Tụkwasịnụ Nsọpụrụ Chineke ná Ntachi Obi Unu
Tụkwasịnụ Nsọpụrụ Chineke ná Ntachi Obi Unu
‘Tụkwasịnụ ntachi obi n’okwukwe unu, ná ntachi obi unu nsọpụrụ Chineke.’—2 PITA 1:5, 6.
1, 2. (a) Olee ụdị uto a na-atụ anya ya n’ebe nwata nọ? (b) Olee otú uto ime mmụọ dịruru ná mkpa?
UTO dị nwatakịrị mkpa, ma a chọrọ ihe karịrị uto anụ ahụ́. A na-atụkwa anya uto nke uche na nke mmetụta uche. Ka oge na-aga, nwatakịrị na-ahapụ omume nwata ya ma too ghọọ nwoke ma ọ bụ nwanyị tozuru okè. Pọl onyeozi zoro aka na nke a mgbe o dere, sị: “Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-adị ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọworo dimkpa, ewepụwo m omume nwa ọhụrụ.”—1 Ndị Kọrint 13:11.
2 Okwu Pọl mere ka otu isi ihe dị mkpa banyere uto ime mmụọ pụta ìhè. Ọ dị Ndị Kraịst mkpa inwe ọganihu site n’ịbụ ụmụ ọhụrụ ime mmụọ gaa n’ịbụ ndị “tojuru etoju n’ikike ịghọta ihe.” (1 Ndị Kọrint 14:20) Ha kwesịrị ịgbalịsi ike ma chọọ iru ‘ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogo dịịrị izu ezu nke Kraịst ahụ.’ Mgbe ahụ, ha agaghị abụ “ụmụ ọhụrụ, ndị ebili mmiri na-enugharị na ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị.”—Ndị Efesọs 4:13, 14.
3, 4. (a) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji bụrụ ndị tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ? (b) Olee àgwà nsọpụrụ Chineke ndị anyị kwesịrị ịdị na-egosipụta, oleekwa otú ha dịruru ná mkpa?
3 Olee otú anyị pụrụ isi tozuo okè n’ụzọ ime mmụọ? Ọ bụ ezie na, n’ọnọdụ dị otú kwesịrị ekwesị, ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na uto anụ ahụ́ adịghị ewe mgbalị, uto ime mmụọ na-achọ mgbalị e leziri anya mee. Ọ na-amalite mgbe anyị nwetara ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke ma na-eme ihe kwekọrọ n’ihe anyị na-amụta. (Ndị Hibru 5:14; 2 Pita 1:3) N’aka nke ya, nke a na-enyere anyị aka igosipụta àgwà nsọpụrụ Chineke. Dị ka ọ dị n’uto anụ ahụ́ na ihe ndị gbara ya gburugburu, ito eto n’àgwà dịgasị iche iche nke nsọpụrụ Chineke na-ewerekarị ọnọdụ n’otu mgbe ahụ. Pita onyeozi dere, sị: “Site n’unu itinye oké mgbalị nile ná mmeghachi omume, tụkwasịnụ omume ọma n’okwukwe unu, n’omume ọma unu ihe ọmụma, n’ihe ọmụma unu njide onwe onye, ná njide onwe onye unu ntachi obi, ná ntachi obi unu nsọpụrụ Chineke, ná nsọpụrụ Chineke unu mmetụta ụmụnna, ná mmetụta ụmụnna unu ịhụnanya.”—2 Pita 1:5-7.
4 Àgwà nke ọ bụla Pita depụtara dị oké mkpa, ọ dịghịkwa nke a pụrụ ịhapụ ahapụ. Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụrụ na ihe ndị a adịrị n’ime unu ma jubiga ókè, ha ga-egbochi unu ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (2 Pita 1:8) Ka anyị lekwasị anya ná mkpa ọ dị ịtụkwasị nsọpụrụ Chineke ná ntachi obi anyị.
