4:2) Ọ̀ bụ na i kweghị na Ndịàmà Jehova na-eme otu ihe ahụ ma na-akụziri mba nile eziokwu ahụ? Ndị mmadụ n’ụwa nile na-anakwere ezi ofufe ma na-enuga ‘n’ugwu nke ụlọ Jehova’ n’ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu. (Aịsaịa 2:2, 3) Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ puku mmadụ baptizim ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Chineke, na-eduga n’iguzobe ọtụtụ ọgbakọ ọhụrụ.
23. Olee otú i si ele ndị na-akụziri mba nile eziokwu ahụ anya?
23 Ọ bụ ezie na nzụlite ha dịgasị iche iche, ndị Jehova dị n’otu n’ezi ofufe. Ịhụnanya ha na-egosipụta na-eme ka a mata ha dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Jọn 13:35) Ị̀ pụrụ ịhụ na ‘Chineke nọ n’etiti ha n’ezie’? (1 Ndị Kọrint 14:25) Ì sonyeworo ndị ahụ na-akụziri mba nile eziokwu ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, na-enwe ekele na-adịgide adịgide maka eziokwu ahụ ma nweta ihe ùgwù nke ije ije na ya ruo mgbe ebighị ebi.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• A bịa n’ụzọ e si efe ofufe, olee otú Ndị Kraịst oge mbụ na Ndịàmà Jehova si yie?
• Olee ememe okpukpe ọ bụ nanị ya ka ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ na-eme?
• Olee ndị bụ́ “ikike ndị ka elu,” oleekwa otú Ndị Kraịst si ele ha anya?
• Olee otú eziokwu ahụ si bụrụ ihe na-eme ka a dị n’otu?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 21]
Ọ dịla anya nzukọ Ndị Kraịst bụwara ngọzi nye ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ
[Foto ndị dị na peeji nke 23]
Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu ime Ememe Ncheta ọnwụ ịchụ àjà ya
[Foto dị na peeji nke 24]
Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ, Ndịàmà Jehova na-akwanyere “ikike ndị ka elu” ùgwù