Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebel ọ̀ maara na àjà anụmanụ dị mkpa iji nweta ihu ọma Chineke?

Ihe ndekọ Bible banyere àjà Ken na Ebel chụrụ dị nnọọ mkpirikpi. Na Jenesis 4:3-5, anyị na-agụ, sị: “O ruo, n’ọgwụgwụ ụbọchị ụfọdụ, na Ken wetara ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala ịbụ onyinye ịnata ihu ọma e nyere Jehova. Ebel kwa, ya onwe ya wetakwara ụfọdụ n’ime ụmụ e buru ụzọ mụọ nke ìgwè ewu na atụrụ ya, na ụfọdụ n’ime iberibe ha mara abụba. Jehova wee lee Ebel, leekwa onyinye ịnata ihu ọma ya, anya ọma: ma Ken na onyinye ịnata ihu ọma ya, O leghị ha anya ọma.”

Ọ dịghị ebe ọ bụla e kwuru n’ime Bible na tupu ihe omume a Jehova enyewo ihe ọmụma a kapịrị ọnụ banyere àjà ma ọ bụ banyere ụdị àjà ọ na-anara nke ọma. N’ihi ya, o doro anya na Ken na Ebel ji ọchịchọ obi ha kpebie ịchụ àjà. E kweghị ka ha banye n’ebe mbụ nne na nna ha biri bụ́ Paradaịs; ha malitere inwe mmetụta nke mmehie; e kewapụkwara ha n’ebe Chineke nọ. N’ọnọdụ mmehie ha dị mwute, ha aghaghị ịchọpụtawo na ọ dị ha mkpa nke ukwuu ichigharịkwuru Chineke maka enyemaka. O yiri ka inye Chineke onyinye ọ̀ bụ ihe ha ji ọchịchọ obi ha mee iji nweta ihu ọma Chineke.

Ihe si na ya pụta bụ na Chineke nakweere àjà Ebel, ma ọ nakweereghị nke Ken. N’ihi gịnị? Ọ̀ bụ n’ihi na Ebel ji ihe ndị a chọrọ wee chụọ àjà ebe Ken na-ejighị? Anyị apụghị ijide n’aka ma ụdị ihe ha chụrụ n’àjà ò nwere ihe jikọrọ ya na okwu ahụ; ebe ọ bụ na ọ dịghị onye nke ọ bụla n’ime ha a gwara ihe a na-anakwere na ihe a na-adịghị anakwere. Otú ọ dị, o yikarịrị ka nke ọ bụla n’ime ihe ndị ha ji chụọ àjà ọ̀ bụ ihe a na-anakwere. N’Iwu ahụ Jehova mesịrị nye mba Izrel, àjà ndị a na-anakwere gụnyere ọ bụghị nanị anụmanụ ma ọ bụ akụkụ ahụ́ anụmanụ kamakwa mkpụrụ akụ́kụ́ ndị a hụrụ n’ọkụ, ùkwù ọka bali, ụtụ ọka dị mma, ihe ndị a mịrị n’ovun, na mmanya. (Levitikọs 6:19-23; 7:11-13; 23:10-13) O doro anya na ọ bụghị nanị ihe Ken na Ebel chụrụ n’àjà mere ka Chineke nakwere nke otu onye ma jụ nke onye nke ọzọ.—Tụlee Aịsaịa 1:11; Emọs 5:22.

Ọtụtụ narị afọ mgbe e mesịrị, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Site n’okwukwe, Ebel chụụrụ Chineke àjà dị oké ọnụ ahịa karịa nke Ken, bụ́ okwukwe nke e sitere na ya gbaa àmà banyere ya na ọ bụ onye ezi omume, ebe Chineke na-agba àmà banyere onyinye ya.” (Ndị Hibru 11:4) N’ihi ya, ọ bụ n’ihi okwukwe ka Chineke ji were Ebel dị ka onye ezi omume. Ma gịnị ka o nwere okwukwe na ya? O nwere okwukwe ná nkwa Jehova kwere na ya ga-eweta Mkpụrụ, nke ‘ga-echifia isi agwọ ahụ’ ma mee ka e nweghachi udo na izu okè nke ihe a kpọrọ mmadụ nụburu ụtọ ya. Site n’okwu ahụ bụ́ na a ‘ga-echifia Mkpụrụ ahụ n’ikiri ụkwụ,’ Ebel pụrụ ịtụgharịwo n’uche na a chọrọ àjà nke gụnyere ịwụsị ọbara. (Jenesis 3:15) Ka o sina dị, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ okwukwe Ebel mere ka ‘àjà ya dị oké ọnụ ahịa karịa nke Ken.’

N’otu aka ahụ, a jụrụ Ken, ọ bụghị n’ihi na o ji ihe na-adịghị mma chụọ àjà, kama ọ bụ n’ihi na o nweghị okwukwe, dị ka omume ya gosiri. Jehova agwawo Ken n’ụzọ doro anya, sị: “Ọ bụrụ na ị na-eme nke ọma, ọ́ bụghị mgbasa ihu ka ị ga-enwe?” (Jenesis 4:7) Chineke ajụghị Ken n’ihi na ihe ọ chụrụ n’àjà amasịghị ya. Kama, ọ bụ “n’ihi na ọrụ ya dị njọ”—ọ bụ nke e ji ekworo, ịkpọasị, nakwa n’ikpeazụ igbu ọchụ mara.—1 Jọn 3:12.