Mkpa Ntachi Obi Dị
5. N’ihi gịnị ka ntachi obi ji dị anyị mkpa?
5 Ma Pita ma Pọl jikọtara nsọpụrụ Chineke na ntachi obi. (1 Timoti 6:11) Inwe ntachi obi pụtara ihe karịrị nanị idi ihe isi ike na ịnọgide na-eguzosi ike. Ọ na-agụnye inwe ndidi, obi ike, na iguzosi ike, ọ bụghị inwe ndakpọ olileanya mgbe e chere ule, ihe mgbochi, ọnwụnwa, ma ọ bụ mkpagbu ihu. Dị ka ndị na-ebi ndụ ná “nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs,” anyị na-atụ anya na a ga-akpagbu anyị. (2 Timoti 3:12) Anyị aghaghị ịtachi obi ma ọ bụrụ na anyị gaje igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ma zụlite àgwà ndị a chọrọ maka nzọpụta. (Ndị Rom 5:3-5; 2 Timoti 4:7, 8; Jems 1:3, 4, 12) Ọ bụrụ na anyị enweghị ntachi obi, anyị agaghị enweta ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 2:6, 7; Ndị Hibru 10:36.
6. Ịtachi obi ruo ọgwụgwụ pụtara ịnọ na-eme gịnị?
6 Otú ọ sọkwara anyị si malite nke ọma, ihe kasị mkpa n’ikpeazụ bụ ka anyị nwee ntachi obi. Matiu 24:13) Ee, anyị aghaghị ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, ọ sọ ya ya bụrụ ọgwụgwụ nke ndụ anyị dị ugbu a ma ọ bụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe a. Nke ọ sọrọ ya bụrụ, anyị aghaghị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị atụkwasịghị nsọpụrụ Chineke ná ntachi obi anyị, anyị apụghị ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, anyị agaghịkwa enweta ndụ ebighị ebi. Ma gịnị bụ nsọpụrụ Chineke?
Jizọs sịrị: “Onye tachiworo obi ruo ọgwụgwụ bụ onye a ga-azọpụta.” (Ihe Nsọpụrụ Chineke Pụtara
7. Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke, gịnịkwa ka ọ na-akpali anyị ime?
7 Nsọpụrụ Chineke bụ mmadụ inye Jehova Chineke nsọpụrụ ofufe, ife ya ofufe, na ijere ya ozi n’ihi nguzosi ike n’ihe nye ọbụbụeze eluigwe na ala Ya. Iji na-enye Jehova nsọpụrụ, ọ dị anyị mkpa inwe ezi ihe ọmụma banyere ya na ụzọ ya. Anyị kwesịrị ịchọ ịmatakwu Chineke nke ọma. Nke a ga-akpali anyị iji obi anyị dum soro ya na-enwe nkekọ chiri anya, bụ́ nke anyị ji omume na ụzọ ndụ anyị egosipụta. Anyị kwesịrị ịchọ ịdị ka Jehova ruo ókè o kwere mee—iṅomi ụzọ ya na igosipụta àgwà na omume ya. (Ndị Efesọs 5:1) N’ezie, nsọpụrụ Chineke na-akwali anyị ịchọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ n’ihe nile anyị na-eme.—1 Ndị Kọrint 10:31.
8. Olee otú nsọpụrụ Chineke na ofufe a na-ekewaghị ekewa si aga ụkwụ na ụkwụ?
8 Iji na-egosipụta ezi nsọpụrụ Chineke, anyị aghaghị ife nanị Jehova, n’ekweghị ka ihe ọ bụla ọzọ weghara ọnọdụ ya n’obi anyị. Dị ka Onye Okike anyị, o ruru eru ịbụ onye anyị ga na-efe ofufe a na-ekewaghị ekewa. (Deuterọnọmi 4:24; Aịsaịa 42:8) Otú o sina dị, Jehova adịghị amanye anyị ife ya ofufe. Ọ chọrọ ofufe si anyị n’obi. Ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ, bụ́ nke dabeere n’ezi ihe ọmụma banyere ya, na-akwali anyị ime ka ndụ anyị dị ọcha na ịrara onwe anyị kpam kpam nye ya, mgbe ahụ kwa, na-ebi ndụ kwekọrọ na ya.
Soro Chineke Na-enwe Mmekọrịta
9, 10. Olee otú anyị pụrụ isi wulite ma nọgide soro Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya?
