Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu

Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu

Ndị Kraịst Na-efe Ofufe n’Ime Mmụọ na n’Eziokwu

“Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.”—JỌN 4:24.

1. Olee ụdị ofufe na-atọ Chineke ụtọ?

ỌKPARA Jehova mụrụ nanị ya, bụ́ Jizọs Kraịst, gosipụtara n’ụzọ doro anya, ofufe nke na-atọ Nna ya nke eluigwe ụtọ. Mgbe ọ na-agbara otu nwanyị Sameria àmà na-enye obi ụtọ n’otu olulu mmiri dị nso n’obodo Saịka, Jizọs sịrị: “Unu na-efe ihe unu na-amaghị; anyị na-efe ihe anyị maara, n’ihi na nzọpụta bidoro n’ebe ndị Juu nọ. Otú o sina dị, oge awa na-abịa, ọ bụkwa ugbu a, mgbe ndị na-efe ezi ofufe ga-efe Nna m n’ime mmụọ na n’eziokwu, n’ihi na, n’ezie, Nna m na-achọ ka ndị dị otú ahụ fee ya ofufe. Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:22-24) Olee otú anyị ga-esi ghọta okwu ndị ahụ?

2. Na gịnị ka ndị Sameria mere ka ofufe ha hiwe isi?

2 Ndị Sameria nwere echiche ndị na-ezighị ezi banyere okpukpe. Ọ bụ nanị akwụkwọ ise mbụ nke Akwụkwọ Nsọ ka ha kweere na e ji ike mmụọ nsọ dee—ọ bụkwa nanị nsụgharị nke ha, nke a na-akpọ Pentateuch nke Sameria, ka ha kweere otú ahụ. Ebe ndị Sameria na-amaghị Chineke n’ezie, e nyefere ndị Juu ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ. (Ndị Rom 3:1, 2) O kwere ndị Juu kwesịrị ntụkwasị obi na ndị ọzọ omume inweta ihu ọma Jehova. Ma gịnị ka nke a ga-achọ n’aka ha?

3. Gịnị ka a chọrọ iji na-efe Chineke “n’ime mmụọ na n’eziokwu”?

3 Iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, gịnị ka ndị Juu, ndị Sameria, na ndị ọzọ biri ndụ n’oge ochie na-aghaghị ime? Ha aghaghị ife ya ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” Otú ahụ ka anyị na-aghaghịkwa ime. Ọ bụ ezie na ozi a na-ejere Chineke aghaghị ịbụ nke e ji ikpo ọkụ, ma ọ bụ ịnụ ọkụ n’obi na-eje, nakwa nke obi jupụtara n’ịhụnanya na okwukwe kpaliri, ife Chineke n’ime mmụọ na-achọ karịsịa na mmụọ nsọ ya ga-anọnyere anyị, anyị ekwekwa ka ọ na-eduzi anyị. Site n’ịmụ na itinye Okwu Chineke n’ọrụ, a ghaghị ime ka mmụọ anyị, ma ọ bụ ọnọdụ uche anyị, kwekọọ na ya. (1 Ndị Kọrint 2:8-12) Ka ofufe anyị wee bụrụ nke Jehova na-anakwere, anyị aghaghịkwa ife ya n’eziokwu. Ọ ghaghị ikwekọ n’ihe Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekpughe banyere ya na nzube ya.

A Pụrụ Ịchọta Eziokwu

4. Olee otú ụfọdụ ndị si ele eziokwu anya?

4 Ụfọdụ ndị na-amụ nkà ihe ọmụma azụlitewo echiche bụ́ na eziokwu zuru ezu adịghị n’ebe aka ihe a kpọrọ mmadụ ga-eru. N’ezie, onye edemede bụ́ onye Sweden bụ́ Alf Ahlberg dere, sị: “Ọtụtụ ajụjụ nkà ihe ọmụma dị n’ụdị nke na ọ gaghị ekwe omume ịza ha n’ụzọ zuru ezu.” Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-asị na e nwere nanị eziokwu na-ezughị ezu, ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ezie? Jizọs Kraịst echeghị otú ahụ.

