Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Hel—Ọ̀ Dị Ọkụ n’Ezie?

Hel—Ọ̀ Dị Ọkụ n’Ezie?

Hel—Ọ̀ Dị Ọkụ n’Ezie?

GỊNỊ ka okwu ahụ bụ́ “hel” na-eme ka i chee banyere ya? Ị̀ na-ewere hel dị ka ebe nkịtị nke ọkụ na brimstone na-ere, ebe mmekpa ahụ́ na nhụsianya na-enweghị ọgwụgwụ? Ka hel ọ̀ bụ ihe atụ e ji na-akọwa otu ọnọdụ?

Ruo ọtụtụ narị afọ, ndị ndú okpukpe nke Krisendọm echewo banyere hel nke ọkụ na-enwu na ya, nke bụ́ ebe oké mmekpa ahụ́, dị ka ebe ndị mmehie na-aghaghị ịga. Ọtụtụ okpukpe ndị ọzọ nwekwara echiche a. “Ọ pụrụ ịbụ na Iso Ụzọ Kraịst emewo ka hel bụrụ okwu a maara nke ọma,” ka magazin bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu, “ma ọ bụghị nanị ha nwere nkwenkwe ahụ. Ihe iyi egwu nke inweta ụgwọ ọrụ na-egbu mgbu mgbe a nwụsịrị nwere ihe ndị yiri ha n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’okpukpe nile bụ́ isi nke ụwa nakwa n’ụfọdụ ntakịrị okpukpe.” Ndị Hindu, ndị Buddha, ndị Alakụba, ndị Jain, na ndị Tao kwere n’ụdị ụfọdụ nke hel.

Otú ọ dị, a na-enwe echiche dị iche banyere hel n’oge a. “Ọ bụ ezie na ọ ka dị ndị na-eche na ọ bụ ebe ọkụ na-enwu dị ka a na-eche kemgbe ụwa,” ka magazin ahụ a kpọtụrụ uche n’elu na-ekwu, “a malitewo n’oge a inwe echiche bụ́ na mbibi ebighị ebi bụ ijichi mmadụ n’ụlọ mkpọrọ ọnọdụ ya na-adịtụghị mma nke nanị otu onye na-anọ, na-enye echiche na hel nwedịrịrịị ike ghara ịdị oké ọkụ.”

Akwụkwọ ndị Jesuit bụ́ La Civiltà Cattolica kwuru, sị: “Ọ na-eduhie eduhie . . . iche na Chineke, site n’aka ndị mmụọ ọjọọ, na-emekpa ndị a mara ikpe ahụ́ n’ụzọ dị egwu dị ka nke e ji ọkụ na-eme.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Hel abụghị ebe kama ọ bụ ọnọdụ, ọnọdụ nke ịbụ onye na-enwe ihe mgbu n’ihi ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ.” Popu John Paul nke Abụọ kwuru na 1999, sị: “Kama ịbụ ebe, hel na-egosipụta ọnọdụ nke ndị ji aka ha kewapụ onwe ha kpam kpam n’ebe Chineke nọ, bụ́ isi iyi nke ndụ na ọṅụ.” Banyere echiche bụ́ na hel bụ ebe na-ere ọkụ, o kwuru, sị: “Ha na-egosi oké nkụda mmụọ na ndụ na-enwetụghị nzube nke mmadụ na-ebi mgbe o kewapụrụ onwe ya n’ebe Chineke nọ.” Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Martin Marty kwuru na a sị na popu ji okwu ndị bụ́ “ọkụ na ekwensu yi uwe na-acha ọbara ọbara nke ji ogologo fọk” kọwaa hel, “ndị mmadụ agaghị ekwenyere ya.”

Mgbanwe ndị yiri ya nọ na-ewere ọnọdụ n’okpukpe ndị ọzọ. Akụkọ si n’aka òtù na-ahụ maka nkwenkwe nke Chọọchị England kwuru, sị: “Hel abụghị mmekpa ahụ́ ebighị ebi, kama ọ bụ ịhọrọ ụdị ndụ ikpeazụ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nke na-emegide nnọọ Chineke kpam kpam ruo n’ókè nke na njedebe ya bụ mkpochapụ kpam kpam.”