9 Mgbe anyị gosipụtasịrị nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke site n’ịbụ ndị e mere baptizim, ọ ka dị anyị mkpa iso ya na-enwe mmekọrịta chiri nnọọ anya ọbụna karị. N’ihi ya, ọchịchọ anyị nwere ime nke a na ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi na-akpali anyị ịnọgide na-amụ Okwu ya ma na-atụgharị uche na ya. Ka anyị na-ekwe ka mmụọ Chineke na-arụ ọrụ n’uche na n’obi anyị, ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-emikwu emi. Mmekọrịta anyị na ya na-anọgide bụrụ ihe kasị mkpa ná ndụ anyị. Anyị na-ewere Jehova dị ka ezi Enyi anyị ma na-achọ ime ihe na-atọ ya ụtọ mgbe nile. (1 Jọn 5:3) Obi ụtọ anyị nwere n’ezi mmekọrịta nke anyị na Chineke na-amụba, anyị na-enwekwa ekele na ọ na-eji ịhụnanya enye anyị ntụziaka ma na-agbazi anyị n’ebe ndị ọ dị mkpa.—Deuterọnọmi 8:5.
10 Ọ gwụla ma ànyị na-anọgide na-eme ihe iji wusie mmekọrịta dị oké ọnụ ahịa nke anyị na Jehova ike, ọ pụrụ ịjụ oyi. Ọ bụrụ na nke ahụ emee, ọ gaghị esi Chineke n’aka, n’ihi na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ 17:27) Lee ka obi si dị anyị ụtọ na Jehova adịghị eme ka o siere anyị ike ịbịakwute ya! (1 Jọn 5:14, 15) N’ezie, anyị aghaghị ịrụ ọrụ iji nọgide soro Jehova na-enwe mmekọrịta chiri anya. Otú ọ dị, ọ na-enyere anyị aka ịbịaru ya nso site n’inye anyị ihe nile dị anyị mkpa iji zụlite ma nọgide na-egosipụta nsọpụrụ Chineke. (Jems 4:8) Olee otú anyị pụrụ isi jiri ndokwa ịhụnanya a nile mee ihe n’ụzọ zuru ezu?
Nọgide Na-agbasi Ike n’Ụzọ Ime Mmụọ
11. Olee ụzọ ụfọdụ anyị si egosipụta nsọpụrụ Chineke?
11 Ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe Chineke nọ ga-akwali anyị igosipụta ókè nsọpụrụ anyị na-enye ya haruru, n’ikwekọ na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Mee ike gị nile iche onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye a nwapụtara anwapụta, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Timoti 2:15) Ime nke a na-achọ na anyị ga-anọgide na-enwe usoro ihe omume dị mma nke ịmụchi Bible anya, ịgachi nzukọ anya, na ikerechi òkè anya n’ozi ubi. Anyị pụkwara ịnọgide na-anọ Jehova nso site ‘n’ikpe ekpere n’akwụsịghị akwụsị.’ (1 Ndị Tesalonaịka 5:17) Ihe ndị a bụ ụzọ ndị dị mkpa anyị ga-esi na-egosipụta nsọpụrụ Chineke. Ileghara nke ọ bụla n’ime ha anya pụrụ ime ka anyị daa ọrịa ime mmụọ ma mee ka anyị bụrụ ndị Setan pụrụ iji atụmatụ ya nweta ngwa ngwa.—1 Pita 5:8.
12. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọnwụnwa?