5. N’ihi gịnị ka Jizọs ji bịa n’ụwa?

5 Ka anyị were ya na anyị nọ na-ekiri ihe omume na-esonụ: Ọ bụ ná mmalite afọ 33 O.A., Jizọs na-eguzokwa n’ihu Onye Ọchịchị Rom bụ́ Pọntiọs Paịlet. Jizọs agwa Paịlet, sị: “N’ihi nke a ka m jiworo bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu [ahụ] àmà.” Paịlet ajụọ, sị: “Gịnị bụ eziokwu?” Ma o chereghị ka ọ nụrụ ihe ọzọ Jizọs ga-ekwu.—Jọn 18:36-38.

6. (a) Olee otú e siworo kọwaa “eziokwu”? (b) Ọrụ dị aṅaa ka Jizọs nyere ụmụazụ ya?

6 A kọwawo “eziokwu” dị ka “ìgwè nke ihe ndị bụ́ ezie, ihe ndị weere ọnọdụ, na ihe ndị mere eme.” (Webster’s Ninth New Collegiate Dictionary) Otú ọ dị, Jizọs ọ̀ gbaara eziokwu n’ozuzu ya àmà? Ee e. O bu otu eziokwu kpọmkwem n’uche. O nyere ụmụazụ ya ọrụ ikwusa eziokwu dị otú ahụ, n’ihi na ọ gwara ha, sị: “Mee ndị nke mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, na-eme ha baptizim n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke mmụọ nsọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile m nyeworo unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20) Tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe a, ezi ụmụazụ Jizọs ga-ekwusa “eziokwu nke ozi ọma ahụ” n’ụwa nile. (Ndị Galeshia 2:14) A ga-eme nke a iji mezuo okwu Jizọs bụ́: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) N’ihi ya, ọ dị oké mkpa na anyị ga-amata ndị na-akụziri mba nile eziokwu site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ.

Otú Anyị Pụrụ Isi Mụta Eziokwu Ahụ

7. Ị̀ ga-esi aṅaa gosi na Jehova bụ Isi Iyi nke eziokwu?

7 Jehova bụ Isi Iyi nke eziokwu ime mmụọ. N’ezie, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid kpọrọ Jehova “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5; 43:3) Jizọs kwetara na okwu Nna ya bụ eziokwu, o kwupụtakwara, sị: “E dere n’akwụkwọ ndị amụma, sị, ‘Ha nile ga-abụkwa ndị Jehova ziri ihe.’ Onye ọ bụla nke nụworo ihe site n’ọnụ Nna m ma mụta ihe na-abịakwute m.” (Jọn 6:45; 17:17; Aịsaịa 54:13) Mgbe ahụ, o doro anya na ndị na-achọ eziokwu ahụ aghaghị ịbụ ndị Jehova, bụ́ Onye Nkụzi Ukwu, ziri ihe. (Aịsaịa 30:20, 21) Ọ dị ndị na-achọ eziokwu mkpa inweta “ihe ọmụma Chineke.” (Ilu 2:5) Jehova ejiriwokwa ịhụnanya kụzie ma ọ bụ mee ka a mara eziokwu ahụ n’ụzọ dịgasị iche iche.

8. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Chineke siworo kụzie ma ọ bụ nyefee eziokwu ahụ?

8 Dị ka ihe atụ, ọ bụ n’aka ndị mmụọ ozi ka Chineke si nyefee ụmụ Izrel Iwu ahụ. (Ndị Galeshia 3:19) Site ná nrọ, o kwere ndị nna ochie bụ́ Ebreham na Jekọb nkwa ngọzi. (Jenesis 15:12-16; 28:10-19) Ọbụna Chineke si n’eluigwe kwuo okwu, dị ka n’oge e mere Jizọs baptizim, a nụkwara okwu ndị a na-akpali akpali n’ụwa: “Nke a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye m nwapụtaworo.” (Matiu 3:17) Anyị pụkwara inwe ekele na Chineke nyefere eziokwu ahụ site n’inye ndị dere Bible ike mmụọ nsọ. (2 Timoti 3:16, 17) Ya mere, site n’ịmụta ihe n’Okwu Chineke, anyị pụrụ inwe ‘okwukwe n’eziokwu ahụ.’—2 Ndị Tesalonaịka 2:13.