Katkizim nke United States Episcopal Church kọwara hel dị ka “ọnwụ ebighị ebi n’ihi ọjụjụ anyị jụrụ Chineke.” Ọnụ ọgụgụ na-amụbawanye amụbawanye nke ndị mmadụ, ka akwụkwọ bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu, na-akwado echiche bụ́ na “ọgwụgwụ nke ndị ajọ omume bụ mbibi, ọ bụghị ịta ahụhụ ebighị ebi. . . . [Ha] na-ekwu na a ga-eji ‘ọkụ na-ere ere’ nke hel mee ka ndị mesịrị jụ Chineke gharazie ịdị adị ọzọ.”

Ọ bụ ezie na ihe na-ewu n’oge a bụ ịjụ echiche nke ọkụ na brimstone, ọtụtụ ndị nọgidere na-ekwenye na nkwenkwe bụ́ na hel bụ ebe nkịtị nke mmekpa ahụ́. “Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere hel n’ụzọ doro anya dị ka ebe nkịtị nke mmekpa ahụ́ n’ime ọkụ,” ka Albert Mohler nke Southern Baptist Theological Seminary dị na Louisville, Kentucky, U.S.A., na-ekwu. Akụkọ bụ́ The Nature of Hell, nke Evangelical Alliance Commission dere na-ekwukwa, sị: “Hel bụ mmadụ ịnụ ụfụ ịbụ onye a jụrụ ajụ na onye a na-emekpa ahụ́.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “A na-ata ahụhụ ma ọ bụ na-ahụsi anya na hel na-adabere n’otú mmehie e mere n’ụwa dịruru ná njọ.”

Ọzọ, hel ọ̀ bụ ebe mmekpa ahụ́ ebighị ebi ka ọ bụ mkpochapụ ebighị ebi? Ka ọ̀ bụ nanị ọnọdụ nke ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ? Gịnị n’ezie bụ hel?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 4]

Akụkọ Dị Mkpirikpi Banyere Ọkụ Hel

OLEE mgbe ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst malitere ikwere na hel dị ọkụ? Ọ bụ ogologo oge mgbe oge Jizọs Kraịst na ndịozi ya gasịrị. “Akwụkwọ bụ́ Apocalypse of Peter (narị afọ nke abụọ O.A.) bụ akwụkwọ mbụ [nke apọkrịfa] nke Ndị Kraịst bụ́ nke kọwara banyere ntaramahụhụ na mmekpa ahụ́ ndị mmehie na-enweta na hel,” ka Encyclopædia Universalis nke France na-ekwu.

Otú ọ dị, Ndị Nna Chọọchị mbụ, ekwekọrịtaghị n’ihe banyere hel. Justin Martyr, Clement nke Aleksandria, Tertullian, na Cyprian kwere na hel bụ ebe na-ere ọkụ. Origen na ọkà mmụta okpukpe bụ́ Gregory nke Nyssa weere hel dị ka ebe mmadụ na-abụ onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ—ntaramahụhụ ime mmụọ. N’aka nke ọzọ, Augustine nke Hippo kweere na ịta ahụhụ na hel bụ ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́—echiche nke ọtụtụ ndị nakweere. “Ka ọ na-erule na narị afọ nke ise, nkwenkwe siri ike bụ́ na ndị mmehie agaghị enwe ohere nke abụọ mgbe ha nwụsịrị nakwa na ọkụ ga na-ere ha agaghị anyụ anyụ zuru ebe nile,” ka Prọfesọ J.N.D. Kelly dere.

Na narị afọ nke 16, ndị Protestant na-eme mgbanwe dị ka Martin Luther na John Calvin ghọtara mmekpa ahụ́ nke ọkụ hel dị ka mmadụ ịnọgide n’ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ ruo mgbe ebighị ebi. Otú ọ dị, a maliteghachiri inwe echiche nke bụ́ na hel bụ ebe mmekpa ahụ́ na narị afọ abụọ sochirinụ. Ụkọchukwu Protestant bụ́ Jonathan Edwards, na-eji ihe osise nke na-egosipụta hel emenye ndị America chịrị mba ha na narị afọ nke 18 ụjọ.

Otú ọ dị, ngwa ngwa nke ahụ gasịrị, ọkụ nke hel malitere ịpụ n’anya. “Ọ fọrọ nke nta ka narị afọ nke 20 bụrụ mgbe a kwụsịchara ikwere na hel,” ka U.S.News & World Report na-ekwu.

[Foto]

Justin Martyr kweere na hel bụ ebe na-ere ọkụ

Augustine nke Hippo kụziri na ịta ahụhụ na hel bụ ma n’ụzọ ime mmụọ ma n’ụzọ anụ ahụ́