12 Ịgbasi ike na ịrụsi ọrụ ike n’ụzọ ime mmụọ na-enyekwara anyị aka iche ọtụtụ ọnwụnwa ndị na-abịara anyị ihu. Ọnwụnwa pụrụ isi n’ebe ndị pụrụ ile anyị ule n’ụzọ dị njọ bịa. Ọ pụrụ isiri anyị ike karị ịtachi obi n’enweghị mmasị, mmegide, na mkpagbu ma o site n’aka ndị ezinụlọ, ndị ikwu, ma ọ bụ ndị agbata obi anyị bịa. A pụrụ iji ụzọ aghụghọ rụgide anyị n’ụlọ ọrụ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ imebi ụkpụrụ Ndị Kraịst anyị. Nkụda mmụọ, ọrịa, na ịda mbà n’obi pụrụ ime ka anyị ghara ịdị ike n’ụzọ anụ ahụ́ ma mee ka o sikwuoro anyị ike ịnagide ule nke okwukwe. Ma anyị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma n’ịnagide ọnwụnwa nile ma ọ bụrụ na anyị anọgidesie ike “n’àgwà dị nsọ na omume nke ịsọpụrụ Chineke, na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche.” (2 Pita 3:11, 12) Anyị pụkwara ịnọgide na-enwe ọṅụ n’ime otú ahụ, na-enwe obi ike na Chineke ga-agọzi anyị.—Ilu 10:22.
13. Gịnị ka anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị gaje ịnọgide na-egosipụta nsọpụrụ Chineke?
13 Ọ bụ ezie na ọ bụ ndị na-egosipụta nsọpụrụ Chineke ka Setan na-awakpo, ọ dịghị anyị mkpa ịtụ egwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na “Jehova maara ụzọ e si agbapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa.” (2 Pita 2:9) Iji tachie obi n’ọnwụnwa ma nweta nnapụta dị otú ahụ, anyị aghaghị “ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa [ma na-ebi] ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.” (Taịtọs 2:12) Dị ka Ndị Kraịst, anyị aghaghị ịnọ na nche ka adịghị ike ọ bụla nke metụtara ọchịchọ na omume anụ ahụ́ ghara igbebata ná nsọpụrụ Chineke anyị ma mebie ya. Ugbu a ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ihe ndị a pụrụ imebi ya.
Kpachara Anya Maka Ihe Ndị Pụrụ Imebi Nsọpụrụ Chineke
14. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ọ bụrụ na a raa anyị ụra ịdaba n’ọnyà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya?
14 Ịhụ ihe onwunwe n’anya bụụrụ ọtụtụ ndị ọnyà. Anyị pụrụ ịghọgbu ọbụna onwe anyị, “na-eche na nsọpụrụ Chineke bụ ụzọ isi rite uru” ihe onwunwe. N’ụzọ dị otú ahụ, obi pụrụ ịka anyị iji ntụkwasị obi ndị kwere ekwe ibe anyị nwere n’ebe anyị nọ na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. (1 Timoti 6:5) Anyị pụrụ ọbụna ikwubi n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ dịghị ihe o mere ịrụgide Onye Kraịst bara ọgaranya ka o binye anyị ego anyị na-agaghị akwụghachili ma eleghị anya. (Abụ Ọma 37:21) Ma, ọ bụ nsọpụrụ Chineke, ọ bụghị ịkwakọba ihe onwunwe, “nwere nkwa maka ndụ dị ugbu a na nke ahụ gaje ịbịa.” (1 Timoti 4:8) Ebe ọ bụ na “ọ dịghị ihe anyị webataworo n’ime ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iburu pụọ na ya,” ka anyị na-achụsokwu “nsọpụrụ Chineke . . . ya na inwe afọ ojuju” ma nye onwe anyị ohere ‘inwe afọ ojuju n’ihe oriri na ihe mgbokwasị.’—1 Timoti 6:6-11.
15. Gịnị ka anyị pụrụ ime ma ọ bụrụ na ịchụso ihe ụtọ na-achọ ikpuchi nsọpụrụ Chineke anyị?
15 Ịchụso ihe ụtọ pụrụ ikpuchi nsọpụrụ Chineke anyị. Ọ̀ pụrụ ịbụ na ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe ozugbo n’akụkụ a? N’ezie, a na-erite uru ụfọdụ n’ọzụzụ nke ahụ́ na ntụrụndụ. Ma, ụgwọ 1 Jọn 2:25) Taa, ọtụtụ ndị bụ “ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya, ndị na-enwe ọdịdị nke nsọpụrụ Chineke ma na-agọnarị ike ya,” ọ dịkwa anyị mkpa ịgbakụta ndị dị otú ahụ azụ. (2 Timoti 3:4, 5) Ndị ji nsọpụrụ Chineke akpọrọ oké ihe “na-atọrọ onwe ha ezi ntọala maka ọdịnihu n’ụzọ nwere nchebe, ka ha wee jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.”—1 Timoti 6:19.