Eziokwu ahụ na Ọkpara Chineke

9. Olee otú Chineke siworo jiri Ọkpara ya kpughee eziokwu ahụ?

9 Karịsịa, Chineke ejiriwo Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, kpugheere ihe a kpọrọ mmadụ eziokwu ahụ. (Ndị Hibru 1:1-3) N’ezie, Jizọs kwuru eziokwu ahụ n’ụzọ ọ na-adịtụbeghị mmadụ ọ bụla ọzọ merela ya. (Jọn 7:46) Ọbụna mgbe ọ rịgosịrị n’eluigwe, o kpughere eziokwu sitere n’aka Nna ya. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi natara “mkpughe sitere n’aka Jizọs Kraịst, nke Chineke kpugheere ya, igosi ndị ohu ya ihe ndị na-aghaghị iwere ọnọdụ n’isi nso.”—Mkpughe 1:1-3.

10, 11. (a) Gịnị ka eziokwu ahụ Jizọs gbaara àmà metụtara? (b) Olee otú Jizọs siri mee ka eziokwu ahụ ghọọ ihe mere eme?

10 Jizọs gwara Pọntịọs Paịlet na ya abịawo n’ụwa ịgbara eziokwu ahụ àmà. N’oge o jere ozi, Jizọs kpughere na eziokwu dị otú ahụ metụtara igosi oruru o ruuru Jehova ịbụ ọkaaka site n’Alaeze Chineke nke Kraịst ga-abụ Eze ya. Ma ịgbara eziokwu ahụ àmà chọrọ ihe karịrị ime nkwusa na izi ihe n’aka Jizọs. Jizọs mere ka eziokwu ahụ ghọọ ihe e ji n’aka site n’imezu ya. N’ihi ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Ka onye ọ bụla ghara ikpe unu ikpe n’iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ ma ọ bụ n’ihe banyere ememe ma ọ bụ banyere ememe ọnwa ọhụrụ ma ọ bụ banyere ụbọchị izu ike; n’ihi na ihe ndị ahụ bụ onyinyo nke ihe ndị gaje ịbịa, ma ihe bụ ezie dịịrị Kraịst ahụ.”—Ndị Kọlọsi 2:16, 17.

11 Otu ụzọ eziokwu ahụ si bịa bụrụ ihe mere eme bụ site n’ọmụmụ e buru n’amụma na a ga-amụ Jizọs na Betlehem. (Maịka 5:2; Luk 2:4-11) Eziokwu ahụ ghọkwara ihe mere eme mgbe okwu amụma Daniel banyere mpụta Mezaịa ahụ n’ọgwụgwụ nke ‘izu 69 nke afọ’ mezuru. Nke ahụ weere ọnọdụ mgbe Jizọs chere onwe ya n’ihu Chineke n’oge e mere ya baptizim na mgbe e ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ, kpọmkwem n’oge ahụ e buru n’amụma, na 29 O.A. (Daniel 9:25; Luk 3:1, 21, 22) Eziokwu ahụ bịakwuru ghọọ ihe mere eme site n’ozi na-enye ihe ọmụma Jizọs jere dị ka onye nkwusa Alaeze. (Aịsaịa 9:1, 2, 6, 7; 61:1, 2; Matiu 4:13-17; Luk 4:18-21) Ọ ghọkwara ihe mere eme site n’ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya.—Abụ Ọma 16:8-11; Aịsaịa 53:5, 8, 11, 12; Matiu 20:28; Jọn 1:29; Ọrụ 2:25-31.

12. N’ihi gịnị ka Jizọs pụrụ iji kwuo, sị, ‘Abụ m eziokwu’?

12 Ebe ọ bụ na eziokwu ahụ hiwere isi n’ebe Jizọs Kraịst nọ, ọ pụrụ ikwu, sị: “Abụ m ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) A na-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha n’ụzọ ime mmụọ mgbe ha “dịnyeere eziokwu” ahụ site n’ịnakwere òkè Jizọs na-ekere ná nzube Chineke. (Jọn 8:32-36; 18:37) Ebe ọ bụ na ndị yiri atụrụ na-anakwere eziokwu ahụ ma jiri okwukwe na-eso Kraịst, ha ga-enweta ndụ ebighị ebi.—Jọn 10:24-28.

13. Olee akụkụ atọ ndị anyị ga-enyocha eziokwu Akwụkwọ Nsọ na ha?

13 Ìgwè eziokwu Jizọs na ụmụazụ ya e nyere ike mmụọ nsọ kwupụtara mejupụtara usoro nkwenkwe bụ́ ezie nke Ndị Kraịst. N’ihi ya, ndị ‘na-erube isi n’okwukwe ahụ’ ‘na-anọgide na-eje ije n’eziokwu ahụ.’ (Ọrụ 6:7; 3 Jọn 3, 4) Ya mere, oleezi ndị na-eje ije n’eziokwu ahụ taa? Olee ndị n’ezie na-akụziri mba nile eziokwu ahụ? N’ịza ajụjụ ndị dị otú ahụ, anyị ga-elekwasị anya n’ebe Ndị Kraịst oge mbụ nọ ma nyochaa eziokwu Akwụkwọ Nsọ ndị metụtara (1) nkwenkwe, (2) ụzọ e si efe ofufe, na (3) àgwà onwe onye.

Eziokwu ahụ na Nkwenkwe

14, 15. Gịnị ka ị ga-ekwu banyere àgwà Ndị Kraịst oge mbụ na Ndịàmà Jehova nwere n’ebe Akwụkwọ Nsọ dị?

14 Ndị Kraịst oge mbụ jiri Okwu Jehova e dere ede kpọrọ ihe nke ukwuu. (Jọn 17:17) Ọ bụ ụkpụrụ ha gbasoro n’ihe banyere nkwenkwe na omume. Clement nke Aleksandria, onye dịrị ndụ na narị afọ nke abụọ na nke atọ kwuru, sị: “Ndị na-agbalịsi ike inweta nke kasị mma agaghị akwụsị ọchịchọ ha na-achọ eziokwu ruo mgbe ha nwetaworo, site n’Akwụkwọ Nsọ n’onwe ya, ihe àmà na-akwado ihe ahụ ha kwenyere na ya.”

15 Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ ahụ, Ndịàmà Jehova ji Bible kpọrọ ihe nke ukwuu. Ha kweere na “Akwụkwọ Nsọ dum sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke, baakwa uru maka izi ihe.” (2 Timoti 3:16) Ya mere, ka anyị tụlee nkwenkwe ole na ole nke Ndị Kraịst oge mbụ ma jiri ha tụnyere ihe ndị ohu Jehova n’oge a mụtaworo n’ihi na ha ji Bible eme ihe dị ka akwụkwọ ọgụgụ ha bụ́ isi.

Eziokwu Banyere Mkpụrụ Obi

16. Gịnị bụ eziokwu banyere mkpụrụ obi?

16 Ebe ọ bụ na ha kweere n’ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ, Ndị Kraịst oge mbụ kụziri eziokwu banyere mkpụrụ obi. Ha maara na ‘mmadụ ghọrọ mkpụrụ obi dị ndụ’ mgbe Chineke kere ya. (Jenesis 2:7) Ọzọkwa, ha na-ekweta na mkpụrụ obi mmadụ na-anwụ anwụ. (Ezikiel 18:4; Jems 5:20) Ha makwaara na “ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”—Eklisiastis 9:5, 10.

17. Ị̀ ga-esi aṅaa akọwa olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ?

17 Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs n’oge mbụ nwere olileanya e ji n’aka na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke n’ọnwụ, ma ọ bụ mee ka ha dịghachi ndụ. Pọl kọwara nkwenkwe ahụ n’ụzọ doro anya mgbe o kwupụtara, sị: “Enwekwara m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15) Ọbụna mgbe nke ahụ gasịrị, onye kpọrọ onwe ya Onye Kraịst bụ́ Minucius Felix dere, sị: “Olee onye dị nnọọ iberibe ma ọ bụ nzuzu nke na ọ ga-anwa anwa ikwu na Chineke apụghị imepụtaghachi mmadụ nke ọ bụ ya mere na mbụ?” Dị ka Ndị Kraịst oge mbụ, Ndịàmà Jehova kweere n’eziokwu ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ banyere mkpụrụ obi mmadụ, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ. Ugbu a, ka anyị tụlee ndị Chineke na Jizọs bụ.