ọrụ ndị ahụ pere mpe ma e jiri ha tụnyere ndụ ebighị ebi. (16. Olee ọchịchọ mmehie ndị na-eme ka ụfọdụ ndị ghara ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke, oleekwa otú anyị pụrụ isi chịkwaa ọchịchọ ndị a?
16 Ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya na iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, omume rụrụ arụ, na oké ọchịchọ nke ime mmehie pụrụ imebi nsọpụrụ Chineke anyị. Ịdaba na ha pụrụ igbochi anyị ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 2 Ndị Kọrint 7:1) Ọbụna Pọl aghaghị ịtachi obi n’ọgụ na-aga n’ihu ya na anụ ahụ́ ya na-emehie emehie lụrụ. (Ndị Rom 7:21-25) A chọrọ ime ihe siri ike iji kpochapụ ọchịchọ ndị na-ezighị ezi. Otu ihe bụ na anyị aghaghị ikpebisi ike ịnọgide na-adị ọcha n’omume. Pọl na-agwa anyị, sị: “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe metụtara ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ na-emerụ ahụ́, na ọchịchọ anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Ime ka akụkụ ahụ́ anyị nwụọ n’ihe banyere ihe ndị dị otú ahụ bụ́ mmehie na-achọ mkpebi siri ike iji wepụ ha, na-ekpochapụ ha kpam kpam. Ikpesi ekpere ike maka enyemaka Chineke ga-eme ka anyị nwee ike ịjụ ọchịchọ ndị na-ezighị ezi ma gbasoo ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime ajọ usoro ihe a.
17. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ịdọ aka ná ntị anya?
17 Nkụda mmụọ pụrụ ime ka ntachi obi anyị belata ma nwee mmetụta dị njọ ná nsọpụrụ Chineke anyị. Ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova enwewo nkụda mmụọ. (Ọnụ Ọgụgụ 11:11-15; Ezra 4:4; Jona 4:3) Nkụda mmụọ pụrụ inwe mmetụta dị njọ n’ahụ́ anyị karịsịa ma ọ bụrụ na anyị na-ewe iwe n’ihi na ọ dị anyị ka e mejọrọ anyị ma ọ bụ n’ihi na a baara anyị mba ma ọ bụ dọọ anyị aka ná ntị n’ụzọ siri ike. Otú ọ dị, ịba mba na ịdọ aka ná ntị bụ ihe àmà na-egosi na Chineke nwere mmasị n’ebe anyị nọ, nweekwa nchegbu nke ịhụnanya kpaliri maka anyị. (Ndị Hibru 12:5-7, 10, 11) Anyị kwesịrị iwere ịdọ aka ná ntị, ọ bụghị nanị dị ka ntaramahụhụ, kama dị ka ụzọ e si enye anyị ọzụzụ n’ụzọ nke ezi omume. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-eji ndụmọdụ kpọrọ ihe ma na-anakwere ya, na-aghọta na “ụzọ nke ndụ ka ịba mba nile nke ịdọ aka ná ntị bụ.” (Ilu 6:23) Nke a pụrụ inyere anyị aka inwe ọganihu ime mmụọ dị mma n’ịgbaso nsọpụrụ Chineke.