Eziokwu ahụ na Atọ n’Ime Otu

18, 19. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na Atọ n’Ime Otu abụghị ozizi Akwụkwọ Nsọ?

18 Ndị Kraịst oge mbụ ewereghị Chineke, Kraịst, na mmụọ nsọ dị ka Atọ n’Ime Otu. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopædia Britannica na-ekwu, sị: “Ma okwu ahụ bụ́ Atọ n’Ime Otu ma ozizi ahụ kpọmkwem adịghị nke pụtara n’Agba Ọhụrụ, Jizọs na ụmụazụ ya ezubeghịkwa ịkụzi ihe megidere Shema [otu ekpere ndị Hibru] ahụ dị n’Agba Ochie: ‘Nụrụ, Izrel: Onyenwe anyị Chineke bụ otu Onyenwe anyị’ (Deut. 6:4).” Ndị Kraịst efeghị chi atọ n’ime otu nke ndị Rom ma ọ bụ chi ọ bụla ọzọ ofufe. Ha nakweere okwu Jizọs bụ́ na ọ bụ nanị Jehova ka a ga-efe ofufe. (Matiu 4:10) Ọzọkwa, ha kweere okwu Kraịst bụ́: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Ndịàmà Jehova nwere otu echiche ahụ taa.

19 Ụmụazụ Jizọs n’oge mbụ maara ọdịiche dị n’etiti Chineke, Kraịst, na mmụọ nsọ nke ọma. N’ezie, ha mere ndị na-eso ụzọ baptizim (1) n’aha nke Nna, (2) n’aha nke Ọkpara, nakwa (3) n’aha nke mmụọ nsọ, ọ bụghị n’aha Atọ n’Ime Otu. N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu sitere n’Akwụkwọ Nsọ, n’ihi ya kwa, ha maara ọdịiche dị n’etiti Chineke, Ọkpara ya, na mmụọ nsọ.—Matiu 28:19.

Eziokwu ahụ na Baptizim

20. Olee ihe ọmụma dị ndị a na-aga ime baptizim mkpa?

20 Jizọs nyere ụmụazụ ya ọrụ ime ndị na-eso ụzọ site n’ịkụziri ndị mmadụ eziokwu ahụ. Iji ruo eruo maka baptizim, ọ dị ha mkpa inwe ihe ọmụma bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ. Dị ka ihe atụ, ha aghaghị ịghọta ọnọdụ na ikike nke Nna ahụ na Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. (Jọn 3:16) Ọ dịkwa ndị a na-aga ime baptizim mkpa ịghọta na mmụọ nsọ abụghị onye kama na ọ bụ ike nọ n’ọrụ nke Chineke.—Jenesis 1:2, ihe odide ala ala peeji nke NW.

21, 22. N’ihi gịnị ka ị ga-eji kwuo na baptizim bụ maka ndị kwere ekwe?

21 Ndị Ndị Kraịst oge mbụ mere baptizim bụ nanị ndị e ziri ihe na ndị chegharịrị echegharị bụ́ ndị raara onwe ha kpam kpam nye Chineke ime uche ya. Ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu bụ́ ndị gbakọtara na Jeruselem na Pentikọst 33 O.A. enweelarị ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Mgbe ha nụrụ ka Pita onyeozi kwuru banyere Jizọs bụ́ Mezaịa, ihe dị ka mmadụ 3,000 “ji obi ha nile nakwere okwu ya,” ‘e meekwa ha baptizim.’—Ọrụ 2:41; 3:19–4:4; 10:34-38.