18. Olee ibu ọrụ anyị nwere ma ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị?
18 Nghọtahie na mmejọ mmadụ mejọrọ anyị pụrụ ịbụrụ nsọpụrụ Chineke anyị ihe ịma aka. Ha Ilu 18:1) Ma ọ dị mma icheta na iburu ndị ọzọ iwe n’obi pụrụ imetụta mmekọrịta anyị na Jehova n’ụzọ dị njọ. (Levitikọs 19:18) N’ezie, “onye na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ hụworo, apụghị ịdị na-ahụ Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụbeghị.” (1 Jọn 4:20) N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jizọs mesiri ike mkpa ọ dị ime ihe ngwa ngwa iji dozie esemokwu dị n’etiti mmadụ na ibe ya. Ọ gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na ị na-ewega onyinye gị n’ebe ịchụàjà, i wee cheta n’ebe ahụ na o nwere ihe nwanne gị nwere megide gị, hapụ onyinye gị n’ebe ahụ n’ihu ebe ịchụàjà, pụọkwa; buru ụzọ mee ka gị na nwanne gị dị n’udo, mgbe ahụkwa, mgbe ị bịaghachiworo, nye onyinye gị.” (Matiu 5:23, 24) Ịrịọ mgbaghara pụrụ inye aka imezi ihe okwu ọjọọ ma ọ bụ omume na-adịghị mma mebiri. A pụrụ ime ka mmekọrịta dịghachi mma ma mee ka a dịghachi n’udo ma ọ bụrụ na anyị arịọ mgbaghara ma kweta na ihe anyị mere adịghị mma. Jizọs nyekwara ndụmọdụ ndị ọzọ banyere ụzọ e si edozi esemokwu. (Matiu 18:15-17) Lee ka obi si adị anyị ụtọ mgbe mgbalị ndị e mere iji dozie nsogbu gara nke ọma!—Ndị Rom 12:18; Ndị Efesọs 4:26, 27.
pụrụ ịkpata nchekasị ma ọ bụ kpalie ụfọdụ ndị iwere nzọụkwụ amamihe na-adịghị na ya nke bụ́ ikewapụ onwe ha n’ebe ụmụnna ime mmụọ ha ndị nwoke na ndị nwanyị nọ. (Gbasoo Ihe Nlereanya Jizọs
19. N’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa iṅomi ihe nlereanya Jizọs?
19 N’ezie, ọnwụnwa ga na-abịara anyị, ma ọ dịghị mkpa ka ha na-adọpụ uche anyị n’ọsọ nke ndụ ebighị ebi. Cheta na Jehova pụrụ ịnapụta anyị n’ọnwụnwa. Ka anyị “[na-eyipụ] ihe ọ bụla dị arọ” ma “jirikwa ntachi obi na-agba ọsọ ahụ nke e setịpụrụ n’ihu anyị,” ka anyị “na-elegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jizọs.” (Ndị Hibru 12:1-3) Iji nlezianya na-enyocha ihe nlereanya Jizọs ma na-agbalịsi ike iṅomi ya n’okwu na n’omume ga-enyere anyị aka ịzụlite nsọpụrụ Chineke ma na-egosipụta ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu.
20. Olee ụgwọ ọrụ ndị a na-enweta site n’ịgbaso ntachi obi na nsọpụrụ Chineke?
20 Ntachi obi na nsọpụrụ Chineke na-arụkọ ọrụ n’inye aka mee ka nzọpụta anyị bụrụ ihe e ji n’aka. Site n’igosipụta àgwà ndị a dị oké ọnụ ahịa, anyị pụrụ iji ikwesị ntụkwasị obi gaa n’ihu n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Chineke. Ọbụna mgbe anyị nọ n’ọnwụnwa, anyị ga-enwe obi ụtọ ka anyị na-enweta mmetụta dị nro na ngọzi Jehova n’ihi na anyị atachiwo obi ma na-egosipụta nsọpụrụ Chineke. (Jems 5:11) Ọzọkwa, Jizọs n’onwe ya na-emesi anyị obi ike, sị: “Site ná ntachi obi unu, unu ga-enweta mkpụrụ obi unu.”—Luk 21:19.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
• N’ihi gịnị ka ntachi obi ji dị mkpa?
• Gịnị bụ nsọpụrụ Chineke, oleekwa otú e si egosipụta ya?
• Ànyị pụrụ isi aṅaa malite iso ma nọgide na-eso Chineke enwe mmekọrịta chiri anya?
• Olee ihe ụfọdụ pụrụ imebi nsọpụrụ Chineke anyị, oleekwa otú anyị pụrụ isi zere ha?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 12, 13]
A na-egosipụta nsọpụrụ Chineke n’ọtụtụ ụzọ
[Foto ndị dị na peeji nke 14]
Kpachara anya maka ihe ndị pụrụ imebi nsọpụrụ Chineke gị