22 Baptizim Ndị Kraịst bụ maka ndị kwere ekwe. Ndị nọ na Sameria nakweere eziokwu ahụ, “mgbe ha kweere Filip, bụ́ onye nọ na-akpọsa ozi ọma banyere alaeze Chineke na banyere aha Jizọs Kraịst, e wee mee ha baptizim, ma ndị ikom ma ndị inyom.” (Ọrụ 8:12) Dị ka ezigbo onye ọhụrụ na-eso ụzọ nke nwere ihe ọmụma banyere Jehova, ọnaozi Etiopia bu ụzọ nakwere ihe Filip kwuru banyere mmezu nke amụma banyere Mezaịa, e mezie ya baptizim. (Ọrụ 8:34-36) Mgbe e mesịrị, Pita gwara Kọnịliọs na ndị Jentaịl ndị ọzọ na “onye na-atụ egwu [Chineke] ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anara nke ọma” nakwa na onye ọ bụla nke na-etinye okwukwe na Jizọs Kraịst na-enweta mgbaghara mmehie. (Ọrụ 10:35, 43; 11:18) Ihe a nile kwekọrọ n’iwu Jizọs bụ́ ‘ime ndị na-eso ụzọ, na-ezi ha ka ha debe ihe nile o nyeworo n’iwu.’ (Matiu 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Ndịàmà Jehova na-agbaso otu ụkpụrụ ahụ, na-anakwere nanị ndị nwere ihe ọmụma bụ́ isi nke Akwụkwọ Nsọ na ndị rarawooro onwe ha nye Chineke, dị ka ndị a ga-eme baptizim.

23, 24. Olee ụzọ e kwesịrị isi na-eme baptizim Ndị Kraịst?

23 Imikpu n’ime mmiri kpam kpam bụ ụdị baptizim kwesịrị ekwesị maka ndị kwere ekwe. Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim n’Osimiri Jọdan, o si ‘na mmiri ahụ pụta.’ (Mak 1:10) E mere ọnaozi Etiopia baptizim na “mmiri.” Ya na Filip ‘banyere n’ime mmiri ahụ’ ma sizie “na mmiri ahụ pụta.” (Ọrụ 8:36-40) Njikọ Akwụkwọ Nsọ na-ejikọ baptizim na olili ozu ihe atụ na-egosikwa mmikpu n’ime mmiri kpam kpam.—Ndị Rom 6:4-6; Ndị Kọlọsi 2:12.

24 Akwụkwọ bụ́ The Oxford Companion to the Bible na-ekwu, sị: “Nkọwa ndị e nyere banyere baptizim ndị e mere n’Agba Ọhụrụ na-egosi na e mikpuru onye e mere baptizim n’ime mmiri.” Dị ka akwụkwọ ndị France bụ́ Larousse du XXe Siècle (Paris, 1928) si kwuo, “e mere Ndị Kraịst oge mbụ baptizim site n’imikpu ha n’ime mmiri n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ mmiri.” Akwụkwọ bụ́ After Jesus—The Triumph of Christianity na-ekwukwa, sị: “N’ụdị ya kasị gbaa ọkpụrụkpụ, [baptizim] na-achọ na onye a na-aga ime ya ga-ekwupụta okwukwe ya, imikpu n’ime mmiri kpam kpam n’aha Jizọs na-esochikwa ya.”

25. Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

25 Isi ihe ndị a e kwuru n’elu banyere nkwenkwe na omume ndị dabeere na Bible nke Ndị Kraịst oge mbụ bụ nanị ihe atụ. Ọ ga-ekwe mee ikwu ụzọ ndị ọzọ nkwenkwe ha na nke Ndịàmà Jehova si yie. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle ụzọ ndị ọzọ e si amata ndị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu ahụ.

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

• Olee ụdị ofufe Chineke na-achọ?

• Olee otú eziokwu ahụ si ghọọ ihe mere eme site n’aka Jizọs Kraịst?

• Gịnị bụ eziokwu banyere mkpụrụ obi na ọnwụ?

• Olee otú e si eme Ndị Kraịst baptizim, gịnịkwa ka a chọrọ n’aka ndị a na-aga ime baptizim?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 16]

Jizọs gwara Paịlet, sị: ‘Abịawo m ịgbara eziokwu ahụ àmà’

[Foto dị na peeji nke 17]

Ị̀ pụrụ ịkọwa ihe mere Jizọs ji sị: ‘Abụ m eziokwu’?

[Foto dị na peeji nke 18]

Gịnị bụ eziokwu banyere baptizim Ndị Kraịst?